ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA VOLUME 12; NO 2, JULY, 2019

Mmetụta Ndịiche dị n'Ụdaolu Igbo Waawa n'Ịkanye Akara Ụdaolu n'Okwu Igbo Izugbe n'Ogo Sinịọ Sekọndịrị na Steeti Ebonyi na Enugwu

Si N'aka

Dr. Uchenna Fabian Ude

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

uchenna.ude@unn.edu.ng 08064231662

Ụmìedemede

Isiokwu nchọcha a bụ Mmetụta Ndịiche dị n'ụdaolu Igbo Waawa n'ịkanye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe n'ogo sekọndịrị ukwu na steeti Ebọnyị na Enugwu. Ụmụakwụkwọ n'ogo sekọndịrị ukwu na steeti Ebonyi na Enugwu anaghị eme nke ọma n'ịkanye akara ụdaolu Igbo n'ihi na olu Igbo Waawa na-emetụta ha n'ọmụmụ Igbo Izugbe nakwa n'ule sinịọ sekọndịrị. Ụdị nchọcha e ji mee nchọcha a bụ Eụpostu Faktọ (Eụpost Facto design). Ọnụọgụ e ji mee nchọcha dị 15,684 (puku iri na ise, nari isii, iri asatọ na anọ). Onye nchọcha seere ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dị 1,555 (otu puku, nari ise, iri ise na ise) site n'iji usoro nsere nke nhọ na nha tụmbọm tụmbọm (proportionate stratified random sampling techniọue). Ngwa nchọcha onye nchọcha ji mee nchọcha a bụ Nnwale Mmetụta Ụdaolu Igbo Waawa n'ịkanye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe (NMUIWIAOUII). Onye nchọcha tụrụ aro na gọọmentị kwesiri ịchịkọbara ndị nkụzi ọzụzụ mmụgharị ebe a ga-akpọta ndị nkụzi ọbịa nleta na-akụzi asụsụ Igbo sitere na Mahadum na Kọleji Kedukeshọn ịkụziri ha ịkanye akara ụdaolu Igbo; ebe ndị nkụzi sekọndịrị n'aka nke ọzọ ga-agba mbọ kụziere ụmụakwụkwọ maka ịkanye akara ụdaolu Igbo Izugbe etu o kwesiri.

Okwu Ndị Pụtakarịchara Ihe: Ụdaolu, Olu Igbo Waawa, Igbo Izugbe, Akara Ụdaolu.

Mkpọlite

Ntọala Nchọcha

Asụsụ bụ otu n'ime njirimara agbụrụ ọbụla nke mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta n'ụdị mkparịta ụka iji mee ka mbunuche ha pụta ihe. Ọ bụ site n'asụsụ ka mmadụ si aghọta ma na-amatakwa ihe onye ọzọ bu n'uche. Asụsụ bụ ihe nrịbaama nke mmadụ ji ezipụta ihe o bu n'obi mgbe ya na ndị ọzọ bịakọtara ọnụ. Ọ bụ asụsụ ka mmadụ na ibe ya ji ekwukọrịta okwu nke mere na e wepụ asụsụ, ọ ga-ahịa ahụ ịmata ihe mmadụ bu n'uche. Asụsụ bụ otu ihe mere ka mmadụ karịa anụ ndị ọzọ dị n'ụwa elu. Farinde (2005), kwadoro na asụsụ bụ nnukwu ihe bara oke uru mmadụ jiri dị elu karịa anụ ndị ọzọ dị iche iche. Agbụrụ ọbụla nwere asụsụ ha na-asụ be ha. Ndị Igbo dịka agbụrụ, nwere asụsụ nke ha na-asụ bụ asụsụ Igbo. Asụsụ Igbo so n'otu n'ime asụsụ a na-asụ na Naịjirịa nke a na-asụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala Naịjirịa.

Ọzọ kwa, asụsụ Igbo so n'asụsụ atọ (Awụsa, Igbo na Yoruba) gọvụment etiti ala Naịjirịa wepụtara ka a na-akụzị ma na-elekwa n'ule sinịọ sekọndịrị. Ọ bụ n'ihi oke uru ọmụmụ asụsụ bara mere gọvụment etiti Naịjirịa jiri kọwapụta nke ọma n'akwụkwọ Federal Republic of Nigeria (2004) na gọvụment nabatara ma hụ uru asụsụ bara dịka nke e ji akwalite ezi mmekọrịta dị n'etiti mmadụ na ibe ya, nkwụgidesike nke ala Naịjirịa nakwa nchekwaba omenaala dị iche iche. Ya mere nwata ọbụla ga-eji mụọ asụsụ dị na gburugburu ya. N'ịga n'ihu, maka ọ dị mma, ịdịkọ n'otu ala Naịjirịa, nwata ọbụla ga-amụrịrị otu n'ime asụsụ ọdịnaala Naịjirịa: Awụsa Igbo na Yoruba (FRN 2004).

Nke a gosiri na nkụzi na ọmụmụ asụsụ ndị ahụ a kpọrọ aha ebe a dị nnukwu mkpa n'ụlọakwụkwọ Naịjirịa dị iche iche; ma nke praịmarị, sekọndịrị nakwaazị ndị dị elu. Ọmụmụ asụsụ na-amalite site n'ịkpọpụta ụda dị iche iche e ji asụ asụsụ ahụ etu o kwesiri. Ụmụakwụkwọ na-amalite ịmụ asụsụ ọbụla site n'ịkpọpụta mkpụrụ ederede na mkpụrụ ụdaasụsụ ahụ dị na gburugburu ha. Ọ bụ mgbe nwata ọbụla kpọpụtara ụda asụsụ ọ na-amụ maka ya etu o kwesiri ka a ga-asị na ọ mụtala ịsụ asụsụ ahụ nke ọma. N'iji kwado nke a, Ayodele, Oyeleye, Yakubu na Ajayi (1990) kwuru na ebe ọ bụ na asụsụ bara oke uru, ọ dị mkpa ịsụ ya etu o kwesiri n'enweghị ntụpọ. Ha gara n'ihu rụtụ aka na ọ bụrụ na mmadụ a kpọkọọ okwu etu ọ dabaghị, na ọ na-ebute nsesa mpụtara na nghọta okwu ahụ nwere nke ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịghọta ihe onye ahụ kwuru. Ya bụ, o kwesiri na mmadụ ga-akpọpụta okwu etu o kwesiri ka onye ọzọ na-ege ntị ghọta ihe o kwuru. Ọ bụ nke a mere na onye na-amụ asụsụ Igbo ga-agba mbọ jiri Igbo Izugbe wee na-akpọpụta maọbụ na-asụ asụsụ Igbo ọ kachasị n'ụlọakwụkwọ.

Asụsụ Igbo bụ asụsụ ọdịnaala e jiri mara ndị Igbo nke a na-asụ na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ala Igbo ebe a na-asụkarị asụsụ Igbo dịka ndị nwe asụsụ a bụ na steeti ise gụnyere: Abịa, Anambra, Ebọnyị, Enugu na Imo. N' ime asụsụ atọ (Awụsa, Igbo na Yoruba) gọvụmenti nabatara ka a na-akụzi n' ụlọakwụkwọ dị na Naịjirịa, asụsụ Igbo so na ya. Asụsụ Igbo bụ nke ụdaolu. N'ọmụmụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ, ọ bụ Igbo Izugbe ka a na-akụziri ụmụakwụkwọ. Igbo Izugbe bụ Igbo a nabatara nke e si n'olundị dị iche iche mejupụta e ji asụ ma na-edekwaazị asụsụ Igbo nke abụghị olundị mba ọbụla. Ọraka (1983), kọwara na Igbo Izugbe bụ asụsụ ahụ e sitere n'olundị dị iche iche dị n'Igbo wee wepụta nke a tụrụ anya na onye Igbo ọbụla ga na-aghọta. Oraka gara n'ihu kọwaa na ihe gbasara asụsụ Igbo Izugbe abụghị naanị isite n'olundị dị iche iche e nwere n'Igbo weta okwu ndị ga-enye aka iji mee ka Igbo Izugbe too kama, o metụtara ibite okwu ụfọdụ sitere n'asụsụ dị iche iche ndị e nweghị ihe a ga-akpọ ha n'Igbo. Site n'ụzọ a, Igbo Izugbe bụ nke e hibere ka onye Igbo ọbụla na-asụ nke ga-eme ka ndị ọzọ bụ ndị Igbo ghọta ihe ọ na-ekwu. Emenanjọ, Okolie, Ekwe, Madụakọ (1985) kọwara na Igbo Izugbe bụ olu nke ọ dịghị mba nwe ya. Ha gosipụtara na otu ihe mere olundị ji dị oke mkpa bụ na, a na-esi na ya enweta ọtụtụ mkpụrụokwu ga-abụ myiwere maọbụ ga-akọwa echiche ndị adịghị n'Igbo Izugbe. Nke a dabara n'ihe Ọraka (1983) kwurula n'elu ebe a maka isi n'olundị dị iche iche wee weta okwu ụfọdụ mejụtara Igbo Izugbe iji mee ka o too ma bụrụkwa asụsụ zuru oke.

N'aka nke ọzọ olundị bụ asụsụ ndị ọbụla na-asụ na be ha nke ezughị Igbo niile ọnụ. Ikekeọnwụ, Ezikeojiakụ, Ụbanị na Ugọjị (1999) kọwara na etu mba dị iche iche dị n'ala Igbo si asụ Igbo bụ olundị ha. Nke a pụtara na etu onye Ọnịcha si asụ Igbo dị iche n'etu onye Nsụka, Udi maọbụ Abakiliki si asụ Igbo. Ikekeọnwụ (1986) kewara olundị dị iche iche e nwere n'asụsụ Igbo ụzọ ise gbara ọkpụrụkpụ site n'ileba anya n'usoro ọnọdụ akpọmakpọ na ụtọasụsụ olundị ndị ahụ. Ogbe ise ndị ahụ gụnyere: Igbo ndị Naịja, Igbo ndị Imeobodo ọdịda Anyanwụ, Igbo ndị imeobodo ọwụwa Anyanwụ, Igbo ndị Waawa/ndị Mgbagougwu na Igbo ndị Mba mmiri. N' ime ogbe ise ndị ahụ e depụtara n'elu ebe a onye nchọcha lebara anya n'olu Igbo waawa. Igbo Waawa bụ ndị Igbo bi na mpaghara mgbagougwu ala Igbo ndị na-asụ 'Waawa' iji zipụta 'mba' maọbụ na ha ekwetaghị n'ihe onye ọzọ kwuru. Ndị Igbo Waawa anaghị aza Waawa dịka agbụrụ kama ọ bụ site n'olu na ihe ha na-asụ. Igbo Waawa nwere ụmụ alaka olundị ọzọ mejupụtara ya ndị gunyere: Achị, Udi, Enugwu, Abakaliki, Ọgwụ na Nsụka. Olu Igbo Waawa nwere ụfọdụ njirimara nke gụnyere na ha anaghị eji mgbakwunye nsonazụ (ghị) ezipụta njụ. Mgbakwunye ha ji ezipụta njụ bụ: 'gụ' 'rọ', ha, 'dụ', 'hụ', na 'gh'. Njirimara ọzọ bụ na ha na-eji mgbakwunye 'me' 'ma' 'ru', gwo, na 'wo' ezipụta ndịmechaa. Ọzọ kwa ha nwere ụdaume itoolu ndị a: i, ị, e, , o,u, a, ọ, ụ, tinyere ụda / / (schwa) na-apụta ihe mgbe ha na-ekwu okwu. Steeti abụọ akachasị asụ olu Waawa bụ n'Ebọnyị na Enugu. Ọ dị mkpa ịrụtụ aka ebe a na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nọ na Steeti Ebọnyị na Enugu na-eji olu Waawa asụ ma na-edekwa Igbo Izugbe n'ụlọakwụkwọ. Ọmụmatụ pụtara ihe n'okwu ndị a:

Ọnụọgụ

Olu Igbo Waawa

Igbo Izugbe

Bekee

1

Ishi

Isi

Head

2

waayị

nwanyị

Woman

3

Weghi

nweghị

Have none

4

Wa

Nwa

Child

5

Oye

Onye

Who

6

Ye

Nye

Give

N'ịga n'ihu Nnachi (2007) gosipụtara na inwe nka ịsụ asụsụ dabeere n'iwu dị iche iche na-achịkwaba asụsụ ahụ nke bụ ụtọasụsụ. Nke a pụtara na onye na-amụ asụsụ ọbụla ga-edebe iwu dị iche iche dị n'asụsụ ahụ.Ya mere Federal Ministry of Education (2009) (FME) depụtara mbunuche nkụzi asụsụ Igbo:

Mbunuche Gọvụmenti banyere ọmụmụ asụsụ ala Naịjirịa na ọdịdị asụsụ Igbo n'onwe ya na ngwucha ọmụmụ Igbo na sekọndịrị ukwu bụ na a tụrụ anya na nwaafọ Igbo ga-eme mee ihe ndị a:

  • Ịsụ Igbo Izugbe werewere na nrụrịtaụka maọbụ mkparịtaụka, n'ejije, n'akụkọ mgbaka, n'akụkọ na akụkọ ọbụla;
  • Ide Igbo Izugbe nke ọma site n'iji ụtọasụsụ dabara adaba, akpaalaokwu na atụmatụokwu dabara adaba, nsoroedide na irighiri ihe ndị ọzọ e ji achọ asụsụ mma;
  • Ịchịkọta na inyochasị ma na inyochasị ma kọwasịa ụdaasụsụ na ụtọasụsụ Igbo dịka a tụrụ anya n'aka onye ọbụla gụchara sekọndịrị ukwu (pg ii).

Nke a gosipụtara njikere gọvụmenti nwere ịhụ na ụmụ amaala Igbo nwere ezigbo mmụta gbasara asụsụ Igbo. Ọzọ kwa, site na mbunuche nke 'b' na nke 'ch' dị n'elu ebe a, o gosiri na ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo dị oke mkpa na nkụzi na ọmụmụ Igbo Izugbe n'ihi na ọ bụ site n'iji ụtọasụsụ dabara adaba ka a ga-esi mata na ụmụakwụkwọ amụtala ịsụ na ide Igbo Izugbe. Mbunuche ọmụmụ asụsụ Igbo gara n'ihu kọwapụta na ọ dịkwazi mkpa na ụmụakwụkwọ ga-akọwapụta ụdaasụsụ nke ọma tupu ha agụchaa sinịọ sekọndịrị.

Ọ bụ ezie na asụsụ Igbo so n'asụsụ ndị ahụ a na-akụzi n'ala Naịjirịa mana ọ bụghị ihe dị mfe n'ihi ọtụtụ nsogbu dị iche iche dị na ya nke mere na ụmụakwụkwọ ụfọdụ anaghị eme nke ọma n'ule sinịọ sekọndịrị dịka 'West African Senior Secondary Certificate Eụamination (WASSCE)'. Onyeisi ule West African Eụaminations Council (2012, 2013, 2014) gosiri na pasentị ụmụakwụkwọ gafeere n'ule asụsụ Igbo na steeti Ebonyi n'afọ atọ ndị ahụ bụ 34%, 37% na 35% ebe pesentị nke ụmụakwụkwọ si steeti Enugu n'ime afọ atọ ndị ahụ bụkwa 40%; 42% na 43%. Nke a gosiri na ụmụakwụkwọ emeghi nke ọma n'ule Igbo n'afọ atọ ndị ahụ so onwe ha. Iji kwado nke a, ozi sitere n'aka onyeisi ule West African Eụamination Council (2000; 2002; 2004; 2007; 2008; 2009, 2010, 2011, 2012, 2013, 2014), kọwara na ụmụakwụkwọ emeghị nke ọma n'asụsụ Igbo n'ihi nsogbu ụfọdụ. Otu n'ime nsogbu ndị ahụ bụ ụbara olundị nke jupụtara n'asụsụ Igbo nke mere ọtụtụ ụmụakwụkwọ ji were olundị ha dị iche iche wee na-ede Igbo Izugbe.

N'ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo, ọ kachasị n'akpọmakpọ; ụdaolu bụ otu ihe dị mkpa ịmụ n'ihi na ọ na-ezipụta ndịiche dị na mkpọpụta okwu abụọ yiri onwe ha na nsụpe. Ụdaolu bụ ogoolu maọbụ piichi e ji akpọpụta ụda dị na mkpụrụokwu. N'ihe gbasara ụdaolu, onyeisi ule (WAEC 2000, 2014) depụtara ajụjụ nke abụọ e nyere ụmụakwụkwọ n'ule nke kwuru: "were akaraụdaolu zipụta na nke ọbụla na mkpụrụokwu ndị a nwere ike inwe nghọta abụọ. Depụta nke ọbụla na bekee. (a) Igwe, (b) eze, (c) azụ, (d) ukwu, (h) ụzọ (i) oke (j) eke. Ọ gara n'ihu kọwaa na ajụjụ ahụ bụ maka ịkanye akara ụdaolu, n'ihi ya, a tụrụ anya na ụmụakwụkwọ ga-egosipụta na okwu ndị ahụ nwere nghọta abụọ maọbụ karịa site n'iji akaraụdaolu mee nke a. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ zara ajụjụ ahụ mana ụfọdụ n'ime ha amaghị ebe a na-akanye akara ụdaolu n'ihi na ebe ụfọdụ kanyere ya n'okpuru mkpụrụ ederede; ndị ọzọ tinyere ụdaolu nke ha n'elu mgbochiume karịa n'elu ụdaume.

Etu o sịla dị, onyeisi ule WAEC (2000) nyere ihe a tụrụ anya na ụmụakwụkwọ kwesiri ide nke gụnyere:

Ígwè (bicycle) ìgwè (many)

Ézē (teeth) ázù (fish)

Mmà (knife) mmā (beauty)

N'ịga n'ihu maka ụdaolu, Nwachukwu (1995) kọwara na asụsụ Igbo bụ nke ụdaolu. O kwuru na ọtụtụ ụmụakwụkwọ sekọndịrị maara na asụsụ Igbo bụ nke ụdaolu. Ọzọ kwa, ụdaolu na-ezipụta ndịiche na nghọta okwu abụọ nwere otu nsụpe. Ọ gara n'ihu kọwaa na ọtụtụ ụmụakwụkwọ nọ na mahadum na kọleji k'edukehọn maara na ụdaolu Igbo pụtara ihe n'ụzọ atọ nke gụnyere ụda elu, (/) ụda nsụda (-) na ụdaala (\). Nwachukwu nyere ọmụmaatụ ndị a:

Ákwa HH (//) 'cry'

Àkwa LL (\\) 'bed', 'bridge'

Àkwá LH (\ /) 'egg'

Ákwà HL (/\) 'cloth'

Óke HH (//) 'male

Òke LL (\\) 'share'

Òké LH (\ /) 'rat'

Ókè HL (/ \) 'boundary'

Nkọwa:

HH pụtara ụdaelu ụdaelu //

LL putara ụdaala ụdaala \\

HL pụtara ụdaelu ụdaala / \

LH pụtara ụdaala ụdaelu \ /

Ọzọ kwa, Nwachukwu (1995) gosipụtara na e nwere usoro nkanye ụdaolu abụọ n'Igbo nke gụnyere usoro nke Green na Igwe; na usoro nke P. Akụjụọobi Nwachukwu (PAN). Ọ kọwara na usoro nkanye ụdaolu nke Green na Igwe bụ nke zipụtara ọnọdụ ndị a:

  • agaghị akanye akara ụdaolu na nkebiokwu (syllable) ọbụla nwere akara ụdaelu;
  • kanye akara ụdaolu na nkebiokwu ọbụla nwere ụdaala;
  • kanye ụdansụda niile.

Ọmụmaatụ:

Osisi tree → HHH (ọ dịghị akara)

àchịchà bread → LLL (akara dị na ha niile)

egō money → HS (naanị akara nsụda)

ebō proper name → HS (naanị akara nsụda)

òlekā person's name → LHS (akara ụdaala na nke nsụda)

(Nwachukwu 1995:1)

N'aka nke ọzọ usoro nkanye nke PAN bụ nke nwere ọnọdụ ndị a:

  • Iji debezuo iwu, a na-akanye akara ụdaelu, ụdala na nke nsụda na nkebiokwu ọbụla;
  • Igosipụta ya n'ọrụ, a na-akanye ụdaolu n'ebe e nwere ndịiche ma hapụ ndị yiri onwe ha;
  • Na ngosipụta, ọ bụ naanị akara ụdaelu (/) na ụdaala (\) ka a na-eji ezipụta ndịiche n'ụdaolu. Anaghị akanye akara ụdansụda n'ihi na ọ bụ ụdaelu e sedatụrụ ala.

Ọmụmaatụ

égó HS (money)

ébó HS (proper name)

álú HS (abormination)

òléká LHS (proper name)

ònyébúchi LHS level (proper name)

(Nwachukwu 1995:2)

Nkọwa: HS pụtara ụdaala; ụdansụda

Ọ dị mkpa izipụta ebe a na ọ bụ usoro nkanye akara ụdaolu nke PAN ka onye nchọcha ga-eji rụọ ọrụ na nchọcha a.Nwaozuzu (2008) kọwara na ụdaolu bụ otu njirimara akpọmakpọ asụsụ Igbo. Ọ gara n'ihu kwuo na olundị dị iche iche n'ala Igbo na-eji ụdaolu ezipụta ndịiche dị n'okwu abụọ maọbụ ahịrịokwu abụọ yiri onwe ha. N'ịga n'ihu ọ bụ n'ihi nnukwu uru ụdaolu bara n'ụtọasụsụ Igbo ka Mbah na Mbah (2014) ji kọwaa sị:

Amụmamụ asụsụ Igbo agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na amụghị gbasara ụdaolu. Ọtụtụ ndị ọka mmụta na-eche na ụdaolu kwesiri ịdị n'akpọmakpọ. Etu o sila dị, onweghi ebe e nwere ike iji bido ụdaolu. Nke a bụ n'ihi na o nweghi mpaghara ọmụmụ asụsụ ụdaolu na-emetụtaghị. E nwere ike ịmụ ya n'akpọmakpọ, mmebe okwu, usorookwu na echiche (pg. 25).

Nke a pụtara na n'agbanyeghi na ụdaolu bara uru n'ụtọasụsụ, o kwesiri na nchọcha a ga-eleba anya n'ihe gbasara ọrụ pụrụ iche ọ na-arụ n'akpọmakpọ dịka o si metụta nchọcha a. O kwesiri na ndị nkụzi ga-akụziri ụmụakwụkwọ mkpọpụta okwu Igbo Izugbe iji zipụta ndịiche dị na nke olundị.

Nsogbu Nchọcha

Asụsụ ọbụla dịka asụsụ Bekee, Awụsa, Yoruba tinyere Igbo nwere alaka ụtọasụsụ nke a na-akụziri ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ taa. Ụtọasụsụ nwekwaaziri ụmụ alaka ndị ọzọ mejupụtara ya dịka: Akpọmakpọ, Mọfọlọjị, Sịntaks na Semantiks. A bịa n'ụlọakwụkwọ Sinịọ sekọndịrị dị n'ala Naịjirịa, Akpọmakpọ na Mọfọlọjị bụ ndị kachasị pụta ihe n'ihi na ha metụtara usoro akpọmụụda na mmụbaokwu nke bụ ebe mbido ọmụmụ asụsụ dị iche iche. Asụsụ ọbụla nwere akpọmakpọ na fọnịm nke ya. N'otu aka ahụ Igbo Izugbe nwekwara akpọmakpọ nke ya. Ihe gbasara nkụzi akpọmakpọ Igbo n'ụlọakwụkwọ dị iche iche n'ala Naịjirịa adịghị mfe n'ihi na asụsụ Igbo nwere ọtụtụ olundị. Olundị dị iche iche n'ala Igbo nwere fọnịm nke ha nke na-emetụta fọnịm Igbo Izugbe. Igbo Izugbe nwekwaaziri akpọmakpọ na fọnịm nke ya a nabatara maka ide ya. Ọ bụ nke a mere na akpọmakpọ olundị dị iche iche ji emetụta nkụzi na ọmụmụ asụsụ Igbo n'ebe ụmụakwụkwọ nọ taa. N'otu aka ahụ, akpọmakpọ olu Igbo Waawa na-emetụta ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe n'ihi na ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nọ na Steeti Ebọnyi na Enugwu nke Naịjirịa na-eji fọnịm olu Igbo Waawa asụ ma na-edekwazi Igbo Izugbe dịka e gosipụtara na ntọala nchọcha a.

Ụdị ọnọdụ a na-eweta mgbanwe na nghọta okwu ụfọdụ nwere n'ihi na e were fọnịm adabaghị dee ha, ọ ga-eweta ndịiche na nghọta okwu ndị ahụ nwere. Nke ọzọ, ọnọdụ dị etu a na-emetụta ụmụakwụkwọ ndị sịnịọ sekọndịrị dị na Steeti Ebọnyi na Enugwu nke Naịjirịa na-ele ule sịnịọ sekọndịrị bụ 'SSCE' n'ihe gbasara ụdaasụsụ nke akpọmakpọ na-amụ maka ya. Onyeisiule 'WAEC' (2002; 2003; 2004; 2007; 2008; 2009; 2010; 2011 na 2012; 2013; 2014), kwekọrịtara na ụmụakwụkwọ anaghị eme nke ọma n'ihe gbasara ụdaasụsụ n'ihi na ụfọdụ amaghị ihe ọ bụ ebe ụfọdụ na-eji akpọmakpọ olundị ha ede nke a. Tinyere nke a, onye nchọcha sobu wee na-atụcha maọbụ eleba anya n'akwụkwọ ụmụakwụkwọ n'ule 'WASSCE' n'oge gara aga wee chọpụta na ụmụakwụkwọ na-eri mperi ebe ọ dị ukwuu n'ihe gbasara ụdaasụsụ Igbo.

Ọ bụ ihe ndị a mere onye nchọcha ji wee na-ajụ: kedu ka ụdaolu olu Igbo Waawa si emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị na Steeti Ebọnyị na Enugu. Nke a gosiri na ụdaolu bụụrụ ụmụakwụkwọ nsogbu, nke o nwere ike ọ bụrụ olundị ha na-emetụta ha n'ịmụ maka ụdaolu Igbo Izugbe.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche izugbe nchọcha a bụ inyocha mmetụta ụdaolu olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị na Steeti Ebọnyị na Enugu. Nchọcha a lebakwaziri anya n'ihe a:

  • igosipụta etu ndịiche dị n'ụdaolu olu Igbo Waawa si emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe.

Oke Nchọcha

Ebe nchọcha a jedebere bụ n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị nke abụọ niile dị na Steeti Ebọnyị na Steeti Enugu ebe a na-asụ Waawa. Ihe mere onye nchọcha jiri họrọ ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nke abụọ maka ime nchọcha a bụ na ha anọọla ihe ruru afọ abụọ maọbụ karịa n'ụlọ akwụkwọ ndị ahụ ma nwee ike ịkpọpụta mkpụrụụdaasụsụ Igbo dị iche iche. Nke ọzọ, ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nke abụọ ndị ahụ bụ ndị lere ule sinịọ sekọndịrị n'afọ bụ 2017. Ihe kpatara onye nchọcha jiri họrọ Steeti Ebọnyi na steeti Enugu bụ na ọ chọpụtara na ụmụakwụkwọ nọ ebe ahụ na-ejikarị olundị ha asụ ma na-edekwa Igbo n'ihi na ọ bụ na steeti abụọ ahụ ka a na-asụ olu Waawa. Nke ọzọ, ọ bụkwaazi ebe dịịrị onye nchọcha mfe inweta ngwaọrụ o ji mee nchọcha a. O lebara anya na mmetụta ụdaolu okwu Igbo waawa n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo izugbe.

Ajụjụ Nchọcha

Iji duzie nchọcha a, onye nchọcha hibere ajụjụ nchọcha a:

  • Kedu etu ndịiche dị n'ụdaolu olu Igbo Waawa si emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe?

Atụtụ Mmụgharị

Atụtụ Ọmụmụ Mmekọrịta Mmadụ na Ibe ya

Atụtụ ọmụmụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ nke Bandura (1925) wepụtara iji gosi etu ndị mmadụ si amụta ihe n'aka ndị ọzọ site n'iṅomi na mmekọrịta n'etiti onwe ha. Bandura bụ otu onye n'ime ndị tụpụtara atụtụ a aha ya kacha pụta ihe. Ihe pụtara ihe nke ukwu n'atụtụ a bụ na omume/agwa na-esite na mmekọrịta dị n'etiti mmadụ na ibe ya n'ụdị nṅomi. Bandura kwenyere na site n'ilele omume maọbụ ka ndị ọzọ si eme, mmadụ na-esite etu ahụ amụta ihe ọhụrụ. Atụtụ a na-egosipụta etu mmekọrịta dị n'etiti mmadụ na ibe ya si eweta mmụta ihe ọhụrụ nke ga-enyere ya aka igbo mkpa dị iche iche nke gbagwojuru ya anya. Dịka Nnachi (2007) siri kwuo, ọmụmụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ ụdị ọmụmụ nke na-apụtakarị ihe n'ụdị nlele anya maọbụ nṅomi nke ụmụanụmanụ dị iche iche siri amụta ihe site na nlele na nṅomi anụ maọbụ mmadụ iji wee nwee ike tozuo ịbụ onye otu ahụ maọbụ ijụ nnabata otu ahụ. Iji maa atụ, ụdị akwa onye nkụzi, etu o siri akpa agwa na ụdị mmadụ ọ bụ ka ụmụakwụkwọ na-eṅomiri maka na ha nwere ike chọọ ịdị ka onye nkụzi ha.

Ụmụakwụkwọ dị etu a na-amalite ime ihe onye nkụzi mere iji wee dị ka onye nkụzi ahụ. N'aka nke ọzọ, ụfọdụ ụmụakwụkwọ nwere ike ghara ịmụ ịkpa ụdị agwa onye nkụzi maọbụ ike ekike ko o si eke. N'otu aka ahụ, n'ihe gbasara akpọmakpọ Igbo, bụ mkpọpụta ụda dị iche iche, mgbe onye nkụzi na-akụzi akpọmakpọ nke na-amụ maka mkpụrụụda/fọnim asụsụ dị iche iche, ihe ga-abụ mbunuche o ji akụzi ya bụ ka ụmụakwụkwọ nwee ike kpọkọnwuo ụda ọbụla etu onye nkụzi siri kpọkọ ya. Onye nkụzi ga-edetu ụda ọbụla na mgboodee, ebe ọ ga-abụ ọ na-akpọpụta ha ụmụakwụkwọ a na-eṅomiri ya site n'ikwu ihe o kwuru na nlele anya. N'ụzọ dị etu a, asụsụ onye nkụzi nwere ike imetụta asụsụ ụmụakwụkwọ. Ọ bụrụ na onye nkụzi ahụ ji olundị ya akpọpụta ụda ndị ahụ, ụmụakwụkwọ nwere ike sorokwa ya jiri olundị ya wee na-asụ asụsụ n'ihi na ọmụmụ ihe ebe a bụ n'ụdị nṅomi na nlele anya. Mana e nwere ike ụfọdụ ụmụakwụkwọ agaghị anabata nke a. Ụmụakwụkwọ dịka ndị na-enwe mmekọrịta n'etiti ibe ha, bụ ndị ha na ndị mmadụ dịka nne na nna, ụmụnne, otu ọgbọ na ndị ọzọ bi na gburugburu ha na-ebikọ ọnụ.

Site na mmekọrịta dị n'etiti ha na ndị ọzọ, ụmụakwụkwọ na-eṅomiri omume ndị ahụ ndị mmadụ na-eme nke nwere ike metụta ụmụakwụkwọ na mkpọpụta ụdaasụsụ ahụ. Site n'ihe niile a kọwara n'elu ebe a, ọ dị mkpa ikwu na ọmụmụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya dabara na nchọcha a n'ihi na ụmụakwụkwọ na-amụ asụsụ dị iche iche site n'iṅomiri na ilele etu onye nkụzi sị akpọpụta mkpụrụụdasụsụ dị iche iche. Iji kwado nke a Mgbodile na Iwuh (2000), kọwara na ụmụaka na-amụta ọtụtụ ihe site n'iṅomiri ndị okenye na ụmụaka ndị ọzọ. Ụmụaka na-elele ihe ndị ọzọ na-eme nke masịrị ha dịka ikwu okwu, ịga ije, ide ihe na iyi akwa. Otu ihe pụtara ihe ebe a dịka o siri metụta nchọcha a bụ na ụmụaka na-eṅọmi etu ndị okenye na ndị ọzọ siri ekwu okwu nke metụtara mkpọpụta ụda dị iche iche e nwere n'asụsụ na itinye akara ụdaolu etu o kwesiri.

Nchọcha A Hụrụ Anya

N'ihe gbasara ụdaolu, Nkamigbo (2013) mere nchọcha n'isiokwu a kpọrọ 'Tone and Syllable structure in Jàbà Language' na Bekee. Ebe ọ nọrọ mee nchọcha a bụ na steeti Kaduna dị na mgbagougwu Naịjirịa nakwa n'akụkụ ụfọdụ na steeti Kwara. Nkamigbo ji usoro 'Eụpost-facto wee mee nchọcha ya. Maka nnweta ngwa ọrụ nchọcha, Nkamigbo ji tepu rekọdo wee dọrọ asụsụ ndị ụfọdụ gụrụ akwụkwọ bụ ndị nwe asụsụ 'Jàbà' ma na-asụkwa asụsụ ọzọ dịka Bekee.

Nchọpụta nchọcha Nkamigbo gosiri na ụdaolu asụsụ Jàbà nwere ụdaelu (/) ụdaala (\) na ụdansụda (-) etu o si dị n'asụsụ Igbo. Ọzọ kwa, ọ chọpụtara na anaghị akanye akara ụdansụda n'asụsụ Jàbà. Nchọcha Nkamigbo dabara na nchọcha a niihi na ha abụọ metụtara nkanye akara ụdaolu n'okwu Igbo nakwa nke Jàbà. Ọzọ kwa, ebe Nkamigbo ji 'Eụpost-facto' wee mee nchọcha ya, onye nchọcha jikwazi eụpost-facto wee mee nke ya. Nkamigbo ji tepu rekọda dịka ngwa ọrụ o ji dọrọ ụsa ndị nzamajụjụ ya. N' otu aka ahụ onye nchọcha jikwazi tepu rekọda wee dọrọ mkpọpụta ụda ụmụakwụkwọ kpọpụtara. Ebe nchọcha Nkamigbo si dị iche na nke a na-eme ugbua bụ na o mere nchọcha ya n'asụsụ Jàbà mana onye nchọcha bụ na asụsụ Igbo ka ọ mere nke ya. Ọ bụ na Steeti Kaduna na Steeti Kwara ebe a na-asụ 'Jàbà' ka Nkamigbo nọrọ mee nchọcha ya; ebe a nọ mee nchọcha nke a bụ na Steeti Ebọnyị na Enugu.

Na nchọcha nke ya, Udemmadụ (2012) n'isiokwu a kpọrọ "The Issue of Ambiguity in the Igbo Language" n'asụsụ Bekee, gosiri na e nwere mgbagwojuanya n'asụsụ Igbo nke na-apụta ihe n'ihe ọ kpọrọ homograf; bụ okwu ndị nwere otu nsụpe mana nghọta/mpụtara ha dị iche. O gosiri na ọ bụ akara ụdaolu ka a na-eji ezipụta ndịiche dị n'okwu ọbụla nwere myiri na nsụpe maọbụ na mkpọpụta. O nyere ọmụmaatụ ndị a:

ákwá - 'cry'

àkwà - 'bed'

ákwà - 'cloth'

àkwá - 'egg'

N'ime nchọcha ndị ahụ emerela, o nweghị nke metụtara ụdaolu Igbo Waawa. Nke a mere onye nchọcha ji mee nchọcha a iji chọpụta mmetụta ndịiche dị n'ụdaolu Igbo Waawa n'ịkanye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe n'ogo sinịọ sekọndịrị na steeti Ebonyi na Enugu.

Usoro Nchọcha

Ụdị Nchọcha

Ụdị nchọcha e ji mee nchọcha a bụ nke Ekspostu Fakto (Eụpost facto design). Ekspostu fakto bụ ụdị nchọcha onye nchọcha ji achọpụta mmetụta otu ihe maọbụ ọnọdụ nwere n'ebe ihe ọzọ dị. Ya bụ, ụdị nchọcha na-eleba anya n'ihe kpatara ihe jiri mee mgbe otu ọnọdụ metụtara nke abụọ nke nwere ike ịpụta ihe n'ezi mmetụta maọbụ nke ọjọọ. Iji kwado nke a, Ali (2006) kọwara na Ekspostu fakto (Eụpost facto) bụ ụdị nchọcha a na-eji atụle mmetụta dị n'etiti agbammbọ nke otu/ogbe mmadụ abụọ. Ya bụ ịchọpụta ihe mere na ndị otu 'a' ka mee nke ọma karịa ndị otu 'b' n'otu nnwale maọbụ nke ọzọ. N'ịga n'ihu Nworgu (2006) kọwara Ekspostu-fakto dịka ụdị nchọcha nke e ji ezipụta ka otu ọnọdụ si emetụta ọnọdụ ọzọ, dịka ịbụ oke maọbụ nwaanyị/jenda, ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ, ọ bụ ime obodo ka ọ bụ obodo mepere emepe?

Ihe kpatara onye nchọcha ji họrọ ụdị nchọcha a bụ na o metụtara ileba anya etu otu ihe maọbụ ọnọdụ siri emetụta nke ọzọ. N'ihi nke a, isiokwu nchọcha a gbasara mmetụta ụdaolu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe. Ụdị nchọcha a dịkwaazị mkpa iji chọpụta ihe dị ụmụakwụkwọ n'ime dịka mkpọpụta ụdaasụsụ dị iche iche.

Ebe Nchọcha

Ebe e mere nchọcha a bụ na Steeti Ebonyi na Steeti Enugwu. Steeti abụọ ndị ahụ so na steeti ise mejupụtara ala Igbo ndị gụnyere Abịa, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo. Onye nchọcha họọrọ Steeti Ebonyi na Enugu dịka ebe nchọcha n'ihi na isiokwu nchọcha ya dabeere n'olu Igbo Waawa maka na ọ bụ ebe ndị ahụ ka a na-asụ Waawa. Ihe mere onye nchọcha jiri họrọ ebe a dịka ebe nchọcha bụ na onye nchọcha chọpụtara na ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị nọ na Steeti Ebonyi na nke Enugwu na-ewebatakarị olu Igbo Waawa mgbe ha na-asụ ma na-ede Igbo Izugbe nke mere ha ji ada n'ule dị iche iche n'Igbo n'ụlọakwụkwọ.

Ndị Njirimee Nchọcha

Ndị e ji mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dị 15, 684 (puku iri na ise, nari isii, iri asatọ na anọ) nọ n'ogo sinịọ sekọndịrị nke abụọ (SS II) ma na-agụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ebe ndị nwoke na ndị nwanyị na-agụkọ akwụkwọ ọnụ na steeti Ebọnyị na nke Enugu. Ọnụọgụ ụmụakwụkwọ ndị ahụ bụ ndị nọ n'agbata agụmakwụkwọ afọ 2016/2017. N'ime ọnụọgụ ahụ ụmụakwụkwọ nọ na steeti Ebonyi dị 3,084 (puku atọ na iri asatọ na anọ) ebe ndị nke Enugu dị 12,603 (puku iri na abụọ, nari isii na atọ).

Ọnụọgụ ụmụakwụkwọ siniọ sekọndịrị nke abụọ ndị ahụ bụ nke e nwetara na 'Research Planning and Statistics, Secondary School Unit, Federal Ministry of Education Abuja, 2016'. N'aka nke ọzọ ọ bụ n'ụlọọrụ na-ahụ maka mmụta n'ogo sekọndịrị dị n'Enugu n'alaka na-ahụ maka mgbakọ na mwepu (Audit and Statistical Unit) ka onye nchọcha si nweta ọnụọgụ ụmụakwụkwọ nakwazi ụlọakwụkwọ e ji mee nchọcha a. Onye nchọcha nwetara ọnụọgụ nchọcha a ebe ndị ahụ a kpọrọ aha n'ihi na ọ bụ ha ka nchịkwaba ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile Gọvụmentị steeti Enugu dị n'aka (Post Primary Schools Management Board).

Ihe kpatara onye nchọcha ji họrọ ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị nke abụọ bụ na ha anọọla ihe ruru afọ atọ ma na-amụ ụtọasụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ. Nke ọzọ, bụ na ha lere ule SSCE n'afọ 2017.

Nsere na Usoro Nsere

Onye nchọcha seere ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha di 1, 555 (otu puku, nari ise, iri ise na ise) nke nọchitere pesentị 10% (iri) mgbakọta ọnụọgụ nchọcha dị 15, 684 (puku iri na ise, nari isii, iri asatọ na anọ). Onye nchọcha ji usoro nsere nke nhọ na nha tụmbọm tụmbọm (proportionate stratified random sampling techniọue) wee sere ọnụọgụ ahụ. Ali (2006) na Nworgu (2006) kọwara na "proportionate stratified random sampling techniọue" bụ ụdị usoro nsere a na-eji esere ọnụọgụ nchọcha mgbe ndị a ga-eji mee nchọcha metụtara ihe ndị a: jenda, ébe nchọcha, ndị toro ogologo, ndị dị mkpụmkpụ, ndị maara akwụkwọ na ndị amaghị akwụkwọ.

Ngwa Nchọcha

Ngwa nchọcha onye nchọcha ji mee nchọcha bụ Nnwale Mmetụta Ụdaolu Igbo Waawa n'ikanye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe (NMỤIWIAUII) nke nwere ndịna iri na ise.

Nnyocha Ngwa Nchọcha

Iji hụ na ngwa nchọcha ndị ahụ e ji mee nchọcha a tozuru oke maka inweta ihe ọrụ e ji mee nchọcha a, onye nchọcha weere ha nyefee n'aka ndị ọkammụta mmadụ atọ nọ na fakọlti keedukeshọn, Mahadum Naịjirịa dị na Nsụka ka ha nyochaa ha iji hụ na ha zuru oke maka ime nchọcha a. Aro na mgbazi ha nyere aka mee ka ngwa nchọcha ndị ahụ bụrụ nke a hazigharịrị ka ha nwee ike rụọ ọrụ ha kwesiri ịrụ. Ọ bụ site na mgbazi na ntụzi aka ha nyere ka onye nchọcha ji hazie ngwa nchọcha ndị ahụ etu ha dị n'ọrụ a.

Usoro Nnweta Ihe Nchọcha

Onye nchọcha gara n'ụlọ akwụkwọ 20 (iri abụọ) ndị ahụ e jiri mee nchọcha kee ụmụakwụkwọ ngwa nchọcha site n'enyemaka ndị nkụzi iri abụọ na-akụzi Igbo bụkwanụ ndị onye nchọcha nyere nkọwa abalị anọ maka nke a. Ihe kpatara nkọwa a onye nchọcha ji were abalị anọ bụ na o ji abalị abụọ wee gazuo ụlọ akwụkwọ isii dị na Nsụka so n'ihe e ji mee nchọcha ma werekwa abalị abụọ ọzọ wee gaa ụlọakwụkwọ isii ndị nọ n'ebe mepere emepe na ebe emepeghị emepe n'Enugu.

Onye nchọcha ji abalị nke ise wee gaa Ebọnyị wee kọwakwaara ndị nkụzi enyemaka nchọcha gbasara iji ngwa ndị ahụ wee nweta ọsịsa ụmụakwụkwọ.

Onye nchọcha ji NMỤIWIAUII wee kee ụmụakwụkwọ ndị ahụ iji nweta ọsịsa ha n'ihe gbasara mmetụta ụdaolu, Igbo waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe. Onye nchọcha gbara mbọ site n'enyemaka ndị nchọcha wee nakọta ngwa ndị ahụ maka nhazi data, mgbe izuụka atọ ndị Bekee gachaara.

Usoro Nhazi Ihe Nchọcha

Onye nchọcha ji ngwa mgbakọ na mwepụ pesentị, wee hazie ma tụchaa ihe ọrụ/data e nwetara na nchọcha a. Ọ bụ ngwa mgbakọ na mwepụ pesentị ka e ji wee tụcha ihe e nwetara site na nnwale na nke nkanye ụdaolu.

Ndịna ọbụla nwere bido na pesentị iri ise (50%) gbagowe ka a nabatara na nchọcha a, ebe ndị nwere opekaa mpe pesentị iri ise (50%) bụ nke anabataghị na nchọcha a.

Ajụjụ Nchọcha Nke Atọ:

Kedu etu ndịiche dị n'ụdaolu olu Igbo Waawa si emetụta ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe?

Ọsịsa e nwetara n'ajụjụ nchọcha nke atọ gbasatra etu ụdaolu olu Igbo Waawa si emetụta ụmụakwụkwọ na nkanye akara ụdaolu pụtara ihe na tebul a.

Ọgụ

Ndịna/Ndepụta Mkpụrụokwu

Ogo Mbịam ugboro ugboro (Frikwensi)

Pesentị

Mkpebi

    okpu

    376

    24.2

    ONM

      ntị

      256

      16.5

      ONM

        anya

        272

        17.5

        ONM

          anwụ

          192

          12.3

          ONM

            ego

            202

            13.0

            ONM

              ahụ

              181

              11.6

              ONM

                akị

                188

                12.1

                ONM

                  nkenke

                  148

                  9.5

                  ONM

                    Osisi

                    158

                    10.2

                    ONM

                      ala

                      232

                      14.9

                      ONM

                        akwụkwọ

                        187

                        12.0

                        ONM

                          oche

                          232

                          14.9

                          ONM

                            ọnụ

                            141

                            9.1

                            ONM

                              ụdara

                              154

                              9.9

                              ONM

                                nkụ

                                197

                                12.7

                                ONM

                                Tebul Nke Mbụ: Akara pensentị na-egosi etu ndịiche dị n'ụdaolu olu Igbo Waawa si emetụta Ụmụakwụkwọ n'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe.

                                Tebul nke a na-egosi pesentị agbammbọ ụmụakwụkwọ n'ịkanye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe. O gosikwara na o nweghi pesentị ọbụla n'ime pesentị ndị ahụ ruru 50% (iri ise) bụ pesentị ọnọdụ mkpebi ndị a nabatara na nchọcha a. Malite na mkpụrụokwu nke iri atọ na otu wee ruo na nke iri anọ na ise, nwere pesentị ndị a n'otu n'otu n'usoro ha: 24.2% (pesentị iri abụọ na anọ kpọm abụọ); 16.5% (pesentị iri na isii kpọm ise); 17.5% (pesentị iri na asaa kpọm ise); 12.3% (pesentị iri na abụọ kpọm atọ); 13.0% (pesentị iri na atọ kpọm efu); 11.6% (pesentị iri na otu kpọm isii); 12.1% (pesentị iri na abụọ kpọm efu); 9.5% (pesentị itoolu kpọm ise); 10.2% (pesentị iri kpọm abụọ); 14.9% (pesentị iri na anọ kpọm itoolu); 12.0% (pesentị iri na abụọ kpọm efu); 14.9% (pesentị iri na anọ kpọm itoolu); 9.19 (pesentị itoolu kpọm otu); 9.9% (pesentị itoolu kpọm itoolu) na 12.7% (pesentị iri na abụọ kpọm asaa). Nke a gosiri na ụmụakwụkwọ emeghi nke ọma n'ịkanye akara ụdaolu na mkpụrụokwu iri na ise e nyere ha. Ọ pụtara na ụdaolu olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ n'ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe.

                                Mkparịta ụka maka Ihe A Chọpụtara

                                Etu Ndịiche dị N'ụdaolu Igbo Waawa si Emetụta Ụmụakwụkwọ N'itinye akara ụdaolu n'okwu Igbo Izugbe.

                                N'ebe a, nchọpụta nchọcha a gosiri na ndịiche dị n'olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ n'ịkanye akara ụdaolu n'ahịrịokwu Igbo Izugbe maọbụkwanụ n'ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo. Nke a bụ n'ihi na tebul nke a gosiri na e nweghị pesentị ndịna ọbụla ruru 50% (pesentị iri ise). Pesentị ndịna malite na nke iri atọ na otu wee ruo na nke iri anọ na ise bụ: 24.2%; 16.5%; 17.5%; 12.3%; 13.0%; 11.6%; 12.1%; 9.5%; 10.2%; 14.9%; 12.0%; 14.9%; 9.1%; 9.9% na 12.7%. Nke a gosipụtara na o nwere ezigbo mmetụta n'ebe ụmụakwụkwọ nọ n'ihi na ọtụtụ ụmụakwụkwọ ji olundị ha wee kanye akara ụdaolu n'okwu ndị ahụ. Ịma atụ, ndị Nsụka na-eji ụdaala (\) ezipụta ahịrị nkwere ma jiri ụdaelu (/) ezipụta ahịrị ajụjụ. Ọ bụrụ na onye Nsụka ekwuo sị: Ànọ m ebe a? N'agbanyeghi na ahịrịokwu ahụ bụ ajụjụ nke e ji akara ụdaala egosipụta n'Igbo Izugbe; n'olundị Nsụka, ahịrịokwu ahụ zipụtara nkwere iji gosi na onye ahụ nọ ebe a mana n' Igbo Izugbe; ahịrịokwu ahụ na-ezipụta ajụjụ. Nke a pụtara na ọ na-emetụta ha n'ịkanye akara ụdaolu. Ọzọ kwa ọtụtụ ụmụakwụkwọ amaghị ihe gbasara akara ụdaolu Igbo n'ihi na ụfọdụ n'ime ha ji akara ngosi bụ '→', na akara nzatara ajụjụ bụ '√' na akara ndị ọzọ wee mere akara ụdaolu n'okwu ndị ahụ e nyere ha. Onyeisi ule WAEC (2000; 2014) kọwara na ụfọdụ ụmụakwụkwọ amaghị ebe a na-akanye akara ụdaolu n'ihi na ebe ụfọdụ kanyere ya n'okpuru mkpụrụ ederede; ndị ọzọ tinyere ụdaolu ha n'elu mgbochiume karịa n'elu ụdaume. N'ihi uru ụdaolu bara n'ụtọasụsụ Igbo ka Mbah na Mbah (2014) ji kọwaa na amụmamụ asụsụ Igbo agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na amụghị gbasara ụdaolu n'ihi na ụdaolu metụtara mpaghara ndị a n'ọmụmụ asụsụ Igbo - akpọmakpọ, mmebe okwu, usorookwu na echiche. Ọ bụ nke a mere o ji dị mkpa na ụmụakwụkwọ ga-amụ etu esi akanye akara ụdaolu Igbo n'ihi na asụsụ Igbo bụ nke ụdaolu.

                                Mmechi

                                Na mmechi, ọ dị mkpa ịrụtụ aka n'isi ihe a chọpụtara na nchọcha a nke gosiri na ụdaolu olu Igbo Waawa na-emetụta ụmụakwụkwọ ndị Waawa n'ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo Izugbe.

                                Ntụnye Aro

                                Site na nchọpụta nchọcha e nwetara na nchọcha a ka onye nchọcha ji atụnye aro na Gọvụmentị kwesiri ịchịkọbara ndị nkụzi ọzụzụ mmụgharị ebe a ga-akpọta ndị nkụzi ọbịa nleta na-akụzi asụsụ Igbo sitere mahadum na kọleji k'edukeshọn ịkụziri ha ịkanye akara ụdaolu Igbo. Ndị nkụzi n'aka nke ọzọ ga-agba mbọ kụziere ụmụakwụkwọ maka ịkanye akara ụdaolu Igbo Izugbe.

                                Edensịbia

                                Ali, A. (2006). Conducting Research in Education and the Social Sciences. Enugu: Tashiwa Networks .

                                Ayodele, S.O.; Oyeleye, A.L.; Yakubu, S.O.; & Ajayi, D.A. (1990). General English: A Course for Tertiary Levels. Ibandan: Paperback Publishers.

                                Bandura, A. (1925). Social Learning Theory. Englewood Cliff N.J: Prentice Hall.

                                Emenajọ, E.N.; Okolie, O.O.; Ekwe, B.U.; & Madụakọ, O.N. (1985). Igbo Maka Sinịọ, Sekọndịrị 4.Ibadan: Univeristy Press.

                                Farinde, R.O. (2005). Nigerian Languages in Education and National Development: Journal of Teacher Education. 8(1) 19-25.

                                Federal Ministry of Education (2009). Senior Secondary School Curriculum Igbo for Secondary Schools. Abuja: NERDC.

                                Federal Republic of Nigeria (2004). National Policy on Education. Lagos: NERDC Press.

                                Ikekeọnwụ, C. I.; Ezikeọjiakụ, P.A.; Ubanị A.I.; & Ugoji (1999) Fọnọlọji na Grama Igbo. Ibandan: African Press .

                                Ikekeonwu, C.I. (1986). A Leụico-Phonotactic Study of Northern Igbo Dialects. Unpublished PhD Thesis, Department of Linguistics and Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka.

                                Mbah, B.M. & Mbah, E.E. (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Nsukka: University of Nigeria Press.

                                Mgbodile, T.O.; & Iwu, L.I. (2000). Understanding Children. A better way to Child's useful upbringing. Enugu: Magnet Business Enterprises.

                                Nkamigbo, L.C. (2013). Tone and Syllable Structure in jàbá. Society for Research and Academic Eụcellence (SRAE). Retrieved on February, 26, 2015 from http:www.academiceụcellencesocietyandsyllablestructureinjàbá.html.

                                Nnachi, R.O. (2007). Advanced Psychology of Learning and Scientific Enọuiries. Owerri: Totan Publishers.

                                Nwachukwu, P.A. (1995). Tone in Igbo Syntaụ. Nsukka: Igbo Language Association.

                                Nwaozuzu, G.I. (2008). Dialects of Igbo Language. Nsukka: University of Nigeria Press Ltd.

                                Nworgu, B.G. (2006). Educational Research: Basic Issues and Methodology. Nsukka: University Trust Publishers.

                                Oraka, L.N. (1983). The Foundations of Igbo Studies. Onitsha: University Publishers.

                                The African West Eụaminations Council (2000, 2002, 2003, 2004, 2007, 2008, 2009, 2010, 2011, 2012). Chief Eụaminers' Reports Nigeria. Lagos: WAEC.

                                Udemmadụ, T.O. (2012). The Issue of Ambiguity in Igbo Language. An International journal of literature and Gender Studies. Bahir Dar, Ethiopia. Retrieved on February 26, 2015 from http:www.afrrevojo.net/afrrevlaligens/vol.1(1)art9UdemmaduT.O.pdf.

                                Mmesonye na Ikikere Asụsụ ndị Dibịa Ahụike n'Igbo

                                nke

                                Crescentia N. Ugwuona

                                Ngalaba Lingwistiiks, Igbo na Asụsụ Naijiria ndị Ọzọ

                                Mahadum Naịjịrịa, Nsụka crescentia.ugwuona@unn.edu.ng +234(0)7036832566

                                Ụmịedemede

                                Nchọcha a gbadoro ụkwụ n'itule mmesonye na ikikere asụsu ndị dibịa ahụike- dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ Igbo (DMI) n'ebe asụsu Igbo na ọgwụ ha dị. Ọ ga-enyochakwa etu ha si emesonye asụsu Igbo; nakwa itule mmesonye ndị n'azụrụ ọgwụ DMI n'ebe asụsụ Igbo dị. Ọ bụ ihe doro anya na ahụike na asụsụ na-agakọ ọnụ ma sorokwa n'ihe kachasị mkpa na ndụ mmadị n'ụwa niile. Mana o nwebeghi ezi nchọcha gbadoro ụkwụ na mmesonye na ikikere asụsụ ndị DMI n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị. A ga-eji ajụjụ ọnụ, nke ederede, nakwa nọrọ lere wee nakọta ngwa chọcha. A ga-eji atụtụ sosiolingwistiks gbadoro ụkwụ na nkọwasị wee tụcha ma nyochaa ngwa chọcha. Nchọpụta gosiri na mmesonye na ikikere asụsụ ndị DMI n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị ejughi afọ ncha ncha; ọtụatụ ndị Igbo nakwa ndị ọchịchị anaghị akwado asụsụ Igbo etu o kwesiri. Nleda na nleghara anya ndị DMI n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị sitere ka ha siri hụ ma werekwa asụsụ ha. A tụnyere aro ka ndị dibịa ahụike niile n'Igbo na-ahụ asụsụ Igbo n'anya, jiri ya na-akọwa, ere, ma na-ekesakwa ọgwụ ha na mpaghara ụlọ ọgwụ dị iche iche nakwa n'Igbo niile. A tunyekwara alọ ka DMI niile na-ahụ asụsụ Igbo n'anya ma jiri ya na-akọwa ọgwụ ha, nakwa ka a ga na-esi aṅụ ọgwụ ha chọpụtara; ọ ga-adịkwa mma ma asụsụ Igbo bụrụ otu n'ihe e ji aba mahadum, ọ kacha ndị ga-agụ maka ahụike; ndị otu asụsụ Igbo dị iche iche inye aka n'ịkwalite asụsụ Igbo. Nchọcha a ga-aba uru n'ebe ihe ọmụmụ gbasara sosiolingwuistiks (mmesonye asụsụ) nakwa nkwado ihe ọmụmụ gbasara asụsụ Igbo na ikikere asụsụ dị.

                                Mkpọlite

                                Nelson Mandela nwere mgbe o kwuru sị: "Ijiri asụsụ mmadụ na-aghọta gwa ya okwu, ọ banye ya n'isi, mana i jiri asụsụ mmadụ gwa ya okwu,ọbanye ha n'uche''. Ọtụtụ ndị nchọcha (Umo, na Ezema, (2007).Nwadike, 2002; Ugwuona na Ikeokwu, 2015 dgz) emela ezi nnyocha maka iji asụsụ Igbo arụ ọrụ n'ebe dị iche iche dịka n'ezinụlọ, ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi, azụmahịa, okporo ụzọ, ụlọ ọba egọ dgz. Mana o nwebeghi ezi nchọcha gbadoro ụkwụ n'ikikere asụsụ ndị dibịa ahụike n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị. E nweghi ezi mmesonye n'ebe ikikere asụsụ epum dị etu o si gbasata nkọwa ụfọdụ metụtara ahụike, ebuterela ọtụtụ mmadụ ọnwụ erughi eru, ọnwụ mberede, nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ gasị n'obodo dị iche iche ọ kacha n'ala Igbo. Ọtụtụ ndị nchọcha maara nke ekwe n'akụ n'ọmụmụ asụsụ Igbo dịka Nwadike (2002), Nwaozuzu (2017), Ohiri Aniche, (2015) Emenanjọ (1996), na Ejiofor (2014) edeela ọtụtụ akwụkwọ na-akọwa na asụsụ Igbo na-anwụ anwụ. Mana e nyomie ihe dị n'akpa oke gbasara asụsụ Igbo ime, a ga-ahụta na ọ naghị anwụ anwụ kama na ọ bụ nleghara anya ndị nwe ya bụ asụsụ na-eleghara ya (nke ndị dibịa ahụike so na ya) tinyekwara nleli nke ndị ọchịchị nye ya bụ asụsụ. Na Naịjirịa taa, a na-ahụta na a na-ejikarị ihe anyị nwetara n'aka ndị chịburu anyị (ndị ọcha Uroop) arụkarị ọrụ n'ọtụtụ ebe na ndụ ndị obodo anyị. Nke a ebutago ntufu ọtụtụ ihe ọkpụ ọdịnaala na ọmenaala anyị nke hiwere isi n'asụsụ epum, nke asụsụ Igbo so n'ime ya. Nwadike (2002) kọwara ihe o weere dịka uche a chịrị achịa:

                                Ngwa agha kacha ndị ọcha chịburu Naịjirịa wetara ha bụ nke na-egbu omenala na ọdịnaala ha, na-ekpochapụkwa nkwenye n'aha ihe ha, asụsụ na gburugburu ha, na ihe ọkpụ ha gasị. Nke a na-eme ka ha na-ahụta ụbọchị ha gara aga dịka ala a tufuru atufu na-enweghi ihe ha nwetara na ya. Nke a mere ha ji achọ ka ha mata asụsụ ndị ọzọ karịa nke ha. Nhọrọ asụsụ na etu e si eji asụsụ arụ ọrụ bụ ihe na-egosi ka ndị mmadụ si were onwe ha n'ebe ụwa niile nọ.

                                Nwadike na-egosi ka nsogbu siri bata Afrika site n'ọchịchị sitere n'aka ndị Yurop. Nke a mere o ji kwuo na e kwukarịala okwu gbasara asụsụ Bekee; na ọ bụ ezie na asụsụ Bekee agbasaala ebe niile, mana ọ bụ maka sọsọ ndị gụrụ akwụkwọ. Ịnabata asụsụ Bekee n'ọnọdụ asụsụ epum emela ka a gbado anya n'asụsụ Bekee ma wepu anya n'asụsụ epum gasị. Ya mere na ọtụtụ mgbe, ndị nchọcha anaghị etinye uchu n'itule asụsụ ọnụọgụ ndị na-asụ ya perempe/asụsụ epum (asụsụ maịnọritii) n'ime obodo nakwa n'obodo mepere emepe na Naịjirịa. N'aka nke ọzọ, a na-egosikwa na ndị dibịa ahụike ọgwụ Bekee enweghi ezi mmesonye n'ebe ikikere asụsụ ha na ọgwụ ha dị. Ọ bụ ihe doro anya na ọgwụ ahụike Igbo (ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ) nakwa nke Bekee na-agwọ ọrịa dị iche iche n'ụwa niile ọ kacha n'ala Igbo. E nweghi ezi mmesonye n'ebe asụsụ ọ bụla nọ na-abụ ọdachị nye asụsụ ahụ na ndị nwe ya ọ kacha n'ebe ihe gbasara ahụ ike dị. Ya mere ebe mgbado ụkwụ nchọcha a ji bụrụ ikikere asụsụ ndị dibịa ahụike n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị. Nchọcha a chọkwara igosipụta mmesonye ndị Igbo n'ebe asụsụ ha dị ọ kacha etu o si gbasata ogwu ahụike Igbo. A ga-agbaso ihe ọmụmụ a site na ngalaba anọ: (i) itule mmesonye na ikikere asụsu ndị dịbịa ahụike (ọgwụ Igbo) n'ebe asụsụ Igbo dị n'ihe gbasara ozi, ire, nakwa ikesa ọgwụ ha n'Igbo; (ii) ihe na-ebuta enweghị ezi mmesonye n'ebe asụsu Igbo dị (iv) ụzọ bụ ịgba ikwalite ezi mmesonye nakwa ntowanye ikikere asụsụ ndị dibịa ahụike n'Igbo.

                                Ọnọdụ asụsụ na Naịjirịa oge ndị British na-achị

                                Mgbe ndị British weghara ikikere ọchịchị na Naịjirịa, asụsụ English wee bụrụzie ngwa ihe e ji ahazi ọnọdụ ọchịchị na mpaghara ọhụrụ ahụ. O wee bụrụzie asụsụ English ka e ji ahazi ọnọdụ ọchịchị n'ebe dị iche iche (Bamgbose, 1991; Lawal, 2004) na Naịjirịa. Ọ bụ asụsụ e ji arụ ọru n'ọnọdụ izugbe na ndụ ndị e wegharagoro (Ogunmodimu, 2015).

                                Naịjirịa bụ obodo dị n'ọdịda anyanwụ mba Afrịka. Ọ bụ Steeti iri atọ na isii mejupụtara ya. E nwere asụsụ dị iche iche na Naịjirịa mana ọ bụ naanị atọ (Awụsa, Igbo na Yoruba) ka ndị ọchịchị etiti Naịjirịa nabatara dịka nke pụtakarịrị ihe iji na-akụzi ihe. N'obodo Naịjirịa, e nwere ọtụtụ asụsu na ọtụtụ agbụrụ nakwa ọtụtu asụsụ nsipu agbụrụ na ya. Ọnụọgụ asụsụ dị na Naịjirịa dịka ụfọdụ si kọwaa dị n'agbata narị atọ, iri iteghete na ise ruo na narịị ise na iri na atọ (395-513). Ịma atụ, Hansford (1976) kwuru narị atọ, iri iteghete na ise (395); Ugwuona (2014) ekwuo na ọ karịrị narị anọ (400); Bamgbose (1992) kwesiri ike na ọ dị narị ise na iri na atọ (513) n'ọgụ. N'agbanyeghị ọnụọgụ a, asụsụ Bekee ka-abụrịrị asụsụ njiarụ ọrụ n'ebe dị elu nakwa n'ọtụtụ ebe ọzọ gasị n'ala Naịjirịa (Ugwuona, 2014). N'ihi nke a, ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa nwere mmasị ma na-ejikarị asụsụ Bekee arụ ọrụ. A bịa n'agụmakwụkwọ, asụsụ Bekee abụrụla isi a hụru kwaba okpu bidoru n'oge ọchịchị ndị mba ọzọ (colonịal pirọd) rue n'oge ugbu a, ebe ọ bụ ya ka e ji akuzi ihe bido n'ọtakara ganye na mahadum. Nke a gosiri na ndị ọcha kwọtara asụsu Bekee n'azụ bịa na Naịjiri na senchụrị nke iri na iteghete. Asụsụ Bekee ka e ji akuzi ihe n'ogo niile n'ụloakwụkwọ ebe a na-akpachapụ asụsu ndi Naịjirịa n'akụkụ. Nke a mere na ọtụtụ mgbe, a na-eleda ihe ọ bụla onye na-asụ asụsụ epum ya meputara anya, ọ bụladị ọgwụ ahụike. Asụsụ Bekee nwere ogo dị elu na Naijirịa site na ngwa ndị gọọvment nakwa nkwado ndị Naịjirịa n'onwe ha na-akwado ya site n'ịhụta ya dịka akara, nakwa nkwado ndị Naịjirị na-esi obodo oyibo alọta na-akwodo asụsu Bekee iji wee gosi na ha so n'ihe a na-eme. N'ụzọ dị otu a, ọtụtụ mmadụ abụrụzie ohu nye asụsụ Bekee. Nke a mere na ọtụtu ndị mmadụ ọ kacha n'ọdịda-ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-asụzịrị ụmụaka ha asụsu Bekee n'ezinụlọ ha dịka asụsụ ire nne ha. Ogbona (2006) kwuru na ụdị ọnọdụ a ebutego anọkwataghị a na-ahụzị n'ebe ọtụtu mmadụ nakwa ndị nrịanrịa nọ.

                                Asụsụ Igbo na Naịjirịa

                                Site na ndeputa Greenberg, ndị Igbo bụ ndị Benue Kongo nke ọhụụ (Ugwuọna, 2013). Ugwuona gakwara n' ihu kwuo na ndị Igbo so n' agbụrụ "Kwa", nke bụ nkewapụta asụsụ Naịja Kongo. Echiegu (1984) siri na ndị Igbo dịka agbụrụ nọọrọ onwe ya nwekwara omenaala na usoro obibi ndụ ha. Igbo bụ otu n'ime agbụrụ pụtara ihe na Naịjirịa nke dị na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ndị na-asụ ya n'ala Igbo (Ugwuona, 2014) dị ka ọtụtụ ndị chọcha si kọwa dị ihe dịka bido na nde mmadụụ iri abụọ na ise rue na nde mmadụ iri anọ na otu, ma ndị n'asụ ya n'akụkụ ụwa niile ga-eru ihe dịka narị nde mmadụ na iri ise. Nke ahụ na-egosi na nde otu nde na narị iri ise mmadụ na-asụ asụsụ Igbo n'ụwa niile. Igbo bụkwa otu n'ime asụsụ atọ gbara ọkpụrụkpụ na Naịjirịa. Asụsụ Igbo kacha nwee olundị. Ọtụtụ mgbe, ha nwere otu echiche na-aghọtakwa onwe ha. Ọtụtụ nsogbu na-echere asụsụ Igbo bụ nke mmesonye na nsirihụ ndị nwe ya bụ asụsụ. Nke a so n'otu ihe na-echere ha aka mgba n'ebe ọtụtụ ihe dị. Nleda anya na ejighị asụsụ ha kpọrọ ihe n'ebe ụfọdu ihe ndị Igbo dị na-agba anya mmiri. N'ọnọdụ dị etu a ka Ụmọ na Okeke (2009) jiri kwuo na ndị Igbo bụ ndị asụsụ ha na-eme ihere. Ha gbahapụrụ asụsụ Igbo ma makụọ asụsụ na omenala ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụrụ ndị Igbo nnukwu ihe ahụhụ ịkpa nkata naanị n'asụsụ Igbo n'ewebataghị asụsụ Bekee n'ime ya. Madụka (2007) kwuru na ihe ndị Igbo jiri jụ asụsụ ara nne ha bụ mgbakwụnye ha n'usoro obibi ndị ọcha (British). N'igbakwunye na nke a, anyị kwesiri ịmata na onye kpọọ efere nri ya mkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpofuo ahịhịa, tinyere na onye kpatara nkụ ahụhụ rịọrọ ngwere ọrịrị. Otu ihe nwere ike ibute nke a bụ oke nkwanye ugwu na nsọpụrụ a na-akwanyere asụsụ Bekee na Naịjirịa. Ọtụtụ ndị Igbo kwenyere na ihe e ji ama onye mara emeputa ihe ọ bụla (tinyere ọgwụ ahụ ike) nakwa onye gụrụ akwụkwọ bụ ka onye ahụ si asụ asụsụ Bekee. Ọ bụ ihe ndị a niile mere nchọcha a ji gbado ụkwụMmesonye na ikikere asụsụ ndị dibịa ahụike n'Igbo.

                                Ntụlegharị Agụmagụ

                                Asụsụ

                                Asụsụ bụ ihe dị oke mkpa na ndụ mmadụ n'agbanyeghị ebe onye hụtara onwe ya. E nwere ike isi n' asụsụ chọpụta ebe mmadụ siri puru ma ọ bụ pụta. Lyons (1981), kọwara asụsụ dịka ndụ mmadụ, n'ihi na ọ bụ asụsụ bụ ụdọ ji ndụ obodo ọbụla. Ọ na-ekwu na asụsụ bụ usoro nhazi mmekọrịta ọhanaeze nke ihe mejupụtara ya bụ ụda, mkpụrụokwu na asụmasụ site n'otu obodo ruo n'ọzọ. Ugwuọna (2015), n' akwụkwọ nkuzi "Ntọala na isiokwu ụfọdụ na fọnọlọjị Igbo" kọwara asụsụ dịka ụzọ mmadụ na ibe ya si emekọrita ma na-ezirịta ibe ha ozi iji zipụta ihe ha bu n'obi. Ọ gara n' ihu kọwawamie na asụsụ bụ otu nhụbaama e jiri mara onye na obodo onye si na ya pụta. O kwukwara na ihe dị iche n' ebe onye Igbo, Yoruba, maọbụ Awụsa nọ bụ asụsụ. N' ịgbado ụkwụ na nkọwa Ugwuọna (2015), a hụtara na obodo maọbụ agbụrụ ọbụla anaghị asụ asụsụ ọnatarachi ya, enweghị ntọala ma ndị obodo dị etu a bụ ndị mbịaraabịa nye obodo ha. Crystal (1995) kwenyere na asụsụ bụ ụdaolu mmadụ a hazịrị ahazị nke o ji akọwapụta ebumnoobi ya, nke nwere ike ịdị n' ụdị ekwurunọọnụ maọbụ ederede. Anagbọgụ, Mbah na Eme (2010), kọwara na asụsụ bụ ụkpụrụ mmadụ kpụpụtara maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke e ji egosipụta atụmatụ aro mmadụ, mmetụta mmadụ nwere na ọchịchọ obi mmadụ nke e ji njiakpọ okwu kwuputa n' ọnụ maọbụ tinye ụbụrụ n'ọrụ detuo ya n' akwụkwọ.

                                Nkọwa a dị n'elu gosiri na asụsụ bụ okwu e kwuru n'ọnụ maọbụ dee n' akwụkwọ nke ndị mmadụ nọ n' otu òtù kwekọrịtara ka ọ bụrụ oluasụsụ jikọtara ha ọnụ, ha ga-eji na-agbasakọrịta ozi ma na-ezipụta omenaala ha. Site na nkọwa a, akwụkwọ nkọwami Brịtenịa a nyere, anyị ga-achọpụta na asụsụ nwere ike ịdị n' ụdị ederede maọbụ n' ụdị ekwurunọọnụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ na-eme nke asụsụ abụghị isi sekpụ ya. E wepụ asụsụ n'etiti mmadụ, mmadụ ga-anọ dịka anụmanụ a gbahapụrụ n'etiti agụ՛ nke enweghị onye ma ọ bụ ihe ya na ya na-enwe mmekọrịta. Asụsụ metụtara ihe niile gbasara mmadụ tinyere mmeputa, nkọwa, nakwa nkesa ọgwụ nke gunyere ọgwụ ọdịnaala (nke si na mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ, nakwa isi anụmanụ). Ọ dịkwa mkpa ịkọwa na ndị dịbịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ na-agwa ọgwụ ha okwu gbasara ọya ha chọrọ ka ọgwụ ha meputara gwọba n'ahụ mmadụ. Asụsụ bụ ụzọ mmadụ si akọwapụta mbumnuche, etu o si dịri ya, nchọ, dg site n'okwu, edide ma ọ bụ akara (Agbedo, 2007). Asụsụ abụghị naanị na o so n'omenaala kama na ọ bụ ihe kara aka dị n'omenaala. Ndị ọ bụla na-achọ ka ha banye ma mata omenanị ọ bụla, ga-ebụ ụzọ maratagodụ asụsụ ya makana asụsụ n'onwe ya no na ngalaba omenaala. Nke a na-egosi na ọgwụgwọ ọrịa na ahụ ike agaghị adịcha nke ọma ma ọ bụru n'obodo ma asụsụ e ji eme ya adịghị otu kwesịrị. Dịka asụsụ si bụrụ isi sekpu ntị na ndu mmadụ nakwa n'omenala, ma bụrụkwa njirimara mmadụ, ihe gbasara asụsu dị oke mkpa n'ebe obodo nwe asusụ dị. Nleda asụsụ anya na-ebute itufu omenala na njirimara ọdinala ahụ. Oge ụfọdụ, ihe na-ebute nke a bụ n'ọnọdụ mkpagbu, mkpachapụ, na nkewa. Asụsụ niile ma ndị a na-ahụta dịka nke kacha (dọmịnaant), ma ndi a na-eleghara anya (maịnọritii) na-aba oke uru. Ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ mgbe, a na-eleghara asụsụ epum ndị bi n'ime obodo anya ọ kacha nke ndị dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ. Ọ dịka ndị ọchịchị nakwa ndị na-ahazi asụsụ n'obodo na-eleghara asụsụ epum nakwa gburugburu ndị ọgwụ Igbo anya ọ kacha n'ala Igbo dị na Naịjirịa. na mkpokota, e nwere ike ịsị na asụsụ bụ ihe zuru ụwa niile ọnụ ma bụrụkwa otu n'ime njirimara mmadụ. Nke a bụ ihe doro anya maka na ọ bụ naanị mmadụ nwere ike iji asụsụ wee mee ọtụtụ ihe dị iche iche. Mmadụ nwere ike iji asụsụ kparịta nkata, zipụta echiche, zirita ozi, gosipụta nka ma nyefekwa omenala. Nke a mere ka mmadụ dịwaga iche n'ebe anụmanụ ndị ọzọ na-enweghị ike ịsụ asụsụ ka mmadụ dị. Ihe nrịta a pụrụ iche mere ka mmadụ na-eji ụda na ọdịmara na-egosi ọnọdụ mmetụta obi na ọchịchọ ya. Ọ bụ ya kpatara na mgbe ọ bụla ndị nwe asụsụ enweghi ezi mmesonye na asụsụ ha, ọ na-ewute nke ukwu maka na ndị dị otu a ga-atufu mjiri mara ha ma ọ bụrụ na onweghi ihe ha mere iji gbochi ọnọdụ ahụ.

                                Ikikere asụsụ

                                Asụsụ mba ụwa dị iche iche so ụzọ ọnwụ. Pupavac (2000) kọwara na asụaụ a na-ele anya na ha ga-ekpochapụ na narị afọ na-abịa dị pasenti iri iteghete. Nke a gosiri na asụsụ bụ ikikere kacha mkpa ndị na-asụ asụsụ ọnụọgụ ndị na-asụ ya pere mpe (asụsụ maịnọriti) ga-enwe. Pupavac kọwakwaara na asụsụ so n'otu ihe kacha mkpa e ji eziputa omenaala. Mgbochị esemokwu na nghọtahie na-adị n'etiti obodo na ibe ya, na ikwado ikikere asụrụ na-agakọta ọnụ. Vollebaek (2008) na-ekwu na ndị tufuru ikikere asụsụ na njirimara omenaala ha nwere ike itufu ihe dị mkpa a na-akụzi banyere ikwanyere ọdịdịchi (nechọ) na ị ghọta gburugburu na usoro ya ugwu. Ikikere asụsụ dịka Eụtra na Yağmur (2004) si kọwaa, bụ ikikere nabatara mmadụ ịhọrọ asụsụ ọbụla masịrị ya maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ha gara n' ihu kọwaa na nhọrọ asụsụ dịka ncheanwụ nye ọsụ asụsụ bụ inwere onwe ya, kwuo okwu n'asụsụ ọbụla masịrị ya n' onwe ya maọbụ n' ọha. Ikikere asụsụ so n'otu n' ime iwu ọchịchị onye kwuo uche ya e wepụtara, nke na-eme ka mmadụ nwe ọnụ okwu maọbụ ka ọnụ ruo okwuu n'ihe obodo na-ekwu maka ya, na-akpachapụghị onye nsoeme n' ihi amaghị asụsụ ndị mba ọzọ nke ha na-asụ. Coulmas (2000) gụpụtaara anyị ikikere asụsụ ndị anyị nwere dịka ikikere mmadụ ịsụ asụsụ obodo ya, ya bụ, olundị maọbụ olumba/izugbe, ọchịchị na ụzọ iwu asụsụ mba nabatara, iji olundị gụọ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ọbụla masịrị gị, iji asụsụ gị gbasaa ozi n' igwe onyonyo (televishọnụ), igwe na-ekwu okwu (rediyo), tinyekwara ngalaba ndụ ndị ọzọ. Òtù na-ahụ maka ikikere asụsụ a kpọrọ "Intaneshọnaal Kọvanaantị nke Civụụl na Pọlitikal Raịt nke ọgbakọ nke UN nabatara n' afọ 1992, kwadoro ikikere asụsụ nye onye ọbụla. Dịka iwu nke usoro nke 27 (aatikl 27) si kwuo, na asụsụ na-anwụ anwụ bụ nke e nwere ike ikpọlite site n'ịsụ asụsụ epum ya. Mana a bịazịrị na-akpa oke asụsụ n' ihi asụsụ ndị mbịarachịwa (asụsụ ndị Briteen) dọọrọ anyị n'agha gbadoro anyị ka anyị na-asụ.

                                Ihe ndị a niile a kọwara na-egosi na ikikere asụsụ Igbo bụ ikikere nwaafọ Igbo ọbụla nwere ịsụ asụsụ Igbo n'ebe ọbụla ọ hụrụ onwe ya, maka na ọ bụ site n'asụsụ ya ka ndị mba ọzọ ga-esi mata na ọsụ asụsụ ahụ bụ onye Igbo. Ya bụ ikike asụsụ na-eme ka ọsụụ nwee okwukwe n'ime onwe ya na ọ dịghị asụsụ ka ibe ya mma, ọ na- enye asụsụ ya ugwu kwesiri ya site n'ịsụ ya na-enweghị ụjọ maka ndị nọ n'ọkwa ọchịchị karịa ya. Ọ bụ ikikere nwaafọ Igbo ọbụla nwere iji asụsụ ya gosipụta maọbụ kọwapụta ka ọnọdụ siri dịrị ya n'obodo na-enweghị onye na-amanye ya aka n' ọnụ.

                                Hyden na Mishler (1999), kọwara na ikikere asụsụ dibịa ahụike nwere ga-emetụtanwu ọnọdụ onye ọrịa nọ n'akwa ọrịa. N' aka nke ọzọ, asụsụ onye nọ n' ọrịa nwekwara ike ime ka dibịa ahụike nọrọ n'ọnọdụ gbagharịa. Na nchọcha, ndị dibịa ahụike asaa mere, ha chọpụtara na onye dibịa Bekee ịdị na-asụ asụsụ ndị ọzọ onye ọrịa ga-aghọta ma e wezuga asụsụ Bekee ka mma karịa ịsụ asụsụ ga-egbochi onye ọrịa ikwupụtacha nsogbu ahụike nke o nwere. Nke a nwere ike mee ka onye dibịa ahụ nyegbu onye nrịanrịa ji n'ọgwụ n'ihi mgbochi dị n'asụsụ mmekọrịta ha. Dibịa ahụike kwesịrị ịnabata onye ọrịa mgbe o ji asụsụ epum ya akọwara ya ka o si arịa ya. Ihe kpatara nke a bụ na nwaafọ Igbo ahụ nwere nchekwa nọ n'iwu kwuru na onye Igbo ọ bụla nwere ikikere ịsụ asụsụ Igbo na ngalaba ọbụla ọ hụrụ onwe ya. Òtù na-ahụ maka ahụike mba ụwa a kpọrọ "WHO" kọwara na dịka e siri nwee dibịa Bekee ka e siri nwee dibịa ọdịnaala, mana nchọpụta ha mere na nso nso a gosiri na ọgwụ Igbo ndị a maara aha ha ka arụ ọrụ agwọmọọrịa karịa nke ndị dibịa Bekee. Mana anyị ga-enyocha mmesonye asụsụ Igbo ndị dibịa ahụike (Igbo) ọdịnala nakwa nke Bekee n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị.

                                UN kọwakwara ikikere asụsu dịka ụzọ ndị ọchịchị obodo si anabata ma ọ bụ akwado asụsu nsipu/olundị nke ụmụ afọ obodo. Dika UN sikwa kọwaa, a na-enwetakwa ikikere asụsụ n'ime ikikere dị iche iche na nwemonwe gasị, dịka mgbochi mkpamoke, ikikere nkọwapụta, ikikere ndụ nke onwe, ikikere agụm akwụkwọ, na ikikere asụsụ ndị ọnụọgụ na-asụ ya pere mpe (olụndị ma ọ bụ asụsụ epum) ịsụ asụsụ ha ebe ndị ọzọ nọ. UN kwekọrịtara ma detukwa ya edetu na ndị sị na agbụrụ asụsụ ọnụọgụ ndị na-asụ yap ere mpe (asụsụ maịnọriti) nwere ikikere ịdị na-asụ asụsụ ha ọ bụladị mgbe ha na ndị ọzọ nọ. Mgbe UN na-akpa ụbụbọ banyere ahụ ike na ikikere asụsụ, ha kọwara na ọ bụrụ na ndị isi ọchịchị abịa n'ebe ha ga-asụnwụ asụsụ epum ndị ebe ahụ, ma hụtakwa na o nweghị ihe dị oke mkpa ga-egbochi ha ịsụ asụsụ epum ahụ, ọ ga-abụ ihe ịkpa oke dịka iwu mba etiti (intaneshọnal lọọ) si dị ma ọ bụrụ na ha ahapụ ịsụ asụsụ epum (maịnọriti) ahụ ma họrọ ịsụ asụsụ izugbe n'ihe gbasara ọchịchị na ihe ndị ọzọ gbasara ọhanaeze ahụ. Ha gara n'ihu kwuo na ebe nkụ dị na mba na-eghere mba nri, o kwesiri ka a na-eji ihe obodo nwere emeputa ihe nke ọma- n'ụzọ ahụike, ije ozi ọha, mgbasa ozi, dgz. Ishida et al (2012) kọwakwara na ịsụ naanị asụsụ ọnụọgụ ndị na-asụ ya dị nnukwụ (asụsụ dọminantị) nwere ike ịbụ oke ihe ọgbatauhie n'ichekwa ndụ ndị bi n'ime ime obodo ọ kacha ụmụnwanyị. N'aka nke ọzọ, ihe dị etu a na-emetutakwa ọnọdụ ahụike.

                                Usoro Nchọcha

                                E jiri usoro sọvee mee nchọcha a. Nworgu (2006) kọwara sọvee dịka usoro nchọcha e ji amata echiche, omume, mbunuche, nkwenye na nhụrụụwa ndị mmadụ nke e si na ya ewepụta mbunuche nchọcha. Nchọcha sọvee bụ nke a na-eji ụfọdụ mmadụ a họpụtara n'otu ebe ma ọ bụ otu obodo ka ha nọchite anya ndịọzọ.

                                Ebe onye nchọcha gbadoro ụkwụ bụ na gburugburu Nsụka, Ọnịcha na Enugu. Nsụka dị na mpaghara Steet Enugu. Nsụka nwere agbataobi ndị a: n'ọwụwa anyanwụ ya bụ ndịda Eha-Amufu, ọdịda anyanwụ ya bụ Steeti Kogi, mgbago ugwu ya bụ Steeti Benue, ndịda ya bụ Udi dị na Steeti Anambra. Ihe e ji mara ndị Nsụka bụ ịzụ ahịa, ịgụ akwụkwọ nakwa dịbịa mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ (ọ kacha na mpaghara Enugu-Ezike na Edeọbara). Ime obodo e si họpụta ndị zara ajụjụ bụ Enugu-Ezike, Ede-Ọbara, Edem, Obollo, Ọba, Ukehe, na Iheaka Nsụka. Mmadụ ise ka a họpụtachara site n'obodo ọ bụla, nke mere ndị a họpụtara n'ebe ndị ahụ ji bụrụ mmadu iri atọ na ise (35). A họpụtakwara ndị dịbịa Igbo abụọ abụọ n'ime obodo ndị ahụ a kpọrọ, tinyere ndị dịbịa ahụike abụọ na-ebugharị ọgwụ Igbo agagharị agagarị n'ala Igbo niile; ha dịzị madụ iri na isii (16). A họpụtakwara ndị dibịa ahụike atọ atọ site n'ebe mepere emepe ndị a: Nsụka ọban, Onitsha, na Enugu; ha dị iteghete (9) n'ọnụọgụ. Nke a mere ọnụọgụ ndị zara ajụjụ jizi dịrị iri isii (60). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ njụmaza, nke isiokwu ya bụ Njumaza Nkwalite Ọmụmụ Asụsụ Igbo (NNOAI). Njụmaza a bụ nke onye nchọcha ji aka ya mepụta. O bụkwa ndị ọkammụta nọ na nnukwu ngalaba lingwistiks, Igbo na asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ na Mahadum Naịjirịa, Nsụka tulere ya. NNOAI bụ ajụjụ dị iri abụọ na ise nke ndị mmadụ zara mebere ya. E ji miin na ndịpụ n'izugbe (Standard Deviation) wee hazie ma tụchaa data e nwetara na nchọcha a. Akara miin bidoro na 2.50 gbagowe ka a nabatara dịka ọsịsa dabara adaba, ebe akara miin pekarịrị 2.50 bụ ndị a nabataghị na nchọcha a.

                                Ngosi na ntụcha data

                                Na nkeji a, anyị ga-egosi ma tụcha ngwa chọcha e nwetara maka nchọcha a

                                Nchọpụta ajụjụ nchọcha nke mbụ

                                Tebul nke mbụ: Kedu asụsụ ndị na-arụpụta ọgwụ Igbo na-ejikarị edeputaa nakwa akọwapụta maka ọgwụ ha?

                                ngụ

                                ajụjụ

                                SD

                                akọwa

                                I

                                Ndị na-arụpụta ọgwụ Igbo na-eji asụsụ Igbo edeputa nkọwa banyere ọgwụ ha.

                                1.96

                                1.05

                                anabataghị

                                Ii

                                Ndị dibịa ahụike anaghị amafenye n'asụsụ Bekee ma ha na-eme nkọwa banyere ọgwụ ha.

                                2.14

                                1.12

                                anabataghị

                                Iii

                                ọ bụ asụsu Bekee ka ndị na-arụpụta ọgwụ Igbo na-eji edeputa nkọwa banyere ọgwụ ha

                                3.29

                                0.79

                                Anabata

                                Iv

                                ndị dibịa ahụike na-amafenye n'asụsụ Igbo na nke Bekee ma ha na-eme nke a.

                                3.29

                                0.79

                                Anabata

                                v

                                Aha ha na-enyekarị ọgwụ ha bụ n'asụsụ Bekee

                                3.05

                                1.10

                                Nnabata

                                Nchịkọta

                                2.75

                                1.2

                                Nnabata

                                Tebul nke mbụ gosiri ọsịsa miin na standad divieshọn asụsụ ndị na-arụpụta ọgwụ Igbo na-ejikarị edeputaa nakwa akọwapụta maka ọgwụ ha. Site na tebul a, ndị zara ajụjụ anabataghị ajụjụ nke mbụ na nke abụọ (i, ii) nwere akara miin 1.96, na 2.14. Ebe ndị sara ajụjụ nabatara ndịna ajụjụ nke atọ, anọ na ise (iii, iv, v). Ajụjụ ndị a nwere akara miin 3.29, 3.29, na 3.05. Na chịkọta, akara miin 3.29, 3.29, na 3.05 gosiri na asụsụ ndị na-arụpụta ọgwụ Igbo na-ejikarị edeputaa nakwa akọwapụta maka ọgwụ ha bụ asụsụ Bekee karịtịa asụsụ Igbo. Nke a gosiri na ndị na-arụpụta ọgwụ Igbo ka enwe ezi mmesonye nye asụsụ Bekee karịa nke Igbo.

                                Nchọpụta ajụjụ nchọcha nke abụọ

                                Kedu asụsụ ndị na-azụrụ ọgwụ na-achọkarị ka e jiri kọwapụta ihe gbasara ọgwụ ha chọrọ ịzụrụ?

                                Tebul 2: Ọsịsa Miin na Standad Divieshọn asụsụ ndị na-azụrụ ọgwụ na-achọkarị ka e jiri kọwapụta ihe gbasara ọgwụ ha chọrọ ịzụrụ.

                                Ngụ

                                Ajụjụ

                                SD

                                Nkọwa

                                i.

                                I ji asụsụ Igbo na-ere ma na-ekesakwa ọgwụ Igbo ka mma

                                3.67

                                0.78

                                E kwenyere

                                ii.

                                Asụsụ Igbo ka mma ikọwa ihe ghasara ọgwụ Igbo karịa nke Bekee

                                2.38

                                0.67

                                E kwenyeghi

                                iii.

                                Asụsụ Bekee ka akọwami ka e si aṅụ ọgwụ Igbo karịa nke Igbo.

                                3.38

                                0.61

                                E kwnyere

                                iv.

                                Asụsụ Igbo na-esi ike n'ighọta.

                                3.44

                                0.52

                                E kwenyere

                                v.

                                Asụsụ Igbo anaghị egosi nke ọma etu e si rụpụta ma na-aṅụkwa ọgwụ Igbo.

                                3.60

                                0.65

                                E kwenyere

                                Tebul nke abụọ (dị n'elu) gosiri ọsịsa miin na standard divieshọn asụsụ ndị na-azụrụ ọgwụ na-achọkarị ka e jiri kọwapụta ihe gbasara ọgwụ ha chọrọ ịzụrụ. Site na tebul a, ndị zara ajụjụ kwenyere n'ajụjụ nke mbụ, atọ, anọ, na ise (i, iii, iv, v) nwere akara miin 3.67, 3.38, 3.44, 3.60; ebe ndị zara ajụjụ ekwenyeghị n'ajụjụ nke abụọ (ii) nwere akara miin 2.38. Na nchịkọta, ọsịsa ajụjụ nke (i, iii, iv, v) nwere akara miin 3.67, 3.38, 3.44, 3.60 gosiri na asụsụ ndị na-azụrụ ọgwụ na-achọkarị ka e jiri kọwapụta ihe gbasara ọgwụ ha chọrọ ịzụrụ bụ asụsụ Bekee. Nke a gosikwara na ndị na-azụrụ ọgwụ Igbo ka nwe ezi mmesonye nye asụaụ Bekee karịa asụsụ Igbo.

                                Nchọpụta Ajụjụ Nchọcha nke atọ

                                Kedumere na ndị dịbịa ahụike nakwa ndị na-azụrụ ọgwụ ha enweghị ezi mmesonye nye asụsu Igbo?

                                Tebul 3: Ọsịsa Miin na Standad Divieshọn ihe mere na ndị dịbịa ahụike nakwa ndị na-azụrụ ọgwụ ha enweghị ezi mmesonye nye asụsu Igbo.

                                ngụ

                                Ajụjụ n'ebe

                                SD

                                Nkọwa

                                i.

                                Asụsụ Bekee na - aka akọwami ka e si aṅụ ọgwụ Igbo

                                3.05

                                1.10

                                Nnabata

                                ii.

                                Ozi gbasara ọgwụ Igbo ka mma ka a na-agwakọta asụsu Igbo na nke Bekee.

                                3.55

                                0.68

                                Nnabata

                                iii.

                                Anaghị aghọtacha aha ndị DMA na-akpọ ọgwụ ha.

                                3.27

                                0.86

                                Nnabata

                                iv.

                                Nkọwa ha gbasara o՛k՝e na ugboro ole e ji aṅụ ọgwụ ha edocheghi anya n'asụsụ Igbo.

                                3.52

                                0.65

                                Nnabata

                                v.

                                Ọtụtụ ndị Igbo enweghi mmasị n'igere nkọwa n'asụsụ Igbo, kama na nke Bekee.

                                3.35

                                0.76

                                Nnabata

                                vi.

                                Aha ha na-akpọ ọgwụ ha anaghị atọ ụtọ na ntị.

                                3.35

                                0.76

                                Nnabata

                                vii.

                                Ndị ọchịchị na ndi ọkaiwu na-ahụ maka nhazi asụsụ na Naịjirịa na-eleda asụsụ Igbo nakwa ikikere ya anya.

                                3.05

                                1.10

                                Nnabata

                                Nchịkọta

                                3.31

                                0.84

                                Nnabata

                                Na tebul ake atọ, dị n'elu, ndị zara ajụjụ nabatara ndịna ajụjụ nke mbụ rue na nke asaa. Ajụjụ ndị a nwere akara miin 3.05, 3.55, 3.27, 3.52, 3.35, 3.35, 3.05, n'otu n'otu. Na nchịkọta, akara miin 3.31 gosiri na ihe mere na ndị dịbịa ahụike nakwa ndị na-azụrụ ọgwụ ha enweghị ezi mmesonye nye asụsu Igbo dị ọtụtụ. Ndị zara ajụjụ kwenyere na asụsụ Igbo adịghị akọwa nakwa izisa ozi gbasara ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ nke ọma. Ha kwenyere na asụsụ Bekee ka mma n'ime nkea karị n'asụsụ Igbo. Nchọpụta a gosikwara na ndị Igbo na-eleda asụsụ ha anya. Ha nwekwara ezi mmesonye n'asụsụ ndị ọzọ (Bekee) karịa asụsụ ha. Nke a dabara n'ihe Ugwuona (2017) kwuru n'ebe asụsụ Bekee dị. O kwuru na asụsụ Bekee ewerela ọnọdụ kachasị elu na Naịjirịa ma nọrọ n'elu ya nwee ezi ugwu na mbuli elu n'ebe nakwa ọnọdu dị iche iche. Nke a na-atuzikwa aka na ndị ọchịchị na Naịjirịa na-eleghara ikikere asụsụ ndị Igbo anya, nke mere na ndị Igbo sokwa na-atufuzi ikikere asụsụ ha ebe ha ejizighi asụsụ ha akpa ngaga.

                                Nchọpụta ajụjụ nchọcha nke anọ

                                Kedu ụzọ a ga-esi kwalite ezi mmesonye na ikikere asụsụ ndị DMI n'asụsụ Igbo?

                                Tebul 4: Ọsịsa Miin na Standad Divieshọn ụzọ a ga-esi kwalite ezi mmesonye na ikikere asụsụ ndị dibịa mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ ọgwu Igbo n'asụsụ Igbo (N =94).

                                ngụ

                                Ndina

                                SD

                                Nkọwa

                                i.

                                Ndị ọchịchị kwesiri ịsụ asụsụ epum ndị dịbịa mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ mgbe na ebe ọ bụla ha nwere ohere ime nke a.

                                2.93

                                1.10

                                Nnabata

                                ii.

                                Ndị gọvmenti ga na-akwadọ asụsụ epum site

                                N'iji ya na-arụ ọrụ n'ụlọ mgbasa ọzị dịka ụlọ , redio, ụlọ akụkọ, televishọn, na vidio

                                3.52

                                0.32

                                Nnabata

                                iii.

                                Ndị ọchịchị ime ka amata maka asụsụ dị iche iche a na-asụgasị n'obodo, nke ga-eme

                                ka a na-akwanyere asụsụ ọ bụla ugwu.

                                3.04

                                0.21

                                Nnabata

                                iv.

                                Nkọwa ha gbasara o՛k՝e na ugboro ole e ji aṅụ ọgwụ ha edocheghi anya n'asụsụ Igbo.

                                3.52

                                0.65

                                Nnabata

                                v.

                                Ebe e deturu ntụgharị banyere ọgwụ ahụ ike

                                2.86

                                1.12

                                Nnabata

                                vi.

                                Inweta ọwa mgbasa ozi maka ọgwụ ime obodo

                                3.54

                                0.17

                                Nnabata

                                vii.

                                Ikwado vido na-egosicha ihe gbasara asụsụ ndị dibịa ahụ ike ime obodo nakwa ọgwụ ha

                                3.42

                                1.87

                                Nnabata

                                Nchịkọta

                                3.3

                                1.17

                                nnabata

                                Tebul nke anọ gosiri ọsịsa miin na standad divieshọn ụzọ ka mma a ga-esi kwalite asụsụ epum ndị dibịa mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ n'ala Igbo. Site na tebul a, ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ niile dị na tebl ahụ (i-vii). Nke a gosiri na ndị gọvmenti, ndị ọkaiwu n'ihe gbasara asụsu, ndị ọchịchị nakwa ndị nwe asụsụ maịnọriti kwesiri ikwado asụsụ maịnọriti/asụsụ epum ndị Igbo ka e jiri ya na-agbasa ọzi maka ọgwụ ahụike nakwa ka ọ na-etowanye.

                                Site n'ajụjụ ọnụ anyị gbara, a chọpụtakwara:

                                Ndị Igbo kwenyekwara na ọgwụ e ji asụsụ Igbo akọwa abụchaghị ezigbo ọgwụ, nke agaghịkwa aru ọrụ nke ọma. Ọzọ kwa, onye na-eji asụsụ Igbo akọwa ọgwụ ya mgbe ọ bụla na ebe niile anaghị enwe ego, nke o ji abụ nnukwu mmadụ. Nkwenye ha bụkwa na onye na-eme nke a na-ewetu onwe ya ala tinyere na o nweghị ugwu na nsọpụrụ. Asụsụ Igbo anaghị akpọtara DMI ọtụtụ ndị na-azụru ọgwụ. Ọtụtụ ndị DMI enweghi ike iji asụsụ Igbo kọwaa ọgwụ ha na-gwọkọtaghị ya asụsụ Bekee, nke kpatara ha jiri kwenye na asụsụ Bekee na-aka aga were were n'ọnụ iji kpọtara ndị mmadụ maka ọgwụ ha. Onye Igbo na - achọkarị ịkọwa onwe ya n'asụsụ Bekee. ọ na - akara onye Igbo mfe ịkọwa onwe ya n'asụsụ Bekee karịa ịsụ Igbo. Ọ bụrụgodu na ọ ga - ekwu ya n'Igbo, ọ ga na - agbakọnye n'ime ya asụsụ Bekee, ọ sụrụ Igbo, ọ sụrụ Bekee. Ọ na - abụ nnukwu nsogbu nye onye Igbo ịkpa nkata naanị n'asụsụ Igbo n'ewebataghị asụsụ Bekee n'ime ya.

                                Ụbụbọm, Mmechi na Ntụnye Aro

                                Mmesonye na akparamagwa ndị dịbịa ahụike (dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwo) Igbo, ndị Igbo, nakwa ndị ọchịchị n'ebe asụsụ Igbo dị na-adọghachị aka elekere azụ n'ihe gbasara ahụike, ọgwụ ahụike nakwa nkwalite asụsụ Igbo dịka anyị siri gosiputa. Mmesonye na ikikere asụsụ ndị dibịa ahụike n'ebe asụsụ Igbo na ọgwụ ha dị na-emetụta ọnọdụ ahụike n'Igbo na, adịmire n'izụrụ na ịṅụ ọgwụ Igbo nke na-emetutekwa ọnọdụ ahụike ha. Nleda anya na ka ndị Igbo siri emesonye asụsụ Igbo na-emetụta ya bụ asụsụ. Omume na nsirihụ ndị nwe asụsụ na-egosipụta ahụ ike ndị nwe asụsụ nakwa asụsụ ahụ nwere. Ọ bụrụ na ndị nwe asụsụ ana-anapụ asụsụ ahụ ugwu ruru ya, asụsụ ahụ ebutela ọrịa a naghị agwọ agwọ nke ga-ebutere ya ọnwụ erughi eru ma ọ bụru na onweghi ihe e mere iji gbochie ya..

                                Anyị na-atunye alo ka ndị Igbo niile bido na nwata rue n'okenye na-ahụ asụsụ Igbo n'anya ma nabatakwa ya dịka asụsụ ha ga na-asụ n'ebe ọ bụla. Ndị DMA na-agbasa ozi maka ọgwụ ha, ga na-eji asụsụ epum ha na-eme nke a. N'aka nke ọzọ, ndị gọvmenti na ndị ọchịchị ga agbasa ozi maka asụsụ ndị ọzọ dịka asụsu Bekee nakwa asụsụ Igbo izugbe. Nke a ga-enye aka ka ndị dibịa DMA nwee ike itụgharị ma sụbakwa nke ọ bụla ma ọ dabatara ha ime nke a. Oge ọ bụla ndị Igbo abụọ ma ọ bụ karịa nọ, ha were asụsụ Igbo na-akpakọrịta nkata. Ndị Igbo kwesiri iji asụsụ Igbo na-akọwa maka ọrịa na-arịa ha. Mgbe ọ bụla ndị Igbo nọ nzukọ, ha jiri asụsụ Igbo na-ekwu ihe niile ha chọrọ ikwu tinyekwara ịkpọpụta aha ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ n'ụzọ ọ ga-edo anya nke ọma, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Asụsụ Igbo kwesikwara ka a na-akwanyere ya ugwu na nsọpụrụ dịka o si dị n'asụsụ Bekee. A ga-eme nke a site n'ime ya ọ bụrụ otu ihe a tụrụ anya na nwata ọ bụla ga-eji na-abanye na mahadum ọ bụla dị n'ala Igbo. N'ụzọ dị otu a, a ga-akwalite ahụike nakwa asụsụ Igbo. Anyị na-ekwusi ike na ndị gọvmeenti na ndị ọka iwu n'ihe gbasara nhazi asụsụ na Naịjirịa ga na-akwado asụmigwe ma nyekwa asụsụ Igbo ogo dị elu. Nke a ga-nye asụsụ Igbo ogo dị elu tinyere ikwado ikikere asụsụ ndị dịbịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ n'iji asụsụ Igbo ekwusa maka ọgwụ ha nebe nakwa gburugburu dị iche iche n'ala Igbo dị na Naijirịa.

                                Edesinbịa

                                Agbaedo, C.U. (2007). Problem of multilingual nations: The Nigerian perspective. Enugu: Fidgina Global Books.

                                Anagbọgụ, P. N., Mbah, B. M. & Eme, C. A. (2010). Introduction to linguistics. Awka: Amaka Dreams Ltd.

                                Bamgbose, A. (1992). Language and the Nation: The language ọuestion in Sub-Saharan Africa. Edinburgh: Edinburgh University Press.

                                Coulmas, F .(2000). The handbook of sociolinguistics. Oụford: B lackwel I Publishers.

                                Crystal, D. (1995). The Cambridge encyclopedia of language. Cambridge: Cambridge University Press.

                                Echiegu, A.O.U. (1984). Translating the collects of the solemnities of the LORD in the language of the Africans; Vol. III sacred Igbo and its rhetorics. ROME.

                                Ejiofor, P. (2014). Asụsụ Igbo n'onyonyo Nọlịwud: Aha mba efuo. Jọnal Amụmụmụ Igbo, (7) 1-8.

                                Emenanjo, E. N. (1996). Olumefula: Asusu Igbo na Ndụ Ndị Igbo: Odenigbo Lecture Series. Owerri: Assumpta Press

                                Eụtra, G., and Yağmur, K. (2004). "Language rights perspectives". In Eụtra, G. and Yağmur, K. (Eds.), Urban Multilingualism in Europe: Immigrant Minority Languages at Home and School, 73-92): Multilingual Matters Ltd.

                                Hansford, K (1976). An indeụ of Nigerian Languages. Accra: Accessed 23 June 2018.

                                Hydén, L., & Mishler, E. (1999). language and medicine. Annual Review of Applied Linguistics, 19 , 174-192. doi:10.1017/ S0267190599190093 International Journal of Humanities and Social Science, (5) 9.

                                Ishida K, Stupp P, TurciosRuiz R, William DB, Espinoza E. (20123), Ethnic ineọuality in Guatemalan women's use of modern reproductive health care',International Perspectives on Seụual and Reproductive Health, (2) 8, 99-108.

                                Lawal, R. A. (2004). Meaning without Mean-ness. The Seventy- fourth Inaugural Lecture. Ilorin: Library and Publication Committee, University of Ilorin: Lgrave Macmillan.

                                Lyons, J (1981). Language and linguistics. Cambridge: Cambridge University Press.

                                Madụka C. T. (2007). The Igbo in world culture: Goodbye to identity. Journal of Igbo studies. (2), 14 -20.

                                Nwadike, I. U. (2002). Igbo language in education: An historical study. Uruowulu-Obasi: Pacific Publishers.

                                Nwaozuzi, G I. (2017). Dialects of the Igbo language. UNN: University of Nigeria Press.

                                Nworgu, B. G. (2006). Educational research basic issues and methodology. Ibadan: Wisdom Publisher Ltd.

                                Ogbona, S. O. (2006) 'Language, Literacy and Learning in Nigerian Primary Schools' In Ejemujulu,

                                Ogunmodim, M. (2016). Language Policy in Nigeria: Problems, Prospects and Perspectives. In Ohiri-Aniche (2015). Nkwụsị Aghịrịgha N' Odide Igbo. Jọnal Amụmamụ Igbo, (10), 1-8.

                                Ohiri-Aniche (2015). Nkwụsị Aghịrịgha N' Odide Igbo. Jọnal Amụmamụ Igbo, (10) 1-8.

                                Pupavac, V. (2012). Language Rights: From Free Speech to Linguistic Governance. UK: Macmillan Publishers Limited.

                                Ugwuona, C. N. (2013). Sociolinguistic study of language contact in Ubolo speech community, Enugu State Nigeria. A Ph. D. Dissertation. Department of linguistics, Igbo and other Nigerian languages . University of Nigeria, Nsukka.

                                Ugwuona, C. N. (2015). Ntọala na Isiokwu ụfọdụ na fọnọlọjị Igbo. Nigeria: University of Nigeria Press Ltd.

                                Ugwuona, C.N. (2014). Asụmigwe na Naịjirịa: Atụmatụ Asụsụ na Agụm Akwụkwọ. Na Jọnal Amụmamụ Igbo (Jọai), (9) 47-63.

                                Umo, C. U. & Ezema, T. O. (2007). Mkpanaaka akwụkwọ ọmụmụ nchọcha n'asụsụ na omenala Igbo. Nsukka: Ifedimma Communications.

                                Umo, C. U. & Okeke, C. O. (2009). Mwulite asụsụ Igbo n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị dị na mgbago ugwu Naịjirịa". Jonal mmụta Igbo (Journal of Igbo studies). 4 (1): 73 - 81.

                                UN (1992) Declaration on the Rights of Persons Belonging to National or Ethnic, Religious and Linguistic Minorities UNGA Doc. No. A/RES/47/135. https://www. un-documents.net/a47r135.htm. Accessed 23 June 2018.

                                Vollebaek, Knut (2008) 'Linguistic Rights in the Work of the HCNM: New and Old Challenges in Promoting Comprehensive Security'. Opening speech to to the Conference on Linguistic Rights of National Minorities: Ten Years after the Oslo Recommendations and Beyond. Oslo - 18 June. https://www.osce.org/documents/ hcnm/2008/06/32045_en.pdf. Accessed 16 October 2018.