Mgbasa Ozi Ọha dịka Ngwa E Ji Akuzi Asụsụ Obodo na Naịjirịa

Aruah, Virginus Onyebuchi ¹

Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

onyebuchi.aruah@unn.edu.ng 08039482647

Eze Jacinta Ukamaka ²

Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

eze.ukamaka@unn.edu.ng 08069088560

Mamah Juliana Ginika ³

Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa Ndị Ọzọ

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

juliana.mamah@unn.edu.ng 08063932170

Ụmịedemede

Akwụkwọ nchọcha a na-enyocha mgbaza ozi ọha dịka ngwa e ji akuzi asụsụ obodo na Naịjirịa. Mbunuche nchọcha a bụ inyocha mkpa ọ dị iji mgbasa ozi ọha kuzie ma mụọ asụsụ obodo n'ime Naịjirịa, itule oke na ọrụ dịrị ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ iji mgbasa ozi ọha rụọ ọrụ dịka ngwa ọmụmụ na igosi uru na ọghọm ndị ọmụụ na-enwe mgbe e ji mgbasa ozi ọha akuzi ha ihe. Nnweta njatule bụ nke ewekọtara site na nsiripụta nke nsoje. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n'usoro nchọcha nkọwa. Nchọpụta nchọcha a gosipụtara na ndị nkuzi asụsụ obodo Naịjirịa ga-eji usoro mgbasa ozi ọha wee kuzie asụsụ obodo Naịjirịa. Nke a ga-adị ire mgbe ndị nkuzi haziri usoro nkuzi ha n'ụdị a chọrọ ka ọ bụrụ ihe mgbado ụkwụ maọbụ ntụziaka akpamụbụbọ mgbe nkuzi nsinikuku malitere gbasara asụsụ obodo. Ụmụ akwụkwọ bụ ndị ga-arụ ọrụ akpamụbụbọ mgbe amụmamụ nsinikuku malitere kpọmkwem. Nchọcha a gosikwara na mgbasa ozi nwere ụfọdụ ọghọm n'ebe ndị ọmụụ nọ mana uru ndị ọmụụ na-enweta na ya abụghị nke a ga-eleda anya.

Ọkpụrụkpụ okwu: Mgbasa ozi, nkuzi, asụsụ obodo, mgbasa ozi ọha, amụmamụ nsinikuku, Naịjirịa

Abstract

This paper examines social media as tools for teaching i ndịgenous languages in Nigeria. The objectives of this study are to investigate the possibility of using social media in teaching and learning of i ndịgenous languages in Nigeria, to examine the role of teachers and learners in the use of social media as learning tools and to find otu the positive and negative impacts of social media on the learners. Data for this study are gathered through secondary sources and the study employs descriptive approach in its analysis. The fi ndịngs of the study reveal that i ndịgenous language teachers can effectively use social media platform to teach i ndịgenous languages. These teachers can achieve these by designing the instruction and playing the role of interaction facilitators when the online courses begin while the students should engage in online tasks-based discussion. The study also reveals that though there are some negative impacts of the social media on the user, the positive impacts cannot be underestimated.

Key concepts: Media, teaching, i ndịgenous language, social media, online pedagogy, Nigeria

Mkpọlite

Ntọala nchọchaA

Asụsụ bụ ngwa nkwalite kachasi mkpa na ndụ mmadụ. Nke a mere Daniel Webster jiri kwuo n'ime Ọmachonu (2011) na ọ bụrụ na akaraka na ike niile a bụrụ nke a napụrụ ya site n'ụfọdụ ihe mgbochi nke nduzi, na ya ga-enwe ike ichekwa naanị otu ihe n'ime ha. N'egbughi oge na ya ga-echekwa ikike nke e ji na-ekwu okwu maka na site n'ikwu okwu ka ya ga-eji naghachite ihe niile ndị ahụ nke a napụrụ ya. Asụsụ bụ ngwa omenala n'ebe ndị mmadụ nọ n'ọha obodo. Leenu anya ka obodo na-enweghi asụsụ ga-adị.

Kedu ka obodo dịka Naịjirịa bụ ndị ejighi akuzi asụsụ obodo ha n'ụlọ akwụkwọ kpọ mkpa ga-adị. Ụmụ akwụkwọ n'onwe ha na-ahụta asụsụ obodo ndị Naịjirịa dịka asụsụ na-etozughi etozu ka akuzie ha n'ụlọ akwụkwọ ndị sekọndịrị nakwa n'ogo ụlọ akwụkwọ ndị dị elu. Asụsụ obodo Naịjirịa ka a na-ahụta dịka ihe mgbe oche, ihe tara nchara, na ihe enweghi uru ọ ga-abara ụmụ akwụkwọ ndagba ọhụrụ. Nke a bụ ezigbo nsogbu nye asụsụ ala Naịjirịa n'ihi na o nwere ike ime ka asụsụ ala anyị nwụọ kpamkpam.

N'ihi ọnọdụ ọjọọ a dakwasara nkuzi asụsụ obodo Naịjirịa n'etiti ụmụ akwụkwọ nime klaasị n'ụwa taa mere ka e jiri ngwa teknọlọjị agbara ọhụrụ bụ nke nwere ike ikwalite mkpakọrịta na njikọta mgbasa ozi ọha ọnụ n'ikuzi asụsụ ala Naịjirịa. Mgbasa ozi ọha bụ nkebiokwu na-akọwa ka nrụ ọrụ weebụ na ngwa teknọlọjị ndị ọzọ si ejikọta ọtụtụ mmadụ ọnụ ka ha nwe ike kpa ụbụbọ maọbụ zirita onwe ha ozi. Nke a bụ mkpanaka nrụ ọrụ weebụ nke mba ụwa niile bụ nke nwere ọdịdị ndị a: ọgbakọ bụlọgụ, ngwa ịkọrị, bụlọgụ nta ndị ọzọ, ngosikọrịta foto, ududo nzụkọrita ahịa, ịgba cha cha keọha na ududo keọha. Ududo keọha gụnyere: ihu akwụkwọ teknọlọjị (facebook), mbipụta okwu (word press), ndị na-ede bụlọgụ, insitagramụ, tiwita, wasapụ na ọtụtụ ndị ọzọ. n'ụwa taa, ihu akwụkwọ teknọnọjị nwere nnukwu ọrụ ọ na-arụ na ndụ mmadụ. ọ na-abawanye dịka ngwa mgasa ozi nke dị mkpa n'ọnọdụ agụmakwụkwọ. N'ezie, mgbasa ozi ọha nwere ike ịrụ ọrụ pụrụ iche n'ikuzi nakwa n'ịmụ asụsụ ala Naịjirịa.

Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ka mgbasa ozi ọha ga-esi nye aka n'ọmụmụ na nkuzi asụsụ obodo na Naịjirịa. Nchọcha a gakwara n'ihu ma nyochaa ka a ga-esi e ji mgbasa ozi ọha kuzie asụsụ obodo n'ime Naịjirịa. Nchọcha a ga-elebe anya n'ihe ndị a kpọmkwem:

  • Inyocha ohere dị ,'iji mgbasa ozi ọha wee kuzie ma mụọ asụsụ obodo ndị dị n'ime Naịjirịa.
  • Itule ọrụ dịrị ndị nkuzi nanke dịrị ndị ọmụụ mgbe e ji mgbasa ozi ọha arụ ọrụ dịka ngwa ọmụmụ.
  • Ịchọpụta mmana adịghị mma ndị ọmụụ na-enweta site n'iji mgbasa ozi ọha mụọ ihe na klaasị.

N'iji nweta mbunobi nchọcha a kpọmkwem, ajụjụ nchọcha ndị a ka a ga-eleba anya:

  • Kedu ka a ga-esi eji mgbasa ozi ọha wee kuzie ma mụọ asụsụ obodo Naịjirịa?
  • Olee ọrụ dịrị ndị nkuzi na ndị ọmụụ n'iji mgbasa ozi ọha mere ngwa ọmụmụ?
  • Gịnị bụ mma na adịghị mma mgbasa ozi ọha na-eweta ebe ndị ọmụụ nọ?

Nchọcha a ga-abụ ihe mmepe anya n'ebe ndị nne na nna, ndị nkuzi na ndị nlekọta nọ iji wee zie ụmụ ha uru dị n'iji usoro mgbasa ozi ọha wee mụọ ihe. ụmụ akwụkwọ n'onwe ha ga-esonye n'ihe a na-eme na mba ụwa dum gbasara ọmụmụ asụsụ obodo n'oge ugbu a. usoro ọmụmụ a ga -emepe anya ndị Naịjirịa ka ha mata na ọ bụghị naanị ọghọm maọbụ ihe adịghị mma ka a na-enweta n'ụdị nkuzi e ji mgbasa ozi ọha akuzi. Nchọcha a ga-abụ ebe mgbado ụkwụ nye onye maọbụ ndị nchọchaọ bụla ga-eme nchọcha yiri nke a.

Ọ bụ eziokwu na-emeela ọtụtụ nchọcha gbasara mgbasa ozi ọha dịka nwa nkuzi mana site n'amamihe ndị nchọcha a na o nwebeghi nchọcha emereela gbasara iji mgasa ozi ọha wee kuzie ma mụọ asụsụ ala Naịjirịa. Asụsụ ala Naịjirịa gụnyere asụsụ niile e ji mara ndị Naịjirịa ma bụrụ asụsụ epum ha.

Ntulegharị AgụmagụNtulegharị agụmagụ e mere maka isiokwu a dabara n'ụzọ atọ ndị a: atụtụ n'isiokwu, atụtụ na nchọcha na nchịkọta.

Atụtụ n'isiokwu

N'ụwa taa, usoro mgbasa ozi ọha jupụtara n'ọtụtụ ebe mana ọrụ e ji ya arụ dị iche iche site n'otu ebe gaa n'ebe ọzọ. E nwere ike ịhụta ya ka ngwa akpụrakpụ nke na-akwalite nkuzi na ọmụmụ ihe. Kaplan na Haelein (2010) kọwara mgbasa ozi ọha dịka otu ngwa ududo bụ nke nwere ntọala echiche ya na weebụ 2.0 ma na-enyekwa aka ịkpụ na mgbanwekọrịta echiche ndị njiarụ ọrụ. Kalasi (2014) na-ekwu na mmetuta nke mgbasa ozi ọha na nkuzi na ọmụmụ ihe gosipụtara onwe ya n'usoro nkuzi na ọmụmụ ihe, oke na ọrụ dịrị ndị nkuzi na ndị ọmụụ nakwa ọnọdụ mmetuta na àgwà ndị ọmụụ. Schmidt na Brown n'ime Kalasi (2014) kpebiri n'ụzọ kachasị mma iji usor mgbasa ozi ọha wee kuzie ihe bụ site n'ịgwakọrịta usoro nkuzi n'ikuku na nke ọdịnala ọnụ n'ime klaasị mgbe a na- akuzi ihe. Ha kwenyere n'ụdị ngwakọrịta a na-enye aka ịhazi ebe nkuzi na ọmụmụ ihe tinyere ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ inwe ezi mmụta sitere na teknọlọjị ọgbara ọhụrụ. Site n'echiche ha , e kwesịrị ikwalite mma dị n'ọmụmụ keahụrụnanya site ,'inyocha usoro nkuzi; itule usoro kacha mma ndị ọmụụ ga-agbaso; inwe ezi mmụta gbasara usoro nkuzi n'ikuku na nke nkuzi ọdịnala nakwa ịhọrọ ngwa nkuzi dabara adaba maka inweta ezi ọmụmụ pụrụ iche. A ga-esikwa na ya wee kpughepu ma mejupụta atụmatụ nkuzi ma megharịa atụmatụ usoro nkuzi n'ikuku.

Site n'ọnọdụ mgbasa ozi ọha maka ezi ọmụmụ, Moody (2010) na-ekwu na ọ bụrụ na e ji mgbasa ozi ọha akụzi ihe, na a ga-enwe ohere nkọwami onwe, mmekọta, ọmụmụ ihe, mkpughepu ihe zoro ezo na ọmụmụ ihe ga-abawanye. Nzaghachi nke ndị nkuzi, ikesa ọmụmụ ihe, nrite ihe a tụrụ anya n'aka ụmụ akwụkwọ, ndịiche, ikesa usoro nkuzi, nchekwa amamihe na usoroedide ga-abawanye. Dịka Wright (2010) siri kwuo na ezi mgbasa ozi ọha na-eme ka obodo dị mma. O kwukwara na mgbe e jiri mgbasa ozi ọha wee na-amụ ihe maọbụ eme nchọcha na o na-enyere ndị nchọcha aka ịma onwe ha site n'ịbịkọta ọnụ n'ọnya nwa ududo. Ọ bụghị naanị ka abịakọta ọnụ ka ọ na-eweta, ọ na-eme ka ha nweta ndị enyi, ichekwaba mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ịmụta ihe n'aka ndị enyi nakwa iwube ogbe ọhụrụ n'ikuku. Kalasi kwadosiri okwu a ike site n'ikwu okwu nke ya n'ụdị ọnọdụ a na-ejikọka ụmụ akwụkwọ na ngalaba na ngalaba ma wube ọkachamara ududo ndị ga-ejiko ụmụ akwụkwọ n'otu ogbe bụ nke karịrị ọnụmara klaasị.

Otu ihe doro anya n'ihe doro anya n'ihe isi ike a na-enweta n'ọnọdụ mbara ezi mgbasa ozi ọhụrụ mere ka Paulsen n'ime Paulsen na Tække (2013) gosipụtara ihe ndọghachi azụ ndị nke na-apụtachaghị ihe a na-enwe na klaasị. Ụdị ọnọdụ a mere ka-enwe ihe ndọlazụ mgbe e webatara isiokwu nke na-adị ịghị na ndịnusoro nkuzi bụ nke agaghị ekwe ụmụ akwụkwọ nghọta na klaasị. O kwukwara na ụdị ndọlazụ ọzọ ụmụ akwụkwọ na-enwe bụ ndọlazụ nra mmadụ ahụ bụ nke a na-enweta mgbe e ji ngwaa teknọnọjị ọgbarọhụ akuzi ihe na klaasị. Iji ngwa teknọlọjị ọgbarọhụ wee kuzie ndị a maghị ka e si eji ya arụ ọrụ bụ ịmafe aka n'ụdị usoro nkuzi omenala e ji akuzi ihe na klaasị n'oge mbụ. Kalasi gosipụtara na mgbasa ozi ọha na-eme ka ndị nkuzi si n'iwebata isiokwu nkuzi ma mafe aka n'ịkọwa isiokwu a ka ọ bụrụ nka ọmụmụ. Nka ọmụmụ gbadoro ụkwụ n'usoro e ji akuzi ma na-amụ ihe na klaasị.

Site n'ịkwalite echiche ụmụ akwụkwọ n'ebe mgbasa ozi dị, Paulsen na Takke tụrụ aro na a ga-ebu ụzọ hiwe isin'ime ka ụmụ akwụkwọ mata ọrụ dịrị ha mgbe a na-akuzi ihe ma lebekwa anya n'ihe ndọlazụ ha na-enwe n'ihi ọtụtụ ọrụ ha ji n'aka n'otu oge. Nke abụọ, a ga-akwalite mmụọ ụmụ akwụkwọ ka nwe ike chọpụta ka a ga-esi e ji mgbasa ozi dijitalụ wee kuzie ihe, jikọta ọtụtụ mmadụ ọnụ, kpa ụbụbọ, nwe nchekwa ma nwe echiche mkpọghachi azụ ihe ndị a kuziri ha.

Atụtụ na nchọcha

Mpaghara ntulegharị nchọcha a na-enyocha nchọcha ndị e mereela gbasara iji mgbasa ozi ọha wee kuzie ma mụọ ihe. Ụfọdụ ndị nchọcha emeela nchọcha yitere ihe ọmụmụ a bụ nke a tulegharịrị nchọpụta nchọcha ha n'okpuru ebe a ma tinyekwa nchọpụta nchọcha a n'okpuru.

Mgbe a na-ekwu maka mgbasa ozi ọha, a ga-arụtụ ihe gbasara ụdọ nzikọrịta ozi (network) na ngalaba ya dị iche iche aka. Ụdọ nzikọrịta ozi na-ejikọta ọtụtụ mmadụ ọnụ na mba ụwa dum. Ihe ana-akpọ nke a bụ ụdọ nzikọrịta ozi ọha. Nke a mere Kalasi (2014) jiri mee nchọcha ya gbasara mmetuta ụdọ nzikọrịta ozi ọha na iji ya kuzie ma mụọ ihe n'oge agba ọhụrụ a. Nchọcha o mere chọpụtara na ụmụ akwụkwọ maọbụ na-etolite etolite na-eji nga teknọlọjị ọgbara ọhụrụ wee na-arụ ọrụ mmụta nke aka ha. Ha na-ejikwa ya akpa ụbụbọ n'etiti ndị ọgbọ ha nakwa iji ya kọwa aro nke ha tụpụtara. Kalasi tụrụ aro sị na ndị ọkachamara na-eji ngwa teknọlọjị ogbara ọhụrụ na-arụpụtakaịrị ọrụ akamkpa bara uru site n'ịmata nka dị na kọmpụta nke ọma. Paulsen na Tække (2013) siri agụgọ na ngwa mgbasa ozi ọhụrụ na-ebute ọtụtụ ihe ndọlazụ ọ kachasị mgbe a na-amụ ihe n'ụlọ akwụkwọ. Nke a ga -eweta ọtụtụ ihe nrite bara uru ma ọ bụrụ na ndị nkuzi achịkọlata ngwa teknọlọjị ndị a ka ha gbasa usoro dị mma n'ikuzi ihe na klaasị. Mgbe a na-akọwa ọrụ dịrị ndị nkuzi n'ịgbaso usoro nkuzi n'ikuku, Dunran na Bernett n'ime kalasi (2014) chọpụtara na e nwere ọrụ ndị karịrị ịgbazi ụzọ na igosi ka usoro nkuzi n'ikuku ga-esi amịta mkpụrụ ọma. ndị nkuzi ga-ahazi ụfọdụ mgbanwe na-abata n'oge a na-akuzi nkuzi nakwa ihazi ọrụ e ji edozi ihe ndọghachi azụ a na-enwe mgbe a na-akuziri ụmụ akwụkwọ ihe. Nchọcha ọzọ a tulegharịrị bụ nke Alfraki na Alharthy (2014) bụ nke gosiri na ọmụmụ na nghọta asụsụ obodo dị mkpa ka-enwe ngwa nkuzi zuru ezu nke ga-enye aka n'inweta ezi ọmụmụ dị mma. Na mgbakwụnye, usoro ọmụmụ ihe nke a enweghi njedebe ma bụrụ ihe ntule nke na-anaghị agwụ agwụ bụ usoro ọmụmụ ihe nke ududo ọha. Mgbasa ozi ọha na-enye aka ka enwe ohere ịmụta asụsụ ma mafe aka n'ọnọdụ ọmụmụ ihe nke a na-amụ na klaasị.

N'ezie, usoro nkuzi a na-enyere ụmụ akwụkwọ aka n'ebe ọ dị ukwuu ịmụta asụsụ ala ha ma na ọ ga ka dị ire ma ọ bụrụ na ndị nkuzi n'onwe ga-agbalị hazie ma họrọ ngwa nkuzi nke ga-amasị ndị ọmụụ (Thurairaj na Roy, 2012). Site n'ịgbaso okwu a dị n'elu nke a, ihu akwụkwọ n'ikuku na tịwịta ga-aka akwalite ezi ọmụmụ asụsụ n'ebe ndị ọmụụ nọ. Na nchọcha e mere gbasara mgbasa ozi n'otu ntabi anya, Craig n'ime Thurairaj, Hoon, Roy naFong (2015) chịkọtara nchọcha a ma kwuo na mgbasa ozi site n'ọwa mgbasa ozi n'ikuku ga-enyere ụmụ akwụkwọ aka inwe ohere ịmụta asụsụ n'ụzọ pụrụ iche. N'ezie, a chọpụtakwara na usoro mgbasa ozi a anaghị akwalitecha ezi mmụta n'ihi na ndị ọmụụ na-agbaso usoro mkpọbiri maọbụ ndebiri na ụfọdụ asụsụ ọrụ arọrọ arọ bụ nke nupuru isi n'iwu ụtọasụsụ asụsụ ala Naịjirịa a na-akuzi. Ụdị ọnọdụ a na-ebute ndacha n'usoro edide na ndọlazụ ezi mmụta n'ebe ụmụ akwụkwọ nọ.

N'ịkọwa ihe ịmaka a na-enweta n'iji igwe kọmpụta kuzie asụsụ, Cumming n'ime Thurairaij na ndị otu ya (2015) na-ekwu na o nweghi mgbe iji kọmpụta nye aka na nkuzi asụsụ ga-anochite anya ndị nkuzi. N'ihi nke a, ọnọdụ ọchịchị nchekwa bụ nke e ji mara ndị nkuzi n'oge ikuzi na ọmụmụ asụsụ na klaasị ga-abụ nke a ga-ewepu n'ọrụ. ka o sila dị, e kwetara na e nweela usoro ọhụrụ kachasị mma eji akuzi asụsụ ma bụrụ ngwa a ga-eji edozigharị ọnọdụ agụmakwụkwọ n' obodo mba ụwa dum. Usoro dP etu a ka nchọcha a tinyere n'ọrụ iji kuzie asụsụ obodo Naịjirịa.

Nchịkọta ntulegharị agụmagụ

Ntulegharị agụmagụ a gosipụtara na e nweela ihe ndọlazụ na mmekpa ahụ mgbe e ji mgbasa ozi ọha dịka ngwa nkuzi wee na-akuzi ihe mana ọtụtụ ihe mbamuru ga-esikwa n'ime ya pụta ọ kachasị mgbe a haziri ngwa ọmụmụ nakwa usoro nkuzi n'oge ugbu a ka ọ dabara ndị agba ọhụrụ. Nchọcha a gosikwara na-emeela ọtụtụ nchọcha yiri nke a n'asụsụ ofesi (AO) mana e nweghi ụdị ya e jiri asụsụ obodo Naịjirịa ọ bụla wee mee.

Igosi na inyocha nnweta njatụle

Nchọcha a gbadoro ụkwụ n'ụzọ a ga-esi eji usoro mgbasa ozi ọha wee kuzie ma mụọ asụsụ obodo Naịjirịa. Mgbasa ozi ọha nwere ọdịdị ndị a: ihu akwụkwọ n'ikuku, yutubu, tịwịta, bụlọgụ, wasapụ, mbipụta okwu na ndị ọzọ. Nke ọ bụla n'ime ọwa okwu ndị a na-enye aka ịkwalite ezi ọmụmụ asụsụ obodo ndị Naịjirịa n'ebe ọ dị ukwuu. Kedu ka a ga-esi eji mgbasa ozi ọha kwalite ezi ọmụmụ ihe mgbe a na-amụ asụsụ obodo Naịjirịa? Ka a ga-esi enweta ihe nrite a bụ site n'ịgbaso ihe ndị a:

Ihu akwụkwọ n'ikuku (facebook)

Usoro ndị a ka a ga-agbaso iji sonye ọwa okwu ihu akwụkwọ:

  • Nke mbụ bụ imepe maọbụ isonye n'ihu akwụkwọ n'udodo bụ nke ga-ejikọta ndị ọmụụ niile sonyere na ya ọnụ. Ndị ọmụụ ndị a ga-emepe ihu akwụkwọ site n'akpọmoku bụ nke jikọtara ndị otu a niile ọnụ.
  • Ịkpọbata ndị ọmụụ ka ha sonye n'otu a e mepere.
  • A ga-ezipu isiokwu kwesịrị nkọwa n'asụsụ a chọrọ ka e nwee usoro ihe omume bụ nke ndị ótú ótù a niile ga-enwe ohere na ikike iji asụsụ a na-ekwu maka ya wee kọwa isiokwu ahụ.
  • Ndị ọmụụ na ndị ngere ga-atụnye echiche ha site n'ịgbaso usoro iwu nkuzi asụsụ obodo ahụ.
  • Itinye ngwa nkuzi ndị ga-akwalite ọmụmụ asụsụ obodo ahụ.
  • A ga-enye ndị ọmụụ na ndị nkuzi ohere izipụta maọbụ isepụta isiokwu ọ bụla kwesịrị ịmụ amụ n'asụsụ obodo a na-amụ site n'ọwa okwu ihu akwụkwọ n'ikuku.
  • Ndị nkuzi dịka ndị nkwalite na ndị nduzi ga-anọ n'ọwa okwu nkuzi a mgbe niile iji zaghachi ndị tụnyere aro maọbụ echiche ha n'ihe a na-akuzi ma gbaa ha ume site n'ụdị aro ha tụnyere.
  • Aro niile ndị a ga-atụnye ga-agbaso usoro asụsụ obodo e ji amụ ihe maọbụ eme nchọcha.

Wasapụ (Whatsapp)

Usoro ndị a ga-agbaso wee sonye n'ọwa okwu Wasapụ nakwa iji ya wee mụọ ihe gụnyere:

  • Ndị ọmụụ ga-emepe ma banye n'ótù Wasapụ.
  • A ga-anabata ndị ọmụụ asụsụ obodo a n'ọwa okwu a.
  • A ga-ewere asụsụ ọmụmụ a zite isiokwu n'ọwa okwu a bụ onye ọ bụla sonyere n'ótù a ga-atụnye echiche ya.
  • A ga-etinye ihe nkiri onyonyo n'ọwa okwu a bụ nke ga-egosi ndị ọmụụ ka ndị nwe asụsụ a na-amụ maọbụ ndị ọ bụ asụsụ epum ha si eji asụsụ ha akpa ụbụbọ ma nụkwa asụsụ a n'ụdị ọkpụ.
  • Onye tinyere isiokwu a ga-atụle kwesịrị ịgwa ha ka ha were asụsụ a na-amụ wee tunye aro n'ihe gbasara ihe ha kiriri nakwa nke ha nụrụ na nti.
  • Ndị nkuzi dịka ndị nnyocha na ndị nhazi, kwesịrị ịhazi ihe ndị ọmụụ depụtara na aro ha tụnyere ma dezie ụtọasụsụ ebe ha dejọrọ. Ha ga-eduzikwa ndị ọmụụ n'iwu na-achịkwa ọmụmụ asụsụ obodo karịa ihe uche ha gwaburu ha na mbụ.

Oke na ọrụ dịrị ndị nkuzi nandị ọmụụ n'iji mgbasa ozi ọha dịka ngwa e ji akụzi mana amụ asụsụ obodo

Nchọcha a ga-ekewa ọrụ ndị a n'ụdị nke ndị nkuzi na nke ndị ọmụụ. Ya bụ ọrụ nke dịrị ndị nkuzi na ọrụ nke dịrị ndị ọmụụ. Usoro ótù abụọ ndị a na-agbaso n'iji mgbasa ozi ọha rụọ ọrụ mmụta na nkuzi di iche. A ga-ebu ụzọ zipụta oke na ọrụ dịrị ndị nkuzi gbasara iji mgbasa ozi ọha wee mụọ ihe maọbụ kuzie ihe.

Ọrụ dịrị ndị nkuzi mgbe e ji mgbasa ozi ọha akuzi asụsụ obodo Naịjirịa:

  • Ịgwa ndị ọmụụ ka ha sonye n'ọmụmụ ihe a na-eme n'ọwa okwu ududo bụ nke gbadoro ụkwụ n'asụsụ obodo a na-amụ.
  • Ịhazi mkparịta ụbụbọ na ọmụmụ ihe nke na-aga n'ikuku maọbụ n'ọnya nwa ududo.
  • Ịkwado ndị ọmụụ ka ha nwe ohere mepee ma sonye n'ọwa mkparịta ụbụbọ dịka ọwa bụlọgụ, ọwa ihu akwụkwọ n'ikuku na ọwa okwu ndị ọzọ ka ha nwe ike na-enweta nchọcha ndị e mereela gbasara ịmụ asụsụ obodo ka ha nwe ike na-agụ ha mgbe niile.
  • Iwube ogbe n'ọwa okwu, intaneti ebe ndị ọmụụ ga -ezukọrịta ma kpaa ihe dịrị ha.
  • Ha ga-akwalite ótù na-agba mbọ ma dị uchu n'ọrụ nakwa iguzobe ọnụnụ ọmụmụ juru ahụ oyi.
  • Ndị nkuzi ga- abụ ndị ọkpụụ ngwa nkuzi.
  • Ndị nkuzi ga-adị nkwadebe ịzaghachi ihe ndị ọmụụ mepụtara gbasara ihe a tụrụ anya n'aka ha. Ya bụ ịhazi oge nkuzi ha ka ọ daba adaba.
  • Ịgba mbọ kpọkọta ndị ọmụụ ma jikọta ha na ndị ogbe na-asụ asụsụ a na-amụ site n'ọwa nkiri, Yutubu.

Ọrụ dịrị ndị ọmụụ gụnyere:

  • Ndị ọmụụ ga-esonye n'ihe ọmụmụ n'ikuku nke gbadoro ụkwụ n'asụsụ obodo a na-amụ.
  • Ha ga-anabata mkparịta ụka keọha iji chọpụta ka e siri wube ihe ọmụmụ nke a na-amụ.
  • Ndị ọmụụ ga-agba mbọ tinye echiche ha na ka-esi eji asụsụ ọha obodo a na-amụ agbagha isiokwu e wepụtara ka a mụọ.
  • Ha ga-atụlekọrịta ọrụ keonwe ha. Nke a ga-enye aka ịkwalite nka nnabata/ ngere na nka nrụpụta.nkwupụta n'ime asụsụ a na-amụ maka ya.
  • Ha ga-ajụ ajụjụ banyere ihe mgbagwoju anya gbasara asụsụ nke a na-amụ nakwa omenala ebe asụsụ ahụ siri pụta. Ha ga-agba mbọ tulee ọtụtụ echiche ndị mmadụ gbasara mgbagha ndị ọmụụ mere bụ nke ga-enyere ha aka ịgbọta asụsụ ahụ nke ọma.

Mbamuru na ọghọm a na-enweta mgbe e ji mgbasa ozi ọha akuzi ihe.

A ga-ebu ụzọ leba anya na mbamuru. Ha gunyere ndị a:

  • Mgbasa ozi ọha bụ ngwa ọrụ e ji ewube nka odide na nke ọgụgụ n'ime asụsụ a na-akuzi. Ịma atụ: ọwa okwu ihu akwụkwọ n'ikuku, bụlọgụ nakwa ọwa okwu ndị ọzọga.
  • Ọwa nkiri yutubu bụ ụdị mgbasa ozi ọha nke na-akwalite nka ọnụnụ asụsụ site na nkiri ihe onyonyo.
  • Mgbasa ozi ọha na-akwalite ọnụdụ ọmụmụ nke onwe.
  • ndị nkuzi bụ enyi ndị ọmụụ site n'ikwalite ọmụmụ ihe ka ọ dị mma.
  • Ụdị ọmụmụihe a anaghị aka oke n'ebe onye si maọbụ ebe onye bi.
  • E nweghi obere oge eji amụ ihe; mgbe ọ bụla ị mepere ọwa okwu a itinye uche gi.
  • Ụdị ọmụmụ a na-ejiko ndị ọmụụ na ndị nwe asụsụ ọkpụ a ka ha na-akparịta ụbụbọ.
  • Ha na-eweta ezi ọnụdụ ọmụmụ ihe n'etiti ndị ọmụụ.
  • Usoro nkuzi a na-ewube ogbe ọmụmụ pụrụ iche ebe ndị ọmụụ na-anọ ama onwe ha ma rụkọ ọrụ ọnụ.
  • Ihe ọmụmụ a na-enye aka n'ebe ọ dị ukwuu site n'ime ndị ọmụụ ka ha mara ihe ekwe na-akụ n'iji mgbasaozi ọha nakwa nka teknọlọji e ji agbasa ozi n'ụwa taa.

Ọghọm dị n'iji mgbasaozi ọha kuzie ihe n' ndụ ndị mmadụ

E nwere ụfọdụ ihe ọghọm a na-enweta site n'iji mgbasa ozi ọha wee kuzie ma mụọ ihe, ọ kachasị mgbe a na-amụ asụsụ obodo Naịjirịa. Ọghọm ndị agụnyere:

  • Mmegharị anya: ụdị mmegharị anya ndị a gụnyere inweta ozi nke onwe, inyochawa ọkwa ndị na-abata n'ọwa okwu mgbe a na-amụ ihe n'ikuku, mgbasa ozi ịkwalite ahịa na ihe ụ́ rà ndị ọzọ.
  • Ihe mmara ahụ: mgbe ụfọdụ, ndị ọmụụ na-ahapụ ọnọdụ ọmụmụ ihe site na mgbasa ozi ọha ma dabere n'ụdị mgbasa ozi ọha ndị ọzọ na-abụghị maka mmụta asụsụ obodo.
  • E nweghi ezi mmụta banyere etu a ga-esi jiri usoro teknọlọjị ọgbara ọhụrụ ndị a kuzie ma mụọ ihe na e nweghi ihe ndọlazụ nye ndị nkuzi na ndị ọmụụ.
  • Ụfọdụ ndị ọmụụ na-ahụta mgbasa ozi ọha dịka ebe a na-anọkọ wee na-ekpori ndụ n'ikuku karịa ebe ọmụmụ ihe.
  • Ụdị nkuzi na ọmụmụ ihe a na-ebute ezi ịkpa oke keọhabụ nke mere na ndị ji ya arụ ọrụ anaghị enwe ohere isonye na ndụ nke a hụrụ anya. Ndụ nke a hụrụ anya n'ebe a bụ mgbe ndị ọmụụ zukoro na klaasị mana amụ ihe. Ụdị ọmụmụ ihe a nọ ọnụdụ onye na nke ya.

Edensibịa

Alfaki, I.M., na Alharthy, K. (2014). Towards a digital world: Using social network to promote learner's language. American International Journal of Contemporary Research, 4 (10), 105-114.

Kalasi, R. (2014). The impact of social networking on nwe age teaching and learning:An overview. Journal of Education and Social Policy, 1(1), 23-28.

Kaplan, A. M., na Haenlein, M. (2010). Users of the world unite: The challenges and opportunities of social media. Business Horizon, 55 (1), 61.

Moody, M. (2010). Teaching twitter and beyond: Tips for incorporating social media in traditional courses. Journal of Magazine & Nwe Media Research, 11 (2), 1-9.

Omachonu, G.S. (2011). Language and linguistics. Na G.S. Omachonu (Ọhz.).NSUK Texts in General Linguistics, (Ihu 1-12). Enugu: Rossen Publication and Services.

Paulsen, M., na Tække, J. (2013). Social media and teaching. Nke dị n'ọwa okwu ududo https://pure.au.dk>files>social-media. E setere ya na Oktoba 4, 2017.

Thurairaj, S., na Roy, S.S. (2012). Teachers emotions in FLT material design. International Journal of Social Sciences and Humanities, 2 (3), 232-236.

Thurairaj, S., Hoon, E. P., Roy, S.S., na Fong, P.K. (2015). Reflections of students' language usage in social networking sites: Making or marring academic English. Nke dị n'ọwa okwu ududo, www.ejel.org. E setere ya na Oktoba 4, 2018.

Wright, N. (2010). Twittering in teacher education: Reflecting on practicum experiences. I Open Learning, 25 (3), 259-265.