ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA VOLUME 12; NO 2, JULY, 2019

Nsogbu Ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime Ntụgharị n'Asụsụ Igbo n'Ogo Sekọndịrị Ukwu n'Okpuru Ọchịchị Igbo-etiti, Steeti Enugwu

Si N'aka

Dr. Uchenna Fabian Ude1

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

E-mail address: uchenna.ude@unn.edu.ng

08064231662

Dr. Chinyere Ezema2

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

E-mail address:

0807728086

Na

Happiness Chioma Ezema3

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

Ụmìedemede

Nchọcha a lebara anya na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti nke Steeti Enugwu. Ndị nchọcha jiri usoro sọvee wee mee nchọcha. Ndị e ji mee nchọcha bụ ụmụakwụkwọ nọ n'ogo Sinịọ Sekọndịrị nke abụọ n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti nke ọnụọgụ ha dị puku abụọ narị ise na iri isii (2,560), ebe ụlọakwụkwọ ha dị iri na isii (16). Ndị nchọcha ji usoro tụmbọm tụmbọm wee sere ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dị narị abụọ (200) bụ ndị nọchitere anya ndị ọzọ. Ndị nchọcha jiri usoro miin wee hazie ihe a chọpụtara. Ngwa ndị nchọcha jiri mee nchọcha a bụ ajụjụ ederede njụmaaza nke ha haziri n'onwe ha. Ajụjụ nchọcha dị anọ, ebe ndịna ya dị iri abụọ (20). Ọsịsa ajụjụ ọbụla nke akara miin ya ruru 2.5 gbagowe bụ nke a nabatara ma jiri ya wee rụọ ọrụ, ebe ọsịsa ajụjụ ndị nke akara miin ya erughi 2.5 bụ nke onye nchọcha wepuru. Site na nhazi ihe a chọpụtara, ndị nchọcha chọpụtara nsogbu dị iche iche ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dịka, olundị ndị nkụzi ji akụzi asụsụ Igbo, mkpụrụokwu ndị Igbo-Etiti, akpaalaokwu na usorookwu. Ndị nchọcha tunyekwara aro n'ihe e nwere ike ime ka e belata nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo dịka gọọmentị ịgba mbọ hụ na ndị nkụzi ha na-ewe n'ọrụ bụ ndị nkụzi mara maka asụsụ Igbo nke ọma. Ha ga-agbakwa mbọ hụ na ha na-akwalite asụsụ Igbo site n'iwepụta ihe nrite dị iche iche maka ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma n'asụsụ Igbo nke ga-eme ka ha nwe mmasị ma matakwa na asụsụ Igbo bụ ihe kwesiri ekwesi na nwata akwụkwọ ọbụla bụ onye Igbo ga-amụta nke ọma nke ga-enyere ha aka n'ime ntụgharị na ndị ọzọ.

Okwu Ndị Pụtakarịchara Ihe: Ntụgharị Asụsụ, Asụsụ Igbo

Mkpọlite

Ntọala Nchọcha

Asụsụ bụ ụzọ mmadụ nwere ike isi zipụta mbunuche ya. Mmadụ nwere ike ime nke a site n'ide ya ede maọbụ kwuo ya n'ọnụ. Eze (2012) kọwara na asụsụ bụ okwu e kwuru n'ọnụ maọbụ dee ede n'akwụkwọ nke mmadụ ji eme ka ndị ọzọ mata ihe o bu n'uche. Asụsụ bụ otu ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta nke bụ ụda okwu nwere ezi nghọta nke sitere n'ọnụ mmadụ pụta. Anọzie (2001) kọwara asụsụ dịka ụzọ mmadụ na ibe ya na-esi enwe mkparịta ụka n'etiti onwe ha. Asụsụ Igbo bụ otu n'ime asụsụ atọ nke kacha wee pụta ihe n'ime asụsụ e nwere na Naijirịa. Asụsụ Igbo na-egosi omenala na ihe ndị ọzọ dị iche iche Igbo nwere dịka o siri dị mkpa.

E meela asụsụ Igbo ka ọ bụrụ ihe ụmụakwụkwọ ndị nọ n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ga-ele n'ule tupu e nye ha asambodo SSCE. Nke a pụtara ihe na nkebi nke mbụ, nkebi edemede asatọ nke Federal Republic of Nigeria (2004). N'ogo sinịọ sekọndịrị, asụsụ Bekee na otu asụsụ ala Naịjirịa bụ nke nwata akwụkwọ ọbụla ga-ele n'ule. Uru asụsụ na omenala Igbo bara n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, iwelite ndụ mmadụ na obodo elu abụghị ihe a ga-eleghara anya n'ihi na ọ na-enye aka ichekwaba omenala nke obodo dị iche iche dị n'ala Igbo. Asụsụ dịkwa mkpa maka ịkwalite mmekorịta dị mma n'etiti ụmụafọ Naịjirịa. Ọ na-ewetakwa ịdịnotu na agamnihu na Naịjirịa. Iji mejupụta nke a, gọọmenti etiti nke Naịjirịa kọwara na Federal Republic of Nigeria (2004) na gọọmentị kwetara na asụsụ na-aba uru iji chekwaba omenala nakwa ịkwalite ịdịnotu na Naịjirịa. Nwatakịrị ọbụla ga-amụrịrị otu asụsụ ala Naịjirịa nke a ga-akụziri ya n'ụlọ akwụkwọ.

Asụsụ bụkwa otu ụzọ n'ime ụzọ dị iche iche e nwere ike isi wee mata onye mmadụ bụ. E nwere ike ime nke a site n'aha onye ahụ na-aza nakwa asụsụ ọ na-asụ. Dịka a maara, asụsụ Igbo bụ nke pụtara ihe n'ụzọ abụọ - Igbo Izugbe na olundị. Igbo Izugbe bụ nke onye ọbụla bụ nwafọ Igbo na-aghọta mgbe ọbụla a sụrụ ya maọbụ dee ya ede. Olundị bụ etu ndị si asụ na be ha. Anọzie (2007) kọwara olundị dịka oluasụsụ dị iche iche e ji mara obodo. Nke a bụ n'ihi na e nwere ike isi n' oluasụsụ mmadụ wee mata ebe onye ahụ siri pụta. Dịka Nwode na Nweze (2015) siri kọwaa, olundị na-emetụta nkụzi na ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo tụmadị mgbe a na-eme ntụgharị ma ọ bụrụ na e webata ya. Nke a bụ n'ihi na mgbe e nyere nwata akwụkwọ ihe ka ọ tụgharia site na Bekee gaa n'Igbo Izugbe, ọ bụrụ na ọ tụgharịa n'olundị ya, ị mara na ọ gaghị enweta ihe e nyere ya ka ọ tụgharịa. Ihe nwere ike ibute nke a bụ mgbe onye nkụzi na-eji olundi wee na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe ọmụmụ asụsụ Igbo karịa iji Igbo Izugbe nke nwafọ Igbo ọbụla maara. N'ihi nke a, ọ dị mkpa na onye nkụzi ọbụla na-akụzi ihe ọbụla gbasara asụsụ Igbo ga-abụ onye nwere ọzụzụ nke ọma. Nke a ga-eme na mgbe ọ na-akụziri ụmụaka ihe, ọ ga-ama usoro dị mma na nka ọ ga-ewebata iji mee ka nkụzi ya bụrụ nke ụmụaka ghọtara nke ọma.

Ọzọ kwa, a bịa n'ọmụmụ asụsụ Igbo, mkpụrụokwu bụ otu n'ime ihe ndị na-apụta ihe nke ọma. Agbedọ (2003) kọwara mkpụrụokwu dịka mkpụrụụda maọbụ usoro mkpụrụụda nke nwere nghọta zuru oke n'ime ya, nwekwa ike ịkwụrụ onwe ya ma nwekwa ọrụ pụtara ihe ọ na-arụ n'asụsụ. Ọfọmata (2013) kwadoro nke a mgbe ọ kọwara mkpụrụokwu dịka okwu ọbụla ga-abụ ọ kwụrụ onwe ya, o nwee nkọwa ma nwekwazị nghọta zuru oke. Dịka o siri kọwaa, ihe nghọta mkpụrụokwu ji abụ okwu zuru oke bụ na ọ na-abụ ọ kwụrụ, ihe okwu ahụ pụtara ga-apụta ihe ozigbo, na e nyoghi ya enyo. Ihe nkọwa ndị a dị n'elu na-egosi bụ na mgbe ọbụla mmadụ kwuru ihe banyere mkpụrụokwu, a ga-amata na ọ bụ okwu kwụụrụ onwe ya nke enweghi mgbakwụnye ọbụla a gbakwụnyere na ya iji zipụta nghọta ya. Ọfọmata (2013) gakwara n'ihu wee kọwaa na mkpụrụokwu nwere ike ịbụ mkpọha, nnọchiaha, ngwaa maọbụ nkejiasụsụ ndị ọzọ e nwere n'asụsụ Igbo. Na nkọwa nke ha, Mbah na ndị ọzọ (2013) kọwara mkpụrụokwu dịka okwu nwere echiche aka ya ma nwee ike ịkwụrụ onwe ya n'asụsụ. Nkọwa nke a yitere nkọwa nke ndị ahụ dị n'elu n'ihi na ọ na-akọwa na mkpụrụokwu bụ nke nwere ike ịkwuụrụ onwe ya, nwee nghọta ma nwekwa ọrụ ọ na-arụ n'asụsụ. Nkọwa ndị a niile na-egosi na a bia n'ọmụmụ asụsụ Igbo, mkpụrụokwu abụghị ihe a ga-eleghara anya n'ihi na ọ na-arụ ọrụ pụrụ iche na ya bụ asụsụ. Ịmaatụ: a bịa na nwube okwu Igbo, ọ bụ mkpụrụokwu ka e ji mwube okwu Igbo dịka:

  • Ada + Eze è Adaeze
  • Udoka + Mma è Udokamma
  • Ụlọ + akwụkwọ è Ụlọakwụkwọ
  • Nwata + akwụkwọ è Nwataakwụkwọ

Ọ bụkwa site na mkpụrụokwu ka onye nkụzi sị akụziri ụmụ akwụkwọ alaka ihe ọmụmụ asụsụ Igbo dị iche iche nke ntụgharị so n'ime ha. Ya bụ na mgbe nwata akwụkwọ amaghị mpụtara mkpụrụokwu n'otu asụsụ, Ọ gaghị enwe ike ịtụgharị ya gaa n'asụsụ ọzọ tụmadị mgbe e ji mkpụrụokwu ndị ahụ mebe ahịrịokwu. A bịa n'ọmumụ asụsụ Igbo, e nwere ngalaba dị iche iche dịka edemede, ụtọasụsụ, agụmagụ, omenala na ewumewu. Ntụgharị bụ mmadụ idegharị ihe site n'otu asụsụ wee baa n'ọzọ. Mbah na ndị ọzọ (2013) kọwara ntụghrị dịka ngalaba ntụcha agụmagu na-ahụ maka ntapị maọbụ ntapịgharị asụsụ iji nye ya nghọta metụtara omenala ntụcha dị iche iche n'ụzọ ọ ga-adị n'etiti agụmagụ ntulekọrita, ebe ọ bụ na ike ekemeke mpụrụ iche na-esite na mbịakọtaọnụ asụsụ apụta (p.g. 7).

Nke a pụtara na ekemekeuche mmadụ na-apụta ihe site n'ime ntụgharị si n'otu asụsụ gaa na nke ọzọ. Ya bụ site n'asụsụ nzimozi gaa n'asụsụ nnataozi.

Asụsụ nzimozi pụtara asụsụ e dere ihe e nyere mmadụ ka ọ tụgharịa dị na ya, ebe asụsụ nnataozi pụtara asụsụ a chọrọ ka mmadụ tụgharịa ederede ahụ na ya. Nwike (2015) kọwara na e nwere ụfọdụ ebe a na-eji okwu a bụ ntụgharị were na-arụ ọrụ. Ha gụnyere: Fiziks nke bụ ịgbanwe ọnọdụ ihe ọbụla dịka usoro ya siri dị. A ga-ahụta na a na-enwe nnọgharị ọnọdụ site n'otu ọnọdụ gaa n'ọzo mgbe ọbụla a na-eme ntụgharị. Robinson (2007 na Schafner (2007) gosiri na a bịa na ntọala ntụgharị, ọ bụ iweta echiche site n'otu asụsụ maọbụ olundị gaa n'asụsụ maọbu olundị ọzọ. Ya bụ na mmadụ nwere ike ime ntugharị site n'asụsụ Izugbe gaa n'olundị maọbụ site n'olundị gaa n'asụsụ Izugbe bụkwanụ asụsụ nke mmadụ niile nabatara ka a sụwa n'obodo.

Ọzọ kwa, Nida (2001) kọwara ntụgharị dịka ibufe echiche dị n'akwụkwọ site n'otu asụsụ gaa n'ọzọ. Ihe nke a na-egosi bụ na e nwere ike ime ntụgharị n'ụdị ederede n'akwụkwọ. Bassnett (2008) gakwara n'ihu nye nkọwa nke ya gbasara ntụgharị site n'ikwu na ọ bụ izipụta echiche dị n'akwụkwọ nzimozi were gaa na nke nnataozi iji hụ na mepụtara echiche ha abụọ yiri onwe ha. Ihe nke a na akọwa bụ na mgbe ọbụla mmadụ na-eme ntụgharị, ọ ga-agba mbọ wee hụ na mbunuche dị n'asụsụ nzimozi bụ nke pụtara ihe n'asụsụ nnataozi. Onye na-eme ngụgharị bụ ya ji aka ya were na-eme mbufe echiche n'ụdị ibufe echiche ahụ dị n'asụsụ nzimozi gaa na nke nnataozi ma gba mbọ hụ na o mere ntụgharị etu o kwesiri.

Ntụgharị na-eme ka e nwee mgbanwe n'etu mmadụ si ahụta onye ya na ya anọghị n'otu agbụrụ maọbụ anaghị asụ otu asụsụ. Ọ na-eme ka e nwee ezi mmekọrịta n'etiti ndị abụghị otu agbụrụ site n'ịzụkọrịta onwe ha ahịa maọbụ nwee udo n'ihu ụlọ ọrụ ha. Ntụgharị na-emekwa ka e nwe ezi mkpọzi nke mkpụrụokwu abụghị asụsụ nke onye maọbụ ndị ntụgharị. Ntụgharị gbasara ndịiche na myiri na-adị n'asụsụ abụọ nke na-enyeaka iwepụta mma dị n'asụsụ a na-elebanye anya na ya. Ọ naghi adị mfe mmadụ ịtụgharị ederede Bekee n'Igbo ọ kachasị mgbe ihe a na-atụgharị bụ maka gburugburu agbụrụ asụsụ nke ya na asụsụ a na-atụgharị abụghị otu asụsụ.

Eze (2012) kọwara na ntụgharị bụ ọrụ na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu n'ihi na dịka e nwere iwu dị iche iche na-achị asụsụ ọbụla bụ nke ndị nwe ya na-agbaso, ọ bụghị mgbe niile ka onye ntụgharị maọbụ nwataakwụkwọ na-ama iwu ndị ahụ ọ kachasị iwu nke nnataozi. A bịa n'asụsụ Bekee, otu n'ime nkejiasụsụ e nwere bụ nkọwaaha na-eburu aha ọ na-akọwa ụzọ, oge ụfọdụ ọ nọrọ n'ihu, oge ụfọdụ, ọ nọrọ n'azụ mana a bịa n'asụsụ Igbo, ọ na-ekpe azụ n'ahịrịokwu. Ihe ndị a niile bụgasị nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ogo sinịọ sekọndịrị. Ụmụakwụkwọ n'ogo sinịọ sekondịrị na-enwekwa nsogbu n'ime ntụgharịa n'ebe ihe gbasara mkpụrụasụsụ nọ ọ kachasị mgbe mkpụrụasụsụ dị na nzimozi adịghị na nke nnataozi.

N' agbanyeghi nsogbu ndị a niile dị n'elu nke ụmụ akwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị, ha na-enwekwa ike ịdị na-enwe nsogbu n'ihe gbasara nka na ntụgharị. Ụmụakwụkwọ na-enwekarị nsogbu nka n'ihe gbasara ntụgharị n'ihi na oge ụfọdụ, ha anaghị ama ihe okwu ụfọdụ odee webatara n'edemede ya putara.

Ọzọ kwa, Eze (2012) kọwara na nwataakwụkwọ ọbụla ga-ebu ụzọ mata ihe edemede na-ekwu maka ya tupu o bido ntụgharị ọ kachasị n'ule WAEC na NECO. Nke a pụtara na nwataakwụkwọ ahụ ga-agụ ederede ahụ ugboro ugboro iji ghọta ya nke ọma tupu o bido ime ntụgharị. Eze gakwara n'ihu wee kọwaa na mgbe nwataakwụkwọ gụrụ ederede otu ugboro wee bido ime ntụgharị, ọ gaghi emeta ya nke ọma. Onye na-eme ntụgharị ga-akwado onwe ya nke ọma iji wepụtacha ihe ndị dị n'ederede nke a tụrụ anya n'aka ya. Nke a na-egosi na ntụgharị abụghi ihe e ji ọsọ ọsọ eme.

A bịa n'amụmamụ asụsu Igbo, akpaalaokwu so n'ime atụmatụokwu e nwere. Dịka Ọfọmata (2013) si kọwaa, akpalaokwu bụ okwu nkà ndị Igbo ji achọ asụsụ ha mma. Dịka O siri kọwaa, akpalaokwu na-adị na nkebiokwu maọbụ nkebiahịrịokwu, mana nkebiokwu ya na-adị n'ime ahịrịokwu ma e were ya mebe okwu. Nke a pụtara na akpaalaokwu enweghi ike ịkwụrụ onwe ya ma nwe nghọta zuru oke, kama ọ ga-adịrịrị n'ime ahịrịokwu iji zipụta nghọta ya. Ndị Igbo ji akpaalaokwu ama onye maara asụsụ nke ọma. N'ihi nke a, o kwesiri ka onye ọbụla bụ nwaamala Igbo ma onye ọbụla na-amụ asụsụ Igbo na omenaala ya tụmadị ime ntụgharị mụta nke ọma ihe bụ akpaalaokwu na etu e si eji ya ekwu okwu n'asụsụ Igbo. Nke a bụ maka na dịka Ọfọmata (2013) siri kọwaa, onye amaghị ihe bụ akpaalaokwu anaghịkwa ama mgbe e ji ya kwuo okwu maọbụ mgbe ọ pụtara ihe n'ime ahịrịokwu bụkwanụ nke ga-eme na onye ahụ ghara ama nkọwa ya maọbụ mpụtara ya. Ịmaatụ akpaalaokwu gụnyere:

  • Ọ na-eme aka ntụtụ.
  • Nwoke a nwere ụwa isa aka n'afọ a.
  • Agụụ na-achọ ibe Obodo a ntị.
  • Ezinaụlọ maazị Okafọ emebeghi aka n'ọnụ kemgbe ụnyahụ.
  • Obi ndị Obodo a na-akwu anwụrụ.

Ọ bụrụ na e lee anya n'ọmụmaatụ ndị a dị n'elu, a ga-ahụ na mpụtara akpaalaokwu ndị ahụ dịgasị n'ahirịokwu ndị ahụ abụghị nke mmadụ nwere ike ịkwụrụ ọtọ zipụta ma ya echemighi echiche ime banyere ya. Ya bụ na akpaalaokwu na-ahịa ahụ na ntụgharị n'ọmụmụ asụsụ Igbo tụmadị isi n'asụsụ Igbo tụgharịa ya gaa n'asụsụ ọzọ ọbụladị n'oge ule. Nwataakwụkwọ ọbụla na-akwado ule n'ogo sinịọ sekọndịrị ga-agba mbọ hụ na ọghọtara usorookwu asụsụ nzimozi na nke nnataozi iji hazie ntụgharị ya nke ọma. Mba na ndị ọzọ (2013) kọwara usorookwu dịka amụmammụ gbasara ka asụsụ si ahazi okwu iji mebe ezi ahịrịokwu. Anagbuọgụ, Mba na Eme (2001) kọwara usorookwu dịka mbịakọtaọnụ maọbụ mkpudewe nso. Ya bụ na usoro okwu bụ ọmụmụ maka mmekọrịta na-adị n'etiti mkpụrụokwu na ibe ya iji mebe ahirịokwu. Mbịakọta okwu na ibe ya na-agbaso ụzọ iwu kwadoro iji wee mebe ahịrịokwu n'asụsụ ọbụla, a ga-eso ụzọ pụtara ihe nke ndị nwe asụsụ ahụ họpụtara iji wee jikọta asụsu ha. Dịka Anagbuọgụ, Mba na Eme siri kọwa, ihe ọmụmụ usoro okwu sitere n'aka ndị okenye ihe ọmụmụ Grik. Ọ bụ ha sitere na nnyọcha ha wee wepụta usoro amụmamụ asụsụ usorookwu. Ọ bụkwa site na nyọcha ha a ka ha siri nweta nkejiasụsụ niile e ji emebe ahịrịokwu. N'ihi emetaghị nke ọma n'ule n'ihe gbasara ntụgharị n'asụsụ Igbo ka onyeisi ule WAEC n'afọ (2006) siri gosi, ka onye nchọcha jiri buru n'obi ịchọpụta nsogbu dị iche iche ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti nke dị na Steeti Engwu na-enwe. Onye isi ule WAEC (2017) gosiri na ụmụakwụkwọ emeghi nke ọma n'ihe gbasara ntụgharị n'asụsụ Igbo nke kpalitere mmụọ ndị nchọcha ịchọpụta nsogbu ụmụakwụkwọ sekọndịrị ukwu dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti na steeti Enugwu na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo.

Nsogbu Nchọcha

Ndị nchọcha na-eche na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo ọ kachasị n'ogo sekọndịrị ukwu so n'ihe na-eme na ha emetaghị nke ọma n'ule ha bụkwanụ nke na-enye nne na nna, ndị nkụzi nakwa ụmụakwụkwọ nsogbu n'oge ugbu a. Onye isi ule WAEC (2007) kọwara na ụmụakwụkwọ emeghi nke ọma n'ịtụgharị abụ na iduuazi e nyere ha tụgharịa. Ọ bụ nke a mere ndị nchọcha jiri chọ ileba anya na nsogbu dị iche iche ụmuakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ogo sinịọ sekọndịrị ọ kachasị n'ụlọ akwụkwọ dị n' okpuru ọchịchị Igbo-Etiti na Steeti Enugwu.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche nchọcha a nke izugbe bụ ichọpụta nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị nke dị n'okpụrụ ọchịchị Igbo-Etiti na Steeti Enugwu. Nchọcha a ga-eleba anya n'ihe ndị a:

  • Ịchọpụta etu olundị ndị nkụzị ji akụzi asụsụ Igbo si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndiri dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti.
  • Ịchọpụta etu mkpụrụokwu Igbo-Etiti si bụrụ nsogbu ụmu akwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti na Steeti Enugwu.
  • Ịchọpụta ka akpaalaokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti.
  • Ịchọpụta etu usorookwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti.

Uru Nchọcha

Ndị nchọcha a ga-abara uru gụnyere ụmụakwụkwọ, ndị nkụzi, ndị nne na nna, ndị omebe kọrikulum nakwa ndị omebe iwu amụmamụ nke ala Naịjirịa. Nchọcha a ga-abara ụmụakwụkwọ uru n'ebe ọ dị ukwuu n'ihi na nchọcha a hibere isi n'ebe ha nọ. Ọ ga-enyere ha aka ịmata ihe ha na-amaghị banyere ntụgharị n'asụsụ Igbo. Nchọcha a ga-enye aka belata nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo. Ụmụakwụkwọ ga-enwetakwa enyemaka site n'ịchọpụta na olundị na Igbo Izugbe abụghị otu. Nke a ga-adị ire site n'ime ka ha jiri asụsụ Izugbe na-amụ asụsụ Igbo ma jirikwa ya na-eme ntụgharị site n'ịchịkọbara ha ọgbakọ maka asụsụ Igbo ya na ịdị na-egosi ha ihe onyonyo mgbe na ebe ọbụla ha na-amụ maka asụsụ Igbo. Mgbe ha matara na naanị Igbo Izugbe ka a nabatara ka e jiri na-ede ma na-asụ asụsụ Igbo, ọ ga-enyere ha aka ibelata nsuhie na ndehie niile ha na-eme.

Nchọcha a ga-enyere ụmụakwụkwọ aka ịmata na mkpụrụokwu bụ ihe di mkpa n'ọmụmụ asụsụ Igbo tụmadị n'ime ntụghari. Ha ga-amata na mkpụrụokwu bụ okwu ọbụla kwụụrụ onwe ya, nwe nghọta zuru oke ma nwee ọrụ ọ na-arụ n'asụsụ. Ebe nke a na-apụtakarị ihe bụ n'abụ. Nke a bụ maka na okwu a pịrị api ma dịkwa ọkpụrụkpụ ka ndị odeabụ ji wee na-ezipụta echiche ha mgbe ha na-ede ederede abụ. Ya bụ na nchọcha a ga-eme ka nwataakwụkwọ ọbụla mara na tupu O bido ime ntụgharị n'asụsụ Igbo, ọ kachasị n'ihe gbasara abụ, ọ ga-ebu ụzọ ghọta ihe mpụtara mkpụrụokwu ahụ bụ.

Nchọcha a ga-abakwara ụmụakwụkwọ uru n'ihi na ha ga-amụta etu e si ejikọta mkpụrụokwu na ibe ya iji mebe ahịrịokwu. Nke a ka ha ga-eme site n'ịma ihe gbasara ụsoro okwu n'asụsụ Igbo. Ha ga-amatakwa nkejiasụsụ dị iche iche e nwere n'asụsụ Igbo na ka e si ejikọta ha ọnụ iji mebe ahịrịokwu.

N'ịga n'ihu, nchọcha a ga-abara ndị nne na nna uru n'ihi na ha ga-amata na asụsụ Igbo so n'otu n'ime asụsụ atọ ndị ahụ a nabatara na Naịjirịa ka e jiri na akụzi ihe n'ụlọ akwụkwọ ma jirikwa ya na-akparịta ụka n'etiti ndị maara asụ ya. Mgbe nne na nna na-asụrụ ụmụaka ha asụsụ Igbo, ọ ga-enyere ha aka ịmụta ya nke ọma ma nwekwa ike ime ntụgharị n'ụdị ọbụla n'ụlọakwụkwọ ha tụmadị n'oge ule ha. Mgbe nke a mere, ha ga-eme ka nne na nna ha nwee obiụtọ n'ebe ha nọ. Nchọcha a ga-abara ma ndị nkụzi ma ụmụakwụkwọ uru site n'ime ka ha mata ihe bụ mpụtara akpaalaokwu dịka otu n'ime okwu nka ndị Igbo ji achọ asụsụ ha mma. Ndị nkụzi ga-amata etu e si eji akpaalaokwu ekwu okwu, ebe ụmụakwụkwọ ga-amata na akpaalaokwu na-adị n'ụdị nkebiokwu maọbụ nkebiahịrị nke na-adị n'ime ahịrịokwu.

N'ịkpeazụ, nchọcha a ga-abara ndị omebe kọrịkulum na ndị omebe iwu amụmamụ asụsụ Igbo uru site n'ime ka ha mara na usorookwu na akpaalaokwu bụ ihe ọmụmụ dị oke mkpa n'asụsụ Igbo ma gba mbọ zidata akwụkwọ ederede ha ebe ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi ga-esi wee mụta ha. Nke a ga-enyere ụmụakwụkwọ aka n'ịma ihe gbasara ọmụmụ asụsụ Igbo nke ọma ma mee ka ha mee nke ọma n'ule ha niile tụmadị n'ime ntụgharị.

Ajụjụ Nchọcha

  • Kedu ka Olundị ndị nkụzi ji akụzi asụsụ Igbo si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?
  • Kedu ka mkpụrụokwu Igbo-Etiti si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?
  • Kedu ka akpaalaokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịri dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?
  • Kedu etu usorookwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?

Atụtụ Mmụgharị

Atụtụ Akparamaagwa

Atụtụ akparamaagwa dịka o siri gbasata ịsụ asụsụ na-akọwa na mgbe a mụrụ nwatakịrị na onweghi ihe ọbụla dị ya n'ụbụrụ. Dịka B.F. Skinner (1957) siri wee kọwaa, ọ bụ ndị mgbazi dịka ndị nne na nna, ụmụnne, ndị ọgbọ, nakwa ndị nkụzi bụ ndị ga-akụziri nwata ahụ ihe nke gana-abanye ya n'ụbụrụ ya. Site n'ụzọ dị etu a ka nwata ahụ ga-esi wee mata usoro ọ ga-esi wee na-akpọpụta mkpụrụokwu ka o nwe nghọta ma matakwazie ka e si akpọpụta okwu ndị ahụ. Skinner kọwara na asụsụ bụ ihe a na-amụ amụ. Ọ gakawra n'ihu wee kọwaaa, na ọmụmụ asụsụ nwatakịrị ọbụla na-ebido n'ụda, ndokọ mkpụrụokwu nke na anaghi agbaso usoro mmebe okwu asụsụ ahụ. Ihe ndị a metụtara nchọcha a n'ihi na ọ bụ onye nkụzi ga-akụziri nwataakwụkwọ usoro asụsụ nakwa etu nwata a ga-esi were asụsụ ahụ wee mee ntụgharị.

Atụtụ Ndịnụbụrụ

Atụtụ ndịnụbụrụ dịka Chomsky (1959) siri kọwaa bụ atụtu na-akọwa na nwata ọbụla a mụrụ n'ụwa nwere ọnatarachi nke na-enyere ya aka ịmuta asụsụ. Nke a na-egosi na nwata ọbụla nwere ike ịmụta asụsụ ọbụla. Ihe ahụ dị n'ụbụrụ nwatakirị ọbụla nke na-enyere ya aka ịmuta asụsụ ka Chomsky kpọrọ 'Ngwa Mmụta Asụsụ' (NMA). Chomsky gakwara n'ihu wee kọwaa na NMA na-enyere nwatakirị ahụ aka n'ịmụ iwu e ji asụ asụsụ ahụ na iwu a ga-agbaso na ndokọ na ọmụmụ asụsụ ahụ. O kwukwara na NMA bụ ihe ga-enyere nwata ahụ aka n'imebe okwu mgbe ọ mụchara iwu asụsụ ahụ. Atụtụ ndịnụbụrụ nke Chomsky a gụnyere asụsụ ọbụla n'ihi na asụsụ ọbụla nwere aha, ngwaa, ụdaume na mgbochiume. Nwata ọbụla nwere ụzọ dị iche iche o si amụta asụsụ ọbụla site n'enyeamaka NMA n'ihi na asụsụ ọbụla nwere ebe dị ahụhụ na ebe ndị nwe ya nọ. Ya bụ na nwata ọbụla kwesiri ịmata ka e si asụ asụsụ ya nke ọma mgbe O ruru afọ ise maọbụ isii ma ọ bụrụ na nwata ahụ ahụta onwe ya na gburugburu ebe ndị maara asụ ya bụ asụsụ nke ọma nọ. Atụtụ a metụtara nchọcha a n'ihi na nwatakịrị ọbụla na-elegara ndị okenye maọbụ ndị nkụzi anya na mmụta asụsụ ya nakwa nkụzi na ọmụmụ asụsụ ọbụla nke ga-enyere ya aka ime ntụgharị mgbe ọbụla e nyere ya ọkachasi n'oge ule. Ọzokwa, atụtụ a metụtara nchọcha a n'ihi na asụsụ Igbo nke e ji eme nchọcha a nwere aha, ngwaa, ụdaume na mgbochiume.

Nchọcha A Hụrụ Anya

Ugwu na Onyishi (2016) mere nchọcha banyere nsogbu ụmu akwụkwọ sekọndịrị na-enwe n'ịtụgharị ederede Bekee gaa n'asụsụ Igbo n'okpuru ochịchị Igbo-Eze Saụwụtụ nke Steeti Enugwu. Ha jiri usoro miin wee hazie nchocha ha. Ha jiri ndị nkụzi Igbo dị iri abụo na isii na ụmụakwụkwọ SS 2 dị narị atọ na iri asaa na anọ wee mee nchocha ha. Ugwu na Onyishi (2016) chọpụtara na nchọcha ha na ụloakwụkwọ enweghi ezigbo ndị nkụzi ga-akụzinwu ntụgharị nke ọma bụ otu nsogbu a na-enwe n'ọmụmụ ntụgharị ederede Bekee gaa n'Igbo n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị. Ha chọpụtakwara na e nweghi ọtụtụ ngwa nkụzi maka ntụgharị so n'ihe na-ebute nsogbu n'ime ntụgharị site n'asụsụ Bekee gaa n'asụsụ Igbo. Nchọcha nke Ugwu na Onyishi nwere myiri na nchọcha nke a n'ihi na ha abụọ na-ekwu maka nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ụlọakwụkwo sekọndịrị. Ndịiche ha nwere bụ na nchọcha nke Ugwu na Onyishi mere gbadoro ụkwụ n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze Saụwụtụ dịka ebe nchọcha ha, ebe nchọcha nke a gbadoro ụkwụ n'okpụrụ ọchịchị Igbo-Etiti dịka ebe nchọcha. Okonkwọ (2010) mere nchọcha banyere nsogbu ntụgharị na usoro ya n'asụsụ Igbo na Koleji kedukeshọnụ dị na Parkishin nke Plateau Steeti. O jiri ụmụakwụkwọ dị iri atọ na-eme ọmụmụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ahụ wee mee nchọcha ya site n'inye ha ngwa nchọcha njụmaaza nke ha zakwara. Okonkwọ chọpụtara na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ụlọ akwụkwọ Parkshin bụ nke sitere n'akpaalaokwu, ụtọasụsụ na mkpụrụasụsụ. Nchọcha a nwere myiri na ndịiche di n'etiti ya na nke a na-eme ugbu a. Myiri dị na ha abụọ bụ na ha gbadoro ụkwụ n'ịchọpụta nsogbu a na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo. Ndịiche dị na ha abụo bụ na nchọcha nke Okonkwọ jiri Parkshin dị na Steeti. Plateau wee mere ebe nchọcha ya, ebe onye nchọcha a ga-eji okpuru ọchịchị Igbo-Etiti dị na Steet Enugwu wee mere ebe nchọcha ya. Eze (2012) mere nchọcha banyere nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ịza ajụjụ ntụgharị Igbo n'ule WAEC na NECO. Ebe ọ nọrọ mee nchọcha ya bụ n'Igbo-Eze Nọọtụ nke Steeti Enugwu. O jiri usoro Sọvee wee mee nchọcha ya. Ndị o jiri mee nchọcha ya bụ ndị nkụzi Igbo niile na ụmu akwụkwọ ndị nke nọ na SS 2. Eze (2012) chọpụtara na nsogbu ụmuakwụkwọ na-enwegasị n'ịza ajụjụ ntụgharị n'ule WAEC na NECO gụnyere ụkọ akwụkwọ e ji eme ntụgharị, enweghi ezigbo mmụta banyere asụsu abụọ a na-eme ntụghari na ha tinyere enweghi ezigbo ọzụzụ n'ebe ntụgharị dị. Nchọcha Eze na nke a na-eme ugbu a nwere myiri na ndịiche dị n'etiti ha. Myiri dị n'etiti ha abụọ bụ na ha na-eleba anya na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsu Igbo. Ha abụọ bụkwa na Steeti Enugwu ka ha abụo nọrọ mee nchọcha ha. Ndịiche dị n'etiti ha abụọ bụ na nchọcha nke Eze mere bụ n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze Nọọtụ ka o jiri mere ebe nchọcha nke a bụ n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti ka a nọrọ mee ya.

N'ime nchọcha a hụrụ anya ndị ahụ a tụlere, o nweghi nke e mere n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti. Ọ bụ nke a kpalitere ndị nchọcha ime nchọcha a n'ebe ahụ.

Usoro Nchọcha

Ụdị Nchọcha

Na nchọcha a, ndị nchọcha ji usoro Sọvee mee ya. Usoro Sọvee dịka Nworgu (2016) siri kọwaa bụ nke na-amụ maka ọtụtụ mmadụ maọbụ ọtụtụ ihe site n'inweta na ihazi ngwa mmụta (data) site n'ụfọdụ mmadụ maọbụ ihe nke nọchitere anya ndị ọzọ niile. Ọzọ, usoro Sọvee na-enye ọsịsa e nwetara n'aka ụmuakwụkwọ bụkwanụ nke a ga-eji chọpụta nke bụ eziokwu gbasara nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti na Steeti Enugwu.

Ebe Nchọcha

Ebe a nọ mee nchọcha a bụ n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti nke Steeti Enugwu. Isi ụlọọrụ Igbo-Etiti dị n'Ogbede. Onye si Enugwu na-aga Mahadum Naịjirịa Nsụka ga-ahapụ okpuru ọchichị Udị wee nweta Igbo-Etiti. Ọ bụrụ onye si ụzọ oyibo ochie, ọ ga-agafe Ụmụlumgbe tupu ọ bata Ukehe nke dị n'Igbo-Etiti. Onye si ụzọ oyibo nke ọhụrụ ga-agafe Ụmụọka wee bata Ogbede. A gachaa Igbo-Etiti, obodo mbụ a ga-enweta bụ Opi nke dị n'okpuru ọchịchị Nsụka. Akụ, Ohodo, Ọzalla na Obodo ndị ọzọ dịgasị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti. Aka ọru ndị Igbo-Etiti bụ ọrụ ugbo.

Ndị E jị Mee Nchọcha

Ndị e ji mee nchọcha bụ ụmụakwụkwọ ọnụọgụ ha dị puku abụọ na naarị ise na iri isii, ebe ụlọakwụkwọ ha dị iri na isii bụ nke onye nchọcha nwetara na 'Post primary School Management Board Ogbede Zonal Office' dị na Ogbede. Onye nchọcha họọrọ ụmụakwụkwọ ndị nọ n'ogo Sinịọ Sekọndịrị nke abụọ n'ihi na ha ka a na-akwadowe maka ule WAEC na NECO n'afọ na-abịanụ.

Nsere na Usoro Nsere

Ọnụọgụ ndị nchọcha seere dị nari abụọ (200). Nke a ka ndị nchọcha mere site n'iji usoro tụmbọm tụmbọm wee họpụta.

Ngwa Nchọcha

Ngwa nchọcha ndị nchọcha ji mee nchọcha a bụ ajụjụ ederede njụmaaza nke ndị nchọcha haziri n'onwe ha maka nchọcha a bụ nke a kpọrọ Njụmaaza Nsogbu Ụmuakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ogo Sinịọ Sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti (NNNNUNAISSI). Ndịna ya dị iri abụọ.

Ajụjụ ederede njụmaaza ahụ nwekwara ọsịsa nke gụnyere:

Ekwesiri m ike ịEIṅ akara anọ

Ekwere m (E).akara atọ

Ajụrụ m (A) akara abụọ

Ajụsiri m Ike (AI).otu akara

Usoro Nnweta Ihe Nchọcha

Ndị nchọcha gara n'ụlọakwụkwọ ndị e ji mee nchọcha wee kesaa ajụjụ ederede njụmaaza ndị ahụ n'etiti ụmụakwụkwọ. Ndị nchọcha gbara mbọ hụ na a nakọtara ajụjụ ederede njụmaaza narị abụọ ahu e nyere ụmụakwụkwọ.

Usoro Nhazi Ihe Nchọcha

N'ebe a, ndị nchọcha ji ngwa ntụcha miin wee hazie ihe a chọpụtara na ndịpụ n'izugbe (STD). Ọzọ, ọsịsa ajụjụ ọbụla nke erughi miin 2.5 bụ nke anabataghị na nchọcha, ebe nke ruru 2.5 gbagowe bụ nke a nabatara.

Nhazi Ihe A Chọpụtara

Tebul nke Mbụ

Ajụjụ Nchọcha nke Mbụ: Kedu etu olundị ndị nkụzi ji akụzi asụsụ Igbo si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?

Ọsịsa ụmụakwụkwọ nyere gbasara etu olundị ndị nkuzi si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo Etiti.

N = 200

Ọnụọgụgụ

Ndịna

EI

E

A

AI

Miin

S.D

Mkpebi

1.

Ọtụtụ ndị nkụzị ji naanị olundị Igbo-Etiti akụzị asụsụ Igbo nke mere na ụmụaka enweghi ike iji Igbo Izugbe mee ntụgharị

71

19

72

38

2.62

1.15

Anabatara

2.

Ọtụtụ ndị nkụzi amaghị asụ Igbo Izugbe nke mere ha ji ewebata asụsụ Bekee na nkụzi ha.

57

86

32

25

2.88

0.97

Anabatara

3.

Ụmụakwụkwọ na-aghọta Olundị Igbo-Etiti karịa Igbo Izugbe.

117

34

28

21

3.24

1.05

Anabatara

4.

Ọtụtụ ndị nkụzi na-agwakọrịta Olundị Igbo-Etiti na Igbo Izugbe.

103

65

19

13

3.29

0.89

Anabatara

5.

Ọtụtụ ndị nkụzi amaghị ihe di iche n'etiti olundị na Igbo Izugbe.

49

25

40

86

2.19

1.29

Anabatara

Mkpokotaọnụ Miin

2.8

Tebul nke mbụ na-egosi ọsịsa e nwetara n'ajụjụ nchọcha nke mbụ. Tebul a na-egosi na n'ime ndịna ise dị n'ajụjụ nchọcha nke mbụ, anọ bụ ihe nwere miin karịrị 2.5. Nke a na-egosi na etu olundị ndị nkụzi ji akụzị asụsụ Igbo si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti bụ na ọtụtụ ndị nkụzi ji naanị olundị Igbo etiti akụzi asụsụ Igbo nke mere na ụmụaka enweghi ike iji Igbo Izugbe mee ntụgharị, ọtụtụ ndị nkụzi amaghị asụ Igbo Izugbe nke mere ha ji ewebata asụsụ Bekee na nkụzi ha, ụmụakwụkwọ na-aghọta olundị Igbo-Etiti karịa Igbo Izugbe ya nakwa ọtụtụ ndị nkụzi na-agwakọrịta olundị Igbo-Etiti na Igbo Izugbe.

Tebul nke Abụọ

Ajụjụ Nchọcha nke Abụọ: Kedu ka mkpụrụokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekondịrị n'okpuru ọchịchi Igbo-Etiti?

Ọsịsa ụmụakwụkwọ nyere gbasara etu mkpụrụokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti.

Ọnụọgụ

Ndịna

EI

E

A

AI

Miin

S.D

Mkpebi

6.

Ọtụtụ ndị nkụzị ji mkpụrụokwu Olundị Igbo-Etiti anọchite mkpụrụokwu Igbo Izugbe dịka waa (mba), ụụtụ (ụtụtụ), leeke (lee) nke mere ha ji ada n'ule ha.

63

25

44

68

2.42

1.25

Anabataghị

7.

Ụmụakwụkwọ na-aghọta mkpụrụokwu Igbo-Etiti karịa nke Igbo Izugbe nke mere ha ji ewere ha eme ntụgharị n' asụsụ Igbo.

70

84

27

19

3.03

0.93

Anabatara

8.

Ọtụtụ ndị nkụzi na-agwakọrịta mkpụrụokwu Igbo Izugbe na nke Olundị Igbo-Etiti iji kụziere Ụmụakwụkwọ ihe ọmụmụ asụsụ Igbo.

89

39

30

42

2.88

1.19

Anabatara

9.

Ụmụakwụkwọ ji mkpụrụokwu Igbo-Etiti anọchite anya mkpụrụokwu Igbo Izugbe n'ime ntụgharị.

61

44

41

54

2.56

1.18

Anabatara

Mkpokotaọnụ Miin

2.7

Tebul nke abụọ na-egosi ọsịsa e nwetara n'ajụjụ nchọcha nke abụọ. N'ime ndịna ya dị anọ, atọ nwere miin gafere 2.5. Nke a na-egosi na etu mkpụrụokwu Igbo-Etiti si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekondịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti bụ na ụmụakwụkwọ na-aghọta mkpụrụokwu Igbo-Etiti karịa nke Igbo Izugbe nke mere ha ji ewere ha eme ntụgharị n'asụsụ Igbo. Ọtụtụ ndị nkụzi na-agwakọrịta mkpụrụokwu Igbo Izugbe na nke olundị Igbo-Etiti iji kụziere ụmụakwụkwọ ihe ọmụmụ asụsụ Igbo. Ọzọ kwa ụmụakwụkwọ ji mkpụrụokwu Igbo-Etiti anọchite anya mkpụrụokwu Igbo Izugbe n'ime ntụgharị.

Tebul nke Atọ

Ajụjụ Nchọcha Nke Atọ: Kedụ etu akpaalaokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?

Ọsịsa ụmụakwụkwọ nyere gbasara etu akpaalaokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti.

Ọnụọgụ

Ndịna

EI

E

A

AI

Miin

S.D

Mkpebi

10.

Ọtụtụ ndị nkụzị amaghị mpụtara ụfọdụ akpaalaokwu nke mere na ha anaghị akụzị ya nke oma.

62

24

50

64

2.42

1.23

Anabataghị

11.

Ọtutu ndị nkụzị anaghị ama mgbe ha kwesiri iwebata akpaalaokwu na nkụzi ha nke mere na ha na-agwakọrịta ya na nka asụsụ ndị ọzọ.

62

55

56

27

2.76

1.04

Anabatara

12.

Ọtụtụ ndị nkụzi anaghị akọwara ụmụakwụkwọ ihe akpaalaokwu pụtara.

41

46

57

56

2.36

1.09

Anabataghị

13.

Ụmụakwụkwo amaghị mpụtara akpaalaokwu n'asụsụ Igbo.

54

72

44

30

2.75

1.02

Anabatara

14.

Ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara akpaalaokwu na Bekee.

44

77

44

35

2.65

1.01

Anabatara

15.

Ụmụakwụkwọ na-ahụta akpaalaokwu dịka ihe adịghị mfe ịmụta nke mere na ha anaghị etinye uche n'ịmụ ya.

81

64

21

34

2.96

1.09

Anabatara

Mkpokotaọnụ Miin

2.7

Site n'ihe ngosi dị na tebul nke atọ, n'ime ndịna ya dị isii, anọ nwere miin gafere 2.5. Nke a na-egosi na etu akpalaokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti bụ na ọtụtụ ndị nkụzi anaghị ama mgbe ha kwesiri iwebata akpaalaokwu na nkụzi ha nke mere na ha na-agwakọrịta ya na nka asụsụ ndị ọzọ, ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara akpaalaokwu na Bekee nakwa ụmụakwụkwọ na-ahụta akpaalaokwu dịka ihe adịghị mfe ịmụta nke mere na ha anaghị etinye uche n'ịmụ ya.

Tebul Anọ

Ajụjụ Nchọcha nke Anọ: Kedu etu usoro okwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ogo Sinịọ Sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti?

Ọsịsa ụmụakwụkwọ nyere gbasara etu usorookwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti.

Ọnụọgụ

Ndịna

EI

E

A

AI

Miin

S.D

Mkpebi

16.

Ọtụtụ ndị nkụzị aghọtaghị mpụtara usorokwu Igbo nke mere na ha enweghị ike ịkụzi ụmụaka ime ntụgharị si na asụsụ Igbo gaa n'asụsụ Bekee.

74

25

24

77

2.48

1.33

Anabatara

17.

Ọtụtụ ndị nkụzị anaghị akụzi usorookwu Igbo nke ọma nke butere ihe nhiaahụ ụmụaka na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo.

65

43

34

58

2.58

1.22

Anabatara

18.

Ụmụakwụkwọ aghọtaghị mpụtara usorookwu Igbo

92

46

28

34

2.98

1.13

Anabatara

19.

Ọtụtụ ndị nkụzị amaghị iwu usorookwu n'asụsụ Igbo.

62

34

47

57

2.51

1.2

Anabatara

20.

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara usorookwu n'asụsụ Bekee nke mere na ha amaghị etu ha ga-esi mee ntụgharị si n'asụsụ Igbo gaa n'asụsụ Bekee.

87

44

24

45

2.87

1.2

Anabatara

Mkpokotaọnụ Miin

2.6

Site n'ihe ngosi dị na tebul nke anọ, n'ime ndịna ise dị nay a, anọ nwere miin gafere 2.5. Nke a na-egosi na etu usoro okwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti bụ na ọtụtụ ndị nkụzi anaghị akụzi usoro okwu Igbo nke ọma nke butere ihe nhịahụ ụmụakwụkwọ na-eme n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo, ụmụakwụkwọ aghọtaghị mpụtara usoro okwu Igbo, ọtụtụ ndị nkuzi amaghị uru usorookwu n'asụsụ Igbo nakwa ọtụtụ ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara usorookwu n'asụsụ Bekee nke mere na ha amaghị etu ha ga-esi mee ntụgharị si n'asụsụ Igbo gaa n'asụsụ Bekee.

Nkata N'ihe A Chọpụtara

Ajụjụ Nchọcha nke Mbụ

Ka olundị ndị nkụzi ji akụzi asụsụ Igbo si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti na steeti Enugwu

Nchọpụta e nwetara site n'ụsa ntụcha ngwa mmụta o mere n'ebe a nke gbadoro ụkwụ n'olundi ndị nkụzi ji akụzi asụsụ Igbo. E gosiri nke a na tebul nke mbụ ebe ndị e jiri mee nchọcha dị narị abụọ bụ ndị nọchitere anya ndị ọzọ gosiri na olundị nkụzi ji akụzị asụsụ Igbo bụ otu n'ime nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị. Ha gosikwara na ọtụtụ ndị nkụzi amaghị asụ Igbo izugbe nke mere ha ji ewebata asụsụ Bekee na nkuzi ha, nke a nwekwara miin 3.4. Ọzọ, ụmụakwụkwọ na-aghọta olundị Igbo-Etiti karịa Igbo Izugbe bụkwanu nke nwere miin 3.24. Na tebul mbụ a, ha gosikwara na ọtụtụ ndị nkụzi na-agwakọrịta olundị Igbo-Etiti na Igbo izugbe, nke a mere miin 3.29.

Nchọpụta a dabara n'echiche Nwode na Nweze (2015) nke ha sịrị na olundi na-emetụta nkụzi na ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo tụmadị mgbe a na-eme ntụgharị ma ọ bụrụ na e webata ya.

Ajụjụ Nchọcha Nke Abụọ

Etu mkpụrụokwu si bụrụ nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti

Dịka o siri metụta mkpụrụokwu e ji akụziri ụmụakwụkwọ ihe n'asụsụ Igbo, ndị nchọcha gosipụtara ọsịsa ụmụakwụkwọ na tebul nke abụọ. Ụmụakwụkwọ kwenyere na mkpụrụokwu bụ otu n'ime nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti. Ha gosipụtara nke a site n'ikwenye na ụmụakwụkwọ na-aghọta mkpụrụokwu Igbo-Etiti karịa nke Igbo Izugbe nke mere ha ji ewere ha eme ntụgharị n'asụsụ Igbo, nke a nwere miin 3.03.

Ha gosipụtakwara na ọtụtụ ndị nkụzi na-agwakọrịta mkpụrụokwu Igbo Izugbe na nke olundị Igbo-Etiti iji kuziere ụmụakwụkwọ ihe ọmụmụ asụsụ Igbo. Ụmụakwụkwọ gosikwara na ụmụakwụkwọ ji mkpụrụokwu Igbo-Etiti anọchite anya mkpụrụokwu Igbo izugbe n'ime ntụgharị. Nke a nwekwara miin 2.56.

Ajụjụ Nchọcha Nke Atọ

Ka Akpaalaokwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti

Nchọpụta e nwetara na tebul nke atọ na-egosi na akpaalaokwu bụ otu n'ime nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti. Nke a gosiri onwe ya site n'ọsịsa ụmụakwụkwọ nyere nke na-egosi na ọtụtụ ndị nkụzi anaghị ama mgbe ha kwesiri iwebata akpaalaokwu na nkụzi ha nke mere na ha na-agwakọrịta ya na nka asụsụ ndị ọzọ

Nke a nwere miin 2.7. Ha gosikwara na ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara akpaalaokwu n'asụsụ Igbo nke nwere miin 2.75. Ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara akpaalaokwu n'asụsụ Igbo nke nwere miin 2.75. Ụmụakwụkwọ gosikwara na ụmụakwụkwọ amaghị mpụtara akpaalaokwu na Bekee. Nke a nwere miin 2.65. Ọzọ, ha gosikwara na ụmụakwụkwọ na-ahụta akpaalaokwu dịka ihe adịghị mfe ịmụta nke mere na ha anaghị etinye uche n'ịmụ ya. Miin nke a bụ 2.96. Nchọpụta a dabara na echiche Eze (2012) nke kọwara na mgbe ọbụla e nyere ụmụakwụkwọ ederede, ọ na-ahịa ha ahụ inweta ụdị okwu ha ga-eji nọchite anya okwuntabire, agwụgwa maọbụ akpaalaokwu n'asụsụ nnataozi.

Ajụjụ Nchọcha nke Anọ

Etu usorookwu si bụrụ nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti

Site n'ihe e nyochara na tebul nke anọ, a chọpụtara na usorookwu bụ otu n'ime nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti. Nke a ka ụmụakwụkwọ gosipụtara site n'ọsịsa ha nyere banyere etu usorookwu si bụrụ nsogbu ha na-enwe n'ime ntụgharị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti. Dịka ha siri gosi, ọtụtụ ndị nkụzi anaghị akụzi usorookwu Igbo nke ọma nke butere ihe nhiahụ ụmụaka na-enwe n'ime ntụgharị n'asụsụ Igbo. Akara miin nke a bụ 2.58. Ha kwenyekwara na ụmụakwụkwọ aghọtaghị mpụtara usorookwu Igbo. Nke a nwere miin 2.98. Ụmụakwụkwọ gosikwara na ọtụtụ ndị nkụzi amaghị iwu usorookwu n'asụsụ Igbo. Akara miin nke a bụ 2.51. N'ikpeazụ, ha kwenyere na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ amaghị mpụtara usorookwu n'asụsụ Bekee nke mere na ha amaghị etu ha ga-esi mee ntụgharị n'asụsụ Igbo gaa n'asụsụ Bekee. Nke a nwekwara akara miin 2.88.

Mkpokọta

Nchọpụta nchọcha gosiri na nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị n'ogo Sinịọ Sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Etiti nke steeti Enugwu bụ:

  • Olundị ndi nkụzi ji akụzi asụsụ Igbo
  • Mkpụrụokwu Igbo-Etiti
  • Akpaalaokwu
  • Usorookwu

Ntunye Aro

Site na nchọpụta nchọcha a, ndị nchọcha tụrụ aro ndị a:

  • Gọọmenti ga-agba mbọ hụ na ndị nkụzi ha na-ewe n'ọrụ bụ ndị nkụzi mara maka asụsụ Igbo nke ọma, nke a ga-eme ka nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ime ntụgharị belata. Ndị nne na nna ga-agbakwa mbọ hụ na ha na-asụrụ ụmụ asụsụ Igbo n'ụlọ ha dị iche iche nke ga-eme ka ha new mmasị n'ebe asụsụ Igbo nọ ma tinye uche ha n'ịmụ ya.
  • Ndị nkụzi ga na-enye ụmụakwụkwọ ihe omume na ntụgharị iji mata ọnọdụ ha n'ihe gbasara ntụgharị ma gbaziere ha ebe o kwesiri.
  • N'ikpeazụ, gọọmenti kwesiri ịdị na-achịkọbara ndị nkụzi ọgbakọ kwa mgbe kwa mgbe ebe ha gana-amụ maka ihe ọhụrụ ga na-apụta ihe gbasara amụmamụ asụsụ Igbo nke ga-enyere ha aka ịkụzi asụsụ Igbo nke ọma ọ kachasị n'ime ntụgharị.

Nchịkọta Nchọcha

Nchọpụta nchọcha a gosiri n'izugbe na ụmụakwụkwọ na-enwe nsogbu dị iche iche n'ime ntụgharị nke mere na ha anaghị emecha nke ọma n'ule dị iche iche. Nke a mere o ji dị mkpa na ndị nkụzi ga-agba mbọ kụziere ụmụakwụkwọ nka ime ntụgharị nke ga-enye aka belata nsogbu ha na-enwe na ntụgharị.

Edensịbia

Agbedo, C.U. (2003). General Linguistics: An Introductory Reader. Enugu: Magnet Business Enterprises.

Anagbogu, P.N. et al (2010). Introduction to Linguistics (3rd ed.). Anambra: Amaka Dreams Limited.

Anozie, C.C. (2001). Ntọala Asụsụ Igbo na Edemede. Enugu: Amazing Grace Printing and Publishers.

Anọzie, C.C. (2007). Ntọala Asụsụ Igbo na Edemede. Enugu: Amazing Grace Printing and Printing Company.

Bassnett, S. (2008). Translation studies. USA: Routledge.

Chomsky, N. (1959). Review of B.F. Skinner Verbal Behaviour language. The Hague: mouton 35, 26, 26.

Eze, C.I. (2012). Nsogbu Ụmụakwụkwọ na-enwe n'ịza ajụjụ ntụgharị Igbo n'ule WAEC na NECO. Ngalaba mmụta Nkụzi Nkamma nke Mahadum Naịjirịa dị na Nsụka.

Federal Republic of Nigeria (2004). National Policy on Education. Lagos: NERDC Press.

Mbah, B.M., et al (2013). Igbo Adị: Igbo-English-English-Igbo Dictionary of Linguistics & Literary Terms. Enugu: University of Nigeria Press Limited.

Nida, E. (2001). Contents in translating. Amsterdam: John Beijamini Publishing Company.

Nwike, C.C. (2015). Usoro na Nsogbu a na-enwe na Ntụgharị Iduazi: Chike and the River dịka ebe mgbakwasị ụkwụ. Ngalaba Lingwistik, Igbo na Asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ. Fakọlti Aati, Mahadum Naịjirịa, Nsụka.

Nwode, P.C & Nweze, O.C (2015). Nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ide edemede Igbo n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchi Ezza north nke Steeti Ebonyi. Ngalaba mmụta nka Mahadum nke Naijirịa, Nsụka.

Nworgu, B.G. (2016). Educational Research: Basic issues and Methodology. Enugu: University Trust Publishers.

Oformata, C.E (2013). Ndezu Ụtọasụsụ Igbo: Nke ndị Sekọndịrị. Enugu: Format Publishers (Nig) Ltd.

Okonkwo, O.C. (2010). Ntụgharị na nsogbu ntụgharị n'asụsụ Igbo. Edemede a gụpụtara n'ogbakọ ISA (Igbo studies Assocaition). University of Nigeria, Nsukak. 12-15 October.

Robinson (2007). Becoming a translator: An introduction to the theory and practice of translation. London: Routledge.

Schaffner, C. (2007). Politics in translation. In P. Kuhiwezak, and K. Littau (Eds), A Companion to translation (pp. 134-147). UK: Multilingual Matters Ltd.

Skinner, B.F. (1957). Verbal behavior. New York: Appleton.

The West African Eụaminations Council (2006). Chief Eụaminers' Reports - Nigeria. Lagos: WAEC.

The West African Eụaminations Council (2017). Chief Eụaminers' Reports Nigeria. Lagos: WAEC.

Ugwu, C.N. na Onyishi, A.N. (2016). Nsogbu ụmụ Akwụkwọ Sekọndịri na-enwe n'ịtụghrị ederede Bekee Gaa n'asụsu Igbo n'okpuru ọchịchị Igbo Eze Sawụtụ nke Steeti Enugwu: Ngalaba nke edukeshọn mahadum Naịjirịa, Nsụka.

Ntule Mbụrụ Metutara Ajọ Ndụ Gbasara Ịgba Akwụna Na Nsirihụ Ndị Igbo

Ezemọka, Augustina Ekwy¹

Igbo department

Fct college of education, zuba-abuja

&

*Ahamefula, Ndubuisi Ogbonna²

Department of Linguistics, Igbo & Other Nigerian Languages,

University of Nigeria, Nsukka

&

Eze, Maudline Adaora³

Department of Linguistics and Literary Studies

Ebonyi State University, Abakaliki, Ebonyi State

&

Okoye, Chinenye Loyce

Department of Languages and Linguistics/Chinese Studies

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Anambra State.

*corressponding author email: ndubuisi.ahamefula@unn.edu.ng

Ụmịedemede

Nchọcha a lebara anya na mbụrụ metụtara ajọ ndụ gbasara akwụna. Mbunuche ndịchọcha bụ ịchọpụta mbụrụ dị iche iche metụtara ajọ ndụ gbasara ịgba akwụna, ya na nsirihụ ndị Igbo gbasara ya. A gbakwara mbọ nyochaa mbụrụ ndị ahụ a chọpụtara iji chọpụta ihe ntụnyere ndị ahụ e jiri gosipụta nghọta nụrụnuche. ndịchọcha lebakwara anya ịkọpụta udịrị mbụrụ nke mbụrụ ndị ahụ dabara n'ime. Atụtụ ndịchọcha gbadoro ụkwụ mee nchọcha yabụ atụtụ njirimee. Usoro a gbasoro were nweta data ụfọdụ ndị ahụ bụ site n'ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ okenye ndị Igbo bi n'Abuja. ụfọdụ mbụrụ a chọpụtara gbasara ajọ ndụ dịka o si metụta ịgba akwụna bụ ndị a: ịbụ nkita, o ji ike eke, ọkamma n'akwa, ọnọ na di achọ di, ọku elu, ejighi anya ahụ nwoke, ejighị anya ahụ nwaanyị, ịchụ nwaanyị, ụkwụ ịdị n'ama, anya ịdị n'ama, ịtụfu ụkwụ na ọkụ enu. A chọpụtara na ụdịrị mbụrụ ndị ahụ a chọpụtara bụ mbụrụ ngwakọ, mbụrụ ke echiche, ke nnọrọonwe na mbụrụ ke mmepụta. Site na nchọchacha a, ndịchọcha chọpụtara na ndị Igbo na-eji ọtụtụ ihe nụrụanya were gosipụta nghọta ṅhụrụnuche.N'ikpeazụ,ndịchọcha tụrụ aro ka ndị ọkammụta gbaa mbọ depụta ọtụtụ akwụkwọ na nọwaokwu ndị ga-enye aka maka ndị ga-eme nchọcha n'ihe ọmụmụ a n'ọdịnihu. Atụkwara aro ka ndị ome nchọcha nyochaa ụdịrị ajọ ndụ ndị ọzọ bụ nke ndị Igbo kpọrọ asị.

Mkpọlite

Amụmamụ ncheke na-esite n'ihe nhụrụanya na gburugburu gosipụta ihe e bu n'uche. Mbụrụ nwere nsara uche n'amụmaamụ ncheke n'ihi na a na-esi na ya aghọta maọbụ tapịa ahịrịokwu. Ndị Igbo bụ ndị nwere nsọ na omenala. O nwere ọtụtụ ihe bụ ndị nke ha na-arọ anya ma a na-elegakwara anya dịka ajọ akparameagwa. Ha na-eji ihu gbarụrụ agbarụ na obi jupụtara n'iwe na-ele onye na-ebi ajọ ndụ ọ kachasị onye na-agba akwụna. Ndị Igbo dịka ndị nwere omenala na nsọ mmadụ ekwesịghị ibi ndụ etu ọbụla masịriị ya. ọtụtụ ndị Igbo anaghị ekwe ka ha na onye na-agba akwụna na-emekọ ihe. N'ihe gbasara isiokwu a, o nweela ọtụtụ ihe ndị ome nchọcha ụfọdụ merela gbasara 'ajọ ndụ'. A chọpụtara na o nwere ụdị ndụ ndị mmadụ na-ebi bụ nke ndị mmadụ weere dịka ndụ adịghị mma dịka mmadụ ịgba akwụna. ọtụtụ ndị mmadụ emeela nchọcha gbasara ịgba akwụna na a kọwa ọtụtụ ihe gbasara ya mana o nwebeghị ihe e meerela na ya dịka o si metụta amụmamụ ncheke.

Na nchọcha nke Gungul na Audu (2014) mere gbasara ịgba akwụna dịka ajọ ndụ na Naịjirịa na ihe ndị so ya, ha chọpụtara na ịgba akwụna bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-eme maka inweta ihe onyinye dị iche iche. Ha chọpụtakwara na ọ na-eme ka ịbagide mmadụ n'ike maka mmekọ nwoke na nwaanyị belata. Ha kọwara na ịgba akwụna na-emechu obodo ihu. N'aka nke ọzọ, Iherue (2011) mere nchọcha gbasara ihe na-ebute ajọ akparamagwa n'ala Igbo bụ nke ịgba akwụna bụ otu n'ime ha. ọ chọpụtara na o bụrụ mgbe ochie na onye ọbụla e jidere n'ụdị agwa a na onye ahụ bụ onye obodo ga-amapụ ruo mgbe onye ahụ kpụrụ arụ, mana ọ dịzịghị etụ ahụ ugbu a.

Na nchọcha nke Eme, Mbagwụ na Mmadike (2016) mere maka ilu na ofufu nke mbụrụ. Ha chọpụtara na ọ bụ naanị ndị okenye na-eji mbụrụ ezipụta ilu n'oge ugbu a, ya bụ n'ụdị iji ihe nhụrụ anya were tụọ ilu. E mekwaala ọtụtụ nchọcha gbasara mbụrụ mana ọ bụghị n'ụdị ọ siri metụta nzipụta ịgba akwụna.

Ọ bụ n'ihi nke a ka ndị nchọcha jiri hụ na ọ dị mpka ime nchọcha n'isi okwu a ma ịchọpụta mbụrụ ndị ahụ metụtara ajọ ndụ gbasara ịgba akwụna. Ndịnchọcha ga achọpụta etu ndị Igbo si eji nsara echiche were ihe nhụrụanya mee ka a ghọta ihe nhụrụnuche gbasara ajọ agwa gbasara ibi ndụ akwụna. A ga-agbakwa mbọ chọpụta ụdịrị mbụrụ ịgba akwụna dabara na ya.

Ntụlegharị Agụmagụ

Nkọwa Okwu Njirimee

Ajọ Ndụ

Ndị Igbo anaghị eji ezigbo anya ele onye na-enupu isi maọbụ onye agwa ya anaghị adaba dịka o si metụta usoro obibi ndụ ndị Igbo. Ajọ ndụ dịka Anọzie (2003) kọwara bụ mmadụ ime ihe ndị ahụ adabaghị n'usoro nke obibi ndụ obodo ọ nọ n'ime ya. Ndị Igbo anaghị ekwe ka ha na onye na-ebi ajọ ndụ na-emekọ ihe. Nke a pụtara na a ne-eze onye na-ebi ajọ ndụ eze dịka omenela Igbo sịrị dị. Ndị Igbo na-ahụta onye na-ebi ajọ ndụ dịka onye merụrụ ala n'ihi na dịka Olisa (1972) siri kwuo, ọ sịriị na ihe ndị Igbo weere dịka ihe ha na-atụ ụjọmaka ụdi obibi ndụ ha bụ 'ala' maọbụ 'chi' ha na-efe. ọ kọwakwara na ataramahụhụ na-adịrị onye merụrụ ala maọbụ onye mere ihe ọjọọ. Olisa gara n'ihu kọwaa na mgbe ụfọdụ, ndị Igbo na-ata onye ahụ ahụhụ iji gosi na ha akwadoghị ihe onye ahụ na-eme. Oge ụfọdụ a na-eji njakịrị maọbụ atụmatụokwu eme ka onye ahụ mata na agwa ya adịghị mma.

Ụfọdụ agwa maọbụ ụdịrị ndụ ndi Igbo na-ahụta dịka ajụ ndụ dịka Anọzie (2003) kọwara bụ, ịkwụ ụdọ, ịgba akwụna, ite ime, izu ohi, ịtọ mmadụ, ịgba asịrị, ịtụ asị, ịnụbiga mmanya oke, ite ime, igbu mmadụ, ikwo ekworo, na otụtụ ndị ọzọ bụ agwa ndị Igbo na-ahụta dịka imerụ ala.

Nchọpụta na-akọwa maka ajọ ndụ nke ụfọdụ ndị mmadụ deerela maka ya bụ nke nyere aka maka nchọcha a, mana ndịnchọcha hụrụ ajọ ndụ dịka agwa mmadụ na-akpa bụ nke megidere odịnaala, okpukpe na ụzọ obibi ndụ nke obodo onye ahụ nọ n'ime ya. N'ịga n'ihu, na ajọ agwa maọbụ omume a bụ nke onye ahụ anaghịzị ezo ezo.

Igba Akwụna

{gba akwụna bụ nke Alobo na Ndifon (2014) kọwara dịka agwa nke metụtara mmekọ nwoke na nwaanyị. Ha kọwara na nke a na-apụta ihe mgbe nwoke na nwaanyị abụghị di na nwunye na-enwe ụdị mmekọ a ọ kacha n'ụzọ iji nweta ego maọbu inweta ihe onyinye dị iche iche.

Nwangama (2005) n'aka nke ya kọwara ịgba akwụna dịka mmadụ iji ahụ ya gbaa mgbere maka inweta ego maọbụ ihe onyinye ndị ọzọ n'ụdị mmekọ nke anụ ahụ bụ nke nwere ike ịdị n'etiti nwoke na nwaanyị abụghị dị na nwunye. O kwukwara na ụdị mmekọ a nwere ike ịbụ n'etiti nwaanyị na nwaanyị maọbụ nwoke na ibe ya.Alobo and Ndifon (2014) gara n'ihu kọwaa na ụfọdụ ihe na-ebute ịgba akwụna bụ ihe ndị a: nne na nna ileghara ụmụ ha anya, anya ukwu, ogbenye, ndị na-achọ ka ha gbaga oyibo n'ike, ngana, ụkọ ọrụ, dg.

Kempada na Doezema (1998) gakwara n'ihu kọwaa na mgbe ụfọdụ ihe akwụna na- eweta bụ ịmụ nwa aghara aghara, ibute ajọ ọrịa dị iche iche dịka ọrịa obiri n'aja ọcha na ọrịa mmịnwụ na ọtụtụ ndị ọzọ. Nkọwa niile ndị ọkammụta a mere banyere akwụna dị ezigbo mkpa ime ka akọwa banyere ịgba akwụna pụta ihe. Mana ndịchọcha na-akọwa igba akwụna dịka mmadụ iji onwe ya gbaa mgbere n'ụdi mmekọ nwoke na nwaanyị abụghị di na nwunye maka inweta ihe onyinye ndị agaghị abara ha uru n'ọdịnihu.

Mbụrụ

Mbụrụ dịka Crystal (2008) siri kọwaa bụ atụtụ nke metụtara ncheke nghọtaokwu bụ nke na- eji otu ihe egosi nghọta dị n'okwu maọbụ ihe ọzọ. ọ gara n'ihu kọwaa na mbụrụ nwere ike ime ka e si na nghọta otu ihe banye na nghota ihe ozo.Lakoff na Johnson (1980) kọwara sị na mbụrụ na-egosi etu mmadụ si eche echiche, ya na etu mmadụ si ahụta otu ihe dịka ihe ọzọ. Ọ gakwara n'ihu kọwaa na mbụrụ na-egosi etu mmadụ si akọwa ihe gbasara ụwa na akparamagwa mmadụ.

Mbah na ndị ọzọ (2013) kọwara mbụrụ dịka atụmatụokwu e nwere n'asụsụ bụ nke e ji ekwu okwu n'ụzọ mkpuke. Ha gara n'ihu kọwaa na iji mbụrụ kwuo okwu maọbụ gwa mmadụ okwu na-eme ka ihe a na-ekwu ghara ibutere mmadụ na ibe ya esemokwu maọbụ tinye onye kwuru okwu na nsogbu. Eme, Mbagwụ na Mmadike (2016) kwuru na mbụrụ bụ nghọta okwu nke na-arụtụ aka n'ihe abụọ yiri onwe ha. Na nkọwa, ha na-egosi na a na-esi na nghọta otu ihe nweta nghọta ihe ọzọ. Nke a bụ iji kwado ihe Lakoff (1987) kwuru. Ọ kọwara na e nwere ụzọ echiche abụọ bụ nke mbụrụ na-enye. Otu nghọta na-egosi echiche nsinebe, ebe nke ọzọ na-egosi echiche nchụta. Ha gara n'ihu kọwaa na echiche nsinebe ne-egosi ihe nhụrụ anya bụ nke a na-esi na ya enweta echiche nchụta bụ nke ne-egosipụta nghọta nhụrụnuche.

N'aka nke ọzọ, Ezeomeke (2004) kwuru na mbụrụ na myiri yitere onwe ha, mana naanị ebe ha nọrọ dị iche bụ na mbụrụ na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ, ebe myiri na-akọwa na otu ihe dika nke ọzọ. N'ezie ọtụtụ ndị mmadụ enyela nkọwa gbasara mbụrụ, mana ndịchọcha n'aka nke ha na-ahụ mbụrụ dịka atụmatụ okwu ndị ahụ a na e ji mkpụrụokwu maọbụ nkebiahịrị ezipụta ihe maọbụ agwa iji mee ka nghọtanhụrụnuche bụrụ nke a gbara n'anwu. Mbụrụ dịka nghọta yi siri dị n'ihe ọmụmụ ncheke asụsụ bụ maka imepụta okwu ọhụrụ na echiche dị na ya. O nwekwara ike bụrụ okwu ga-agbatịwanye nghọta dị n'okwu ụfọdụ.

Ụdị Mbụrụ dị iche iche

Richard (2018) chọpụtara na e nwere ọtụtụ mbụrụ dị iche iche. O kwuru na nke ọbụla n'ime ha nwere njirimara ha. Udịdị mbụrụ ndị ahụ bụ ndị a:

Mbụrụ Nnọrọonwe

ụdi mbụrụ a bụ nke a na-ahụ mgbe ọ na-ahịa ahụ ịchọpụta ihe nke e jiri mado na nwanne ya iji mepụta nghọta nhụrụnuche.

Mbụrụ Mgbagwo

Nke a bụ ụdị mbụrụ nke a na-enweta nghọta nkịtị ya site n'iwebata ọtụtụ ihe nsinebe.

Mbụrụ ke Echiche

Ụdịrị mbụrụ a bụ nke a na-esi na nghọta otu ihe nweta nghọta ihe ọzọ.

Mbụrụ Ke Mmepụta

Nke a bụ ụdịrị mbụrụ nke agbaghị onwe ya n'anwụ dịka atụmatụ okwu.

Mbụrụ nwụrụ Anwụ

Ụdịrị mbụrụ a bụ ụdị atụmatụụokwu nke e jizighị arụ ọrụ maọbụ nke anaghịzi enye ezigbo nghọta maọbụ echiche n'ihi na oteela aka e ji ya rụọ ọrụ

Mbụrụ Kemgbatị

Ụdị mbụrụ a na-apụta ihe mgbe e ji ihe abuo eyighị onwe ha were atụnyere ibe ya n'ime ahịrịokwu ufọdụ dị na nkeji edemede maọbụ n'ọgbara abụ ụfọdụ.

Mbụrụ Ngwakọ

Ụdịrị mbụrụ a bụ nke ihe nsinebe na nke nchụta ya anaghị enwe myitere ma ncha.

Ké Nsipụta

Mbụrụ dị e tua bụ nke na-enye mmadụ nghọta n'ihe gbasara ụwa na ntapịa ihe bụ eziokwu n'ụwa

Mbụrụ Ke Ndịnime

Ụdị mbụrụ a bụ ụdịrị nk nsinebe ya na nsinebe ya anaghị agba onwe ha n'anwụ, kama a na-esi na nghọta otu n'ime ha enweta nghọta nke ọzọ. Nghọta otu n'ime ha anaghị apụta ihe nke ọma.

Mbụrụ Nhụrụanya

Mbụrụ a bụ ụdịrị nke a na-eji ihe eserese were nọchie anya mmadụ, anụmanụ, ebe maọbụ ihe; mana ihe eserese ahụ bụ nke a tụrụ anya na ọ ga-enwe ihe a ga-arụtụ aka bụ ebe o yiri ihe ahụ ọ na-anọchi anya ya.

Ntụlegharị Atụtụ

Nwanchọcha tụlere atụtụ ncheke ụfọdụ iji chọpụta atụtụ nke kacha mma, bụ nke nchọcha a ga-agbado ụkwụ na ya, ụfọdụ atụtụ ndị ahụ gụnyere ndị a:

Atụtụ Nsinụbụrụ (Mbumpụtaụwa)

Ndị tụpụtara atụtụ a dịka Mbah (2018) siri kwuo bụ Zellig Haris, L. Pavlov, Leonard Bloomfield na ndị ọzọ n'afọ 1951. Ndị otu a kọwara na asụsụ abụghị ebumpụta ụwa na o nweghị ihe dị n'okpokoro isi mmadụ tupu a mụọ ya. Ha kwenyere na ka nwata ahụ na-eto, ọ na-enweta ntụzi ake asụsụ site n'ihe ndị ọ na-eṅomi na gburugburu ya. ọ bụ ụzọ dị etu a ke o si amụta asụsụ. Ndị tụpụtara atụtụ a kọwara na nwatakịrị na-amụta asụsụ site na njali na kwunkwugha nke sitere n'aka ndị mụrụ ya na ndị na-eku ya. Ndị otu a hụrụ amụmamụ asụsụ dịka njali na nzaghachi bụ nke nwata na-eme mgbe a kpaliri umere maọbụ umezi ya. Ndị otu atụtụ nsinibụrụ a kọwara na a na-eme ka nwata gbalịa kwugharịa mgbe o nwetaghị ihe a chọrọ ka o kwuo. Ha kọwara na-echiche ihe ọbụla nwere bụ enyo ihe ahụ na-akpalite n'echiche mmadụ mgbe ọbụla a kpọrọ ihe ahụ aha.

Atụtụ a bara uru n'ihi na ọ na-enye aka ịkọwapụta ihe gbasara mkpọaha na ihe n'ihe a na-ahụ anya, nke a bụ maka na mgbe a kpọrọ ihe ahụ aha enyo ya ga-abia onye ahụ n'uche. Atụtụ a rikwara mperi n'ihi na ọ bụghị ihe niile a kpọrọ aha nwere enyo uche nke mmadụ mwere ike ịghọta. Ọzọ, mmadụ abụọ maọbụ karịa anaghị enwe otu enyo nghọta gbasara otu ihe.

Atụtụ nsinagburugburu

Dịka Mbah (2018) si kwuo, atụtụ nsinagburugburu bụ nke Noam Chomsky na Zellig Haris tụpụtara. Ọ gbaghara atụtụ nke nsinubụrụ. Ọ kọwara na nwata ọbụla a mụrụ na-ebu ngwa mmụta asụsụ apụta ụwa. Chomsky kọwara na nwata ọbụla, na-agbanyeghi ebe a mụrụ ya maọbụ ndị nọ ya gbugburu na amụta asụsụ ma kwuo okwu n'ihi akụkụ ụbụrụ ya bụ nke chineke kere maka isụ asụsụ. Chomisky kpebiri na e nwere enyo n'ụbụrụ isi mmadụ bụ nke e ji ahụta asụsụ maọbụ amụta ya na-agbanyeghị ma a kụziri onye ahụ maọbụ na a kụzighị ya.

Usoro ọmụmụ asụsụ atụtụ a na-agbaso bụ usoro kwunkwukwa nke bụ usoro njali na nzaghachi. Ndị otu atụtụ a kọwara na njali na nzaghachi na aha nhata nha. Atụtụ a bara uru n'ihi na a na-esi na ya amata ihe dị n'zbụrụ mmadụ. N'aka nke ọzọ, atụtụ a riri mperi dịka ndị ọka mmụta siri kwuo n'ihi na o nweghị mgbe usoro izugbe omume ihe na ọsịsa ya ga-esi gaa ihu na ihu. Ndị mmadụ katọrọ atụtụ a n'ihi na ọ kọwaghị ihe mere ụmụaka niile ji amụta asụsụ n'otu oge na-agbanyeghị n'ebe a mụrụ ha maọbụ asụsụ a mụnyere ha na ya.

Atụtụ Ndịna Ncheke

Atụtụ a bụ nke Lakoff na Johnson tụputara n'afọ 1980. Ndị otu a tụpụtara atụtụ a iji mezie mgbagharị anya bụ nke dapụtara n'etiti ndị atụtụ nsinụbụrụ na ndị nke nsinagburugburu. Ha gara n'ihu kọwaa na tupu a mata echiche okwu ọbụla, na a gaghị elefere ọrụ ụbụrụ na gburugburu anya. Ha na-akọwa na nsirinhụ ndị otu abụọ a dịcha mkpa n'ọmụmụ na nghọta asụsụ. Lakoff na ndị otu ya kọwara na ngwa ịmụta asụsụ bụ nke mmadụ buru pụta ụwa bụ nke ga-enyere ya ake ịmụta na ịghọta asụsụ mgbe ihe dị na gburugburu ya kpaliri ya.

Lakoff na ndị otu ya tụrụ atụmatụ atọ gbasara etu asụsụ si arụ ọrụ. Ha bụ ndị a: nke mbụ bụ ịchọpụta ihe bụ eziokwu n'ekwumekwu. Ha kwuru na a na-achọpụta nke a site n'ịchọpụta ma isiokwu dị n'ahịrịokwu ọ bụ nke dị n'ọnọdụ e jiri kwuo ya. ọzọ bụ ịchọpụta ma echiche okwu ọ bụ ihe ahụ a na-ahụ anya. Nke ọzọ abụrụ nke ịhụta eziokwu izugbe. Iwu nke a na-ekwu na onye ọbụla nwere etu o si amata ihe bụ eziokwu n'ụbụbọ.

Ọ bụ ihe ndị a mere ha jiri kpebie na ngwa ịmụta asụsụ dị nnukwu mkpa n'ụbụrụ mmadụ maka iji nabata ihe a kụziri ya ọkachasi mgbe ihe dị na gburughuru ya kpaliri ngwa mmụta ya.

Atụtụ Njirimee

Atụtụ ncheke ọzọ pụtara ihe bụ atụtụ njirimee. Ndị tụpụtara ya bụ Ludwig Wittgenstein na Paul Horwish. Dịka Umezi (2017) siri kọwaa, o kwuru na o nwere akwụkwọ Wittgewtein dere n'afọ 1953 bu nke ọ kpọrọ phisophical investigation. Ọ kọwara na ọ bụ n'ime akwụkwọ ahụ ka Wittgenstein nọrọ tụlee ihe jikọtara owku ọbụla na akụkụ ụwa ebe a nọrọ kwuo ya. Ọ chọpụtara na echiche okwu ọbụla pụtara ihe ndị nwe ya ji ya eme maọbụ ihe ha nwere ike iji ya mee ma ọ bụkwanụ usoro ha nwere ike ịgbaso mgbe ha chọrọ iji ya mee ihe n'asụsụ ha. Udemmadụ (2018) n'aka nke ya kwadokwara atụmatụ a mgbe o kwuru sị na mpụtara okwu ọbụla na-esite etu agbụrụ nwe asụsụ ahụ siri hụ ya.

Umezi (2017) gakwara n'ihu kwuo na Horwish dọnyere atụtụ a ukwu n'ime akwụkwọ ya ọ kpọrọ Truth. Umezi kwuru na ọ bụ n'ime akwụkwọ a ka ọ nọrọ kwado atụtụ a mekwuo na ihe dị mkpa n'echiche okwu ọbụla gbadoro ụkwụ n'ihe ndị nwe asụsụ ahụ o di na ya eme. Ọ gara n'ihu kọwaa na ịga nyochawa ma okwu ahụ a bụ eziokwu ma ọ bụghị bụ nke adịghị mkpa.

Uru dị n'atụtụ a dịka Ibeh (2017) siri kọwaa bụ na ọ na-ewepụta echiche na nsirihụ mba dị iche iche. N'ihi uru dị n'atụtụ a, a ka ji ya arụ ọrụ ruo taa. N'agbanyeghị uru nke atụtụ a, ndị ọkammụta kọchara ya. Ha kwuru na ebe ọ bụ na atụtụ a na-egosi na echiche okwu ọbụla bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme n'asụsụ ha, atụtụ a enyeghị ohere maka asụsụ abụọ ji otu ihe eme ihe dị iche iche n'otu oge. Ọzọ kwa ha kọchara ya were sị na echiche nwere ọdịdị nnọrọ onwe nke emetụghị ọnọdụ ya n'asụsụ maọbụ n'atụmatụ okwu.

Atụtụ Emereeme Nsinokwu

Atụtụ a bụ nke na-akọwa na okwu na-enwe echiche miri emi bụ nke nwere ike izo n'ime ahịrịokwu bụ etu o siri pụta ihe n'asụsụ ọ dị n'ime ya. Atụtụ a kọwakwara n'ike di n'okwu ọnụ mmadụ. Iji kwado atụtụ a, Bach na Harnish (1979) kwuru na atụtụ a nyere ezigbo aka ime ka a mata na ihe dị n'okwu abụghị ihe okwu ahụ na-egosipụta kama na ọ bụ ihe ndị nwe asụsụ okwu ahụ dị n'me ya mere oge e kwuru ya.

Ndị ọkammụta ụfọdụ dịka Udemmadụ na Umezi (2017) ekwechaghị n'atụtụ a n'ihi na ha kọwara n'ụfọdụ oge, agwa nghọta okwu nke okwuu kwuru anaghị adịcha mfe, nke a bụ maka na ịghọta ihe o kwuu na-ekwu na-esi n'ọnọdụ nkata nakwa gburugburu ọ nọ na ya. Ụfọdụ ndị ọkammụta katọrọ atụtụ a n'ihi na ọ nwere iwu dị iche iche na-achị ya. Ha kwuru na ebe iwu dị mkpa bụ n'amụmamụ ụtọasụsụ na usoro ahịrịokwu, mana ọ bụrụ n'amụmanụ ụbụbọ na ọ bụ ntụziaka ka o ji arụ ọrụ.

Atụtụ Nchọcha

Site na ntụlegharị nchọcha nke ndịnchọcha mere, ha chọpụtara na ọ dị mkpa ka nchọcha isiokwu a gbado ụkwụ n'atụtụ njirimee n'agbanyeghị ụfọdụ mperi bụ nke ndị ọkammụta asụsụ ụfọdụ kwuru na atụtụ a nwere. Ihe kpatara nwa nchọcha jiri họrọ atụtụ a bụ maka na nchọcha a gbadoro ụkwụ na nkwenye atụtụ njirimee.

Nchọcha a ga-erita elele n'atụtụ njirimee n'ihi na atụtụ a na-akọwa na echiche okwu ọbụla bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme n'asụsụ ha. N'ihi nke a, anyi maara ndị Igbo dịka ndị na-ekwu okwu n'ụzọ mkpuke iji mepụta mbunuche ha oge ụfọdụ. Ya mere ha na-eji ọtụtụ ihe ndị nhụrụnanya bụ ndị emetụtaghị ihe ha na-ekwu maka ya were ya gosipụta nhuụrụnechiche ha.

Ntụlegharị Ihe E Meerela N'isiokwu

Ọ bụ ebe a ka nwanchọcha ga-eleba anya ma tụlee ụfọdụ nchọcha ndị mmadụ merela gbasara isiokwu nchọcha ya. ọ bụ nke a ga-enye ya mgbakwasa ụkwụ maka ime ihe nchọcha nke ya. Gungul na Audu (2014) na nchọcha nke ha mere banyere ịgba akwụna na ihe ọjọọ ọ na-eweta na ndụ mmadụ bụ nke ha mere ka a mata na obodo dị iche iche nwere iwu dị iche iche ha nwere iji megide ịgba akwụna. Ndị nchọcha a chọpuụtara na ọ bụ ezie na ndị na-agba akwụna na-eche na ha na-enweta elele maka ụdị ndụ ha chọrọ ibi nakwa akụ na ụba ha na-enweta na ya mana ajọ agwa a nwere ike ịdọghachi ụmụmwanyị azụ na mbọ ha na-agba n'isonye maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo nakwa iketa oke ruuru ha. Ndị nchọcha a tụpatara aro ka ndị ọchịchị gbaa mbọ hụ na ọrụ bụ nke ga-agbara ndị mmadụ kasaa. Ha kwukwara na ọ dị mma ka a na-akụziri ndị mmadụ ihe gbasara mmekọ nwoke na nwanyị ma hapụ ịdị na-ezo ihe gbasara ya ezo.

Nchọcha a bara uru n'ihi na o gosiri na ịgba akwụna bụ agwa ọjọọ ma bụrụ nke ndị mmadụ na-agbarụrụ ihu maka ihe gbasara ya. Nke a gosiri na ọ bụghị naanị ndị Igbo kpọrọ ịgba akwụna asị. Ọ bakwara uru n'ihi na ọ tụpụtara aro ihe a ga-eme iji mee ka ndị mmadụ hapụ ibizi ndụ ịgba akwụna. Ha kwuru na inye ndị mmadụ ihe ọmụmụ gbasara mmekọ nwoke na nwanyị ya na ime ka ọrụ bụrụ nke ga-eju ebe niile. ọ bụ nke a ga-eme ka uche ha ghara ịgbaga n'ibi ụdị ajọ ndụ ahụ.

Nwangama (2005) na nchọcha nke o mere gbasara ihe bụ njọ na nkwenye na omenala ndị 'Ezza' na ụzọ e si akpụ arụ maka njọ ndị ahụ. ọ chọpụtara ọtụtụ ihe bụ ndị Igbo hụrụ dịka njọ ma kọwapụtakwa ụzọ dị iche iche njọ ndị a si emegide ọdịmma ndị mmadụ. Nwangama tụpụtara aro were kwuo na ndị 'Ezza' na-ahụ njọ na ajọ omume bụ nke ịgba akwụna so n'ime ya dịka 'nsọ anị'. Ya mere na ọ dị mma ka a katọọ ma nye onye merụrụ ala ezigbo ọpịpịa ka iwe Chukwu okike ghara ịdakwasa ha niile. O kwukwara na ọ dị mkpa ka ndị mbịambịa bi n'Ezza na-ebi ezigbo ndụ ghara ime 'nsọ anị' bụ nke megidere usoro obibi ha.

Nwangame tụpụtakwara aro were sị na ọ dị mma ka ndị nne na nna, ndị okenye, ndị otu ogbo na ndị nchekwa obodo bụrụ ndị ga-agba mbọ hụ na ụmụaka na ndị otu ọgbọ na-ebi ezigbo ndụ kwesịrị ekwesị ka ha ghara imebi 'omenana' ha. Nchọcha a bara uru n'ihi na o nyere aka kọwapụta ụfọdụ ihe ndị Ezza kpọrọ njọ bụ nke ịgba akwụna so n'ime ya. ọ gosikwara na ime ajọ ihe bụ nke obodo anaghị anabata ma na-agbarụkwa ihu maka ya.

N'ịga n'ihu, Eme, Mbagwụ na Mmadike (2016), site na nchọcha ha mere banyare ndabere nke ilu na-adabere na mbụrụ, ha kọwara na nghọta ilu nwere bụ nke na-apụta ihe site na nghọta okwu ndị nsinagburugburu bụ nke e ji egosipụta nghọta nhụrụnuche. Ha chọpụtakwara na ọ bụzị naanị ndị okenye na-eji mbụrụ atụ ilu n'oge ugbua, nke mere na mbụrụ bụ ihe na-achọ ifu n'ilu Igbo. Ha tụpụtara aro ka e nwee ndepụta maka mbụrụ Igbo. Nchọcha a bara uru n'ihi na ọ nyere aka kọwaa ihe mbụrụ nwere ike ime nke bụ isi n'ihe nhụrụnanya were nweta nghọta nhụrụnuche.

Site na nchọcha Ibeh (2017) mere maka ntụle ndị metụtara nzuzu na nsirihụ ndị lgbo na ndị Bekee. O jiri atụtụ njirimee were mee nyochaa mbụrụ ndị o nwetara. Ọ pụtara na echiche okwu ọbụla bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme n'asụsụ ka ọ bụ. Nchọcha a ga-enye aka na nchọcha nke a n'ihi na nwachọcha jiri atụtụ njirimee were mee nnyocha nke ya.

Nchịkọta Ntụlegharị Agụmagụ

N'isi nke a, ndịchọcha tụlere tụlere agụmagụ dị iche ice ndị mmadụ deerela bụ ndị nke metụutara isiokwu nchọcha a. ndịchọcha lebara anya n'okpụrụkpụ okwu ndị e jiri mere isiokwu. Agụgmagụ ndị dị etua bụ ndị nke metụtara ihe ndị mmadụ meerela gbasaraịgba akwụna mbụrụ na ụdị mbụrụ dị iche iche. ndị nchọcha tụlekwara ụfọdụ atụtụ ndi metụtara isiokkwu nchọcha ya. Ebumnuche nwa nchọcha bụ iji chọpụta ihe ndị mmadụ meerela gbasara isiokwu a iji mara ebe ọ ga-awudo ụkwụ.

Usoro Nchocha Udidi Nchocha

Nchọcha a bụ nchọcha soveyi. Aga-eleba anya na mbụrụ metụtara ajọ ndụ dịka ọ si metụta ịgba akwụna na ka Igbo siri hụ ya. A ga-agbaso atụtụ njirimee iji were nye nkọwa mbụrụ ndi ahụ maka imejupụta ebumnobi nchọcha a.

Ngwaọrụ nchọcha

Ngwaọrụ e ji mee nchọcha a bụ akwụkwọ dị iche iche e dere n'ihe yitere isiokwu nchọcha a ya na ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ ndị okenye ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị Igbo bi n'Abụja.

Nkowasị Ngwaọrụ

N'ebe a ndịnchọcha lebara anya n'ihe bụ ebumnobi nchọcha a nke bụ ịchọpụta mbụrụ metụtara ajọ ndụ gbasara ịgba akwụna na nsirihụ ndị Igbo gbasara ụdị agwa a. Ọ gbakwara mbọ ịchọpụta ụdịrị mbụrụ ndị ahụ a chọpụtara ma gosikwa nyocha ha.

Mbụrụ metụtara ịgba akwụna na nsirihụ ndị Igbo

Ịgba akwụna dịka ndịchọcha chọputara so n'otu n'ime ajọ ndụ nke ndị Igbo na-ahụ dịka ime ihe rụrụ arụ maọbụ imerụ ala. Ebe a ndịchọcha kọwapụtara ụfọdụ mbụrụ ndị a na ka ndị Igbo siri hụta ha.

Ịbụ Nkịta

Na nghọta nkịtị, a maara nkịta dịka anụmanụ ike anaghị agwụ ọsịsọ, ya na nke ihere anaghị eme n'ihe gbasara mmekọ oke na nwunye. ọ bụ n'ihi nke a mere ndị Igbo na-eji ya atụnyere mmadụ na-ebi ụdị ndụ dị etu ahụ.

Ọkụ enu

Ndị Igbo na-eji mbụrụ nke a egosi na mmadụ na-agba akwụna.'ọkụ enu' kwesiri igosi n'ọkụ a ne-ekwu maka ya abụghi nke a na-ezo ezo, na ọ bụ nke nọ n'elu na-achawa ka onye ọbụla hụ ya. Ọ bụ ụdị ọkụ a ka e ji akọwa etu ụfọdụ si eso nwoke bụ nke abụghị nke zoro ezo.

Éjìghị anya ahụ nwoke

Mgbe onye bụ ofeke n'asụsụ Igbo nụrụ maọbụ ụdị mbụrụ a, onye ahụ nwere ike chee na a na-ekechi anya mmadụ ka onye ahụ ghara ịhụ nwoke, mana nghọta okwu a abụghị etu ahụ. Oge ụfọdụ, ọ bụrụ na onye Igbo achọghị ikwu na mmadụ na-ebi ụdị ndụ iso nwoke o nwere ike iji ụdị mbụrụ a wee kọwaa ụdị ndụ onye ahụ na-ebi nke bụ ịgba akwụna.

i). Ụkwụ ịdị n'ama

Na ṅghọta nkịtị, ọ ga-adị ka o nwere ụkwụ mmadụ e bepụrụ wụsa n'ama, mana ezigbo nwaafọ Igbo ga-ama na e ji ihe nhụrụanya ahụ were na-ezipụta na onye a na-agwa maọbụ onye a na-ekwu maka ya na-agba akwụna.

ii). Anya ịdị n'ilo

Na mbụrụ nke 4.1.4.i-ii, e ji akụkụ ahụ mmadụ nke bụ anya na ukwu were nọchite anya mmadụ. N'aka nke ọzọ, mkpụrụokwu ndị a: 'n'ama' na 'n'ilo' dịka ọ dị n'ahịrịokwu atọ ndị ahụ na-arụgara ụdị ajọ ndụ onye ahụ na-ebi nke bụ ndụ akwụna. Ya mere mbụrụ atọ ndị a bụ nke ndị Igbo nwere ike iji kọwaa ụdị ajọ nke bụ ịgba akwụna mana e ji akụkụ ahụ mmadụ na ọnọdụ ebe were gosi na onye ahụ na-agba akwụna.

Ịtụfu ụkwụ

Dịka anyị maara, mmadụ ekwesighị ịtụfụ ụkwụ bụ nke o ji aga ije. Ndị Igbo na-ejikarị ụdịrị mbụrụ a ekwu okwu mgbe ha chọrọ ikwu maka nwanyị nọ na di mana ọ na-eso nwoke abụghị di ya na-ebi ndụ akwụna. N'ihi nke a onye bụ ofeke n'asụsụ Igbo nwere ike chee na mmadụ tụfuru ụkwụ ya. Mana ọ bụghị otu ahụ, a na-akọwa na onye ahụ na-agba akwụna.

Ejighị anya ahụ nwaanyị

Ndị Igbo na-ejikwa ụdị mbụrụ a atụnyere nwoke na-agba akwụna nke ukwuu, mana dịka ahịrịokwu a siri dị onye amaghị asụsụ Igbo nke ọma ga-eche na onye a na-ekwu maka ya anaghị eji anya ahụ nwaanyi anya mana ezigbo nwaafọ Igbo ga- ama na onye ahụ na-agba akwụna

.

Ịchụ nwaanyị

Okwu a apụtaghị mmadụ ịchu nwaanyị ọsọ, kama ndị Igbo na-eji ya dịka mbụrụ e ji atụnyere nwoke na-agba akwụna ọ kacha iso nwaanyị.

Ọkọmma n'akwa

Onye obụla maara na àkwà bụ nke onye ọbụla nwere ike idina na ya, nke a bụ na nghọta nịtị. Mana ndị Igbo na-eji mbụrụ a egosi na mmadụ bụ akwụna.

Ọnọ na di achọ di

Na nghọta nkịtị, ofeke nwere ike iche na ọ pụtara mmadụ ịchọgharị di ya, mana ọ bụ otu n'ime mbụrụ ndị Igbo ji atụnyere nwaanyị lụrụ di mana ọ na-ebi ndụ ịgba akwụna.

Òjì íkè ékè

Na nghọta nkịtị, anaghị eji íkè eke ihe. Mana ndị Igbo na-eji ụdị mbụrụ dị etu a na-atụ nyere nwaanyị na- ebi ndụ akwụna.

Nnyocha na ị chọpụta ụdịrị Mbụrụ Ndị a Chọpụtara

Ịbụ nkịta

Ebe a 'nkita' bụ anụmamanụ mana ndị Igbo ji ya mere ihe nhurunanya e ji a tụnyere onye na-agba akwụna, nke a mere ka atụtụ njiri mee pụta ihe. ụdị mbụrụ a bụ mbụrụ ke echiche.

Ọkụ elu

'Ọkụ enu' bụ ntụ e ji atụnyere agwara onye na-ebi ndụ akwụna site n'iji ihe nhụrụananya gosipụta nghọta nhurunuche. Atụtụ njirimee pụtara ihe ebe a n'ihi na ndị Igbo na-eji 'ọkụ enu' atụnyere mmadụ. Nke a bụ mbụrụ nnọrọonwe

Ejighị anya ahụ nwoke.

E ji ihe nhụrụnanya bụ 'anya', na 'nwoke' were gosipụta ṅghọta ṅhụrụnuche na mburu a. 'Anya' bụ ihe nsinebe, ebe 'nwoke' bụ ihe ṅtụụnyere; nke a na-egosi etu atụtụ njirimee siri pụta ihe. ọ bụkwa mbụrụ ngwakọ.

Anya ịdị n'ilo

Na mbụrụ ịgba akwụna a, 'anya' bụ okwu nsinebe mana 'ilo' bụ okwu ntụnyere. Ha abụọ bụ ihe nhụrụnanya wee gosipụta nghọta nhụrụnuche bụ ịgba akwụna. Mbụrụ a bụ mbụrụ ngwakọ.

Ụkwụ ịdị n'ama

Ebe a ndị Igbo ne-eji 'ụkwụ' bụ ihe nhụrụnanya were tụnyere 'ama' iji mepụta nhụrụnuche maka mmadụ ịgba akwụna. Atụtụ njirimee pụtara ihe ebe a n'ihi na ndị Igbo jiri mkpụrụokwu abụọ ndị ahụ gosipụta ịgba akwụna. Mbụrụ a bụ nke ngwakọ.

Ịtụfu ụkwụ

Ụkwụ bụ ihe ṅtụnyere ṅhụrụnanya e ji nọchi anya mmadụ, ebe 'ntụfu' na-egosi agwara mmadụ ahụ iji mee ka ṅghọta ṅụrụunuche bụ Igba akwuna. Udi mbụrụ a bụ mbụrụ ke echiche. Atụtụ njirimee putara ihe ebe a.

Ejighị anya ahụ nwaanyị

Na mbụrụ ndị Igbo nke a, 'anya' bụ ihe nsinebe, mana 'nwaanyị' bụ ihe ntụnyere. E ji 'anya' nke bụ akụkụ ahụ mmadụ were tụnyere agwa mmadụ na-akpa ebe ụmụ nwaany nọ. Ya bụ na e ji ihe ndị ṅhụrụnanya were gosipụta ihe ṅhụrụnuche nke bụ igosi na mmadụ bụ akwụna. Atụtụ ntụnyere ka e jiri gosipụta ndụ igba akwụna. Nke a bụ mbụrụ ngwakọ.

Ịchụ nwaanyị

N'ebe a, 'nwaanyị' bụ ihe nhụrụnanya e ji gosipụta nghọta ṅhụrụnche bụ ịgba akwụna. Atụtụ njirimee pụtara ihe na mbụrụ a n'ihi na ndị Igbo na-eji 'nwaanyị' nọchie anya ụmụ nwaanyị na-ebi ndụ akwụna. ọ bụ mbụrụ ke echiche.

Ọkamma n'akwa

N'ụdịrị mbụrụ nke a, ndị Igbo ji 'akwa' dịka ebe ndina were na-atụnyere agwa ụfọdụ mmadụ na-akpa nke bụ ndụ akwụna. Nke a bụ iji gosi na nghọta okwu bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme. Mbụrụ a bụ nke ngwakọ

Ọnọ na di achọ di

Na mbụrụ a, ndị Igbo ji okwu a bụ 'ịchọ di' were na-atụnyere nnwaanyị lụrụ di na-agba akwụna. Atụtụ njirimee pụtara ihe ebe a n'ihi na onye nọ na di ekwesighị ịchọ di, mana ndị Igbo ji ya dịka ntụ a ga-eji mee ka nhọta ṅhụrụnuche bụ akwụna pụta. Nke a bụ mbụrụ ke mmepụta

Òjì íkè ékè

Onye ọbụla maara na 'ike' esoghịn'akụkụ ahụ mmadụ e ji eke ihe, mana site n'ihe atụtụ njirimee na-akọwa, ṅghọta okwu ọbụla bụ ihe ndị new ya ji ya eme n'asụsụ ha. ọbụ n'ihi nke a mere ndị Igbo jiri were ihe ndị ahụ na-egosi ṅghọta nhụrụnuche. Mbụrụ nke a bụ nke ngwakụ.

Nchịkọta, Mmechi na Aro Nchịkọta

Na nchịkọta nchọcha a, nwanchọcha chọpụtara ụfọdụ mbụrụ ndị Igbo ji ezipụta ịgba akwụna dịka otu n'ime ajọ ndụ nke ha na-agbarụrụ ihu. Ụfọdụ mbụrụ ndị ahụ bụ: ọkụ enu, ịbụ nkịta, ejighị anya ahụ nwoke, ejighị anya ahụ nwaanyị, anha ịdị n'ilo, ịtụfu ụkwụ, dg. A chọpụtakwara na ụfọdụ n'ime ha bụ mbụrụ ngwakọ, mbụrụ nnọrọonwe na nke echiche. Ọzọ kwa, a chọpụtara site na mbụrụ ndị ahụ na ndị Igbo na-eji ihe nsinebe na ṅhụrụnanya were gosipụta nghọta ṅbụrụnuche bụ ịgba akwụna. Ọzọ, a chọpụtara na atụtụ njirimee e jiri nyochaa mbụrụ ndịa pụtara ihe n'ihi na ọtụtụ ihe ntụ ndị ahụ ndị ahụ e ji atụnyere akwụna enweghị ka ha siri daba nghọta nkịtị ha nwere. Nke a bụ iji gosi na okwu ọbụla bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme n'asụsụ ka ọ bụ.

Mmechi

Na mmechi nwachọcha mejupụtara ebumnobi ya site n'ịchopụta mbụrụ ndị ahụ ndị Igbo na-eji ekwu okwu n'ụzọ mkpụke bụ nke na-egosipụta ajọ ndụ ịgba akwụna. Atụtụ njirimce bụkwa nke pụtara ihe na nchọcha a n'ihi na ọtụtụ ihe ṅhụrụnanya dịka: anya, ụkwụ, ọkụ elu, ego na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ihe nhụrụanya e jiri zipụta nghọta nhụrụnuche.

Aro

Ndịchọcha na-arịọ ka ndị ọkammụta n'asụsụ Igbo ọ kacha n'ihe Amụmamụ Ncheke ka ha gbaa mbọ bipụta ọtụtụ akwụkwọ agụmagụ ga-enyere ndị ga-eme nchọcha n'ihe gbasara atụtụ ncheke n'ọdị n'ihu. Ọ dịkwa mma ka ha mepụta nkọwaokwu gbasara amụmamụ a. A kwukwara na ọ ga-adị ndị mma ka ndị ome nchọcha nyochaa ụdịrị ajọ ndụ ndị ọzọ n'Igbo.

Edemsibịa

Alobo, E.E. & Ndifon, R. (2014). Addressing prostitution concerns in Nigeria: issues, problems and prospects. Europeans scientific journal. 10(14). Ihu 37- 47.

Anọzie.C.C. (2003). Igbo Kwenu. (akụkọ na omenala ndị Igbo). Enugu: Computer Edge Publishers.

Bach, K. & Harnish, R. (1979). Linguistic communication and speech acts. Cambridge, MA: The M.I.T. Press.

Crystal, D. (2008). The Cambridge encyclopaedia of language. Cambridge: Cambridge

University Press

Eme, C. A., Mbagwu, D. U. & Mmadike, B. I. (2016). Proverbs and loss of metaphor. Preorcjah 1(1), 73-91

Ezeomeke, S. O. (2004). Igodo nghọta ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Easy ọuality Press

Gungul, T.Y. & Audu, J.S. (2014). Prostitution as a social evil in Nigeria: issues and challenges. International journal of peace and conflict studies. 2(1). Ihu 82- 90.

Ibeh, P. I. (2017). Ntụle mbụrụ metụtara nzuzu na nsirihụ ndị Igbo na ndị Bekee. Nnamdị Azikiwe University, Awka.

Iherue, S. O. (2011). Ihe ndị na-ebute ajọ akparamagwa na ihe ndị ọ na-eweta n'ala Igbo. Unniversity of Nigeria, Nsukka.

Kempada, A. & Doezema, J. (1998). Global seụ workers. London: Routledge.

Lakoff, G. (1987). Women, fire, and dangerous things: What categories reveal about the mind. Chicago: Chicago University Press.

Lakoff, G. & Johnson, M. (1980). Metaphor we live. Chicago: Chicago University Press

Mbah, B.M. (2018). Lectures on Cognitive Linguistics. Nnamdi Azikiwe University, Awka.

Mbah, B. M; Mbah, E. E; Ikekọnwụ, E. S; Okeke, C. O; Ugwuona, C. N; Akaeze, C. M, Onu, J. O; Eze, E. A; Prezi, G. O & Odii, B. C (2013). Igbo adi. Enugu: University of Nigeria Press Limited.

Nwangama, E. U. (2005). The concept of sin and atonement in Igbo traditional religion: A case study of Ezza community in Ebonyi state. A Ph.D Thesis, University of Nigeria, Nsukka

Olisa, M. D. (1972). Taboos in Igbo religion na society na West Africa religion II. University of Nigeria, Nsukka.

Richard, N. (2018). The different types of metaphor. Thought co. Owa ududo, mee 6, 2018.

Udemmadu, T.N (2018). Omụmụ nghọtaokwu (semantiks). Onitsha: Durability Press.

Udemmadu, T. N. & Umezi, P. (2016). Ntulekọrịta ngwaa asụsụ Igbo na ngwaa asụsụ Latin. Odezurigbo, 1, 167-179.

Umezi, P. I. (2017). Nnwemagba oge na oke ala n'ilu Igbo na Steeti Anambra. Nnamdi Azikiwe University, Awka.