Nsogbu Ịkụzi Ụdaolu Igbo N'ụlọ Akwụkwọ Sekọndịr

by

Ezema, Chinenye Anthonia Humanities Unit School of General Studies University of Nigeria, Nsukkachinenye.ezema@unn.edu.ng

Ụmịedemede

Nchọcha a lebara anya n'ọmụmụ ụdaolu Igbo n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. Ọ bụkwa maka ịkụzi ụdaolu dị ka ihe ọmụmụ n'ụlọ akwụkwọ ka e mere nchọcha na ya. Ọ chọpụtara ụdaolu dị ka otu ihe ọmụmụ na-ahịa ndị nkụzi ahụ ịkụzi ya n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị n'agbanyeghị na e nyere ha (ndị nkụzi) ọzụzụ na nke a n'ụlọ akwụkwọ dị elu - Kọleji Edukeshọn na Mahadum. Ọ bụ otu isiokwu kacha enye ndị nkụzi nsogbu n'ịkụzi n'ụtọasụsụ Igbo. Itinye ma ọ bụ ịkanye akara ụdaolu site n'olu dị elu ma ọ bụ ala ekweghị ha akanye. Nchọcha a lebara anya n'ụdaolu na ihe ọ pụtara. Ọ gakwara n'ịkọwa ụdị ụdaolu e nwere, akara ha dị iche iche na nsorịta ha n'okwu na n'ahịrịokwu. Echiche atọ ka a ga-esi kanye akara ụdaolu bụ nke e lebara anya wee hụ nke a naghị ede ha n'ihi nhịamahụ dị na ya na ndị a nabatara a ka ji ede ihe ma taa. E mere nchọcha a na zonu mmụta Nsụka. Usoro e ji mee nchọcha bụ ndịmemecha. E ji ndị nkụzi dị iri iteghete na abụọ sitere n'ụlọ akwụkwọ dị iri na ise wee mee nke a. A chọpụtara site na data nke e wetara na njụmaza ma jiri pacenteji (%) wee gosi nsogbu/nhịa ahụ ndị nkụzi na-enwe n'ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. Ndị nkụzi niile e jiri mee nchọcha kwetara na ha chọkwuru ọzụzụ n'ụdaolu na otu e si akanye akara ụdaolu. Ọ bụrụ na ndị nkụzi amụta ma mara ụdaolu na ịkanye akara ya nke ọma site n'ọzụzụ ha ga-enweta, ọ ga-ebelata ọsọ ha na-agba ịkụzi ya n'ụlọ akwụkwọ ma sikwa otu ahụ nwee mmasị na-akụziri ya ụmụaka bụ ndị ga na-aghọta ya nke ọma mgbe onye mara ya na-akụziri ha.

Mkpọlite

Ụdaolu bụ nke pụtara ịkpọli ụda elu ma ọ bụ ịkpọda ya ala oge a na-akpọpụta okwu. Ọ bụ etu e si eji olu akpọpụta okwu na otu o si ada oge a na-akpọpụta ya. Ụdaolu na-eme ka a mara ihe okwu pụtara ọkachasị ebe otu mkpụrụokwu nwere ike inwe ọtụtụ nghọta. Naanị ihe ga-eme ka amata ihe okwu dị otu a pụtara bụ site n'ịkanye ya akara ụdaolu iji gosi mgbe olu dị elu ma ọ bụ ala. Mbah na Mbah (2006) kọwara ụdaolu dị ka mpụtara njikwa ogo olu. Ha gakwara n'ihu kọwaa na ọtụtụ ihe na-emetụta ogo olu dị ka ndọtị mkpọụda nke na-eme ka ogo olu rịa elu. Nke abụọ, etu ikuku si aga na ngụ na-eme ogo olu ịdị elu ma ọ bụ ala.

Anagbogu, Mbah na Eme (2010) na nkọwa nke ha kwuru na ụdaolu bụ ndịiche dị n'olu dị ka o si gbasa nkejiokwu n'asụsụ ụdaolu, nke nghọta ya pụtara ihe nke ọma ma dị iche n'ụdị ya. Ndịiche dị n'ụdaolu n'okwu abụọ ma ọ bụ karịa na-esite n'asụsụ bụ asụsụ ụdaolu. Nke a pụtara ihe nke ọma n'asụsụ Igbo. Asụsụ Igbo dị ka a mara bụ asụsụ ụdaolu. Ikekeọnwụ, Ezikeojiakụ, Ụbani na Ugojị (1999) mere ka a matakwa na ọtụtụ asụsụ mba Afrịka na ụfọdụ asụsụ mba Eshia bụ asụsụ ụdaolu. Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụ ka mkpụrụokwu si ada ka e si amata nghọta na mpụtara ya. N'asụsụ Igbo, otu mkpụrụokwu nwere ike na-akọwa ọtụtụ ihe. Ọ bụ ụdaolu na-eme ka a mata ihe mkpụrụokwu ọ bụla pụtara. Ọtụtụ mkpụrụokwu na-enwe otu nsụpe ma ha na-enwe nghọta dị iche iche. Ọ bụ ụdaolu na-eme ka nghọta ha na-egosipụta ihe ha pụtara.

E ji akara ụdaolu egosi ụdị ụdaolu e ji kpọpụta nkejiokwu dị iche iche. E nwere ụdị akara ụdaolu atọ n'asụsụ Igbo. E ji ha eogsi ka nghọta, ọnọdụ na ọrụ mkpụrụokwu si dị. Ha bụ:

Akara ụdaolu elu ( ´)

Akara ụdaolu ala ( ` )

Akara ụdaolu nsụda (-)

Mkpụrụokwu 'akwa' nwere ike ịpụta ọtụtụ ihe dị ka: ogodo; ọgọdọ; ime ọkụkọ; na ụrịa. Ọ bụrụ na a kanyeghị ya akara ụdaolu, mkpụrụ edide ka ọ bụ. Ma ọ bụrụ na o bu akara ụdaolu na-egosi kpọmkwem ihe ọ bụ , onye akpọtaghị ya dara ya ada.

Ịma atụ:

1. ákwá (ụrịa)

ákwà (ọgọdọ)

àkwá (ime ọkụkọ)

àkwà (ogodo)

Ọmụma atụ ndị otu ọzọ nwere otu edide.

2. òké (anụmanụ na-arị arị)

ókè (ogige)

óké (abụghị a nyị m)

òkè (orubere)

3. ísí (obu)

ìsì (ahụghị ụzọ)

ísì (ùkò)

ísï (ighekọ)

  • ókwà (ichi)

ókwá (obere odo)

òkwà (ụdị nnụnụ)

òkwá (òtú)

5. áká (nku)

ákà (ụdị agwọ)

àká (na-agafe na)

àkà (ngwa mma)

6. ózò (ụdị anụ ọgụ)

ózó (ụdị echiche)

òzó (na-abụghị nke)

7 òkù (efere nkụwa (ụrọ)

ókù (ụba)

ókú (mmụmụ icheku)

8. ntú (asị)

ntú (uzuzu/icheku ọkụ)

9. nchà (nnyemaka ogbo)

nchá (dum)

10. mkpá (ncha)

mkpà (aga)

E lee anya na nọmba 1 rue 10, a ga-ahụ na a bịa na otu nke ọ bụla mkpụrụokwu niile e depụtara nwere otu mkpụrụ edide, naanị ihe dị iche na ibe ya bụ ụdaolu bu nke mere ka nghọta ha dị iche. Ọ bụ n'elu ụdaume (a e i ị o ọ u ụ) ka a na-akanye akara ụdaolu dị ka a hụrụ na nọmba 1 rue na 7. N'aka nke ọzọ, a na-akanyekwazị akara ụdaolu na myiriụdaume (m n) dị ka a hụkwara na nọmba 8 rue na 9. Nke a pụtara na ọ bụghị mkpụrụ edide niile ka a na-akanye akara udaolu. Naanị ụdaume na myiriụdaume na-ebu ụda na mkpọpụta ha. Ọtụtụ na-nwe nsogbu nchọpụta na ebe e kwesịrị ịkanye akara ụdaolu. Tinyekwara ịmata ụdị akara ụdaolu a ga-akanye.

Dị ka e gosirila na e nwere akara ụdaolu atọ n'asụsụ Igbo - ụdaolu elu, ụdaolu ala na ụdaolu nsụda. Akara ndị a nwere njirimara ha na usoro ha si esorita onwe ha.

Ntụleghari Agụmagụ

E meela nchọcha banyere ụdaolu na akara ụdaolu. Mbah na Mbah (2010), Nwachukwu (1995), Emenanjọ (1987), na Green na Igwe (1963) ndị ọkammụta dị iche iche e lebara anya n'ụdaolu na ka a ga-esi kanye ha akara dị ka o kwesịrị . A tụlere ụdaolu elu, ụdaolu ala na ụdaolu nsụda na ka e si kanye akara ha n'ọmụma atụ mkpụrụokwu ụfọdụ.

Ụdaolu Elu

Ụdaolu elu bụ ụdaolu ịrị elu mgbe a na-akpọpụta ụda. E ji akara nlamelu ( ´) egosi ya. Ọ na-:

  • ebido mkpụrụokwu ma ọ bụ ahịrịokwu d.k. óché, élú
  • anọ n'etiti mkpụrụokwu d.k. ógólógó njédébé
  • anọ na ngwụcha mkpụrụokwu na ahịrịokwu d.k. Há gbùrù éwú
  • eso ụdaolu elu ọzọ d.k. ányá ékwé
  • edekọ ya na ụdaolu ala
  • edekọ ya na ụdaolu nsụda

Ụdaolu Ala

Nke a bụ ụdaolu dị ala e ji (` ) egosi. Ọ na-:

  • ebido mkpụrụokwu maọbụ ahịrịokwu d.k. àlà ìsì
  • anọ n'etiti mkpụrụokwu d.k. ùdèlè àkùkò
  • anọ na ngwụcha mkpụrụokwu na ahịrịokwu d.k. Ó bịàrà
  • eso ụdaolu ala ọzọ d.k. ìtè ùgò
  • edekọ ya na ụdaolu elu
  • anaghị edekọ ya na ụdaolu nsụda

Ụdaolu Nsụda

Ụdaolu nsụda bụ ụdaolu elu gbadara ala. E ji akara uhie (-) egosi ya. Ọ :

  • naghị ebido mkpụrụokwu ma ọ bụ ahịrịokwu kwụụrụ onwe ya d.k. égo éze
  • na-anọ n'etiti mkpụrụokwu d.k. ngiga íjiji
  • na-anọ na ngwụcha mkpụrụokwu d.k. nwóke ígwe
  • na-eso naanị ụdaolu elu d.k. ája íme
  • naghị edekọ maọbụ eso ụdaolu ala

Ọrụ Ụdaolu N'assụsụ Igbo

Ụdaolu na-arụ nnukwu ọrụ adịghị mgbagha n'asụsụ Igbo. Ọrụ ọ na-arụ gụnyere:

  • Ngosi ndịiche n'okwu abụọ ma ọ bụ karịa nwere otu nsụpe.

a. ákwá (ụrịa)

b. ákwà (ọgọdọ)

ch. àkwá (ime ọkụkọ)

d. àkwà (ogodo)

  • Ngosi ndịiche n'ahịrịokwu ajụjụ na ahịrịokwu nkwusa.

a. Ò nò n'úlò Ó nò n'úlò

b. Ó jere Ò jèrè

  • Ngosi ndịiche dị n'ọnụ ọgụ na nọmba nke.

a. áká átó

b. áká atọ

4. Ngosi ndịiche dị n'ahịrịokwu na nkebiokwu keaha.

a. Ngọzi bịara

b. Ngọzi bịara ...

5. Ngosi ndịiche dị na mkpọaha mgbe ọ na n'okwu na mgbe ọ na-egosi onwunwe.

a. udu ntị

b. udu ntị

Nkanye Akara ỤdaoluMbah (2009) kwuru na ọtụtụ ndị ọkammụta kwenyere n'ọnụ ọgụ ụdaolu e nwere n'asụsụ Igbo. Ebe ọ gbata uhie dịzi bụ ka e si depụta ma ọ gosipụta ha n'ihe a na-ede. Ụfọdụ na-ekwu na ịkanye akara ụdaolu n'ebe niile o kwesịrị na-eme ka ndị mmadụ ghara inwe mmasị n'ịgụ ihe e dere. Ebe ụfọdụ kwenyere ka a kanye akara ụdaolu niile, ụfọdụ ekwetaghị na nke a.

Usoro Odide

Ọ dị echiche atọ pụtara ihe n'usoro ịkanye akara ụdaolu. Nke mbụ ma bụrụkwa nke ochie bụ nke R. C. Abraham wepụtara. Ọ dị mkpa ka a mara na a nabataghị usoro odide ya. Usoro a na-ekwu na :

a. nkejiokwu niile nwere ụdaolu elu na-aga ede ya na nnukwu mkpụrụ edide/leta.

b. nkejiokwu niile nwere ụdaolu nsụda a ga-eji nnukwu mkpụrụ edide wee bido ma dezie ụdaume na-eso ya n'obere leta ma ọ bụ ọ bụrụ myiriụdaume e jiri obere leta dee ya.

ch. Nkejiokwu niile bụ ụdaolu ala a ga-eji obere leta dee ha.

Omụma atụ

áká AkA

ákwá AkwA

ego EGo

ànya ANYa

mmíri MMIri

àlà ala

àkwa akwa

èfè efe

Usoro odide a e nweghị nnabata ozuru mba n'ụdị ka e si eji nnukwu mkpụrụ edide ede ihe, ọkacha n'ibido mkpụrụokwu, nkebiahịrị ma ọ bụ ahịrịokwu. Nke ọzọ, ọ na-emeka ihe e dere ghara ịdị mma ma mekwa ka ịgụ ihe hịa ahụ. N'aka nke ọzọ kwa, ọ na-eme ka a ghara ịma ka a ga-esi na-ede obere leta. Usoro odide a anwụọla, a naghịzi ede ya.

Echiche nke abụọ bụ nke ndị ndu ha bụ Welmers na Nwachukwu. E jirila nke a dee ọtụtụ ihe dị ka a ga-ahụ na Green na Igwe (1963), Welmers (1973), Nwachukwu (1983), na Mbah (1999,2006). Usoro odide anabatara akara nta abụọ maka ụdaolu atọ e nwere - ( ´) maka ụdaolu elu na nsụda na ( ` ) maka ụdaolu ala. Ọ na-ekwu ka:

  • a kanye akara naanị na mkpụrụ edide mbụ ma ọ bụrụ na ha niile nwere otu ụdaolu
  • ebe e nwere ndịiche n'ụdaolu elu na-esotenu, ka a kanye akara ụdaolu nke mbụ na ndị ọzọ.
  • e were akara ụdaolu gosipụta ụdaolu abụọ sochiri onwe ha dị, nke mbụ bụ ụdaolu elu ebe nke abọ bụ ụdaolu nsụda

Ọmumatụ

Áka áka

Ákwá ákwa

Égo égó

Ánya Ányá

Mmíri mmírí

Àlà àla

Àkwà àkwa

Èfè èfe

Echiche nke atọ nke Emenanjọ na Williamson nọ na ya kwuru ka:

1. aghara ịkanye ụdaolu elu niile akara

2. akanye ụdaolu ala niile akara

3. akanye udaolu nsụda niile akara

Ọmụmatụ

áká aka

ákwá akwa

égo ego

Ánya Ánya

Mmíri mmiri

Àlà àlà

Àkwà àkwà

Èfè èfè

Ntụnyere Na Ndịiche Ha

Tebulu 1

Okwu

Abraham

Williamson

Welmers

íré (tongue)

IRE

Ire

Íre

élé (antelope)

ELE

Ele

Éle

áká (hand)

AKA

Aka

Áka

ákwà (cloth)

Akwa

Akwà

Ákwà

nwa óke (man)

NWA Oke

nwa oke

nwá oké

àlà (land)

Ala

Àlà

Àla

nkàtà (basket)

Nkata

nkàtà

Nkata

égo (money)

Ego

Ego

Égó

ìkwìghìkwíghi (owl)

ikwighiKWIGHi

Ìkwìghìkwighi

Ìkwighikwíghí

(Hụ Mbah (2009) ihu 116)

Ịkụzi ỤdaoluỊkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ tụmadị na nke sekọndịrị bụ nke nchọcha a lebara anya. Ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị so n'otu n'ime ọmụmụ e nwere ma na-eme n'ụtọasụsụ Igbo. Ọ bụ n'ihi na e mere nchọcha ka a chọpụtara na ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ na-enye ndị nkụzi nsogbu. Na nchọcha Mbah (2009) mere maka ụmụ akwụkwọ na-agụ na ngalaba Igbo Asụsụ Nịajirịa ndị ọzọ, na ọmụmụ IGB 308 ebe ụdaolu so n'otu ihe a na-akụzi n'ọmụmụ ahụ.

Nchọcha a bụ maka ụmụ akwụkwọ nọ oge niile n'ụlọ akwụkwọ na ndị na-abịa naanị n'oge ezumike ogologo oge. Ndị na-abịa ọmụmụ n'oge ezumike bụ ndị e kwenyere na ha bụ ndị nkụzi n'ụlọ akwụkwọ dị iche iche. A chọpụtara na otu ajụjụ bụ nke a jụrụ maka ụdaolu na imirikiti ha azaghị ya. Ebe ndị nke zara ya aza ka ọtụtụ n'ime ha dara. Nchọpụta gosiri n'ihe ha ji agba ọsọ n'ụdaolu bụ amaghị isiokwu ahụ nke ọma nke mere na ha anaghị akụziri ya ụmụ akwụkwọ ha.

Usoro Nchọcha

Nchọcha nke a lebara anya na nsogbu ndị nkụzi na-enwe ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. Ụdị nchọcha a bụ Ndịmemecha. Ebe e mere nke a bụ na zonu mmụta Nsụka. E ji ụlọ akwụkwọ iri na ise wee mee ya. Ndị nkụzi dị iri iteghete na abụọ n'ọnụ ọgụ na-akụzi Igbo n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ka e ji mee ya. E ji njụmaza dị iteghete wee weta ọsịsa ndị nkụzi gbasara nke a. E jikwa pacenteji wee yochaa data e nwetara. E ji akara ngosi anọ wee zaa njụmaza ndị ahụ. Ha bụ Ekwesịrị m ike (EI), Ekwere m (E), Ajụrụ m (A) na Ajụsiri m ike (AI).

Tebulu 2: Ịkụzi Ụdaolu N'ụlọ Akwụkwọ Sekọndịrị

N/i

Ajụjụ

%EI

%E

%A

%AI

1

Ụdaolu bụ otu ihe ọmụmụ n'ụtọasụsụ Igbo

80

16

04

-

2

Enwere m ọzụzụ n'ụdaolu

60

20

05

15

3

Ana m akụzi ya n'ụlọ akwụkwọ

40

36

13

11

4

Ama m akụzi ya nke ọma

08

14

31

47

5

Ama m akanye akara ụdaolu n'ebe o kwesịrị

08

14

36

42

6

Enwere m ike ịza ajụjụ ọ bụla sitere n'ụdaolu

06

10

35

49

7

Ana m ezere ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ

45

25

25

5

8

Ịkụzi ụdaolu edochaghị m anya

48

25

24

03

9

Achọrọ m ọzụzụ na nka ịkụzi na ịkanye ụdaolu

79

11

06

04

Nchọpụta

Site na tebulu dị n'elu, a chọpụtara na ọtụtụ ndị nkụzi nwere nhịa ahụ n'ịkụzi ụdaolu. Ha kwenyere na a na-akụzi ya n'ụlọ akwụkwọ mana ọ bụghị ha niile na-ekwe akụzi ya n'ihi na ha amaghị akụzi ya nke ọma na ịkanye akara ụdaolu ebe o kwesịrị . Ụfọdụ ha na-eze ịkụzi ya site n'ịmafe ya n'usoro nkụzi ha. Ha kwetara na ịkụzi ụdaolu edochaghị ha anya. Ha gakwara n'ihu kweta na ha chọrọ ọzụzụ pụrụ iche n'ụdaolu - ịkụzi na ịkanye akara ụdaolu.

Nchịkọta Na Mmechi

Ọmụmụ ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ sekọdịrị bụ otu isiokwu e nwere n'ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo. Ọtụtụ ndị nkụzi na-agba ọsọ ịkụzi ya n'ihi na ha amaghị isiokwu a (ụdaolu) nke ọma. Nchọcha lebara anya n'ụdaolu na ihe ọ pụtara. Tinyere ụdị ụdaolu atọ e nwere n'asụsụ Igbo - ụdaolu elu, ụdaolu ala na ụdaolu nsụda na akara ha. E gosipụtara ezi nsorịta ha n'okwu na n'ahịrịokwu. Ọrụ ụdaolu na-arụ bụ nke a kọwapụtara n'uju na nchọcha a. Ụzọ echiche atọ pụtara ihe n'ịkanye akara ụdaolu ka e gosiri na usoro odide ha.

Data e nwetara site na njụmaza ndị nkụzi zara gbasara nsogbu na nhịa ahụ ha na-enwe n'ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ka e ji pacenteji gosi. Ndị nkụzi kwenyere na ha na-enwe nsogbu n'ịkụzi ụdaolu n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ma kweta na ha chọrọ ọzụzụ pụrụ iche maka nke a iji kwalite mmasị ha n'ịkụziri ụmụ akwụkwọ nke a.

Edensibịa

Abraham, R. C. (1967). The Principles of Ibo.Occasional Publications. No. 4. Institute of African Studies, University of Ibadan.

Anagbogu, P.N., Mbah, B.M. & Eme, C.A. (2010). Introduction to Linguistics. Awka: Amaka Dreams Ltd.

Emenanjo, N. (1987). Elements of Modern Igbo Grammar. A Descriptive Approach. Ibadan: University Press Limited.

Emenanjq, N. E. (2015). A Grammar of Contemporary IgboPort Harcourt: M & J Grand Orbit Communications Ltd.

Ezema, C. A. (2018). Ndubata N'ọmụmụ Asụsụ Igbo. Enugu: Computer Edge Publishers.

Green, M. M. & Igwe, G. E. (1963). A Descriptive Igbo Grammar. London: Academie-Verlag.

Ikekonwu, C., Ezikojiaku, P.A., Ubani, A. & Ugoji, J. (1999). Fọnọlọjị na Grama Igbo. Ibadan. University Press PLC.

Mbah,, B. M. (1999). Studies in Igbo Syntax: Igbo Phrase Structure. Nsukka: Prize Publishers.

Mbah, B. M. (2009). '' The Teaching and Learning of the Igbo Tone: Guides to its Effective Understa ndịng in a Typical Classroom Learning Situation". Review of Education. Vol 20 no. 1. Ihu 108-123.

Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2006). GB Syntax: Theory and Application to Igbo. Enugu: Cross River State Chapter of the Association of Authors.

Mbah, B.M. & Mbah, E.E. (2010). Topics in Phonetics and Phonlogy.Contribution from Igbo. Nsukka: AP Eụpress Publishers.

Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Nsukka: University of Nigeria Press Ltd.

Nwachukwu, P.A. (1995). Tone in Igbo Syntax. Nsukka: Igbo Language Association.

Okonkwo, M.N. (1979). A Complete Course in Igbo Grammar. Lagos. Macmillian.

Ụwalaka, M.A. (1996). Fọnọlojị na Ntọasụsụ Igbo. Ibadan: Kraft Books Limited.

Welmers, W. E. (1973). African Language Structures. Los Angeles: University of California.

Nkeji Mmeju N'asụsụ Igbo

nke Chisara Patience Good Shepherd Schools, 3 Olayinka Street, Moroga, Meiran Lagos State. +2347034488651; chikechisara@yahoo.com

Ụmịedemede

Ọnọdụ mkpụrụokwu nwere na nkega dị iche iche dị n'ahịrịokwu na-enye aka ịchọpụta na ịkọwa ọrụ ọ na-arụ na ndokọ okwu ahụ, n'ihi ya mkpụrụokwu ọ bụla nwere ike ịrụ otu ụdịọrụ n'otu ọnọdụ ma rụọ ọrụ ọzọ n'ọnọdụ ọzọ. Ọrụ ya nwere ike ịbụ ọrụ a maara ma ọ bụ a tụrụ anya ọdịdị nkeji asụsụ ahụ kwesịrị ịrụ mana n'aka nke ọzọ, ọrụ ya nwekwara ike ịbụ ọrụ eseghị n'elu dịka ọdịdị ya si dị. Mbunuche nchọcha a bụ ileba anya n' echiche adabanyeghị banyere mmeju n'asụsụ Igbo dị ka o si metụta ọnọdụ ha oge ụfọdụ, ịkọwapụta na ọ dịghị ihe dị iche na nnara na mmeju n'ebe o metutara ndokọ okwu Igbo. E nwetere ngwa ọrụ e jiri rụọọrụna nchọcha a site n'ajụjụọnụ nwa nchọcha gbara mmadụ abụọ ndị bụọka n'amụmamụ usoro okwu Igbo nakwa ịgụọtụtụ ederede banyerenchọcha a nke ọtụtụ ndị mmadụ edeela ihe banyere ya. Nchọcha a chọpụtara ebe dị iche iche mmeju okwu na-anọọnọdụ isiahịrị nke ngwaa anaghị agacha tupu e nwete ya bụ mmeju site ka iwu na ntụ ndokọ okwu Igbo si eme. Nchọpụta ọzọ bụ nzipụta mkpụrụokwu ndị ahụ na-esochi ngwaa n'azụ ndị nọọnọdụ nnara mana ha abụghị nnara kpọm kwem kama nnapụta nnara site n'okwu ọzọ na-eso ha n'azụ, wee na-akọwa na ma nnapụta nnara ma nnara, na ha niile bụ mkpụrụokwu mmeju di na-etinyeso aka n'imejupụta echiche dị n'ahịrịokwu ma ọ bụ nkeji ahịrịokwu a na-akọ maka ya. Nchọcha a chọpụtakwara na n'ogo ndokọ mkpụrụokwu, na mkpụrụokwu mejupụtara echiche zuru oke nye mkpụrụokwu nke bụ isi-ahịrị nwere ọdịdị ya nke na-arụkwa ọrụọzọ ma e wezuga ọrụ mmeju nke sere n'elu ọ rụrụ nye mkpụrụokwu ahụ. Ntinyeuche ederede a bụ izipụta na e kwesighịịgbaso usoro asụsụọzọ si akọwapụta mmeju n'asụsụ ha wee na-akọwa nke Igbo maka na asụsụ Igbo rijuru afọị kwụrụ onwe ya nakwa ọ bụghị mkpụrụokwu niile nọọnọdụ nnara bụ mmeju ma ọ bụ na-arụọrụ mmeju. Nke a ga-enye aka n'ebe mmụta na ikuzi ụtọasụsụ ndokọ okwu Igbo na-abanyewu.

Mkpọlite

N'ụtọasụsụ, mmeju bụmkpụrụokwu , nkeji ahịrịokwu ma ọ bụ nkebiahịrị nke dị mkpa imezu mpụtara okwu enyere. Dịka Borsley (1991) na Brinton (2000) si kọwaa na mgbe ụfọdụ mmeju na-abụ aha (nke bụ okwu na-enye aka n'imezu mpụtara ngwaa). Mbah na ndịọzọ (2013:129) kọwara mmeju dị ka "okwu echiche ya dị n'echiche isiokwu ya mana echiche isiokwu ya adịghị n'echiche nke ya onwe ya; ya na isi nkeji na-ejikọ bụrụ nkeji ahịrị". Ebe Cook na Nweson (2009:41) n'aka nke ha kwuru na mmeju bụ akụkụ asụsụ mgbanwe dị mkpa nke metụtara ọnọdụ isi na mmekọrịta mmewere keji ahịrịokwu ndịọzọ. Mmeju dabaranọ n'echiche "nnara" nke ụtọasụsụọdịnaala mana ụfọdụọka asụsụ dị ka Nwachukwu na Emenanjọ na-akọwa na nnara dị iche na mmeju. Ha kọwara na mmeju bụ naanị na ngwaa ka e si enwete ya site na nkewasi nkeji ngwaa. Mana Mbah na Mbah na-arụsịụka ike na-ekwu na ọ dịghị ihe dị iche na nnara na mmeju, na ọ bụ otu ihe ka ha abụọ na-akọwa nke bụ imejupụta echiche dị n'ahịrịokwu.

N'ihi nrụmaarụụka a gbasara ihe e nwere ike ịkpọ mmeju n'ebe o metụtara nkeji mmeju Igbo kpọlitere mmụọ nwa nchhọchha iji mebe nchọcha a; iji chọpụta ebe dị iche iche mmeju okwu na-anọ ọnọdụ nakwa ihe ịmata kpọm kwem ma e nwe ihe dị ichhe na nnara na mmeju n'ebe o metụtara mmeju Igbo maka na dị ka e si mara na mmeju n'ahịrịokwu bụ onye agwa ngwaa kpara fesara, nke na mgbe ụfọdụ ọ na-enwe nnapụta. Ajụjụ abụrụzie ma nnapụta o sokwa bụrụ mmeju?

Mkpa nchọcha a ga-egbo bụ I doo oke na ngwere anya na ọ dighị ihe dị ichhe na nnara na mmeju dị ka Mbah na Mbah si kọwaa belusọ na mkpụrụokwu ọ bụla nọọnọdụ mmeju na-enye aka izipụta echiche dị n'ahịrịokwu ahụ ma ọ bụ mkpụrụokwu. Otu uru nchọcha a ga-aba bụ idozighara echiche ọtụtụ banyere ihe bụ mmeju n'asụsụ Igbo ọ kachasi ndị na-ebu n'uche na mmeju Igbo bụ okwu na-esote ngwaa n'azụ site na ndokọ okwu IsNgwNn n'usoro ụtọasụsụọdịnaala e ji atụtụ X-bar na-akọwa. Nchọcha a ga-egosipụta naọ bụghị mkpụrụokwu ọ bụla nọdebere ngwaa bụ mmeju ọ kachasị ma ọ bụrụ na mkpụrụokwu ahụ bụ nrụmaka "a" na "ahụ". Nhịamahụ nwa nchọcha nwetere na nchọcha a bụ nchọpụta ndị o nwetesiri site n'aka ụmụakwụkwọ nakwa ụfọdụ ndị nkuzi ụtọasụsụ tụmadị akwụkwọ ụfọdụ e derela banyere mmeju wee na-ekwu na okwu ọ bụla na-arụọrụ mmeju na-eso naanị ngwaa n'azụ site n'iwu na ntụ a na-agbaso akọwa ndokọ okwu nakwa na mkpụrụokwu sitere ngwaa na-abụ nnara na-abụghị mmeju.

Ọ bụ n'akwụkwọ nkọwa bụÌgbò Àdìka e si kọwapụta mkpụrụokwu sayensị asụsụ dị na nchọcha a.

Ntulegharị Agụmagụ

A hazịrị mpaghara a n'ụzọ ndị a : nkọwasị mkpụrụokwu dị n'isiokwu, atụtụ nchọcha, chọcha ndị e meerela n'isiokwu nakwa nchịkọta ntulegharị agụmagụ.

Nkowasị mkpụrụokwu dị n'isiokwu

N'ebe a nwa nchọcha ga-eleba anya n'ụfọdụ mkpụrụokwu o chere dị mkpa n'ịkọwasi isiokwu ọ na-eme nchọcha na ya. Otu mkpụrụokwu metụtara isiokwu a bụ usoro okwu, maka na tupu mmadụ e nwe ike kọwata mmeju, ga-ebu ụzọ mata ka asụsụ Igbo si agakọ.

Usoro okwu dị ka Mbah na Mbah (2014:28) si kọwaa bụ "isi sekpụ ntị n'amụmamụụtọ-asụsụ. Nke a bụ n'ihi na ọ na-akọwa ka asụsụ si ahazi okwu na mgbakwunye ụtọ-asụsụ dị iche iche iji nweta ahịrị-okwu dịziri adịzi ma nwee echiche". Ha gakwara n'ihu kọwaa na n'ezie, ọtụtụ ndị mmadụ na-ewe usoro okwu dị kaụtọ-asụsụ, mana usoro okwu naụtọ-asụsụ dị iche'. Ha kowari na usoro okwu metụtara naanị ka asụsụ si ahazi mkpụrụokwu ya iji mebepụta ahịrị nwere echiche ma nwee ike kwụrụ onwe ya.

Site n'echiche Mbah na Mbah, o kwere ghọta na usoro okwu bụ ihe dịọkpụ nke pụtara na ọ bụ ihe dị adị. Usoro okwu bụ usoro asụsụ ọ bụla si edokọ mkpụrụokwu ya n'ụzọ ha ga-enye nghọta n'ihi ya asụsụọ bụla site na mmalite agbụrụ wee ya na-ahazi mkpụrụokwu ya n'ụzọ ha ga-enye nghọta nke echiche ndụ na usoro obibi ndụ ha. E nwere ike ighọtakwa na usoro okwu site na nkọwa Mbah na Mbah nyere, bụkwa ụzọ agbụrụ kwekọrịtara ha si ezikọrịta ozi ma ọ bụ akparịta ụka. Ọ bụ nke a mere na agbụrụụ bụla dị ka Igbo sikwa hazie asụsụ ya ga-adịrị ya otu ahụ tụmadị ma ọ bụrụ na ọ na-egboro ha mkpa ga. Eleghị anya ọ bụ nke a mere sayensi asụsụ ji kwuo hooha na asụsụ niile dị n'ụwa haa nhatanha.

Anthony na Timothy (2014) n'aka nke ha kwuru na usoro okwu na-eleba anya ka e si etinyekọ mkpụrụokwu ọnụ iji mebepụta ahịrịokwu nwere nghọta ihe a chhọrọ. Ha gakwara n'ihu kwuo na isi usoro okwu bụ na mkpụrụokwu asụsụọ bụla na-abịa n'ụdị dị iche iche ma ọ bụ nkeji asụsụ dị ka aha, ngwaa, nkọwaaha, mbuụzọ dgz. N'akụkụ Mbah na Mbah (2014), ha kwuru na " usoro okwu agabigala agba atọ n'ọmụmụ ya. Agba nke mbụ bụ inyochapụta ọdịdị usoro okwu. N'ebe a, a na-enyochapụta etu e si ekeji mpaghara asụsụ dị iche iche iji nweta ọdịdị okwu, ụdịdịya na ọrụ dị iche iche ọ na-arụ n'ọnọdụ dị iche iche. Agba nke abụọ bụ agba metụtara etu a ga-esi mebepụta iwu usoro okwu dị iche iche nke pụrụịchịkọta ụzọ dị mma a ga-esi kọwaa ndokọ nwere otuụdịdị nhazi". Ha kwuru na mbọ agba a na-agba bụịhụ na ndokọ okwu niile yiri onwe ha ga-enwe otu iwu a ga-eji jikọta ha. Ọzọ kwa, agba a na-agba mbọịchọpụta etu a ga-esi kpokọta iwu dị n'asụsụ ma pịajilata ha ka ha pelata mpe. Sitekwa na nkọwa ọzọ Mbah na Mbah (2014:80) nyere gbasra usoro okwu, ha kwuru na "usoro okwu dị ka atụtụ na-ekwu na asụsụ ọ bụla nweriri ụzọ o si ahazi okwu n'ụtọ-asụsụ ya iji mepụta ahịrị okwu nwere echiche". Ha kwuru na asụsụ dị iche iche ga-enwezu ntụ ọ ga-eji tupụta ụzọ ọ ga-esi gbaso iwu nke a. n'ịkọwada echiche ha, ha kwuru na Comrie (1981) na Jesperson (1924) amụọla ụzọ nhazi usoro okwu dị iche iche asụsụ nwegasịrị. nhazi usoro a gunyere ka nkeji asụsụ dị iche iche si eso onwe ha n'imebe ahịrịokwu nwere echhichhe. Imirikiti asụsụ nwere usoro isi ahịrị, ngwaa na nnara (INgNn) dị ka Bekee, Frenchi, Igbo na Jaman. Ebe usoro okwu asụsụ ndị ọzọ bụ isi ahịrị, nnara na ngwaa (INnNg), ngwaa, isi ahịrị, na nnara (NgINn).

Nkeji asụsụ

N'ụtọasụsụ ọdịnaala, nkeji asụsụ bụ nkeji okwu ndị nwere njimara nghọta n'ụtọasụsụ yiri. Mkpụrụokwu ndị e kenyere n'òtù nkeji asụsụ na-egosipụta otu ụdị akparamagwa n'usoro okwu. Ha na-arụ otu ụdị ọrụ n'ime ahịrịokwu ndokọ nghọta n'ụtọasụsụ, oge ụfọdụ n'usoro mmebeokwu, na nke ahụ ha na-anabata mgbakwunye maka otu ụdị njimara. Ụfọdụ nkeji asụsụ a bụ: mkpọaha, ngwaa, nkọwaaha, nkwuwa, nnọchiaha, mbuụzọ, njikọ, ntimiwu.

Mbah na Mbah(2014:29) gbadoro ụkwụ n'atụtụ ọdịnaala kọwaa ihe nkeji asụsụ bụ, wee kwuo na atụtụ ọdịnaala gbadoro ụkwụ n'ịchọpụta nkeji asụsụ dị iche iche nakwa okwu dị n'asụsụ kwunyere na ya. Ha kọwara na atụtụ ọdinaala jiri ọdịdị na ọrụ okwu na-arụ n'ọnọdụ ya n'ọgbara okwu mee nkeji asụsụ. Ọ bụ nkewa atụtụọdịnaala mepụtara ka e ji akọwa asụsụ ruo oge ugbu a. Nkeji asụsụ pụtara ihe n'atụtụ a bụ aha, nnọchiaha, nkọwaaha, ngwaa, nkwuwa, mbuụzọ, njikọna olu mkpu. Site na nkọwa Mbah na Mbah nke gbadoro ụkwụ n'atụtụọdịnaala, a ga-aghọta na nkeji asụsụ bụ nkewapụta e kewapụtara mkpụrụokwu nke bụ na mkpụrụokwu bụ otu nkeji asụsụ dị ka ọnọdụ ha nọ, ọrụ ha na-arụ na ndokọ okwu ahụ si dị. Nkeji asụsụ bụkwa nchịkọta nke a chịkọrọ okwu dị ichhe iche dị ka ọdịdị ha si dị, ọrụ ha nakwa ọnọdụ ha nọ. Ihe nke a pụtara bụ na nkeji asụsụ abụghịnaanịotuụzọ ka e si akọwa ya maka na mkpụrụokwunwere ikeị bụotu nkeji asụsụn'otu oge dị ka ọdịdị ya ma ọ bụọrụọ na-arụ maọ bụọnọdụọ nọ, ma a bịa n'ebe ọzọ, mkpụrụokwu ahụ nwekwarsa ike ịrụọrụ dị iche ma ọ bụ zaa nkeji asụsụ dị iche; ya mere iji kọwaa nkeji asụsụ etu kwesịrị nakwa usoro ụtọasụsụ ọgbara ọhụụ, e kwesịrị na a ga-eleba anya n'ihe atọ ndị a:

a. Ọdịdị mkpụrụokwu ahụ

b.Ọnọdụ mkpụrụokwu ahụ na ndokọ ahụ

ch. Ọrụ ya n'ebe ahụ.

Ọdịdị

N'ọdịdị ihe ọ pụtara bụna mkpụrụokwu ọ bụla nwere nkeji asụsụọ bụ dị ka nkewasị e kewasịrị mkpụrụokwu dị ka aha e nyere ya si dị ma ọ bụ ka Chi si kee ha, mana ọ na-abụ aha kwesịrị inye ihe dị ka ya ma ọ bụ n'ihe ọ dabara.

Ọnọdụ

Ọ bụọnọdụ mkpụrụokwu na-eme ka ndokọ okwu nwee isiokwu.Ọnọdụ bụ ebe mkpụrụokwu dịna ndokọ okwu.

Ọrụ

Ọrụ mkpụrụokwu bụ isi sekpu ntịna nkọwa mkpụrụokwu na nkeji asụsụ n'usoro ụtọasụsụọgbara ọhụụ. Ọ bụọnọdụ mkpụrụokwu na ndokọ na-ekenye mkpụrụokwu ọrụ ha na-arụ. Ima atụ: ụlọ m

Ụlọ nọ ọnọdụ isiahịrị, ebe 'm' nọ ọnọdụ mmeju nke rụrụ ọrụ 'nnwe' na-emejupụta ihe isiahịrị bụ na ndokọ.

Atụtụ Nchọcha

N'ebe a, nwa nchọcha ga-eleba anya n'atụtụ dị iche iche metụtara nchọcha ma kọwapụta atụtụ dabara adaba iji kọwapụta nchọcha a. atụtụ nchọcha a niile bụ nke Mbah na Mbah(2014).

A bịa n'usoro okwu, e chepụtala ọtụtụ atụtụ gbasara ụzọ ka mma ma zuo ezuo a ga-eji na-akọwa asụsụ.Usoro ndị a gabigara agbatọ.Agba nke mbụ bụ inyochapụta ọdịdị usoro okwu. N'ebe a, a na-enyochapụta etu e si ekeji mpaghara asụsụ dị iche iche iji nweta ọdịdị okwu, ụdịdị ya naọrụ dị iche iche ọna-arụ n'ọnọdụ dị iche iche. Agba nke abụọ bụ agba metụtara etu a ga-esi mebepụta iwu usoro okwu dị iche iche nke pụrụịchịkọta ụzọ dị mma aga-esi kọwaa ndokọ nwere otu ọdịdị nhazi. Mbọ a na-agba bụ ịhụ na ndokọ okwu niile yiri onwe ha ga-enwe otu iwu a ga-eji jikọta ha. Ọzọ kwa, agba a na-agba mbọịchọpụta etu a ga-esi kpokọta iwu dị n'asụsụ ma pịajilata ha ka ha pelata mpe.Nke a ga-eme ka e nwee otu iwu jikọtara ọtụtụ iwu usoro okwu. Ya bụna atụtụ usoro okwu niile e nwere hidoro isi n'agba atọ ndị a. atụtụ usoro okwu e nwere gunyere: atụtụọdịnaala, atụtụ ndokọ ma ọ bụ ewumewu, atụtụụtọasụsụ mgbanwe na ụtọasụsụ izugbe.

Atụtụọdịnaala bụ atụtụ izizi e mebepụtara na-akọwa usoro okwu.O sitere na nsirihụ filọsọfi kọwaa asụsụ Griik. Ọ gbadoro ụkwụ n'ịchọpụta nkeji asụsụ dị iche iche okwu dị n'asụsụ kwụnyere na ya. O jiri ọdịdịnaọrụ okwu na-arụ n'ọnọdụ ya n'ọgbara okwu mee nkeji asụsụ. Ọ bụ nkewa o mepụtara ka e ji akọwa asụsụ ruo oge ugbu a. atụtụọzọ atụtụ ndokọ, atụtụ pụtara n'ihi ọghọm atụtụọdịnaala nwere. Ndị otu a nke onye isi ha bụ Ferdinard de Saussure kọchara atụtụọdịnaala etu o si na-esi agụgọnaọ bụ naanị nkeji abụọ ka ahịrị okwu ọ bụla kwesịrị inwe, ya bụ mpaghara omee na nke ihe o mere. Nke abụọ, ha ekwenyeghi n'ihe atụmatụ ọdịnaala kwuru na asụsụ ederede ka mkpa karịa nke asụrasụ. Ha gbadoro ụkwụ n'echemeche a, nke ha na-akọcha na asị na asụsụ bụ ndịnusoro.

Atụtụ ndokọ na-ekwu na iwu asụsụ bụụdọ ji ya bụ asụsụ. Ha nabatara na ahịrịokwu nwere nkeji abụọ; nkeji nke isi ahịrị/ omee na nkeji ngwaa. Mana ha siri agụgọ sịna, na mpaghara ọ bụla n'ime ha, nkeji ndabe mejupụtara ya. E nwere ike igbuda nkeji abụọ ndị a ka e nweta nkeji ndabe ndịa n'iji mejupụta nke a, ha malitere ụzọọhụrụ esi egbuda ndịna ahịrịokwu ka nke ọ bụla n'ime ha kwuru onwe ya. Usoro mgbuda ndokọ okwu ndị a ka a na-akpọ nkewa ndịna ewumewu ma ọ bụ ndokọ. Ha chepụtara usoro anọ e nwere ike iji kọwada ahịrịokwu ọ bụla e nyere. Usoro anọ ndị a na-ekwu otu ihe mana usoro ha ji eme nke a dị iche iche. Ha gunyere usoro akara nkịtị, usoro akara mbudo, usoro eserese nkịtịna usoro eserese nkọwa.

Atụtụọzọ e kwesịrị ka eleba anya na ya n'ebe o metụtara nchọcha a bụ atụtụụtọasụsụ mgbanwe. Atụtụ a na-akọwa naọ bụghi mgbe niile ka okwu niile na-enye ahịrịokwu echiche na-apụta ihe n'ihe a na-akpọpụta mgbe a na-ekwu okwu. Atụtụ dị n'atụtụụtọasụsụ mgbanwe dịọtụtụ, ndị gunyere: mbughari, mwepu, mtinye, mgbanweta. Ọ bụkwa ewumewu anọ na-egosipụta mgbanwe anọ ndị a. mgbe e wepụtasiri iwu mgbanwe dị iche iche, a chọpụtara na iwu ha dịọtụtụ, ọzọkwa ime nke a , agaghị egosipụta ihe nwa ọhụụ mma mgbe ọ matara asụsụ epum ya; e chere na ọ dị mkpa ịchọpụta iwu ga-achịkọta iwu mgbanwe ndị a niile. E chhere na e nwee iwu metụtara mbughari ọ ga-ejikọ iwu mgbanwe ndịọzọ niile. A kpọrọ iwu a 'bugharị ihe ọ bụla ά'

Atụtụ nke ikpeazụ bụ atụtụụtọasụsụ izugbe nke gbanwere nsirihụ nchọcha ụtọasụsụ ma gbado anya n'etu asụsụ niile si wee yite onwe ha. Atụtụ a nwere agba abụọ, isi ihe atụtụ na-akọwa bụ maka iwu na ntụ metụtara etu asụsụ dị iche iche si ahazi okwu. Mbah na Mbah (2014)

Ọ bụ site n'atụtụ a metụtara iwu na ntụ ka e siri nweta atụtụ a kpọrọX-bar. Dị ka Wikipedia si kọwaa X-bar, ha kwuru na ọ bụ usoro mwube ọdịdị usoro okwu nke nwere nkwado abụọ kwụụrụ onwe ha nke mbụ bụ na nkebiokwu nwere ike inwe nkega nke siri na isi nkeji, ebe nke abụọ bụ na usoro nkega a gbasoro nwekwara ike ịbụkwa otuụdị wee nye otu nkebiokwu ndịọzọ dị ka ( mkp,Ng, Nkw, Mbz). Ihe 'X-bar' pụtara bụụzọ e si amata mkpụrụokwu nkeji na-eso isi nkeji n'usoro okwu asụsụọ bụla.N1 ka a gbanwere ọ bụrụzie N- , ọ bụ akara a dị n'elu N ka ana-akpọ 'bar'. N'aka nke Mbah na Mbah (2014:18) a ga-ahụta na ha kọwara 'X-bar' dị ka atụtụ ewumewu gbasara nhazi okwu nye mmebe nkeji ahịrịokwu nke a chịkọtara n'ọdịdị usoro nkeji ahịrị dị ka:

I0- isiokwu

I1 - isiokwu na nkowa

I11 - isiokwu, nkọwa na mmeju nkọwa

N'ebe a, a chọpụtara ọtụtụ atụtụ nchọcha dị iche iche wee hụta na ọ bụ naanị site n'atụtụ mgbanwe ọ kachasị bughari, x-bar na ndokọ nke metụtara eserese nkọwa ga-enye aka n'ịkọwapụta isi nchọcha a n'ụzọọ ga-esi doo anya.

Nchọcha ndị e meerela n'isiokwu

N'ebe a, nwa nchọcha lebara anya na nchọcha e meerela banyere isiokwu ọ na-eme nchọcha na ya wee họta na ọ bụ na nkewasị nkeji ngwaa Igbo n'ebe ọ gbasatara mmeju ya ka ọtụtụ ndị nchọcha megoro nchọcha na ya. A bịa na nkewasi nkeji ngwaa Igbo, achọpụtara na Nwachukwu (1987:17) kewara ngwaa Igbo site na mmeju ha dị ka:

I. Ngwaa mmeju ndabe( Bound Verb Complement (BVC): N'ebe a o kwuru na mmeju ngwaa ndabe (BVC) bụ urughuru ngwaa nke na e site ma na-adị abe na ngwaa n'onwe ya. Ọ bụrụna mmebere ngwaa adịghị, o nweghị ike ịkwụrụ onwe ya. Ngwaa mmeju ndabe bụ akara onye nke nwere ike iji ngwaa Igbo pụta mgbe ọ bụla e nwere mmasị ikwusi ihe ike. ịma atụ: Aga m ekwu ezi okwu ekwu.

UdemmadụnaỌkpalike (2014:106) n'ịkọwada echiche Nwachukwu kọwara na nkọwa ngwaa a kọwara n'ọmụma atụ dị n'elu dị ka nkọwaaha ngwaa maka na ha na-arụ ọrụ nkọwaaha na-arụ n'asụsụ ọzọ. BVC bụ mmewere iwu ụdị ngwaa '-ru'. ịma atụ: Ọjị toro eto

Chịma buru ibu

BVC bụ okwu nsome nke nkeji ogo nkịtị ebe nnara bụ okwu nsome nke nkeji ogo ngw1 .(V1)

Ngw1

Ngw0 A (arg)

Isngw

IC

BVC Tns A (arg)

Ha gara n'ihu kwuo na e nweghịụzọọzọ a ga-esi kọwapụta mpụtara nkọwaaha a ma ọ bụrụ na-ejighị BVC ma ọ bụ mmeju mkpọaha kwesịrị . Myiri agwa usoro okwu dị n'etiti BVCna IC (mmeju nsinachi) ka a makọrọ na myiri nghọta echiche ha. BVC bụ mmewere onye, ebe IC bụ mpụtara nzi ma ọ dịghị n'ime ha abụọ bụ aha.

II. Ngwaa mmeju nsinachi (Inherent Complement verbs (ICVs): Ngwaa mmeju nsinachi bụ nke iwu ngụpụta bụ iwuriri na mpụtara na-ezi mmeju mkpọaha ga-eso. ịma atụ ICVs gunyere

  • Tụ- anya
  • Kụ ilu

ch. Si ike

ICVs na-apụtakarị n'oge niile nakwa n'ụdịọ bụla nke mpụtara ha na-ezipụta mmeju mkpọaha, nke a na-akọwa na nsinachi.

III. Ngwaa mmeju nkeji mbuụzọ (Prepositional Phrase Complement): Ọ bụ eziokwu na e kejisiri ụfọdụ ngwaa ma ka nkeji mbuụzọ mana e nwere ọtụtụụfọdụ ngwaa nke na n'agbanyeghị na ọnọdụ nkeji mbuụzọ site n'echiche e chere ka ha nwee. Ọzọ kwa, nkeji mbuụzọ na-amịpụta usoro mịrị mkpụrụ n'ịkọwa mpụtara nkwuwa. ịma atụ: Ogu bi n'Aba.

IV. Ngwaa mmeju nnabiga (Ergative Complement Verbs): Ngwaa mmeju nnabiga dị ka UdemmadụnaỌkpalike (2014) si kọwaa na edughie edughie maka na o nweghịụdị ngwaa a n'Igbo ma ọ bụ nke asụsụ Igbo ji bụrụ nnabiga. Mana nnabiga na-emetụta ndịnọrụ na-ekenye njirimara asụsụ. Igbo nwere ikeị bụ naanị asụsụ nnara ebe ọ bụ na ngwaa Igbo na-ekenye omee ọrụ isi ahịrị/ aha nsịna ngwaa, ebe nnarahụhụ ya bụ ndịnọrụ nnara. Emenanjọ (2005:479) kwadoro ihe Nwachukwu (1987) kwuru. Nwachukwu kwuru na ngwaa Igbo kwesịrị ka ekenye ha site na mmeju ha. Ihe dị iche n'echiche ọka mmụta abụọ a bụna Nwachukwu gbakwunyere na ụfọdụ ngwaa nwere ike ịbụ mmennara ebe ndịọzọ bụ ebū nnara iji maa atụ ngwaa 'gbu' bụ mmennara na: Ugoo gburu oke.

Mana ngwaa 'ri' nwere ike I nwere mmeju nsinachi dị ka -nri, -mperi dgz dị ka na:

Ifeji riri nri

Ifeji eat pst food

Ifeji ate food

2. Ifeji riri mperi

Ifeji be weak

Ifeji is found wanting

Udemmadụ na Ọkpalike (2014)

Nchịkọta ntuleghari agụmagụ

Na nchọkọta ntulegharị agụmagụ nchụcha a, e lebara anya n'ọtụtụ agụmagụ e dogoroola gbasara mkpụrụokwu ndị nwa nchọcha chere bara ezigbo uru banyere nchọcha a ndị gunyere usoro okwu, nkeji asụsụ maka na tupu e nwee ike imete nchọcha a nke ọma o kwesịrị ka a mata ka asụsụ ọ bụla si ahazi okwu na ndokọ okwu nakwa ihe ndị kpatara ụdị ndokọ ahụ etu ọ ga-esi gboro ha mkpa. E lebakwara anya n'atụtụ dị iche iche dị ka atụtụ ụtọasụsụ ọdịnaala, ndokọ okwu, mgbanwe, ụtọasụsụ izugbe, ka e nwe ike ị mata nke ga-adaba adaba iji kọwada isiokwu nchọcha a.

Usoro Nchọcha

Usoro a gbasoro mee nchọcha a bụ usoro nkọwa.Nwa nchọcha gbasoro usoro nkọwa mee nchọcha a site n'izipụta ma kọwaa usoro okwu nkeji asụsụ mmeju n'ebe ọ gbasatara asụsụ Igbo.Ọ bụ ihe ndị a bụ nkeji asụsụ n'Igbo ka e jiri mee nchọcha a. n'ihi ya , mmadụ atọ bụ ndị Igbo mara ma na-amụkwa asụsụ Igbo ọ kachasị n'ebe o metụtara ụtọasụsụ Igbo bụ ndị e jiri mee nchọcha a. Ebe a gbakwasara anya bụ ebe dị iche iche e nwere mmeju n'asụsụ Igbo. Mmadụ atọ a bụỤzọma, Chisom ebe onye nke atọ bu ọka mmụta n'asụsụIgbo , onye bụọka mmụta Udemmadụ, ndị na-agụ mana arụkwa ọrụ na mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka Anambara Steeti. Nwa nchọcha gukwara ọtụtụ akwụkwọ dị iche iche ma ndị o nwetere n' ọba akwụkwọ ma ndị sitere nakọmpụta.

Nnyocha Isiokwu

A ga-enyocha isiokwu e mere nchọcha na ya nke a gbadoro ụkwụ n'echiche ihe mmeju pụtara nke Mbah na Mbah kwuru na ma nnara ma mmeju, ha niile bụ mmeju. Na nchọcha a, akọwapụtara isiokwu site n'atụtụ ndokọ ewumewu eserese nkọwa, atụtụ mgbanwe nke mbugharị nakwa x-bar nke ụtọasụsụ izugbe kọwapụta ya. Nke a bụ maka na e nwere ọtụtụ ebe na nkọwapụta isiokwu a agaghị anabatali X-bar ma ọ bụ bugharị ma ọ bụ eserese nkọwa kama otu n'ime ha n'ebe dị iche iche. Ọ bụkwa echiche Mbah na Mbah (2014) maka atụtụ ma ọ bụ ewumewu gbasara nchọcha ka nwa nchọcha ji kọwapụta isiokwu ya. N'ebe o metụtara eserese nkọwa, ọ bụ ndebiri ndị a ka e ji rụọọrụ:

Nkeji mmeju - Nmmj- A

Nkeji mkpọaha - Nmkp

Nkeji ngwaa - Nngw

Nkeji nkowa - Nnkọ

Nkeji mbuụzọ - Nmbz

Nkeji nkwuwa - Nnkw

Mmeju - mmj

Mkpọaha - mkp

Nkọwa - nkọ

Mbuụzọ - mbz

Ngwaa - ngw

Nrụaka - nrk

4.1 Mkpụrụokwu ndị na-esochi ngwaa n'azụ nọọnọdụ nnara mana ha abụghị nnara kpọm kwem kama nnapụta nnara site n'okwu ọzọ na-eso ha n'azụ. Mana e nwere ha niile ka mmeju n'ihi na ha tinyekọrọ aka zipụta echiche zuru oke nye ndokọ okwu aha nọ na ya.

i. Nna m zụtara m uwe

isiokwu nnwe agwa nnapụta nnara

A

Nmkp Nngw

Mkp ngw Nmkp mkp mkp

Mkp mkp Nna Isngw

tns m uwe m

zụta ra

N'ọmụma atụ a, a ga-ahụna 'm' nke abụọ sochiri ngwaa 'zụtara' n'azụ mana ihe ọ nọọnọdụ ebe ahụ bụ nnapụta nke 'uwe' mejupụtara dị ka nnara. Mana ha 'm' na 'uwe' bụcha mmeju nye ahịrịokwu ezipụta

ii.Ọ dị agwaa ọjọọ

Isiokw agw nnapụta nnara

A

Nmkp Nngw

mkp ngw Nmkp

Ọdị mkp nkọ agwa

ọjọọ

'Ọjọọ' dị ka nnara bụ ọdịdị nkọwaha ka ọ bụ nke mejupụtara echiche ndokọ okwu a nke ọdịdị 'agwaa' bụ mkpọaha mana ọ nọ ọnọdụ nnapụta.

iii. Amaka nwere akwụkwọChisara

isiokwu agwaa nnapụta nnara

A

Nmkp Nngw

mkp ngw Nmkp

Amaka Isngw tns mkp mkp

nwe -ru2 akwụkwọ Chisara

re N'ebe a 'Chisara' mejuru 'akwụkwọ' iji zipụta echiche zuru oke

iv. Chinedu zuru ego Nkọlị

isiokwu agwaa nnapụta nnara

A

Nmkp Nngw

mkp ngw Nmkp

Chinedu isng tns mkp mkp

zu -ru2 ego Nkọlị

ru

Ọdịdị'Nkọlị' bụ mkpọaha, nke nọọnọdụ nnara, ebe 'ego' nọọnọdụ nnwe nnapụta nke ọdịdị ya bụkwa mkpọaha, ha jikọrọ aka dị ka nnapụta na nnara mejupụta echiche dị na ndokọ okwu dị n'elu

v. Ha ga-ete ofe ete

isiokwu agwaa nnapụta nnara

A

Nmkp Nngw

mkp ngw Nmkp

Ha nny mkngw mkp ngw

ga ete ofe ete

  • Mmeju dị ka isiahịrị nke ngwaa anaghị agacha tupu e nwete ya dị ka iwu na ntụ ndokọ okwu Igbo si eme (IsNgwNn)
  • O hichapụrụ oche

A

Nmkp Nngw


mkp ngw mkp


O hichapụrụ oche

N'ọmụma atụ a, 'o' nọọnọdụ isiahịrị nke rụrụọrụ mmeju nye ngwaa maka na echiche ndokọ okwu a tadoro n'elu isiahịrị nke kọwapụtara onye kpara agwaa ngwaa maka na e wepu 'o' ihe a ga-enwezi bụ 'hichapụrụ ochhe nke e nweghị echiche zuru oke.

  • Ọ sara efere

A

Nmkp Nngw

mkp ngw mkp

Ọ sara efere

Otu ihe ahụ mere n'ọmụma atụ nke mbụ mere na nke abụọ.

  • Na ọ bịaghị wutere m

A

Nmkp Nngw

A (Nmmj) ngw mkp


Na ọ bịaghị wutere m

N'ọmụma atụ nke a, a ga-ahụna 'na' nke ọdịdị ya bụmbuụzọ nọọnọdụ isiahịrị na ndokọ okwu a mana ọ bụọrụ mmeju ka ọ rụrụ nke tinyekwuru nghọta n'ihe a na-ekwu maka ya nke bụ maka na 'ọ bịaghị'. Nke a bụ site na bugharịa ὰ nwetere mgbanwe nye mpụtara echiche ahịrịokwu ahụ.

  • Na ọ bịaghị dị mwute

A

Nmkp Nngw

A ngw mkp

Na ọ bịaghị dị mwute

Otu ihe mere n'ọmụma atụ 'iii' bụkwa ihe mere na 'iv'.

  • Mgbe o rutere oge akwụla.

A


Nnkw Nngw

nkw mkp ngw Nmkp

Mgbe o rutere mkp ngw


oge akwụla

N'ebe a 'mgbe' nke ọdịdị ya bụ nkwuwa nọọnọdụ isiahịrị nke rụrụọrụ mmeju nye ngwaa maka na o mejupụtara echiche dị na ndokọ okwu ahụ.

  • Etu ọ gara lọta ka mma

A

Nnkw Nngw

nkw mkp ngw nkọ

Etu ọ Isngw tns nny mma

ga-ru2Isngw ka

ra lọta

Na nke a, 'etu' rụrụ ọrụ mmeju nye ngwaa ndokọ okwu a, mana ọnọdụ ya bụ ọnọdụ isiahịrị nke ọdịdị ya bụ nkwuwa keagwaa.

  • Nzipụta ihe abụghị mmeju n'ogo ndokọ mkpụrụokwu nakwa nke bụ mmeju n'ogo ndokọ mkpụrụokwu.

Ọmụma atụ ndị abụghị mmeju n'ogo mkpụrụokwu

  • Ada ọma ahụ
  • Nwoke ogologo a

ch. Ugbene ọcha ahụ

N'ọmụma atụ ndị a, nrụaka 'ahụ' na 'a' arụghịọrụ mmeju n'agbanyeghịna ha nọọnọdụ mmeju n'usoro ndokọ dị ka ọtụtụ ndị si kọwaa. Ọ bụrụ ka akọwa ha dị ka mmeju site n'usoro ndokọ, nke mbụ bụ na ha agbasoghị usoro iwu na ntụ ndokọ nke bụ (IsNgwNn) nke merenu na nchhọchha a ekwunye n'echiche ndị na-ekwu na 'ahụ' na 'a' bụ mmeju n'ebe ndokọ ogo mkpụrụokwu a nọ "Ada ọma ahụ" kama a ga-asị na ihe 'ahụ' 'na' rụrụ na ndokọ mkpụrụokwu a bụ mgbatị nkọwa nye isiokwu mkpụrụokwu nke na-agbasobe usoro ndokọụtọasụsụ izugbe bụ X-bar, ihe 'ahụ' na-ezipụta nọ nzi (specifier) nke bụ XII.

Ọmụma atụụfọdụ ndokọ n'ogo mkpụrụokwu

  • Ụlọ m

X0- ụlọ

XI- m

'ụlọ' n'ebe a bụ isiokwu nke ọdịdị ya mkpọaha, ebe 'm' dị ka mmeju ya bụkwa mkpọaha n'ọdịdị nke nọọnọdụ mmeju nakwa nnwe. 'M' mejupụtara echiche dị n'isiokwu.

  • Ego Ibe

'Ego' na 'Ibe' bụ mkpọaha n'ọdịdị, ebe Ego nọọnọdụ isiahịrị, 'Ibe' anọdụọnọdụ mmeju nakwa nnwe nke mejupụtara echiche isiahịrị 'Ego'

X0- Ego

XI- Ibe

  • Ugbene ọcha

'Ugbene' bụ mkpọaha n'ọdịdị nọọnọdụ isiahịrị ebe 'ọcha bụ nkọwaaha nke nọọnọdụ mmeju tinyekwuru ngọta n'echiche isiahịrị 'ugbene'. X0- ugbene, XI- ọchha

  • Mmanya ụtọ

'Mmanya' bụ mkpọaha n'ọdịdị nke nọọnọdụ isiahịrị, ebe 'ụtọ' bụ aha nkọwa n'ọdịdị ma na arụ ọrụ mmeju nye 'mmanya'. X0- mmanya, XI- ụtọ

  • Ama obosara

Otu ihe ahụ mere n'ọmụma atụ 'd' bụkwa ihe mere na nke a. X0 -Ama, XI- obosara.

Nchịkọta Nchọpụta

Na nchọcha a, e jiri atụtụ nchọcha ndokọ okwu nke nkọwa eserese, atụtụ mgbanwe nke bugharị nakwa atụtụụtọasụsụ izugbe nke X-bar tulee nchọcha a. A gbadosiri ụkwụ ike na nkwenye Mbah na Mbah gbasaraihe mmeju bụ, nke na-akọwa na, na nnara na mmeju bụotu ihe beluso ihe ha na-eme na ndokọ okwu bụ itinyeso echiche na ndokọ ahụ.

E gosipụtara ebe emegorola nchọcha banyere isiokwu nchọcha a wee hụta na ọ bụ o metụtara nkewasị ngwaa ka aka zipụta ihe e nwere ike ịkpọ nkeji mmeju n'asụsụ Igbo. Mana nwa nchọcha chọpụtakwara ebe ọzọ a na-enwe mmeju n'asụsụ Igbo wee chọpụta mkpụrụokwu ndị na-esochi ngwaa n'azụ nọ ọnọdụ nnara mana ha abụghị nnara kpọm kwem kama nnapụta nnara site n'okwu ọzọ na-eso ha n'azụ ma rụrụ ọrụ mmeju. Ọzọ kwa , nwa nchọcha chọpụtakwara mkpụrụokwu ndị nọ ọnọdụ isiahịrị bụ mmeju nke ngwaa anaghị agacha tupu enwete ya dị ka iwu na ntụ ndokọ okwu Igbo si eme (IsNgwNn). Ebe nchọpụta nke ikpeazụ bụ nzipụta ihe abụghị mmeju n'ogo ndokọ mkpụrụokwu nke ọtụtụ ndị na-eche na ha bụ mmeju ma zipụtakwa nke bụ mmeju n'ogo ndokọ mkpụrụokwu.

Mmechi na Alo

Na mmechi, ọ dị mkpa na tupu mmadụ ọ bụla akọba ma ọ bụ chọọ ị mata banyere asuụsụ ọbụla, onye ahụ ga-agba mbọ ị mata usoro asụsụ ahụ si edekọba mkpụrụokwu ha, iwu na ntụ ha na-agbaso n'ogo ahịrịokwu ma ọ bụ nkeji ahịrịokwu ma gharakwa iji usoro asụsụ ndị ọzọ na-akọwa asụsụ ọ na-achọ ịmụta ma ọ bụ amụta maka na asụsụ ndị bụ ọdịbendị nke na-enye nghọta nke echiche ndụ na usoro obibi ndụ ha; ma malitekwa mgbe agbụrụ ha malitere ọ kachasị asụsụ Igbo.

Edensibịa

Anthony, J.L & Timothy, J.C. (2014).Language Description.Na Alan, D na Catherine, E (ohz). The Handbook of Applied Linguistics. Malden: Blackwell Publishing.

Borsley, R. (1991). Syntactic theory: a unified approach . Cambridge, MA: Blackwell Publishing.

Brinton, L. (2000). The Structure of Modern English.Amsterdam: John Benjamins Publishing Company.

Comrie, B. (1981). Language universal and linguistics typology. Chicago: The University of Chicago Press

Cook, V.J & Nweson, M. (2009). Chomsky's Universal Grammar: An Introduction (mbgh 3). Malden: Blackwell Publishing.

Emenanjọ, N. E (2005).Igbo Transitivity or Complementation.Na ndịmele, O.M (ohz). Trends in the Study of Language and Linguistics in Nigeria. A festschrift for Philip Akujuobi Nwachukwu. Ihu 479.Port Harcourt: Grand Orbit Communication and Emhai Press.

Jesperson, O. (1924). The philosophy of grammar. London: Allen & Unwin.

Mbah, B.M na ndị ọzọ. (2013). Ìgbò Àdì.Igbo-English Dictionary of Linguistics and Literay Terms.Enugu: University of Nigeria Press Limited.

Mbah, B.M & Mbah, E.E (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Enugu: University of Nigeria Press.

Nwachukwu, P.A. (1987). The Argument Structure of Igbo Verb. Cambridge: MIT

Udemmadụ, T. N. &Ọkpalike, B.I. (2013). Igbo VP in X-bar Syntax. N' Anedo, A.O ^& T.N, Udemmadụ (ohz) Igbo scholars journal. (vọl; 1)

Wikipedia(2017). X-bar theory. Mbutu site na https:/en.m.wikipedia.org.28-11-1