ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA VOLUME 10; NO 1, OCTOBER, 2018

Ngụgharị Amaechina Nke G. I. Nwaozuzu

Ezebube, Chinedu Chidiebere

Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa ndị Ọzọ

Mahadum Naịjirịa, Nsụka

chinedu.ezebube@unn.edu.ng

07030565592/08171253789

Ụmịedemede

Ọrụ nchọcha a mere ngụgharị ejije Amaechina nke G. I. Nwaozuzu dere. Ebumnuche ya bụ ịgbagha echemeche nke ụfọdụ ndị ọgụụ nakwa ekwumekwu ọkọakụkọ n'ejije Amaechina na ama Amaechina chiri. Ọrụ nchọcha a mere nke a site n'iji atụtụ Dikọnstrọnshọn nke Jacques Derrida chepụtara. O ji usoro 'agụm-ugbo-abụọ' ma mee ngụgharị ya bụ ejije. Site na nchọpụta nchọcha, a hụtara na n'agbanyeghị na Ibekwe tụwara Udumma ime, nwa ahụ Udumma dị ime ya bụ nke Amaechina ma ọ bụrụ na a tụlee ya site n'ịgbakwasị ụkwụ n'ihe omenaala ndị nabatara. Site n'inyocha usoro omenaala alụmalụ ndị Igbo, ekwumekwu Ibekwe nakwa akparamagwa na ekwumekwu Udumma, a gbaghara echiche na 'ama Amaechina chiri' n'ejije Amaechina.

Mkpọlite

Ọkankụzi Gabriella Ihuarugo Nwaozuzu edeela ọtụtụ agụmagụ. Akaraka ya n'ebe ide agụmagụ nọ pụtawakara ihe n'ejije na abụ. Ejije ndị o derela gụnyere Ome Ihe Jide Ọfọ (1991), Ajọ Obi (1998), Nke M Ji Ka (2005), Eruru (2009) na Amaechina (2014). Naanị otu akwụkwọ abụ nke naanị ya dere a kpọrọ Akị na Ụkwa (2015) ka o nwere, n'agbanyeghị na o nwegasịrị abụ n'ụyọkọ abụ Igbo nke ndị odeabụ ndị ọzọ chịkọbara. Nwaozuzu site n'agụmagụ nka ya ndị a na-ezipụta nsirihụụwa ndị Igbo, mgbanwe batarala n'obodo, ihe obodo nabatara nakwa nke ha na-agbarụrụ ihu. Iji kwado nke a, Nwadike (1992) kọwara agụmagụ dịka ọrụ nka nke sitere n'echiche ma bụrụ nke e si na ya egosipụta ma na-ahụ ndụ. Nke a pụtara na agụmagụ dị ka enyo, nke e jị ele ndụ na obibi ya.

Dịka agụmagụ na-enyocha ndụ, ọ na-arụtụ aka n'omenaala site n'izipụta usoro ndị si ebi ndụ ha. Agụmagụ na-emejupụta ihe ndị a site n'iji asụsụ rụọ ọrụ n'ụzọ nka. E kewara agụmagụ ụzọ atọ gbara ọkpụrụkpụ - iduuazị, ejije na abụ. Ọrụ nchọcha a gbadoro ụkwụ n'ejije. Ejije, dịka Ikeokwu (2000) siri kọwaa, bụ emereme nke (onye) ndị mmee na-ejije agwa ma ọ bụ akparamagwa (onye) ndị ọzọ n'ihu ndị nkiri bụ ndị akaebe n'elu nkwago ma ọ bụ obom. Ejije nwere ike ịdị n'ụdị ndepụta, n'agbanyeghị na ụdị kacha mkpa e mebere ejije bụ maka mmepụta/ngosi.

Ọrụ nchọcha gbadoro ụkwụ na ngụgharị ejije Amaechina iji nye nkọwami gbasara echiche ndị dị na ya bụ ejije. Agụmagụ, dịka ọrụ nka, nwere ike inwe karịa otu nghọta. Nke a so n'otu ihe mere ntụle/nnyocha agụmagụ ji dị mkpa n'ihi na ọ na-enye aka eduba ndị ọgụụ n'ịmata ihe miri emi gbasara agụmagụ. Ọzọ, onye ntụle agụmagụ ga-agba mbọ lekwasị agụmagụ ọ na-atụle anya nke ọma iji chọpụta ụzọ dị iche iche ya bụ agụmagụ siri metụta ndị mmadụ, omenaala na usoro ebimndụ. Ọ dị mkpa ịrụtụ aka na ntụle agụmagụ nwere ike ibute arụmarụ ụka. Arụmarụ ụka a abụghị nke imegide ya bụ agụmagụ kpọmkwem, kama, ọ bụ isite n'echiche ụfọdụ ma ọ bụ asụsụ agụmagụ rụtụ aka ihe ndị ọzọ zoro ezo gbasara agụmagụ. Site na ya bụ arụmarụ ụka, e nwere ike inye nkọwa ma ọ bụ nchọpụta ma ihe ndị ahụ zoro ezo, ma ha a na-akwado ma ọ bụ emegide echiche odee ya bụ agụmagụ. N'ala Igbo, ọ bụrụ na mmadụ nwụọ n'amụtaghị nwa, a na-ahụta ya dịka ihe egwu. Abasili (2004) rụtụrụ aka na nke a ga-eme ka ama onye ahụ chie, ma bụrụ nke ma ndị dị ndụ, ma ndị nwụrụ anwụ ga-echefu. Nke gosiri na ndị Igbo bụ agbụrụ na-ejighi 'ama' ha egwu egwu. Dịka o si metụta ejije Amaechina nke G. I Nwaozuzu, ọrụ nchọcha a chọrọ ịmata n'eziokwu, ma ama isi agwa nọ n'ejije echiri ka ọ bụ na o chighị.

Nkenke akụkọ gbasara ejije Amaechina

Amaechina bụ ejije Igbo nke a tọrọ ntọala ya n'oge agha. Chike na Egondụ mụtara naanị otu nwa - Amaechina. Egondụ achọghị ka otu nwa nwoke sonye na ya bụ agha. Nke a mere o ji kwanye ya ịlụ nwaanyị ngwa ngwa. N'ihi ihe oge wetara, Egondụ chọkwara ka Amaechina na nwunye ya bụ Udumma mụnye ya nwa; mana nke a abụghị ihe Amaechina chọrọ. Amaechina, na nke ya, chọrọ ịga agha. Ọ bụrụ na ọ lọta agha, o nwezie ike ịmụba ụmụ. Site na mgba okpuru nke enyi Amaechina bụ Ibekwe gbara ya, Amaechina mechara gaa agha n'agbanyeghị mbọ niile Egondụ gbara. Chikwe, bụ nna Amaechina bụ ofeke mmadụ nke naanị ịṅụ mmanya bụ ihe ọ maara nke ọma. Chikwe na Egondụ mechara nwụọ n'oge agha. Ka agha biri, Ibekwe gobiri ndị ga-atọrọ Amaechina ma gbuo ya ka ha na-alọta agha n'ihi mmasị o (Ibekwe) nwere n'ebe nwunye Amaechina nọ.

Ka Ibekwe lọtara, ọ gwara Udumma na ọha obodo na ndị iro gburu Amaechina n'ụzọ ka ha na-alọta. O ji ohere ahụ kpọrọ nwunye Amaechina. Ka Chukwu si chọọ ya, ndị tọọrọ Amaechina egbughị ya, kama ha hapụrụ ya ma gwa ya onye kpara nkata ka e gbuo ya. Ka Amaechina lọtara, ọ chọpụtara na Udumma dị ime tinyere na ya na Ibekwe bizi. Nke a mere ka Amaechina gbuo Ibekwe ma gbukwaa onwe ya.

Mkpalitere/nsogbu nchọcha

Amaechina dịka ejije Igbo bụ akwụkwọ e ji akụziri ụmụ akwụkwọ na-eme Igbo agụmagụ Igbo na Ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa ndị Ọzọ, Mahadum Naịjirịa, Nsụka nakwa ụfọdụ ụlọ akwụkwọ dị elu na Naịjirịa. E ji ya bụ ejije kụziere ụmụ akwụkwọ ndị nọ n'afọ nke anọ, agba 2016/17 'Ejije Ọlọrọọhụrụ Igbo' nakwa ndị nke afọ atọ, agba 2017/2018 'Mkpọlite Ejije Igbo' na Nsụka. Na mkparịta ụka ọchọcha na ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ndị a gbasara ejije Amaechina, ha na-ahụta ya na ebe ọ bụ na Ibekwe napụrụ Amaechina nwunye ya, ama ahụ nke Egondụ gbara mbọ ka ọ ghara ichi echiela.

Ọzọ kwa, Nwaozuzu dịka onye odee, ji nka 'ọkọakụkọ' rụọ ọrụ mgbaama n'ejije ya. Ọkọakụkọ n'ejije Amaechina na-enye ndubata n'omume ma ọ bụ emume nke ọ bụla. Ihe ọkọakụkọ kwuru na ngwụcha ya bụ ejije bụ nsogbu nke ọrụ nchọcha a na-eleba anya. Ọ sịrị:

Amaechina! Egondụ lụtaara otu mkpụrụanya ya ji isi ụgwọ nwaanyị n'oge, ka ama ya ghara ichi. Ewo! Egondụ amaghị na osisi ga-adako adako, e gbugọdị ya n'ọdọ achara, ọ ga-adakorịrị. Amaechiela, ụzọ aghọọla ọhịa. Ihe agha mere ...(107)

Site n'ekwumekwu ọkọakụkọ dị n'elu, ọ pụtara n'eziokwu, ama Amaechina echiela. Mana, site n'iji usoro dikọnstrọnshọn, ọrụ nchọcha a gbaghara echemeche na ama Amaechina echiela. Na nchịkọta, ebumnuche nchọcha a bụ ime ngụgharị ejije Amaechina ma gbaghaa echemeche nke ụfọdụ ndị ọgụụ na ọkọakụkọ nwere na ama chiri na ya bụ ejije.

Ntụlegharị agụmagụ

Ngụgharị dị oke mkpa n'agụmagụ n'ihi na ọ na-enye aka agba echiche dị omimi nke ndị ọgụụ nkịtị nwere ike, ha agaghị enwe ike achọpụta n'agụmagụ. Site na ngụgharị, ọchọcha nwere ike ịkwalite echemeche e nwere gbasara agụmagụ, ime mgbagha gbasara ụfọdụ echemeche, agwa ma ọ bụ akparamagwa dị n'agụmagụ ma ọ bụkwanụ ịkatọ echemeche e nwere n'ebe agụmagụ dị. Nke a kwadoro echemeche na agụmagụ ọ bụla enweghị otu nghọta n'ihi na nhụrụụwa, usoro echiche na nghọta ndị ọgụụ nwere ike ịdịwaga iche n'onwe ha. Nke a mere o ji dị mkpa ime ntụlegharị agụmagụ/ọrụ nchọcha ndị e merela dị ka o si metụta ngụgharị. Ọ ga-enye aka izipụta ohere ọrụ nchọcha chọrọ imechi.

Ikeokwu (2009) mere ngụgharị Isi Akwụ Dara n'Ala nke Tony Ubesie iji chọpụta etu jenda si arụ ọrụ n'agụmagụ. Iji mejupụta ebumnuche nchọcha ya, o ji atụtụ dikọnstrọnshọnizm nke Jacques Derrida mee ngụgharị iduuazị ahụ iji nye agwa Chike na Ada ohere ịzara ọnụ ha. Ikeokwu (2009) na ngụgharị, katọrọ ọtụtụ akpọmọnụ a na-enye agwa bụ Ada n'ihi ụdịrị agwa ọ kpara n'oge agha. Ọ rụtụrụ aka na n'agbanyeghị na ihe Ada mere adịghị mma n'anya mmadụ na Chukwu, ọ dị mkpa ịchọpụta na ọ bụrụ na Chike, dị ka di Ada mere ihe a tụrụ anya n'aka ya dị ka nna ezinaụlọ n'oge agha ahụ, Ada agaghị akpa agwa ọjọọ ndị ahụ ọ kpara. Ikeokwu (2009) ji nke a kwado echemeche ya na abụm nwoke ma ọ bụ nwaanyị bụ nke ihe oge wetara na ọnọdụ na-akụrụ nkwa. Ọ kọwara na nkwanye ugwu na nsọpụrụ Chike nwetara n'aka Ada tupu agha amalite bụ maka na o (Chike) mere omume ka nwoke. Oge agha malitere, ekweghị aga agha na enweghị ike inyeju ezinaụlọ afọ dị ka nna ezinaụlọ mere ka Chike ghọọ nwaanyị e kechiri n'ahụ nwoke. Ikeokwu (2009:22) rụtụrụ aka na Ubesie, dịka onye odee, sitere na kọọnkọfe ya, chefuo onwe ya. O kwuru na "o chefuru na ọ bụ ya kpụrụ ma kee agwa Chike na Ada, tinyekwa omume, echiche na okwu n'ime ha. Ya mere, ihe ọ chọrọ ka anyị ghọta ka ọ gbara mbọ ime ka anyị ghọta, ma cheekwa echiche ka o si eche. Kama, ya na ndị ntụle na nnyocha ụfọdụ chefuru na agụmagụ ọ bụla nwere ngụgharị ma ọ bụ nghọtagharị, dịka anyị mere na nchọcha a." Na nchịkọta, Ikeokwu n'ọrụ nchọcha ya, na-akọwa na ikpe amachaghị Ada, kama, n'ụfọdụ ụzọ, ya bụ ikpe makwara Chike.

Ikwubuzo na Eze (2014) mere ngụgharị ejije ọdachi anọ nke Goddy Onyekaọnwụ dere iji gbagha echemeche ndị ọchọcha ụfọdụ na agwa ukwu ndị nọ n'ejije Nwata Rie Awọ, Eriri Mara Ngwugwu, Ụwa Ntọọ na Ọkụ Ghara Ite bụcha odogwu ọdachi. Ha gbaghakwara echemeche na agwa ukwu ndị ahụ gbasoro usoro ọdachi nke Aristotle. Iji kwado nke a, Ikwubuzo na Eze (2014) mere nkọwa na mkpọwa onye e nwere ike ịkpọ 'odogwu,' 'ọdachi,' nakwa 'odogwu ọdachi' n'ejije. Ha kọwara na ọ bụrụ na a tụlee onye Aristotle rụtụrụ aka dịka odogwu ọdachi, a ga-aghọta na ọ bụ mmadụ dị ka mmadụ nkịtị, nke ihe mberede/ọdachi dakwasịrị ya abụghị maka na ọ bụ agwa uhie, kama maka obere mpachọ o nwere n'agwa ya. Ọ kọwara na ọ bụ ọdịda onye dị etu a na-eweta mmetụta n'obi, ebere nakwa ụjọ n'ebe ndị ọgụụ nọ. Ha jikwa ohere ahụ zipụta ndịiche dị n'etiti ọdachi Aristotle na nke Shakespeare. Na nchọpụta ha, ha chọpụtara na agwa dị ka Awọrọ, na Nwata Rie Awọ ekwesịghị ka a kpọọ ya odogwu ọdachi dịka ụfọdụ ndị ọchọcha na-eme. Nke a bụ n'ihi na ụfọdụ akparamagwa Awọrọ n'ejije ahụ; dịka ịbụ mkpi na-agbara ọha ehi, itinye ọgwụ na nri nke ya, nakwa irefu nwa ya nwaanyị ma mechaa lụrụ ya n'amaghị ama abụghị ihe e ji ama odogwu. Ikwubuzo na Eze (2014) kọwara na Awọrọ bụ naanị agwa uhie nke nhịahụ/nsogbu ya bụ nke sitere n'aka ya. Ha kwuru na ịkpọ Awọrọ odogwu ọdachi maka ọnọdụ ya dịka ọka mgba obodo erijughị afọ. Ha katọrọ echemeche na ọnwụ Awọrọ n'ejije ahụ na-eweta mmetụta obi ụjọ n'ihi na Awọrọ, dịka agwa kpara agwa ọjọọ natara ntaramaahụhụ ruuru ya. Ikwubuzo na Eze (2014) n'ọrụ nchọcha ha rụtụrụ aka na agwa ukwu dị ka Awọrọ, Ebubedike na Orieji Okwundu n'ejije Onyekaọnwụ abụghị odogwu ọdachi, kama, ha bụ agwa ọdachi nkịtị ma ọ bụ agwa agwa uhie. Nke a bụ n'ihi na ọdịda agwa ndị ahụ esiteghị na mpachọ dị n'agwa ha, kama o sitere n'agwa ọjọọ e ji mara ha n'ejije ndị ahụ.

Ọrụ Ikeokwu (2009) na nke Ikwubuzo na Eze (2014) gbadochara ụkwụ na ngụgharị agụmagụ Igbo. Ebe nke Ikeokwu (2009) gbadoro ụkwụ n'iduuazị, nke Ikwubuzo na Eze (2014) gbadoro ụkwụ n'ejije Onyekaonwu. Myiri dị n'etiti nchọcha ndị a atụlegharịrị na nke a na-eme ugbu a bụ na ha niile lebara anya na ngụgharị agụmagụ Igbo. Ebe nke Ikeokwu (2009) nyochara iduuazị iji zipụta na ikpe mara ma Chike ma Ada n'Isi Akwa Dara n'Ala, nke Ikwubuzo na Eze (2014) nyochara ejije ma gbakwasị ụkwụ na mgbagha odogwu ọdachi n'ejije anọ nke Goddy Onyekaọnwụ, ọrụ nchọcha a na-eleba anya n'ejije Amaechina iji gbaghaa echemeche na ama Amaechina chiri.

Atụtụ njiarụọrụ

Atụtụ njiarụọrụ nchọcha a bụ atụtụ Dikọnstrọnshọn, nke sitere n'echemeche Jacques Derrida. E wezuga Jacques Derrida, ndị ọzọ a maara n'atụtụ a gụnyere Roland Barthes, Jacques Lacan na Michel Foucault. Atụtụ dikọnstrọnshon sitere na poststrọkchọralizm. Nke a mere oge ụfọdụ, e nwere ike iji dikọnstrọnshọn nọchite anya poststrọkchọralizm (Goring, Hawthorn & Mitchell, 2011 na Dobie, 2012). Dịka Li na Cheng (2011) siri kọwaa, atụtụ dikọnstrọnshọn na-eme ngụmi agụmagụ iji gosipụta na agụmagụ enweghị otu nkọwa/nghọta. Echemeche a megidere atụmatụ ndị Strọkchọralizm, ndị kwenyere na agụmagụ nwere otu nkọwa/nghọta. Ọ dịkwa mkpa ịrụtụ aka na nghọta agaghị adị ire ma e wezuga ọnọdụ.

Ọrụ nchọcha a gbasoro usoro Derrida, nke ọ kpọrọ 'agụm-ugbo-abụọ' (Dobie, 2012). Nke a pụtara na ọgụụ ga-ebu ụzọ gụọ agụmagụ n'usoro ọdịnaala/nkịtị iji wepụta nghọta izugbe onye ọ bụla gụrụ agụmagụ ahụ na mbụ ga-enwe. Nke a bụ ọgụgụ nke mbụ. N'ọgụgụ nke abụọ, ọgụụ ga-agba mbọ ịgbagha nghọta sitere n'ọgụgụ nke mbụ iji zipụta na ọgụgụ nke mbụ, n'ụzọ dị aṅaa, ghagidere onwe ya. Ọgụgụ agụmagụ n'ụzọ nkịtị na-agba mbọ iwepụta nghọta maka agụmagụ mana ọgụgụ agụmagụ n'ụzọ dikọnstrọnshọn metụtara ajụmajụjụ, nke na-achọ igosipụta na ihe agụmagụ na-ekwu dị iche n'ihe ọ na-akọwa. Dikọnstrọnshọn metụtara ngụgharị agụmagụ iji degharịa ya ma gbaghaa echemeche nghọta nkịtị agụmagụ nwere. Nchọcha a ga-eme ọgụgụ Amaechina nke G. I. Nwaozuzu site n'igbaso usoro agụm-ugbo-abụọ nke Derrida iji gbaghaa echemeche na ama chiri n'ejije Amaechina.

Nnyocha agụmagụ n'uju

N'ebe a, ọchọcha ga-arụtụ aka n'ihe ndị ọ hụtara mere ngụgharị Amaechina ji dị mkpa site n'iji usoro agụm-ugbo-abụọ nke Jacques Derrida wee rụọ ọrụ. Ihe ndị a bụ ihe ndị ọ hụtara gbaghara echemeche nke mbụ e nwere na ama echiela.

Usoro omenaala alụmalụ ndị Igbo

Ndị Igbo bụ ndị ejighị alụmalụ egwu egwu. Ha na-akpọ ya mkpa. Ekwealor (1998) kọwara alụmalụ dịka njikọta nwoke na nwaanyị dịka di na nwunye ka o siri dị n'omenaala, nke ga-eme ka ụmụaka a ga-enweta na njikọta ahụ bụrụ nke obodo nabatara. Otu n'ime ihe dịkarịsịrị mkpa ndị mmadụ ji aba n'alụmalụ bụ ọmụmụ. O nweghị ihe e nwere ike iji tụnyere ọmụmụ n'ala Igbo. Nke a kpatara na ọ na-echu onye Igbo ọ bụla ụra ma ọ bụrụ na nke a esiere ya ike imepụta. Ndị Igbo na-ezipụta nke a n'uju site n'ụdịrị aha ha na-agụ ụmụ ha. Ọmụmaatụ gụnyere aha dị ka Nwakaego, Nwabụwa, Gịnịkanwa, Nwaamaka na Madụka. Ndị Igbo site n'aha ndị a na-ezipụta nkwenye ha nwere n'ebe nwa dị. Ọ dị mkpa ịrụtụ aka na ndị Igbo nwere nkwenye dịgasị iche iche gbasara nwa.

Ekwealor (1998:22) rụtụrụ aka na otu n'ime nkwenye ndị Igbo gbasara nwa bụ na nwa abụghị ihe otu onye nwe. Ọzọ, ndị Igbo kwenyekwara na nwa, tụmadị nwa nwoke, na-eme ka ama ghara ichi. N'Amaechina, Egondụ gbara nnukwu mbọ ịhụ na nwa ya nwoke bụ Amaechina lụrụ nwaanyị n'oge. Amaechina rụtụrụ aka na nke a oge ọ sịrị nne ya:

Agwara m gị ka i chetụ n'ihi na ọ dịghị onye ma ebe agwọ anyasị a bụ agha dowere isi. M ka na-ekwu, i bugalarịị mmanya ịkụ aka, sị m na agha gahụ ebi. Ugbu a, gịnị mere? (16-17).

Nke a pụtara n'eziokwu, na ọ bụ Egondụ kwanyere nwa ya ịlụ nwaanyị n'oge n'ihi agha iji hụ na ama di ya agaghị echi. Ọ pụtakwara na a lụrụ Udumma nke ọma, n'usoro omenaala. N'agbanyeghị mbọ niile Egondụ gbara, ekwumekwu ya nye Amaechina n'omume nke mbụ, ngosi nke abụọ mechara bịa na mmezu. Ọ sịrị ya:

... Amaechina mụnye m nwa. Onye arachaghị ọnụ n'ụgụrụ na-eche ka ụgụrụ kwụsị ka ọ rachaa ọnụ ya, ụgụrụ nwekwara ike rachaala ya ọnụ ahụ (17)

Okwu a dị n'elu bụ nke jupụtara na mbụrụ. Odee Nwaozuzu ji mbụrụ 'ụgụrụ' nọchie anya 'agha' na 'Ibekwe' n'ihi na ka agha biri, Ibekwe, site n'ụzọ aghụghọ, ghọọrọ ụgụrụ ma rachaara Amaechina ọnụ ya (Udumma). N'agbanyeghị na Ibekwe tụwara Udumma ime, ọ dị mkpa ịrụtụ aka na e nweghị ebe a hụtara na Ibekwe mere ihe n'isi Udumma dị ka Amaechina siri mee. Ọ bụrụ na a gbaghaa ya na Ibekwe lụgharịrị Udumma, ajụjụ ga-abụzi, 'kedu onye Ibekwe nyeghachiri isi akụ nwaanyị Amaechina mere n'isi Udumma oge ọ lụrụ ya dị ka nwunye n'usoro omenaala?' Omenaala Igbo kwenyere na ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịlụghara nwaanyị mmadụ lụburula, ọ ga-agba mbọ kwụghachi di nwaanyị nke mbụ, isi akụ nwaanyị o mere n'isi nwaanyị ahụ iji mee ka nwaanyị ahụ ọ chọrọ ịlụ bụrụ onye na-enweghị ihe ga-egbochi ya ịlụ di. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọha obodo ga-anabata nwoke ahụ ịlụrụ ya bụ nwaanyị gaa n'ihu ebe ọ bụ na e gbubiela ụdọ mmekọrịta dị n'etiti nwaanyị ahụ na di mbụ lụrụ ya. Chikwe na Egondụ, bụ nne na nna Amaechina nwụchara n'oge agha, nke mere na ọ ga-ahịa ahụ inweta ndị ga-anataghachi isi akụ nwaanyị Udumma n'ọnọdụ Amaechina.

Ekwumekwu Ibekwe n'Amaechina

Iji kwado ihe e kwuburula n'elu, ekwumekwu ụfọdụ Ibekwe kwuru n'ejije Amaechina zipụtara na ama Amaechina echibeghị. Oge Ibekwe lọtara agha ma kwuo na ndị iro egbuola Amaechina, nke a wutere Udumma nke ukwu. Oge ọ jụrụ Ibekwe ihe di ya kwuru tupu ọ nwụọ. Ibekwe sịrị ya:

Ị makwa na, ebe ahụ m zoro, ka ha na-ebepụ ya isi, ihe ọ na-ebe bụ "Ibekwe, ebe ọ bụla i zoro, chetakwa leziere m Udumma anya ma ị laruo na ndụ. Ibe ahapụkwana Udumma (93)

Ekwumekwu Ibekwe a dị n'elu pụtara na Amaechina rịọrọ ya ka o lekọtara ya nwunye ya. Nke a nwere ike ịpụta ilekọta ya ka ama ya (Amaechina) ghara ichi. N'otu aka ahụ, Ibekwe gwakwara Udumma 'abụ m Amaechina, Amaechina bụ m' (93) nakwa 'Ama anwụọla ma Ama ka dị ndu.' Ọ bụrụ na e were ya na Ibekwe kuchiri Udumma dịka nwunye, ọ gaghị adaba n'ihi na Ibekwe na Amaechina abụghị nwanne. Ekwealor (1998:47) kọwara nkuchi nwaanyị dịka:

Nke a pụtara nwanne nwere ike iweghara nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ. Otu aka ahụ kwa, nwa nwere ike iweghara nwunye nna ya ma nna ya nwụọ. Tupu e mee nke a, a na-aga be nna nwaanyị ahụ meekwa omenaala ụfọdụ. Alụmdi na nwunye dị otu a ga-eme ka ụmụ a mụtara ka e kuchichara nwaanyị ahụ dịịrị nwoke ahụ kuchiri ya.

Iji kwado nke a, Igbo (2012) kọwara na ọ bụrụ na e kuchie nwaanyị ma ghara ime omenaala metụtara nlụgharị (ịtụgharị nkwụ na mmụọ), nwoke ọ bụla lụrụ nwaanyị ahụ ga-abụ di-akwụ-ụgwọ. Nke a pụtara na nwa/ụmụ ọ bụla sitere na mmekọrịta ahụ ga-abụ nke nwoke nwụrụ anwụ. Igbo (2012) kwuru na a naghị eji nwoke mụtara nwa/ụmụ ndị ahụ akpọrọ ihe n'omenaala Igbo, kama ọ bụ nwoke nke dịka omenaala si chọọ, mere ihe n'isi ya bụ nwaanyị ma nwụọ ka a na-ewere dịka nna nwa/ụmụ dị ahụ. Ibekwe, iji ghọrịa Udumma, gwara ya na Amaechina rịọrọ ya ka o lekọta ma kasie ya obi. N'omume nke isii, ngosi nke abụọ, ọ gwara Udumma, 'ọ kwa m gwara gị ihe Amaechina kwuru oge ọ na-anwụ. Nyenụ m ohere ka m mejupụta ya, ka obi dị yam ma n'ala mmụọ' (93).

Akparamagwa na ekwumekwu Udumma n'Amaechina

Akparamagwa na ekwumekwu Udumma n'Amaechina zipụtara n'ebe ọ dị ukwu na o kwenyere na di ya, Amaechina ka dị ndụ. Otu n'ime ụzọ nke a si pụta ihe bụ na n'agbanyeghị ihe niile Ibekwe gwara Udumma, o nweghị mgbe o si na be Amaechina pụọ. Ọ gwara Ibekwe:

Ị mara n'eziokwu na enyi gị nwoke sị gị letewe m anya, ị bịawanụ be ya. Achọghị m ịhapụ be di m, ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ (95).

Udumma n'ebe a zipụtara obisike o nwere. N'otu aka ahụ, ọ rụtụrụ aka na ọ chọghị ịhapụ be di ya. Nke a gosiri na Udumma weere Amaechina n'ebe ọ dị ukwu, ka di ya n'agbanyeghị na 'ọ nwụọla'. N'oge niile Ibekwe na Udumma nọrọ, o nweghị mgbe o jighị akpọtụ Amaechina. Nke a mere ka o wute Ibekwe n'ebe ọ dị ukwuu n'ihi na o chere na izu ọjọọ ọ gbara megide Amaechina ga-eme ka Udumma chefuo ya (Amaechina). Mkparịta ụka dapụtara n'etiti Ibekwe na Udumma n'omume nke isii, ngosi nke anọ ga-enyere anyị aka ịghọta nke a nke ọma:

Ibekwe: (Na-emetụ Udumma aka n'imi) Mma m, ọ-ọ gịnị mere oge niile mụ na gị nọrọ, ị na-akọ naanị maka Amaechina, Amaechina. Agwala m gị chefuo Amaechina, ọ nwụọla.

Udumma:Ibe, kedu ka m ga-esi chefuo di m? Ọ - kwa ị ...

Ibekwe: Ị bịakwa. Onye bụ di gị? Amaechina anwụọla. Kedu ka obere nwa dịka gị ga-esi bido n'afọ iri abụọ na otu ị dị kwawa di? Ọ bụ na ị nabataghị m? M meere gị elu, mere gị ala, ihu anaghị adị gị mma. Ama m na...

Udumma: Ibe, ọ bụghị na m na-ewesara gị iwe. ka Chi m m na- ewere iwe.

Ibekwe: Ọ dị mma (kpọlite Udumma n'oche, kuru ya) Lee anya site taa gawa, achọrọ m ka ị hapụ ịkpọ Amaechina oge niile. Ị na...

Udumma: Ibe, nke ahụ gakwa ahịa ahụ - o. Kedu ka m ga-esi echefu ịkpọ ya? Ọ bụghị ya lụtara m? Ị ma na m hụrụ ...

Ibekwe: (Mee Udumma aka n'ọnụ) shii ama m, ma ọ nwụọlanụ. Lee m anya, ahụrụ m gị n'anya karịa etu Amaechina siri hụ gị. Nabata ịhụnanya m (101-102)

Otu n'ime ihe ndị e nwere ike ịchọpụta n'ekwumekwu a dị n'elu bụ na Udumma ahụtaghị Ibekwe dịka di ya. Ọzọ kwa, tupu ngosi a, Udumma adịrịla Ibekwe ime, mana Ibekwe, dịka e si gosipụta ya ebe a ka na-arịọ Udumma ka ọ nabata ya. Nke a pụtara na dịka o si metụta uche-ime-mmụọ Udumma, Amaechina bụ di ya. Ajụjụ ikpeazụ ọ jụrụ Ibekwe nyekwaara aka ịkwado echemeche ndị e zipụtarala n'elu. Ọ jụrụ ya - Ọ bụghị ya (Amaechina) lụtara m? (102). Nke a gosiri na dịka o si metụta omenaala Igbo, Ibekwe abụghị di Udumma n'agbanyeghị na ọ tụwara ya ime. Ibekwe n'onwe ya ghọtara nke a n'ihi o ji aka ya kwuo na ya onwe ya bụ manejimenti (102).

Ka Amaechina si n'aka ndị iro Ibekwe gobiri ka ha gbuo ya lọta, ihe ọ hụrụ gbagwojuru ya anya n'ihi na Udumma dịịrị Ibekwe ime. Na ngosi ahụ, Udumma gara n'ihu ịkpọ Amaechina 'di ya.' Oge Amaechina jiri obi mgbawa na ọnụma gbuo Ibekwe nakwa onwe ya, Udumma dadoro Amaechina ma na-akwagharị ya (106). Nke a gosipụtara mmetụta obi o nwere n'ebe di ya nọ.

Nchịkọta

Site n'ihe ndị e nyochara, ọ dị mkpa ịrụtụ aka na, n'agbanyeghị na Ibekwe tụwara Udumma ime, onye nwe nwa ahụ ọ dị ime ya n'usoro omenaala ndị Igbo bụ Amaechina. Ejije Amaechina bụ ejije Igbo, nke a tọrọ ntọala ya n'ala Igbo. O kwere nghọta na Udumma nyere Ibekwe onwe ya n'ihi asị ọ sịrị na Amaechina anwụọla ma gwa ya ka o lekọta ya (Udumma) anya. Ebe ọ bụ na Ibekwe akwụghachighị isi akụ nwaanyị Udumma, e nwere ike ịsị na nwa ahụ Udumma dịịrị ya ime ya bụ nke ya? Ọ bụrụ na e kwenyere nke a, ị mara na ọ bụ ịhapụ omenaala Igbo, mewe omeneelu. Dịka o si metụta Tamar na Judah (Jenesis 38) n'akwụkwọ nsọ, Abasili (2011) mere ka a mara na, n'agbanyeghị na Judah tụwara Tamar ime ka ọ mụọ ejima nwoke abụọ, ụmụ ejima ndị ahụ bụ nke di ya (Tamar) mbụ bụ Er. N'ihi nke a, ejima ndị ahụ abụghị ụmụ a jụrụ ajụ.

Ọ dịkwa mkpa ịrụtụ aka na Udumma anwụghị na ya bụ ejije. Nke a gosiri na ọ ga-amụ nwa ahụ ọ dị ime ya. Ọ bụrụ na ọ mụọ nwoke, ya bụ nwa nwoke ga-anọchi anya ama Amaechina. Ọ mụkwaanụ nwaanyị, e nwere ike ịhachi ya iji hụ na ama Amaechina echighị.

Nrụaka

Abasili, A. I. (2004). Resolving the dilemmas of life: Way out when there seems to be no help and hope. Enugu: Snaap.

Abasili, A. I. (2011). Seeing Tamar through the prism of an African woman: A contextual reading of Genesis 38. Old Testament Essays, 24(3), 555-573.

Dobie, A. B. (2012). Theory into practice: An introduction to literary criticism (3rd edition). Louisana: Wadsworth Cengage Learning.

Ekwealor, C. C. (1998). Omenala na ewumewu ndị Igbo. Onitsha: Palma Publishing & Links Ltd.

Goring, P., Hawthorn, J. & Mitchell, D. (2011). Studying literature (2nd edition). London: Bloomsbury Publishing Plc.

Igbo, P. C. (2012). Elements of Igbo culture and tradition. Onitsha: Elite Publishers.

Ikeokwu, E. S. (2000). The traditional Igbo drama and theatre: Issues and concepts. Jakadiya: A Journal of Researches in African Languages and Literature, 2(2), 80-93.

Ikeokwu, E. S. (2009). Akara ikom na akara inyom: Ngụgharị Isi Akwụ Dara n'Ala. Jọnal Mmụta Igbo, 4(1), 15-23.

Ikwubuzo, I. & Eze, E. (2014). Revisiting the question of tragic protagonist in Onyekaọnwụ's plays. N'ime N. Nnyigide, R. Ezeuko, N. Nwokoye & J. Eyisi (Odz.), The eagle of Igbo literature: A festschrift in honour of Prof. G. O. Onyekaọnwụ (Etigbuchaa eziokwu) (ihu 9-25). Nimo: Rex Charles & Patrick Publications.

Li, X & Cheng, S. (2011). The analysis of translators from the perspective of deconstruction. Asian Social Science, 7(5), 258-262.

Nwadike, I. U. (1992). Ntọala agụmagụ. Nigeria: Ifunanya Publishers.

Nwaozuzu, G. I. (2014). Amaechina. Nsukka: University of Nigeria Press Ltd.






Abụ Igbo Na Mmepe Ala Naijiria. Nnyocha Abụ Akọ na Uche nke Echebina dere.

Oluchi Nebolisa na Blessing Onwubie Ngalaba Asụsụ Igbo. Alvan Ikoku Federal College of Education, Owerri, Imo State.

Ụmịedemede

Abụ Igbo bụ ọrụ nka nke e tinyere n'asụsụ di ọgọ, hazie n'usoro pụrụ iche, bịa nwee echiche miri emi, ma na-emetuta n'ahụ na n'obi .Echiche na mmetutaobi nke abụ nwere, nwere ike ịbụ mmetutaobi iji gosipụta ọnodụ mmegbu, nchekwa, ịdịnaotu, ndidi na mmepe. Dịka ngwaọrụ kachasị dị mkpa, abụ na-ejikọta mmadụ niile ọnụ ma mee ka e nwee ezi nchekwa, ịdịnaotu na mmepe n'obodo. Nke a bụ ka odee maọbụ ọkpọabụ siri jiri asụsụ wee rụọ ọrụ. Nchọcha a lebara anya n'ihe abụ pụtara, ụdịdị abụ, uru abụ bara, asụsụ ọkpọabu na ka abụ si akwalite idinotu, nchekwa na mmepe nke ala Naịjịrịa.Nchọpụta gosiri na e nwere ọnọdu ọjọọ dị iche iche a na-ahụ n'ala Naịjịrịa dịka igbu ọchụ maọbụ ịkwafụ ọbara, mkpọrita asị nke ndị otu ekpemekpe dị iche iche na enweghị ezi nchekwa. Nchọcha achịkọtakwara na site n'abụ na ọnọdụ ọjọọ ndị a, a na-ahụ n'ala Naijiria ga-ebelata, ma mekwaa ka e nwee udo, ndidi, obi mgbaghara, ịdịnaotu na mmepe. N'ikpeazụ, onyenchọcha tuzikwara aka, ka ndị otu ekpemekpe dị iche iche n'ala Naịjịrịa, jiri abụ na-enye nkuzi n'ụlọ ekpemekpe ha. Nke a ga-eme ka ndị mmadụ chegharịa ma bịakọta ọnụ dịka ụmunne, n'agbanyeghi asụsụ onye, wee tụọ alo ka ihe ga-esi kawaye mma n'ala Naijịrịa.

Okwu Mmalite

Agụmagụ Igbo malitere mgbe ndị Igbo malitere. Na mbido, o bụ n'ọnụ nkiti ka a na-agu ya. N'ime ya e nwere abu, akuko na ejije. ndị Igbo na-esite n'agụmagụ ha n-egosipụta usor ebimndu ha nakwa ka ha siri huta uwa. Ha na-egosipụta ngalaba agụmagụ a, n' anodu dị iche iche ha na-ano na ndu ha.

Ka e wee nwee udo, agamanihu, ịdịnaotu na mmepe n'ala Naijiria. Agụmagụ bụ ezigbote ngwaọrụ a ge-eji nweta ihe ndị a. nke a bụ n'ihi ha agụmagụ, na-enye aka n'ime ka mmadụ kwuwapụ okwu n;oha na-emeghi ihere ọbula iji gosipụta echiche bụ nke nwere ike ịbụ iwe, mmegbu, enwegh nchekwa dzg.

N'ala Naịjirịa, e nwere ọtụtụ obodo n'ime ya bụ nke mejupụtara ala Naịjirịa. Obdo ndị ahụ rụru narị anọ n'ọnụ ọgụgụ (400). N'ihi na e nwere ọtụtụ obodo mejupụtara Naịjirịa ime ka obi mmadụ nile buru otu ọ kachasị n;ihe gbasara ndọrọ ọchịchị biara sie ike n'ihi na obodo ọbụla na-achọ ala Naịjirịa. Ọ bụ n'ebe a ka agụmagụ batara iji jikọta mmadụ nile ọnu, na mee ka ndị mmadụ ghọta na n'agbanyeghi obodo maobu asụsụ onye na-asu, na ọ bụ anyi nile so mejupụta ala Naijira.

Akinlabi na ndị otu ya (2016:103) kwuru n'ihe e jiri webata ọmụmụ agumagụ ogo, agụm akwukwọ dị iche iche bu ka ọ wee nye aka n' ijikọta mmadụ niile ọnụ iji weta udo, ịdịnaotu, nchekwa na mmepe ka ala Naijiria. Nke a pụtara na agụmagụ na'akwalite udo na ịdịnaotu nke Naịjirịa ma mekwa ka ndị mmadụ ghara ịdị na-achọzị naanị nke onwe ha karịa ịchọ etu ọhanaeze ga-esi nwee agamnihu. Agụmagụ ga-emekwa ka ndị mmadụ belata aka n'ibukọrọ akụnaụba nke ọhanaeze nwe na aha kama ndị mmadụ ga-amalitezi chọọ ihe ha ga-emere ọhanaeze ka e nwee agamnihu n'ala Naịjirịa.

Agụmagụ nwere ngalaba atọ; abụ, akụkọ na ejije. Nwara (1989:) kwuru na "ọmụma abụ ge-enye aka mee ka e enwee udo na ịdịnaotu n'ala Naịjirịa n'ihi na onye ọbụla ga-ewere onye Naịjirịa ibe ya dịka nwanne ya. Ala Naịjirịa bụ mba ọ na-amasị mgbe niile, ka agbụrụ nile di na ya dịkọọ n'otu, ma na nkewa na ikpa oke na-eme ka ebumnobi a ghara ịmịta mkpụrụ.

Nchọcha a, na-atụ alo ka ndị isi ọchịchị ala Naịjirịa n and otu ekpeme kpe dị iche iche jiri abụ na-enye nkuzi ha dị iche iche. Nke a ga-eme ka ndị mmadụ obi mgbahara, udo, nchekwa na ịdịnaotu. ọ bụrụ na ọnọdụ dị otu a adị, nke a ga-ebute mmepe dị elu n'ala Naịjirịa. Abụ Igbo dị ụzọ abụọ; ha bụ abụ ọnụ na abụ ederede. Abụ ọnụ bụ ndị ahụ a na-akọ n'ọnụ nkịtị.

Chukuezi (1988:4) kwuru na abụ ọnụ bụ ụdị abụ nwere ike na-akọ maka ndụ ebiri ebi, emume dị iche iche ndị mmadụ na-eme na egosi etu ndị mmadụ siri nabata maọbụ jụ otu echiche maọbụ ibe ya" Abụ ọnụ metutara ọnọdụ niile ma ọnọdụ ọma ma nke ọjọọ. ọ bụ ihe nd echiche ha gbasara ụwa. N' age ugba a, abụ ọnụ na'alaghachizi azụ n'ihi na ndị mmadụ enweghizi mmasi na ya. ndị ọkpọabụ na -ahiazikwa ahụ inwete n'ihi na o nweghizi onye na-ege abụ ọnụ. Ihe onyonyoo nd ọche ma foonu dgz. Ewerela ọnọdụ abụ ọnụ Igbo.

Abụ ederede bụ abụ ndị ahụ e deturu edetu n'akwụkwọ. N'ụdị abụ a, a maara onye dere ya na onye ya.

Echebima bụ odee abụ Igbo. ọ bụ ode aka siri ike n'ihe gbasara abụ Igbo. Ọ bụ onye ode ọ na-amas n'iji abụ mee ka ọgụụ huta ihe na-eme n' ụwa n'ụzọ dị iche iche. Echibima bụ onye Egbu-Owere dị na steeti Imo. ọ bụ ezigbo onye nkuzi kuzirila na nnukwu ụlọ akwụkwọ dị iche iche ma dekwa ọtụtụ akwụkwọ ngugu. ọ bụ onye asụsụ igbo doro anya nke ọma. Onye ọbụla na-agụ akwụkwọ aghaghị ịhụ ụtọasụsụ, okwu chara acha, amamihe, mkpughe na ezi akọ na uche nke jupụtara n'ime ya.

Mmepe Ala Naịjirịa

`Naịjirịa bụ obodo nwere ọtụtụ omere asụsụ na ekpemekpe dị iche iche. Kemgbe afọ (1960) Naịjirịa nwechara onwe ha, mmepe nke ala Naịjirịa bụ nke na-achu ndị mmadụ ụra, mana ịkpa oke, ọgbaghara na ịkwafu ọbara dzg. nke ndị mmadụ ibe ya, nke nsi otu ekpemekpe dị iche iche, nke otu agbụrụ na ibe ya na-eme ka ebumnobi Naịjirịa gbaa mta ezi mkpụrụ. Ala Naịjirịa nwe0re ato kacha pụtakarcha ihe n'ime ya; agbụrụ nd ahụ bụ Awụsa, Igbo and Yorụba. Agbụrụ niile ndị a juputere ala Naịjirịa olile anya mgbe niile oge Naịjirịa ga-esite ndụ ochie benye ndụ ọhụrụ.

Mmepe bụ mgbe mmadụ, obodo, mba, agbụrụ sitere na ndụ ochie wee banye na ndu ọhụrụ, sitekwa n'omume ọjọọ wee banye n'omume ọma.

Dike (2008:38) kọwara mmepe dịka mmadụ maọbụ sitere na ndụ ochie wee banye na ndụ ọhụrụ maọbụ omume ọhụrụ" ndụ ochie a, nke a gbanwere bụ nke a tụrụ anya na o ga-enweiri ihe oma ya na ya so bụ aka e jiri dechie anya ihe ọjọọ. Ndụ ọhụrụ maọbụ omume ọhụrụ a ka a tụwara anya na ọ ga-eme ka ụwa dịwagara ndị mmadụ mfe n'obibi.

Mmepe abụghị naanị iru ihe a na-ahụ anya dịka iru ọku letrik, pomp mmiri, iru okporo ụzọ, ụlọakwụkwọ na ihe ndị ọzọ. Mmepe nke kacha mkpa bụ mmepe nke mgbanwe echiche na akpamagwa ndị mmadụ adịghị mma ma mee ka ha chee echiche n'ụdị kachasị mma ga-eweta udo na agam n'ihu nyere onye ọbụla n'obodo. Akidi (1013:178) kwuru na ọ bụ eziokwu na mmepe nwere ike ịdị na mpaghara niile dịka ọrụ ugbo, agụmakwụkwọ, izu aha, nkanuzu, dzg. o kwuru na n;ime mpahara niile nd e nwere ike inwe mmepe nay a ma na mmepe kaches baa uru bụ mmepe nke mmadụ siste n'omuma ọjọọ ya gbanwee wee mewe omuma oma. Nke a pụtara na ihe kachasi di mkpa na mmepe bu "echiche". ọ bụ na n'echiche mmadụ ka ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ na esite apụta. ọ bụrụ na ndị mmadụ eụhezie echiche nke ọma, nke ga-eweta ihe ọma dị iche iche ma chefuo omume ọjọọ, ihe abakwa dịịrị ndị mmadụ mfe, ndụ atọwakwa onye ọbụla ụtọ. Mgbe ọnọdụ dị etu dịịrị, mmepe ga-adikwa. Ka e wee nwee mmepe tọrọ atọ n'ala Naịjirịara, abụ Igbo di ezigbo mkpa n'iji mee nke a n;ihi na abụ na-eji ụzọ doro anya kuziere ma gbaziri ndị mmadụ ụzọ kachas mma ha ga-esi ebi ndụ ha. Ekwealor (2009:22) kwadoro nke a mgbe o kwuru ka "... abụ bụ okwu dere ede na-eji nwayọọ edeba n'obi." Ihe na-eme ha abụ baa ndị mmadụ n'obi ma nye echiche etu a tụrụr anya bụ asụsụ ode abụ. Odee na-ewere nhọrọọkwu kacha mma ji mee ka abụ ya metụ ọgụụ n'obi. ọ bụ site n'ikpechapụ anya n'họrọ okwu kwesịrị ma debakwaa adaba site na ka ọnọdụ siri dig a-eme ka ọgụụ maọbụ ndị na-ege nti tulee okwu ndị ha nụrụ n;uche ha ma kpebie n'igbanwe agwa ọjọọ dịka kwafụ ọbara , ohi na ọgbaghara dị iche iche ma nabata mmekorita, ịdịnaotu, mgbaghara dzg. ọ bụ na ọnọdụ dị etu a, nje a ga-eweta mmepe di elụ n'ala Naịjirịa.

Abụ Igbo

Abụ Igbo abụ ndị ahụ dị ọkpụ, nke malitere mgbe ndị Igbo malitere. Na mbu, ọ bụ n'ọnụ n kiti ka ana-agụ ya. ọ bụkwa site n'aka fere aka ka ọ siri rute anyi aka. Abụ di ụzọ abụọ, abụ ọnụ na abụ ederede. Abụ ọnụ bụ abụ nd ahụ a na-agụ naani n'ọnụ nkiti, bụ nke e detugh edetu n'akwụkwọ. A maghị chepụtara ha, a maragodu ka oga na-aga, a na-echefu ha.

Abụ ederede bụ abụ nd ahụ e detụrụ edetụ n'akwụkwọ. Nwadike (1992:34) kwuru na abụ ederede Igbo dịka iduuazi na ejije ederede, ebidigh oge. N'agbanyegh na ọtụtụ ndị mmadụ e deela abụ na onwe ha. O kwuru na abụ Igbo apụtaghi n'oge genye n'afo 1975 bụ mgbe Ekechukwu chikọtara abụ iri issi na ise (65) kpọọ ya "Akpa uche" nke ndị "Oxford University press bipụtara".

Abụ agụmagụ.

Abụ ọbụla dị n'akwụkwọ bụ agụmagụ ka ọ bụ. Emenanjọ (2013:10) kọwara abụ dịka ihe mmadụ chepụtara ma detụọ ya n'akwukwọka ụwa na olu ya. Ọ bụghi naani nchepụtara mere abụ ihe ọ bụ, e chepụtakwara iduuozi ma ejije echepụta kama ọ bụ usoro e jiri dee abụ nakwa asụsụ aka e jiri chọọ abụ mma, mere ka abụ dị iche na nglalba agụmọgụ ndị ọzọ.

Abụ na-adị n'ahịrị n'ahịrị na nkeji na nkeji n'abụ, a naghi ekwu ahịrịokwu, owere ihe a na-ekwu bc ahịrịabụ ọtụtụ oge, e nwere ike inweta ahịrị maọbụ karịa n'otu ahịrị abụ bụ nke ga-emese ahịrịokwu zuru oke ma nye nghọta mgbe ufọdụ otu ahịrị abụ na-enye nghọta zụrụ, mgbe ọzọ nghọta ya anaghi ezu oke ganye na ọ banyere n'ahịrị ọzọ. Abụ anaghi eji ogologo akwu arụ ọrụ dike iduunazi na ejije. Abụ na-akpa okwu akpa, otu mkpuruokwu n'abụ nwere ike pụta ọtụtụ ihu akwụkwọ ma atulechaa ya. Ihe kpatara nka a bụ n'ihe na ode jọrọ okwu kacha mma bu nke o jiri dee abụ. Nhọrọ okwu ndị ahụ bụ asụsụ nka. Asụsụ nka dịka Emenanjo (1988) kwuru bụ asụsụ a pr aka nke ọma chepụta ma họpụta bụ nke ode jiri chọọ agụmagụ ya mma. Nke pụtara na ọ bụ asụsụ nke dị iche iche bụ nke odeasụ webatara n'abụ ya ka ọ ji eme ka ọgụụ hụta ụwa d ọ siri hụ ya.

Akparobaro (2006:304) kowere abụ dịka nke mmadụ na-esite na ya were na-egosipụta ọhanaeze ka ihe siri metu ya na mmụọ. Nke a pụtara na mmadụ nwere ike isite n'abụ egosipụta ebumnobi nakwa nghọta dị iche iche ọ nwere gbasara ihe na-eme na ndu, na-atụghị ụjọ ọbụla maọbụ mee ihere. Site n'abụ, ode na-agwa ndị mmadụ eziokwu gbasara ndụ. O nwee ebe ndị mmadụ mere ihe ọma, ọ bụ ọrụ odee ijali ha maọbụ too ha. Ọ dịkwanụ ebe e mere ihe ọjọọ, ọ bụ ọrụ ode na-akatọ ihe ọjọọ ndị ahụ ma mee ka ndị mmadụ chọpụta ebe ha riri mperi na ha.

Asụsụ ọkpọabụ

Abụ bụ ụzọ mmadụ si akọwapụta ka ime mmụọ ya dị. Asụsụ bụ ụzọ dị iche iche mmadụ si akọwapụta ebumnaọbi ya. A na-ewere abụ dịka asụsụ mgbe ọkpọabụ jiri abụ mee kọwapụta ebumnobi ya. Okafor (2005:383) kwuru na "... n'ihi mmadụ na-eji abụ akwapụta ebumnobi ya, ya bụ na abụ bụ asụsụ."

N'ikọwaoụta ebumnobi mmadụ. Asụsụ ọbụla baara ndị na-asu ya uru. Ọ nweghi asụsụ ka ibe ya mma. Asụsụ ọbụla dị mkpa n'ihi ọrụ dị iche iche ọ nwere ike rụrụ ndị nwe ya. Asụsụ ndị Igbo na-asụ ka a na-akpọ asụsụ Igbo. ọtụtụ ndị igbo enweghị ihe ha ji asụsụ Igbo kpọrọ . ndị dị etu a kwereyere n'asụsụ Igbo kwesighi isu asụ. Ha chefuru na ma asụsụ Igbo ma asụsụ bekee na ọ bụ otu ọrụ ka ha na-aru, iji kọwapụta ebumnobi ndị mmadụ. ọ bụ ihe asụsụ ndị mba dị iche iche na-arụ ha, ka asụsụ Igbo na-arụrụ ndị Igbo. Nke a pụtara na ndị Igbo kwesịrị iji asụsụ ha nwere kpọrọ ihe ma ghara ịdị na-eleda asụsụ Igbo anya. N'ihi na ọ bụrụ na ndị Igbo ejiri asụsụ ha kpọrọ ihe, nke a ga-eme ha ndị mba ọzọ mụọ isu na ide asụsụ Igbo. N'ụzọ dị etu a, ga eme, ọ bụrụ na odee abụ ejiri asụsụ Igbo dee abụ ya, ndị ma ọrụ maọbụ agbụrụ ọzọ ga-agụ ya ma nwekwa ezi mgbanwee n'akparamagwa bụ nke ga-ebute mmepe nke ala Naịjirịa.

Ikekaonwu (1999:VI) na ndị otu ya kọwara asụsụ dịka "... ebe nehedo nke akọnauche na ahumuihe ndị mmadụ." Asụsụ na-egosi ebumnobi mmadụ. E jikwa ya akuzi usoro akparamagwa na omume di mma bụrụrkwa usoro nkọcha nke agwa ọjọọ dị iche iche. ndị Igbo bi n'ọwụwa anyanwu nke Naịjirịa. steeti ndị mebere ala Igbo gunyere Abia, Anambra, Enugu, Ebonyi and Imo, ebe ọzọ bụkwa Delta na mpaghara cross River na Rivers.

Abụ igbo na asụsụ Igbo dịka aka nri na aka ekpe. ọ nwegh nke a ga-ewezu ga n'ebe ihe ya no. tupu abụ Igbo arụọ ọru nke ọma n'iji ya zie ọhanaeze oz, ọgụụ maọbụ ndị na-ege nti ga-abụ ndị mara asụsụ Igbo nke ọma. Ibekwe (2010"135) kwenyere nke a mgbe o kwuru na tupu mmadụ e nwee ike ngọta ihe abụ na-ekwu maka ya na onye ahụ ga-abụ onye asụsụ e jiri dee abụ ahụ doro anya nke ọma."

Abụ ga-arụ ọrụ ya karia ma ọ bụrụ na ọgụụ bụ onye asụsụ Igbo doro anya nke ọma. Asụsụ Igbo ido ọgụụ anya gụnyere imeta imeta ma tii ma rii din a ya bụ imata ma atụmatụokwu ma atụmatụ agụmagụ bụ nke e ji achọ abụ Igbo mma.

Mmakọrita ọzọ dikwa n'ettit abụ Igbo na asụsụ Igbo bụ na abụ Igbo na-amalite rụ ọrụ yam be asụsụ igbo rụsiri ọrụ mke ya. Nke a pụtara na ọ nwere okwu ụfodụ mmadụ e nweghi ike ikwu dịka okwu karia ma e kwuru ya n'ụd abụ. Abụ na-enyere mmadụ aka a ikwapụ okwu n'oha na-emeghi ihere ọbụla. Marriam (1964), Tracey (1954) na Nettle (1964) kọwara n'ime ibekwe (2013:155) na n'abụ mmadụ nwere ike iji abụ kwuo okwu ọ gaghi e nwe ike kwuo m'ọnọdụ nkiti ma e wezuga abụ. Nke a pụtara na ode nwere ike ikwu gbasara ọnọdụ ọbụla na-atụghịi ụjọ. N'ihi ikikere nke abụ na-enye nd ọkpoabụ maọbụ ndị ode, ode nwere ike isite n' abụ dee gbasara ọnọdụ ọbụla nke nwere ike ibu ọnọdụ oma maọbụ nke mbe ọjọọ ma tuzikwara ndị aka etụ ọ kwesịrị ka ọnọdụ di iji weta mmepe na ịdịnaotu nke ala Naịjirịa.

Ụdịdị Abụ Igbo Dị Iche Iche

Nd igbo nwere ọtụtụ abụ ha ji egosipụta ihe na-eme na ndụ ha dịka . Nebolisa (2014:38) kọwara n'ufodu n'ime abụ ndị igbo gunyere abụ Ifo, Abụ otito, abụ nkocha, abụ akwarr, abụ ịhụnanya.

  • Abụ ifo: bụ abụ ndị ahụ a na-enbata mgbe a na-efo ifo. Abụ ifo nwere ike kwụ naani ya, a na-efo dịka ifo. ọ nwekwara ike nọkwa n'ime akụkọ ifo.
  • Abụ otito: Nke a bụ ụdi abụ nwere ike iji too Chukwu maọbụ mmadụ. E nwekwara ike iji ya too ihe nkiti.
  • Abụ nkọcha: nke a bụ udi bụ eji agwa mmadụ ihe ọjọọ ọ na-eme. Ebumnobui abụ a, bu ka onye ahụ kwụs ihe ọjọọ ọ na-eme.
  • Abụ akwarịrị: Nke a bụ ụdị abụ maadụ ji egosi na obi adịghị ya mma.
  • Abụ ihunanya: n'ụdi a, mmadụ ji ya egosi ihunanya n'ebe onye ọzọ nọ.

Uru Abụ Bara

Abụ bara ọtụtụ uru nke gụwayere nd a. ọ bụ site b'abụ ka mmadụ si ezipụta ka ihe siri metata y na mmụọ. Mmadụ jikwa abụ akasi onwe ya obi. Eji abụ ekpe ikpe ma jirikwa ya na-efe ofufe dị iche iche. E ji abụ akwagide ihụnanya dị iche iche. Abụ na-arụkwa dịka enyo ncheta ihe gara aga na ndu mmadụ. Ihe nke a pụtara bụ na ihe ọbụla nke e tinyere n'ụd abụ ọbụlafodu omenala, nkwenye maọbụ ihe ọbụla mere mmadụ na ndụ, ọ bụ na-agụpụta n'abụ, ọ ga-aha ezigbo tupu ndị mmadụ maọbụ ndị nke a metutara echefuo ya.

Abụ Igbo na Mmepe Ala Naịjirịa

Ode abụ bụ otu n'ime ndị odee bụ ndị nyere aka iji kwalite ịdịnaotu na mmepe nke ala Naịjirịa bụ.

Echebima. Nchocha a na-eleba anya n'abụ dịka enyo e ji ahụ ihe na-eme n'ala Naịjirịa dịka Echebima siri dee ya n;isiokwu nke o kpara "Gini ka mmadụ bu" isiowku a na-egosi ka o si anu ode ọkụ n'obi, n'ime ka e nwee udo, ịdịnaotu na mmepe n' ala Naịjirịa. ode a mepụtara ọnọdụ ọjọọ dị iche iche bụ nke a na-ahụ n' ala Naịjirịa dịka oke ọchịchịọ nke onwe, mmegbu naikwafu ọbar na mee ka ogụụ ghọta n; ihe niile nd a, e nwegh nke bara uru ọbụla n'ihi na njedebe ha nile bụ n'uwa a. Odee dighi abụ a maka iji me endị mmadụ obi ụtọ. ọ depụtara ụzọ di iche iche ndị mmadụ si echekasi ma na adogbu onwe n'ihi oke ọchichọ, ma chefuo na mmadụ bụ aja nkiti.

Mmegbu, na ikwafu ọbara na nkewa anaghi eweta mmepe ọbụla n'ala Naịjirịa keria omume ọjoo ndị a na-eme ka ọnọdụ ala Naịjirịa jọkaria ajọ. Odee depụtakwara ka ndị mmadụ n'enwe obi anur mgbe ha na-akwafu ọbara ma na-emegidekwa mmadụ ibe ha. Odee kwụrụ na ndị mmadụ e chefuola n' uwa a bụ ihe efu. Odee gosipụtakwara nwute ya n'ala Naịjirịa ka ndị mmadụ si adogbu onwe ha n'oke ọchịchịọ ma chefuo n'ụwa bụ aja.

O siri;

Gini ka mmadụ bụ

O ji esogbu onwe ya

Adogbu onwe ya

Echegbu onwe ya?

Aja efu

Kom kom

Ikuku efu (peji 29: ahịrị 1-7)

Odee kọwakwara omume ụfodu na-ebute ndegbachiazụ na mmepe nke ala Naịjirịa dịka mmegbu na I nara mmadụ ihe rurru ya. ọ tuziri aka na I nweghi ruruuuuu mmadụ na-erite mgbe ọ na-emgbu mmadụ ibe ya.

O siri,

I na-emegbu mmadụ ibe gi

I bụ onye?

I ga-ato n'ụwa

I ga-ebụ akụ ụwa laa mmụọ?

ọ dighi, eny m

ọ dgh (ahịrị 1-6)

Odee egosipụtakwara ka ndị mmadụ si e nwe anụri mgbe ha na-akwafụ ọbara. O nyere ndụmodụ ka agbzrz niile na n'ime Naịjirịa nwee obi mgbaghere, ịdịnaotu ma na-emekọrita dịka nwanne na ọ bụ ụzọ dị etu a kachas mma iji bi n'ụwa, n'ihi n'ụwa a bụ aha onye nọsa ọ laa.

Mgbe I nan-enu na-eme abụba

Mgbe na-eweliri onwe gi aka

N'ihi ike na mmegbu gi

I na-echetakwa

Na ụwa bụ aha

Onye nọsa ọ laa. (ahịrị, 1-6)

Odee chopụtara mkpa ọ d udo, ịdịnaotu n'ala Naịjirịa. ọ chọpụtara n'omume rur ụny niile a na-ahuta n'ala Naịjirịa. agagh abụ uru ọbụla na mmepe ala Naịjirịa. ọ mere ka nd omebi iwee niile, ndị na-akwafu ọbara na nd mmegbu ka ha mata ọnọdụ ha n'cwọ.

O siri;

I na-echetakwa

Na aja efu ka I bụ?

Kom kom efu

Nke nke ise (ahịrị 1-3)

N'ihe na odee chọpụtara mkpa ọ dị na e nwere ezi mmepe n'ala Naịjirịa. ma ọ bụkwanụ mmadụ nwere ike ime ka mmepe ahụ ghara idị etu o keresiri. Odee na-eme ka ndị mmadụ mata na ọ ka mma hapụ ihe omume ọjọọ dị iche iche iji nwee mmepe n'ala Naịjirịa makana dịka mmadụ, na ọnwụ nwere ike ba mgbe ọbụla.

ọ siri;

Gini ka mmadụ bụ?

Okpokoro ihe

Na nwegh nọ n'ime ya

Ebumnobi odeabụ a bụ ka e were nwee udo, ịdịnaotu na ezi mgbanwe tọrọ atọ. ọ bụ ihe nd a jikọtara ọnụ wee bụrụ mmepe nke ala Naịjirịa. obodo nwere udo na ịdịnaotu e nwela mmepe n'ihi na mmepe kacha dị mkpa bụ mmepe nke ndị mmadụ isite n;ụzọ ọjọọ ha si eche echiche webanye n'iche echiche etu kwesịrị ekwesi. Odee wepụtara ọnọdụ ọjọọ dị iche iche bụ nke a na-ahụ n'ala Igbo nakwa Naịjirịa dịka; mmegbu Ikwafu ọbara, ikpo as nke ndị otu ekpemaekpe dị iche iche, nkewa, oke ọchịchịdgz. Ihe ndị a niile bụ ihe ndị so akpagide mmepe nke ala Naịjirịa.

Abụ bụ ezegbata ngwaọrụ eji ahụza akpamagwa ndị mmadụ.

Nchọcha a na-atu alo na ọgugu na ọmụmụ abụ Igbo ga-eme ka e'nwee udo, ịdịnaotu, chekwa na obi mgbaghara n'etit agbụrụ niile mejupụtara ala Naịjirịa. n;ihi na abụ ba-eji okwu aka dị iche iche gbanwee wchiche ndị mmadụ bụ nke ga-ebute udo isinaotu mmepe nke ala Naịjirịa.

Nchikọka

Ala Naịjirịa a nwechebeghi mmepe n' akụkụ niil dịka o kwesịrị . Ihe kpatara nke a bụ nkewa, kwafu ọbara, ndị nna ndọrọ na ekparamagwa ndị mmadụ dị iche iche bụ ndị mejupụtara ala Naịjirịa. Ebe ọnọdụ ọjọọ dị iche iche etu a di, mmepe fọrọ atọ agaghi adikwa ọ bụ ọrụ odee abụ n'iji asụsụ dabara adaba gbanwee echiche ndị mmadụ ma mee ka ala Naịjirịa nwee udo, ihunanya, ịdịnaotu na mmepe. Abụ kwesikwara ka a na-agụ ma na-tuzi ya malite n'ụlọakwụkwọ ọtakara wee ruo na mahadum. Nke a ga-akunye ihunanya n'ime nd na-eto eto na mee ka ha mata na mmadụ n'ala Naịjirịa bụ otu na ebe nkewa na ikpa oke di na mmepe anaghi adi.

Edensibịa

Akinlabi, A.W Waheed, T, A, Ojo, T.A (2013). Poetry as a tool for promoting national intergration and security. Journal of African & Asisa studies Nnamdi Azikiwe University Awka. Vol 1, No (2) pp 103.

Akparobaro, F. B. O (2006) Introduction to African oral literature Lagos: Princeton press.

Akidi, C.F (2013). Igbo language & sustainable development interaction journal of Igbo studies Awka Nnamdi Azikiwe university Awka.

Chukwuezi, A. B (1988); Akọ bụ ndụ. Lagos mages press.

Dike, G. A (2008) Nigeria languages: Veritable tools for community education and development. Journal of language, Art & culture. Owerri Alvan ikoku federal college of Education.

Echebina, G. N (2001) Ako na uche Ibadan loyal press.

Ekwealor C. C (2009) Agụmagụ ederede Igbo n'ozuzu oke nsukka: pascal press.

Emenanjọ, N. (2013). Utara Nti Nwoyacha Abụ igbo Awka.

Emenanjo, N (1988). Atumatu agụmamụ na atụmatụ okwu lagos: long men press

Ikekaọnwụ, C. N. ndị otu ya (1999). Fọnọloji na grama igbo Ibadan: University press.

Ibekwe, E.U (2010) Music, Languag and the universal implication of meaning journal of the association of Nigeria music cologists pp 66-73.

Ibekwe; E.U (2013). Music as and invaluable tool for substance of Igbi language. Journal of igbo studies, unizik.

Merrian, A. P (1964) the anthropology of music. leSA: North Western university press.

Mett, B. (1964). Theory aid method in Ethnomusicology. Nwe York Macmilliam press.

Nebolisa, O. E (2014). ọmụmụm Agụmagụ igbo Awka: SamosamoPress.

Nwana, O. C (1989). Role of Education in fostering national and united in Nigeria. Nigeria palm beach foundation press.

Nwadike, I. U (1992), Ntọala Agụmagụ: Enugu: Ifunanya press.

Okafor, R. C (2005) music in Nigeria society. Enugu: nwe generation press.