ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA VOLUME 12; NO 2, JULY, 2019

Ụzọ Ịkwalite Ọmụmụ Abụ Ederede Igbo n'Ogo Sinịọ Sekọndịrị Na Zonu Mmụta Nsụka, Steeti Enugwu

Si N'aka

Dr. Uchenna Fabian Ude

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

E-mail address: uchenna.ude@unn.edu.ng

08064231662

Dr. Nneka Justina Eze

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

E-mail address:

08039555509

Na

Joy Ujunwa Agboeze

Department of Arts Education,

University of Nigeria, Nsukka

08063625885

Ụmìedemede

Nchọcha a lebara anya n'ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n'ogo siniọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka nke steeti Enugwu. Nchọcha a jedebere n' ụlọ akwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka. Onye nehọcha jiri usoro sovee mee nchọcha a. ọnụọgụ ndị nchọcha jiri mee nchọcha bụ ndị nkụzi dị otu narị, iri atọ na isii (136) bụ ndị na-akụzi asụsụ Igbo na zonu mmụta Nsụka. Ndị nchọcha ji ndị nkụzi niile mee nchọcha a n' ihi na ha adịghị ọtụtụ. Ndị nchọcha jiri ajụjụ ederede njụmaaza nke bụ ụzọ ịkwalite ọmụmụ abụ Igbo (ụ{ọAI.). Onye nchọcha haziri ihe nchọpụta na tebulu na tebulu dịka ajụjụ nchọcha anọ nchọcha a siri dị. Nchọpụta nchọcha gosiri na ngwa nkụzi kọmputa, usoro nkụzi mmemme, nka ekwumekwu na iwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta n'ọrụ ga-akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo. Otu n' ime aro ndị nchọcha tụnyere bụ na gọọmentị ga-ekewapụta agụmagụ ederede n'asụsụ Igbo nke abụ bụ otu ngalaba n' ime ya ka ọ dịka nke asụsụ Bekee.

Okwu Ndị Pụtakarịchara Ihe: Ọmụmụ Agụmagụ, Abụ, Abụ Ederede Igbo

Mkpọlite

Ntọala Nchọcha

Asụsụ bụ okwu a na-ekwu n'ọnụ maọbụ ederede. ọ bụ n'etiti mmadụ na ibe ya ka a na-asụ asụsụ iji mee ka ha ghọta onwe ha. Mmadụ na-ebu ụzọ asụ asụsụ tupu o bido dewe ya ede. Ya bụ na asụsụ ọbụla a na-asụ na e nwere ike ide ya ede. ọ bụ asụsụ ka e ji a mata ebumnobi mmadụ.Asụsụ na-enwe usoro nke onye ọbụla na-asụ ya ga-agbaso. Mba ọbụla nwere asụsụ nke ha. A bịa n'ala Naịjirịa, asụsụ Igbo bụ otu n'ime asụsụ atọ kachasị pụta ihe. Ndị ọzọ bụ Awụsa na Yoruba. E nwekwara asụsụ ndị ọzọ dịka Tivi, Igala, Idoma, Urhobo na Efik.

ụfọdụ ndị ọkammụta akọwaala asụsụ n'ụzọ dị iche iche. Nwodo (2008) kwuru na nkọwa ihe bụ asụsụ adịchaghị mfe etu ọtụtụ ndị mmadụ siri chee n'ihi na ọtụtụ ihe mejupụtara asụsụ. N'ihi ya mgbe ọbụla a na-akọwa asụsụ, a ga-enwe ebe mgbado ụkwụ asụsụ na ihe a na-elegara anya na-akọwa ya. ọ gara n'ihu kwuo na e nwere ike ịgbasa aka kọwaa asụsụ dịka usoro ụda nke mba, obodo maọbụ agbụrụ ọbụla nwere ike iji na-ezikọrịta ozi n'etiti onwe ha. Anọzie (2001) kọwara na ọtụtụ ndị mmadụ akọwaala asụsụ n'ụzọ dị iche iche mana nkọwa ndị a niile bụ na asụsụ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya na-esi enwe mkparịtaụka n'etiti onwe ha.Na nkọwa Nwaozuzu (2008) asụsụ bụ otu n'ime ihe kacha pụta ihe n'akparamagwa mmadụ ma mwulite ewulitere asụsụ ma yọcha ya ka ọ bụrụ ngwa mmadụ ji akọwapụta onwe ya ma na-ezirita ozi, bụrụ otu n'ime ihe kacha pụta ihe mmadụ mejupụtara n'ụwa. Asụsụ bụ ụzọ e si echekwa omenala site n'ọgbọ ruo n'ọgbọ. Ọ bụ site n'asụsụ ka omenala jiri si n'aka ndị nna nna rute ụmụ ha. Okafo (2008) kọwara na asụsụ bụ ụzọ ndị mgbe ochie chepụtara ka mmadụ na ibe ya were na-ekwukọrịta okwu ma na-agwarịta ibe ya ihe a chọrọ ka ha mata. Ọ gakwara n'ihu kwuo na asụsụ bụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya.Ezeuko (2000) kwuru na asụsụ nwere njirimara ndị a: A ga-ebu ụzọ mụta ịsụ asụsụ tupu odide ya, asụsụ na-enwe nhazi na usoro e si asụ ya. Asụsụ dị ụzọ abụọ; ekwuru n'ọnụ na ederede.

Asụsụ bụ iji akara zipụta ebumnuche. Nke a dabara na nkọwa Mba (2001) ebe ọ kọwara asụsụ dịka akụkụ iji akara edemede ezipụta ebumnuche mmadụ. Agbedo (2000) kọwakwara na asụsụ bụ okwu si mmadụ n'ọnụ pụta iji weta mmekọrịta mmadụ na ibe ya. E si n'asụsụ a mata agbụrụ onye si, dịka ndị Igbo.

Ndị Igbo bụ ndị isi ojii a na-ahụta n'akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa. Ndị Igbo kwenyere n'usoro okpukpere chi dị iche iche. Ha kwere na e nwere chi ukwu nakwa ụmụ agbara na-ejere ya ozi. Ndị Igbo na-adị uchu n'ọrụ iji nweta ihe ha na-eri. Ndị Igbo na-azụ ahịa dị iche iche dịka: Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Steeti ebe a na-asụ asụsụ Igbo bụ steeti Abịa, Enugwu, Ebonyi, Anambra na Imo.A na-ahụta ndị Igbo na nge na nge na steeti Delta, Rivers na Akwa Ibom. Ndị agbataobi ndị Igbo na mpaghara ugwu gụnyere Igala na Idoma. A bịa n'ebe ọwụwa anyanwụ dịka Owere, agbataobi ndị Igbo bụ ndị Ikom na Yakum. A bịa n'ọdịda anyanwụ ha bụ Urobo na Isoko. Ọnụọgụgụ ndị na-asụ asụsụ Igbo bara ụba. Ugwuona (2013) kọwara na ndị na-asụ Igbo bụ ihe dịka nde mmadụ iri atọ. Ndị Igbo dịka Ikekeonwu (1987) kọwara so n'agbụrụ Kwa nke bụ nkewapụta Niger Congo. Asụsụ Igbo bụ asụsụ nwere olu izugbe na olundị. Nwaozuzu (2008) kwuru na a bịa n'asụsụ ọbụla na e nwere olu izugbe nwee olu abụghị olu izugbe. O kwuru na olu nke a kpọrọ olu izugbe bụ olu e ji eme nchọcha banyere asụsụ Igbo na omenala ya. Olu abụghị asụsụ izugbe ka a kpọrọ olundị.

Olundị bụ asụsụ a na-asụ na mpaghara dị iche iche nwere otu asụsụ izugbe. ụfọdụ olundị e nwere n'ala Igbo gụnyere olu Nsụka, olu Udi, olu Ezeagụ dị na steeti Enugwu. Olu ụmụahịa, olu Ngwa dị na steeti Abịa. Olu ọnịcha, olu ọka, olu Idemili dị na steeti Anambra. Olu Owere, olu Mbaise, olu Mgbidi dị na steeti Imo. Olu asụsụ Igbo ndị a na-egosipụta olundị ụfọdụ e nwere n'asụsụ Igbo. Mana ọ bụ Igbo Izugbe ka e ji amụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ nke abụ nọ n'ime ya. Alaka ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị gụnyere: ụtọasụsụ, ụdaasụsụ, omenala, edemede, atụmatụokwu, aghọtaaza, leụis, akaraedemede, ntụgharị, iwu nsupe na agụmagụ. Ihe bụ mkpa ndị nchọcha bụ agụmagụ nke abụ bụ otu ngalaba n'ime ya.

Agụmagụ bụ akụkọ ụfọdụ gbasara isiokwu nke e jiri ọkpọka asụsụ kwuputa n'ụdị akụkọ, ejije na abụ. E nwere ụdị agụmagụ abụọ: Agụmagụ ọdịnala maọbụ ekwuru n'ọnụ na nke ugbua maọbụ ederede.Agụmagụ ọnụ bụ agụmagụ ndị Igbo nwere tupu ndị ọcha a bịa n'ala anyị. Na nkọwa Okebalama (2008), agụmagụ ọnụ bụ akụkọ ọdịnala niile a na-akọ n'ọnụ, abụ niile a na-abụ n'ọnụ, ifo, ilu, akpaalaokwu, agụmagụ na okwu niile e nwere n'Igbo. Agụmagụ ugbua maọbụ ederede bịara abịa n'ala anyị. Ugbu a e deela ọtụtụ ihe n'akwụkwọ agụmagụ ederede. Agụmagụ ugbu a maọbụ agụmagụ ederede nwere nghọta abụọ: Agụmagụ nkụzi na agụmagụ dịka ọrụ nka.

Agụmagụ nkụzi bụ ihe ọbụla dị n'ụdị ederede dịka fiziks, kemịstịrị, akwụkwọ mgbakọ na mwepụ, akwụkwọ dị n'ime ọgwụ a zụrụ azụ na-akọwa etu esi aṅụ ya, akwụkwọ nsọ na ndị ọzọ. Agụmagụ dịka ọrụ nka na-adị n'ụdị akụkọ, abụ na ejije. A na-esi n'ụdị agụmagụ a na-akọwapụta ma na-ahụta ndụ mmadụ. Ejije bụ njije agwa ma bụrụ ọrụ nka nke na-enwe akụrụngwa dị iche iche na-abata n'ime ya maka ihe na-emejupụta ya bụ ọrụ nka zuru oke. Akụkọ bụ ngalaba ọzọ e nwere n'agụmagụ. Akụkọ na-adị n'ụdị deregawa. ọ naghị enwe nkeji dịka abụ. A na-agbaso usoro ndepụta akwụkwọ dịka isiokwu, ndịna isiokwu, agwa, akparamagwa na ihe ndị ọzọ wee depụta ya.

Abụ bụ nnukwu mmetụta nke ime mmụọ nke mmadụ na-abụ mgbe o nwetara onwe ya n'ọnọdụ dị iche iche. Mgbe a na-ekwu maka abụ, anaghị asị na a na-agụ ha etu e si agụ ụfọdụ ukwe maọbụ uri maọbụ egwu. ọ bụghị abụ niile ka a na-abụ maọbụ agụ agụ. Abụ onye nchọcha na-ekwu maka ya bụ abụ echepụtara echepụta. Nke a pụtara na ọ bụ ihe otu onye chepụtara ma depụta n'akwụkwọ ka ndị mmadụ mara maka ya. ọ bụ usoro e jiri dee abụ na asụsụ nka e jiri chọọ ihe e dere maka abụ jiri dị iche n'agụmagụ ndị ọzọ. E nwere ụdị abụ dị iche iche nke gụnyere: Abụ nwa, abụ otito, abụ ikpe, abụ akwa, abụ ịhụnanya, abụ akụkọ, abụ mmemme, abụ nkụzi, abụ ekere na echiche miri emi, abụ ngụgọ na abụ ofufe. Ụfọdụ ndị ọkammụta akọwaala abụ n'ụzọ dị iche iche. Mmuakor (1991) kọwara na abụ bụ ihe ọmụmụ gbasara mmetụta ndị mmadụ na-enwe n'ime obi ha nke na-akacha emi emi. Ogbe (1995) kwuru na abụ bụ ụdị agụmagụ kacha ụdị ndị ọzọ nwee ọkwa dị elu ma na-ahịa ahụ na nghọta. Nke a bụ maka na abụ na-ezipụta onwe ya n'ụzọ pụrụ iche, nke na-achọ nnukwu nkata ahụ n'amamiihe, n'akwụkwọ na akọnuuche. Abụ bụ otu ụdị agụmagụ juputara na nka, mmadụ ji akọwa ndụ, ekere na ihe ndị ọzọ a na-ahụ na-eme n'ụwa. Abụ na-eji asụsụ dị elu, olu ọṅụ mmadụ, olu aṅụrị egosi ọnọdụ mmadụ nwetara onwe ya n'ụwa. Asụsụ abụ na-esi ike, dị nkenke, ju eju na nghọta ma nwee ndanusoro.

Abụ dịka ihe ọmụmụ dị na kurikulum nke sinịọ sekọndịrị na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu ọtụtụ oge. ụmụakwụkwọ na-enwebe nsogbu n'ọgụgụ na nghọta abụ Igbo. Nke a mere ndị nchọcha ji elebaa anya n'ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu. Ndị nchọcha na-eche na otu ụzọ e nwere ike isi kwalite ọmụmụ abụ Igbo bụ iji ngwa nkụzi kọmputa akụziri ụmụakwụkwọ abụ.

Ngwa nkụzi bụ otu akụkụ n'usoro nkụzi nke na-enye aka n'imejupụta mbunuche ihe ọmụmụ. Anọzie (1999) gụpụtara ụfọdụ ngwa nkụzi, nke gụnyere: Mgbo odee, akwụkwọ ọgụgụ, atụratụ, ndị ọkachamara, onye nkụzi n'onwe ya na akụrụngwa ndị ọzọ a na-eji ọkụ latrik enye ike dịka kọmputa.

Kọmputa bụ igwe nwere ọtụtụ akụkụ e ji ọkụ latirik enye ike, nke nwere ike ịnata ozi, chekwaa ozi, hazie ha ma nwekwaa ike ịrụ ọrụ mgbakọ na mwepụ. Kọmputa dịka ngwa nkụzi etebeghị aka ọ bịara n'ala Igbo ma ọ bụrụ na e were ya tụnyere ngwa nkụzi ndị ọzọ. Okafọ (2001) kọwara kọmputa dịka igwe na-anata ozi, rụọ ọrụ mgbakọ na mwepụ maọbụ rụọ ọrụ ndị ọzọ e ji ọgụgụ isi arụ ma nwee ike ịgbanwe ozi e nyere ya ma wepụta ọsịsa ozi ahụ etu e siri chọọ. ụzọ ọzọ e nwere ike isi bụkwa site n'ịgbaso usoro nkụzi mmemme wee na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe. Ọnwụka (2016) kọwara usoro mmemme dịka nwata akwụkwọ ibido ime ihe a chọrọ ka e mee. Ọ gakwara n'ihu kwuo na usoro mmemme gbasatara ọgụgụ, odide, ọnụnụ, ịza ajụjụ, ịkparịtaụka na ime ihe ọbụla a sị ka e mee. ọ bụrụ na onye nkụzi agbaa mbọ hụ na nwata akwụkwọ ọbụla sonyere n'ihe ọmụmụ, ọ ga-akwalite abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị.

Ọzọ kwa, ndị nchọcha na-eche na iji nka ekwumekwu akụziri ụmụakwụkwọ abụ nwere ike ịkwalite ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu. Nke a pụtara na o nwere ihe ndị a tụrụ anya na onye nkụzi ga-amata nke ọma. Nka ekwumekwu bụ nka onye nkụzi webatara na nkụzi ya iji mee ka ụmụakwụkwọ gee ntị ma kpapụta ha ụka n'ọnụ. Ndụdịm (2003) gosipụtara nka ekwumekwu Igbo ndị a: {sa ajụjụ, ikwe ukwe, ọgụgụ ngụpụta.

Uzo ọzọ e nwere ike iji kwalite ọmụmụ abụ Igbo bụ site n'iwe ndị nkụzi nwere ezigbo mmụta n'asụsụ Igbo n'ọrụ. Ezigbo onye nkụzi ga-abụrịrị onye a zụrụ nke ọma ma bụrụ onye nwere ezigbo mmụta na nghọta n'ime ihe ahụ ọ ga-akụzi. Ebe (2004) kọwara na mmadụ anaghị enye onye ọzọ ihe ọ na-enweghị.

Ọtụtụ oge, ndị na-akụzi asụsụ Igbo nke abụ so n'ime ya n'ogo sinịọ sekọndịrị bụ ndị enweghị ezigbo ọzụzụ n'asụsụ Igbo. ọ bụrụ na e nwee ndị nkụzi nwere ezigbo mmụta n'asụsụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu, ọga-enye aka kwalite ọmụmụ asụsụ Igbo.

Ndị nchọcha ga-agbado ụkwụ n'ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị na zoonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu.

Nsogbu Nchọcha

Abụ Igbo bụ ihe na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu. ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-ahụta abụ Igbo dịka ihe siri ike. Ihe kpatara nke a bụ na abụ nwere ụdịrị asụsụ e ji ede ya, nke na onye na-agụ ya ga-echemi echiche nke ọma tupu ọ ghọta ihe odee na-ekwu maka ya.Abụ anaghị adị n'ụdị akụkọ maọbụ ejije. ọ na-adị nkenke na ọgbara na ọgbara, nke na-ebutere ụmụakwụkwọ nsogbu nghọta. ọ bụ n'ihi mgbagwojuanya ụmụakwụkwọ na-enwe mere ndị nchọcha ji lebaa anya n'ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche izugbe nchọcha a bụ ịchọpụta ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu. Nchọcha a ga-elebakwazi anya n'ihe ndị a:

  • {chọpụta ka a ga-esi e ji ngwa nkụzi kọmputa kwalite ọmụmụ abụ Igbo.
  • {chọpụta ka a ga-esi e ji usoro nkụzi mmemme kwalite ọmụmụ abụ Igbo.
  • {chọpụta ka a ga-esi e ji nka ekwumekwu kwalite abụ Igbo.
  • {chọpụta ka a ga-esi kwalite abụ Igbo site n'iwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta, n'asụsụ Igbo n'ọrụ.

Uru Nchọcha

Nchọcha a nwere uru ọ ga-aba na nkụzi na ọmụmụ abụ Igbo, ọ kachasị na zonu mmụta Nsụka. ọ ga-abara ụmụakwụkwọ, ndị nkụzi na ndị gọọmentị uru. Ụmụakwụkwọ ga-erita uru na nchọcha a nke ukwuu. Nchọcha a ga-eme ka ha mara ede nakwa agụ ihe gbasara abụ Igbo. Ọ ga-akwalite mmụọ ụmụakwụkwọ ịgụ akwụkwọ abụ Igbo ọbụla n'ihi na abụ ọbụla nwere ihe ọ na-akụzi. Ọ ga-emekwa ka ọmụmụ abụ dị mfe ma nwee nghọta zuru oke. Ndị nkụzi ga-erite uru na nchọcha a maka na ọ ga-enyere ha aka ịmata abụ Igbo dị iche iche. ọ ga-emekwa ka ha nwee ike ịkwụrụ chịm mgbe ọbụla ha nọ n'ọgbakọ ebe ihe gbasara abụ dapụtara. Ọ ga-eme ka onye nkụzi mara nke ọma ihe ọ na-akụziri ụmụakwụkwọ ma dị njikere ịza ajụjụ ọbụla ha jụrụ ya. Nchọcha a ga-abara gọọmentị uru maka na ọ ga-eme ka ha mata uru ọ dị inwe ndị nkụzi nwere ọzụzụ/mmụta n'ọrụ.

Oke Nchọcha

Nchọcha a jedebere n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị na zoonu mmụta Nsụka nke steeti Enugwu. O lebara anya n'ịchọpụta ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka nke Steeti Enugwu. Ihe ndị e lebara anya iji mee ya bụ nchọcha gụnyere: Ngwa nkụzi kọmputa, usoro nkụzi mmemme, nka ekwumekwu na iwe ndị nwere ezigbo ọzụzụ/ mmụta n'ọrụ. Ebe e medebere nchọcha a bụ n'okpuru ọchịchị mmụta zonu Nsụka.

Ajụjụ Nchọcha

  • Kedụ ka a ga-esi e ji ngwa nkụzi kọmputa kwalite ọmụmụ abụ Igbo?
  • Kedụ ka a ga-esi e ji usoro nkụzi mmemme kwalite ọmụmụ abụ Igbo?
  • Kedụ ka a ga-esi e ji nka ekwumekwu kwalite ọmụmụ abụ Igbo?
  • Olee etu a ga-esi kwalite abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị site n'inwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta n'asụsụ Igbo n'ọrụ?

Atụtụ Mmụgharị

Atụtụ Ebumpụtaụwa

Atụtụ a si n'aka Noam Chomsky na ndị otu ya n'afọ 1957. Atụtụ a na-akọwa na nwatakịrị ọbụla nwere ihe Chineke tinyere n'ime ụbụrụ ya, nke ga-eme ka ọ mụta asụsụ ọbụla ọ na-asụ n'ebe o nwetara onwe ya. Ihe a ka Chomsky na ndị otu ya kpọrọ 'Language Acọuisition Device' (LAD) Ngwa mmụta asụsụ. Ha kọwara na ọ bụ maka na ụmụanụmanụ enweghị 'LAD' mere na ha enweghị ike ịsụ asụsụ. Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ atụtụ a na-eme ka ụmụaka a mụrụ n'otu ọgbọ na-amụta asụsụ dị iche iche. Atụmatụ Chomsky na ndị otu ya dabara na nchọcha a n'ihi na abụ bụ ọrụ ụbụrụ. Ihe nke a pụtara bụ na nwata ọbụla ụbụrụ ya dị mma nọrọ ebe a na-agụ abụ, o gee ntị tụlee ya n'echiche ya, ọ ga-amụta ya n'egbughị oge ọbụla. Ebe abụ bụ otu ngalaba agụmagụ, agụmagụ a bụrụ asụsụ, nwatakịrị ọbụla ga-amụtali abụ.

Nchọcha A Hụrụ Anya

Amakwe, Nwachukwu na Nwagbara (2016) mere nchọcha banyere nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ọmụmụ abụ Igbo n'ụlọakwụkwọ Junịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Bende nke Steeti Abịa. Ha ji ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi mee nchọcha ha. Ha ji ajụjụ ederede njụmaza mee ngwa nchọcha bụ nke ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ zara. Site na nchọcha ha mere, ha chọpụtara na nsogbu na-adị n'ọmụmụ abụ Igbo bụ na ọtụtụ ụmụakwụkwọ anaghị enwe mmasị n'ọmụmụ abụ Igbo. Myiri dị na nchọcha nke Amakwe na ndị otu ya na nke ugbua a bụ na ha abụọ na-ekwu maka abụ. Ndịiche dị na nchọcha Amakwe na ndị otu ya na nke ugbua bụ na ha na-ekwu maka nsogbu a na-enwe n'ọmụmụ abụ Igbo. Ndịiche ọzọ bụ na ha mere nchọcha ha na Steeti Abịa. Ha ji junịọ sekọndịrị mee nchọcha ha.

Eze na Agbo (2016) mere nchọcha banyere etu a ga-esi kwalite nkụzi na ọmụmụ ejije ọdịnaala Igbo n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Nsụka ọban na Steeti Enugwu. Ha ji ndị nkụzi asụsụ Igbo na ụmụakwụkwọ mee nchọcha ha. Ha ji ajụjụ ederede njụmaza mee ngwa nchọcha ha. Site na nchọcha ha, ha chọpụtara n'iji ngwa nkụzi akụzi ejije ọdịnaala Igbo ga-enye aka kwalite nkụzi na ọmụmụ ejije ọdịnaala n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Nsụka ọban. Ha chọpụtara na ụmụakwụkwọ isonye na mmepụta ejije ọdịnaala ga-enye aka ka ha ghara ichefu ihe akụziri ha nke ga-akwalite nkụzi na ọmụmụ ejije ọdịnaala Igbo. Myiri dị na nchọcha ọzọ na Agbo na nke ugbu a bụ na ha abụọ na-ekwu maka etu a ga-esi kwalite ọmụmụ. E mere nchọcha abụọ a na Steeti Enugwu. Ndịiche dị na ha bụ na Eze na Agbo na-ekwu maka ejije ọdịnaala bụ otu ngalaba agụmagụ, ebe nchọcha nke ugbua na-ekwu maka abụ bụkwa otu ngalaba n'ime agụmagụ. Ha mere nchọcha ha na Nsụka ọban ebe nke ugbua bụ na zonu mmụta Nsụka. Onuh (2014) mere nchọcha banyere nsogbu a na-enwe na nkụzi na ọmụmụ abụ n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-eze nọọtụ. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ụmụakwụkwọ e nwere n'okpuru ọchịchị Igbo-eze nọọtụ. O jiri ngwa nchọcha ajụjụ njụmaza bụ nke ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi zara. Otu n'ime ihe a chọpụtara na nchọcha a bụ na-ejighị ngwa nkụzi na-adọghachi ọmụmụ abụ Igbo azụ n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-eze nọọtụ. Myiri dị na nchọcha nke Onuh (2014) na nke ugbua bụ na ha abụọ na-ekwu maka ọmụmụ abụ Igbo. ọzọkwa, ha abụọ mere nchọcha ha n'ogo sinịọ sekọndịrị. Ndịiche ha abụọ bụ na Onuh (2014) na-ekwu maka nsogbu a na-enwe na nkụzi na ọmụmụ abụ ebe nchọcha nke ugbua na-ekwu maka ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo

Ugwoke na Nduka (2013) mere nchọcha banyere nsogbu na-adị na nkụzi na nghọta abụ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Nsụka. Ha ji ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ mee nchọcha ha. Ngwa nchọcha ha bụ ajụjụ ederede njụmaza bụ nke ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ zara. Site na nchọcha ha mere, ha chọpụtara na ụmụakwụkwọ na-ahụta abụ dịka ihe siri ike.

Myiri dị na nchọcha ha na nke ugbu a bụ na ha abụọ na-ekwu maka abụ. ọzọkwa ha abụọ bụ n'okpuru ọchịchị Nsụka ka e mere ha. Ndịiche dị na nchọcha ha na nke ugbua bụ na nchọcha ha na-ekwu maka nsogbu na-adị na nkụzi na nghọta abụ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ebe nke ugbua na-ekwu maka ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo.

N'ime nchọcha a hụrụ anya ndị ahụ a tụlere, o nweghị nke lebara anya n'ụzọ a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ Igbo. Nke a mere ndị nchọcha ji nwee mkpali mmụọ ime nchọcha maka ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite nkụzi na ọmụmụ abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Nsụka nke steeti Enugwu.

Usoro Nchọcha

Ụdị Nchọcha

Ndị nchọcha ji sọvee nkọwa mee nchọcha a. Nworgu (2006) kọwara sọvee nkọwa dịka usoro nchọcha e ji amata echiche, mbunuche, nkwenye na nhụrụ ụwa ndị mmadụ nke e si na ya ezipụta mbunuche nchọcha. Sọvee bụ iji ụfọdụ mmadụ a họpụtara n'otu ebe ka ha nọchie anya ndị ọzọ.

Ebe Nchọcha

Ebe a nọ mee nchọcha a bụ na zonu mmụta Nsụka nke gụnyere okpuru ọchịchị ụzọ-ụwanị, Igbo Etiti na Nsụka. Ihe mere ndị nchọcha ji họrọ zonu mmụta Nsụka bụ na ha chọpụtara na nkụzi abụ ederede Igbo na-ala azụ n'ebe ahụ.

Ndị Nsụka bụ ndị e ji ọrụ ugbo wee mara. Ha na-akọ nri dị iche iche dịka ọka, ji, ede na akpụ. Ha na-esi ụdị nri dị iche iche nke ndị mpaghara ala Igbo ndị ọzọ anaghị esi dịka, ayaraya ọka, ayaraya ji, achịcha, ọkpa, nteko na ịgbangwụ.

Ndị E Ji Mee Nchọcha

Ndị e ji mee nchọcha a dị narị iri atọ na isii (136) bụ ndị nkụzi asụsụ Igbo na mpaghara zonu mmụta Nsụka. ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka dị iri ise na iteghete. (PPSMB May, 2018).

Nsere na Usoro Nsere

Ndị nchọcha ji ndị nkụzi niile na-akụzi Igbo na zonu Nsụka mee nchọcha a. ọnụọgụ ha dị otu narị, iri atọ na isii.

Ngwa Nchọcha

Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha bụ njụmaza nke isiokwu ya bụ ụzọ {kwalite ọmụmụ Abụ Igbo (ụ{ọAI) nke ndị nchọcha mepụtara n'onwe ha. Njụmaza ahụ nwere ndịna iri abụọ a haziri maka ndị nkụzi iji nweta ebumnobi ha maka ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo. N'ajụjụ ederede njụmaza ndị a ga-aza, ajụjụ ga-egosi etu ha si kwenye n'ọsịsa ajụjụ ajụrụ ha. Site n'ịkanye akara a (√) n'ebe masịrị ha . E kewara nkwenye a ụzọ anọ ndị a:

Ekwesiri m ike (EMI) Akara anọ

Ekwere m (EM) Akara atọ

Ajụrụ m (AM)Akara abụọ

Ajụsiri m ike (AMI) Otu akara

Nnyocha Ngwa Nchọcha

Ndị nchọcha weere ngwa nchọcha a gakwuru ndị ọkammụta mmadụ abụọ n'asụsụ Igbo nọ na ngalaba mmụta nka na otu onye meshọmentị na evalueshọnna ngalaba mmụta sayensị na mahadum Naịjirịa, Nsụka ka ha lebara ya anya. Ndị ọkammụta lebara anya na ngwa nchọcha a ka ha mara ma ihe ndị nchọcha dere ọ bụ ihe dabara na nchọcha ya. ọ bụ site na ntụziaka ha nyere ka ndị nchọcha ji hazie ngwa nchọcha a etu ọ si dị na nchọcha a.

Usoro Nnweta Ihe Nchọcha

Ndị nchọcha gara n'ụlọakwụkwọ ndị a họpụtara, nata ikikere n'aka onyeisi ụlọakwụkwọ maka iji ndị nkụzi ya mee nchọcha. Ndị nchọcha nọkwa ebe ahụ kọwara ha ihe ha kwesiri ime. Ndị nchọcha nakọtara ha ngwa nchọcha a ma gwa ha na ụsa niile ha nyere ga-abụ naanị maka nchọcha a.

Usoro Nhazi Ihe A Chọpụtara

Ndị nchọcha ji miin na standad devieshọn hazie ihe ha chọpụtara. Ọsịsa ajụjụ nwere miin 2.5 gbagowe bụ nke ndị nchọcha nabatara ma jiri ya wee rụọ ọrụ, ebe ọsịsa ọbụla erughị 2.5 bụ nke ndị nchọcha anabataghị.

Ajụjụ Nchọcha nke mbụ: Kedụ ka a ga-esi e ji ngwa nkụzi kọmputa kwalite ọmụmụ abụ Igbo?

Tebulu nke Mbụ: Etu a ga-esi eji ngwa nkụzị kọmpụta kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo

N = 136

Ọnụọgụ

Ndịna

EMI

EM

AM

AMI

Miin

SD

Mkpebi

1.

Ngwa nkụzị kọmpụta ga-eme ka ọmụmụ abụ ederede Igbo di mfe

70

50

6

10

3.5

0.86

1.

2.

Kọmpụta ga-eme ka ụmụakwụkwọ nwe mkpali mmụọ n' ọmụmụ abụ igbo

56

64

9

7

3.2

0.79

2.

3.

Kọmpụta ga-eme ka ụmụakwụkwọ hapụ irahụ ụra mgbe a na-akụzị abụ ederede Igbo.

60

48

27

1

3.4

0.53

3.

4.

Ngwa nkụzị kọmpụta ga-eme ka ọmụmụ abụ Igbo dowanye anya

73

50

3

10

3.3

0.85

4.

5.

Ngwa nkụzị kọmpụta ga-eme ka onye nkụzị na ụmụakwụkwọ nwe ezi mmekọrịta n' ọmụnụ abụ ederede igbo

64

49

18

5

3.2

0.82

5.

Mgbakọta ọnụ miin.

3.3

Data e gosipụtara na tebulu nke mbụ a na-egosi na ngwa nkụzi kọmpụta dabara na ngwa nkụzi ga-akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo. Ndịna nke mbụ 3.3, nke abụ bụ 3.2 nke atọ 3.2, nke anọ 3.3 na nke ise 3.2. A nabatara ndịna ndịa n' ihi na miin ha gafere 2.5.

Ajụjụ Nchọcha nke abụọ: Kedụ ka a ga-esi e ji usoro nkụzi mmemme kwalite ọmụmụ abụ Igbo?

Tebulu nke abụọ: Etu usoro nkụzị mmemme ga-esi kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n' ogo Sinịọ sekọndịri

Ọnụọgụ

Ndịna

EMI

EM

AM

AMI

Miin

SD

Mkpebi

6

Site n' iji usoro ọgụgụ ngụpụta

38

79

7

12

3.0

0.82

A nabatara

7.

Site n' ọgụgụ ngụkọọnụ-ga akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo

44

66

18

14

2.9

0.93

A nabatara

8.

Ịza ajụjụ na klaasi, ga akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo

15

6

78

37

1.9

0.87

A nabataghi

9.

Nrụrịta ụka ga-akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo

87

39

7

3

3.5

0.69

A nabatara

10.

Ntụlekọrịta echiche ga- akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo

61

53

15

7

3.2

0.84

A nabatara

Mgbakọta ọnụ miin.

2.9

Data dị na tebulu nke abụọ a na-egosi na ndịna nke isii bụ 3.0, nke asaa 2.9, nke iteghete 3.5 na nke iri 3.2 dabara na nchọcha a n' ihi na miin ha gafere 2.5 ebe ndịna nke asatọ bụ 1.9 anabataghị nke asatọ n'ihi na miin ya erughị 2.5. O gosiri na usoro nkụzi mmemme ga-akwalite nkụzi abụ ederede Igbo.


Ajụjụ Nchọcha nke atọ: Kedụ ka a ga-esi e ji nka ekwumekwu kwalite ọmụmụ abụ Igbo?

Tebulu nke atọ: Etu a ga-esi eji nka ekwumekwu kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo.

Ọnụọgụ

Ndịna

EMI

EM

AM

AMI

Miin

SD

Mkpebi

11.

Site n' ige ntị na radio

36

79

14

7

3.0

0.75

A nabatara

12.

Site n' ịkpọbata onye ọkachamara n' asụsụ Igbo

40

69

19

8

3.0

0.82

A nabatara

13.

Site n' ịkọwa eserese dị iche iche

15

18

70

33

2.1

0.89

A nabataghi

14.

Iwebata agwụgwa na okwu ntụhi dị iche iche

88

24

13

11

3.3

0.95

A nabatara

15.

Site n' ikwe ukwe

66

43

13

14

3.1

0.98

A nabatara

Mgbakọta ọnụ miin

2.9

Data dị na tebulu nke atọ na-egosi na ndịna nke iri na otu 3.0, nke iri na abụọ 3.0, nke iri na anọ 3.3 na iri na ise 3.1 dabara na nchọcha n' ihi na miin ha gafere 2.5, ebe ndịna nke iri na atọ bụ 2.1, anabataghị ya n' ihi na miin ya erughị 2.5. Ọzọ kwa akara miin mgbakọtaọnụ bụ 2.9 nke gosikwara na nka ekwumekwu ga-akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n'ihi na ọ gafeere 2.5.

Ajụjụ Nchọcha nke anọ: Olee etu a ga-esi kwalite abụ Igbo n'ogo sinịọ sekọndịrị site n'inwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta n'asụsụ Igbo n'ọrụ?

Tebulu nke anọ: Etu a ga-esi eji ndị nkụzị nwere ezigbo ọzụzụ kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo.

Ọnụọgụ

Ndịna

EMI

EM

AM

AMI

Miin

SD

Mkpebi

16.

Ndị nkuzị nwere ezigbo ọzụzụ mara oge ụmụakwụkwọ dị njikere maka ọmụmụ abụ ederede Igbo

50

68

13

5

3.1

0.75

A nabatara

17.

Ndị nkụzị nwere ezigbo ọzụzụ mara usoro na nka kacha mma eji akụziri ụmụakwkwọ abụ.

70

39

17

10

3.2

0.93

A nabatara

18.

Ndị nkụzị nwere ezigbo ọzụzụ ga-eme ka ụmụakwụkwọ new mkpali mmụọ n' ọmụmụ abụ ederede Igbo.

49

54

19

14

3.1

0.95

A nabatara

19.

Ndị nkụzị nwere ezigbo ọzụzụ na ebido na abụ di mfe ga na nke adịghị mfe.

63

50

14

9

3.2

0.88

A nabatara

20.

ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmuta na-ewepụta oge maka nkụzị abụ ederede Igbo.

51

68

13

5

3.2

0.73

A nabatara

Mgbakọta ọnụ miin.

3.1

Data dị na tebulu nke anọ na-egosi na ndịna nke iri na isii 3.1, iri na asaa 3.2, iri na asatọ 3.1 iri na iteghete 3.2 na iri abụọ 3.2 anabatara ndịna ndịa niile na nchọcha n' ihi na miin ha gafere 2.5.

Mkparịtụka

Etu a ga-esi eji ngwa nkụzị kọmpụta kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbọ.

Ọsịsa ndị nkụzị Igbo gosipụtara na ngwa nkụzi kọmpụta ga-eme ka ụmụakwụkwọ nwe mkpali mmụọ n' ọmụmụ abụ ederede Igbo. Ọzọ kwakọmpụta ga-eme ka ụmụakwụkwọ hapụ ịrahụ ụra mgbe a na-akụzi abụ ederede Igbo. Ngwa nkụzi kọmpụta ga-eme ka ọmụmụ abụ ederede Igbo dowanye Anaya. Ngwa nkụzị kọmpụta ga-eme ka ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ nwe ezi mmekọrịta.

Ihe ndịa niile ga-enye aka n'ịkwalite nkụzị na ọmụmụ abụ ederede Igbo n' ogo sinio sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsuka. Nchọcha a dabara n' echiche Ogbu (2017) nke kọwara na ngwa nkụzi kọmpụta pụtara n' ihi ezughi oke ngwa nkụzi ndị ọzọ. Nke a bụ eziokwu n' ihi na ngwa nkụzị kọmpụta abụghị naani ọnụnụ kama ụmụakwụkwọ na- anụ, hụ n' anya ma metukwa ya aka, nke a ga-eme ka ha nwe mkpali mmụọ ma weta ezi mmekọrịta na etiti ha na onye nkụzị.

Etu usoro nkụzi mmemme ga-esi kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo.

Ọsịsa ndị nkụzi Igbo zara na ajụjụ nchọcha nke abụọ gosiri na e nwere usoro nkụzị mmemme dị iche iche onye nkụzị ga-gbaso iji kwalite ọmụmụ abụ ederee Igbo. Usoro ndị a gụnyere ọgụgụ ngụpụta, ọgụgụ ngụkọọnụ, nrụrịta ụka na ntụlekọrịta echiche. Ọ bụrụ na onye nkụzị agbaso usoro nkụzi mmemme nke ọma na ụmụakwụkwọ ga-esonye nkọma n' ọmụmụ abụ ederede Igbo. Nke a dabara n' echiche Ọnwụka (2016) nke kọwara na ụsọrọ nkụzi mmemme bụ na nwata akwụkwọ ọbụla ga-esonye n' ihe omume. Nke a bụ eziokwu n' ihi na ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ sonye n' ihe omume mgbe onye nkụzị na-akụzi ihe ọ ga-eme ka ha hapụ ichefu ihe onye nkụzi kụziri.

Etu a ga-esi eji nka ekwumekwu kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo.

Ọsịsa ndị nkụzi Igbo n'ajụjụ nchọcha nke atọ gosiri na onye nkụzi Igbo iwebata nka ekwumekwu dị iche iche na nkụzi abụ ederede Igbo ga-enye aka kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n' ogo sinịọ sekọndịrị. Nka ekwumekwu ndị ha nabatara bụ ige ntị na redio, site n' ịkpọbata onye ọkachamara n' asụsụ Igbo iwebata agwụgwa na okwu ntụhị dị iche iche na ikwe ukwe.

Nchọcha a dabara na nkọwa Ebe (2004) n'ihi na ọ kọwara na nka ekwumekwu bụ nka onye nkụzi webatara na nkụzi ya iji mee ka ụmụakwụkwọ mụta ihe ọ na-akụziri ha. Nkea bụ eziokwu n' ihi na nka ekwumekwu nwere ọtụtụ uru ọ na-aba na nkụzi na ọmụmụ, ọ na-eme ka ụmụakwụkwọ mara etu-esi akpọpụta ọtụtụ okwu Igbo dị iche iche. Ọ na-eme ka ha mara okwu ọhụụ batara n' asụsụ Igbo. Ọ na-emekwa ka nkụzi na ọmụmụ dowanye anya tụmadi abụ ederede Igbo.

Etu a ga-esi kwalite abụ ederede Igbo n' ogo sinịọ sekọndịrị site n' iwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta n'asụsụ Igbo n'ọrụ. Ọsịsa ndị nkụzị Igbo na ajụjụ nchọcha nke anọ gosiri na iwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta n' ọrụ ga-kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo. Ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ ịmmụta mara oge ụmụakwụkwọ dị njikere maka ọmụmụ abụ ederede Igbo, ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta mara usoro na nka kacha mma e ji akụziri ụmụakwụkwọ abụ ederede Igbo. Ha ga-eme ka ụmụakwụkwọ nwe mkpali mmụọ maka ọmụmụ abụ ederede Igbo. Ha ga-ebido na abụ dị mfe gaa na nke adịghị mfe. Ha na-ewepụta oge maka ikụzị abụ ederede Igbo Ọsịsa ha gosiri na ihe ndị a niile edapụtara ga-enye aka kwalite abụ ederede Igbo n' ogo sinio sekọndiri dị na zonu mmụta Nsụka.

Nchọcha a dabara na nke Ebe (2004) nke kọwara na mmadụ anaghị enye onye ọzọ ihe ọ na-enweghị. Nke a bụ eziokwu n' ihi na tupu mmadu akụzịe ihe ọ ga-ama ihe ọ chọrụ ịkụzi maka ya nke ọma, ma na ọ bụrụ na onye nkụzi enweghi ọzụzụ banyere abụ ederede Igbo nkụzi na ọmụmụ abụ ederede ga-abụ nsogbu nye onye nkụzị na ụmụakwụkwọ.

Mkpokota

Nchọcha a gosipụtara ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n' ogo sinịọ sekọndịrị di na zonu mmụta Nsụka nke steeti Enugwu. Site n' ụdị ngwa nkụzi eji akụzi abụ ederede dịka ngwa nkụzị kọmpụta. Ngwa nkụzị kọmpụta ga-enye aka kwalite nkụzị na ọmụmụ abụ ederede Igbo. Nchọcha a gosipụtara na usoro nkụzi mmemme ga-akwalite ọmụmụ abụ ederede n' Igbo. Usoro dịka ọgụgụ ngụpụta onye nkụzị ga-agụpụta ihe ma kpọlite ụmụakwụkwọ n' otu n' otu ka ha gụgharịa ihe ọ gụpụtara. Nchọcha gosikwara na nka ekwumekwu dị iche iche ga-enye aka kwalite omụmụ abụ ederede Igbo dịka stie n' ige ntị na redio nke ga-eme ka ha mụta ka esi akpọpụta okwu ụfọdụ di iche iche nke ọma.

Ọzọ kwa nchcha gosiri na iwe ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta na ọrụ ge-akwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo maka na onye nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta mara ụzọ kacha mma ọ ga-agbaso na nkụzi na ọmụmụ abụ ederede Igbo.

Ntnye Aro

  • Gọọmentị ga-ekwepụta agụmagụ n' asụsụ Igbo nke abụ bụ otu ngalaba n' ime ya ka ọ dị ka nke asụsụ bekee.
  • Gọọmentị ga-agba mbọ hụ na ngwa nkụzị kọmpụta dị na ụlọakwụkwọ sekọndịrị niile.
  • Gọọmentị ga-agba mbọ hụ na ha nwere ndị na akụzi agụmagụ iche ka ọ ghara I bụ ndị nkụzi asụsụ Igbo na-akụzi agụmagụ nke abụ bụ otu nglalaba n' ime ya.
  • Gọọmentị tumadị ụlọakwụkwọ dị iche iche ga-agba mbọ na-enye ụmụakwụkwọ ndị mere nke ọma n'ule agụmagụ ihe nrite dị iche iche.

Mmechi

Nchọcha a lebara anya n' ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n' ogo siniọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Nsụka, steeti Enugwu.

Nchọpụta nchọcha a gosiri na ngwa nkụzi kọmpụta dị oke mkpa na nkụzi na ọmụmụ abụ ederede Igbo, ọ bụrụ na onye nkụzi ejiri ngwa nkụzi kọmpụta na-akụziri ụmụ akwụkwọ abụ ederede Igbo na ọ ga-eme ka nkụzị na ọmụmụ abụ ederede dị mfe ma dowanye anya.

Usoro nkụzi mmemme bụ ụzọ ọzọ dị mkpa na nkụzi na ọmụmụ abụ ederede Igbo. Nchọpụta nchọcha gosiri na ọ bụrụ na onye nkụzi ewebata usoro nkụzi mmemme dị iche iche mgbe ọ na-akuzi abụ ederede Igbo na nke a ga-eme ka ụmụakwụkwọ sonye n' ihe ọmụmụ ma ghọta ihe onye nkụzi na-ekwu nkeọma.

Ọzọ kwa nchọpụta nchọcha a gosiri n nka ekwumekwu ga-enye aka kwalite ọmụmụ abụ ederede Igbo n' ogo siniọ sekọndịrị. Ọ bụrụ na onye nkụzi ewebata nka ekwumekwu di iche iche oge ọ na-akụzi abụ ederede Igbo na ọ ga-eme ka ụmụakwụkwọ ghọta nkụzi ya nkeọma.

Iwe ndi nkụzị nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta na-ọrụ bụ ụzọ ọzọ a chọpụtara na nchọcha a ga-enye aka kwalite ọmụmu abụ ederede Igbo n' ihi na ndị nkụzi nwere ezigbo ọzụzụ/mmụta mara ụzọ kacha ma eji akuzi abụ ederede Igbo.

Edensịbia

Agbedo, C. U. (2000). General linguistics: An introductory research. Nsukka: ACE Resources

Agbo, E. C. & Ozo, A. L. (2016). Etu a ga-esi kwalite nkụzi na ọmụmụ ejije ọdịnaala Igbo n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Nsụka ọban.Unpublished B.Ed. project,. Department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka.

Amakwe, E. J., Nwachukwu, C. N., & Nwagbara, U. K. (2016). Nsogbu ụmụakwụkwọ na-enwe n'ọmụmụ abụ Igbo n'ụlọakwụkwọ junịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Bende nke Steeti Abịa. Unpublished B.Ed. project, department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka.

Anozie, C. C. (1999). Lingwistiki: Sayensị asụsụ. Nsukka: Fulladu Publishing Company.

Anozie, C. C. (2001). Ntọala ụtọasụsụ Igbo na edemede. Nsukka: Amazing Grace Printing Company.

Chomsky, N. (1957). Syntactic structures. The Hague: Mouton.

Ebe, A. E. (2004). Nka nkụzi Igbo maka ụlọakwụkwọ praịmarị na junịọ sekọndịrị skul. Nsụkka: Chuka Educational Publishers.

Eze, S. O. & Agbo, E. (2014). Etu a ga-esi kwalite ọmụmụ asụsụ Igbo. Unpublished B.Ed. project, Department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka.

Ikekeonwu, C. I. (1987). Igbo dialect clusters: A classification. University of Nigeria, Nsukka. Linguistics Department Seminar Paper.

Maduakor, O. (1991). Introduction to poetry. Nsukka: Fulladu Printing Company.

Mba, B. M. (2001). Introduction to linguistics. Nsukka. J. F. C. Limited.

Ndudim, C. (2003). Towards an Inclusive Mother Tongue for Hearing Impaired. Journal of Nigeria Association of Journalist. Ibadan: HAD HOH 34-41.

Nduka, C.A. & Ugwuoke, U.J. (2013). Nsogbu dị n'ịkụzi na nghọta abụ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Nsụka. Unpublished B.Ed project, department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka.

Nwaozuzu, G. I. (2008). Dialects of Igbo language. Nsukka: University Press.

Nwodo, C. S. (2008). Applied English linguistics: An introductory approach. Enugwu: Liben Press.

Nworgu, B. G. (2016). Educational research (3rd ed.). Nsukka: University Trust Publishers.

Ogbe, N. G. (1995). Fundamentals of literature: Comparative approach to literary appreciation. Enugwu: John Best Publishers.

Ogbu, L.C. (2017). Adịmire kọmpụta na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n'agụmagụ Igbo n'ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ukwu na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebọnyi. Unpublished M.Ed Dessertation, Faculty of Education, University of Nigeria, Nsukka.

Okafo (2001). Starting with computers. Enugwu: Immaculate Publishers.

Okafo, S. O. (2008). Akanka n'agụmagụ Igbo: Ederede na ọdịnaala. Enugwu: John Best Publishers.

Okebalama, C. N. (2003). Mkpọlite agụmagụ ọnụ. Nsukka: Snap Press.

Onuh, C. N. (2014). Nsogbu a na-enwe na nkụzi na ọmụmụ abụ n'ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze Nọọtụ nke Steeti Enugwu. Unpublished B.Ed. project, department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka.

Onwuka, G. T. (2016). Igbo Special method. Unpublished Lecture Note. University of Nigeria, Nsukka.

PPSMB (2018). Enugu State Students' Population. Statistical Unit. Nsukka.

Ugwuona, C. N. (2015). Ntọala na isiokwu ụfọdụ na fonọlọji Igbo. Nsukka: University of Nigeria, Press.

Ụfọdụ Nkọmịrịnkọ Nnamdi Azikiwe (ZIK) N'ala Igbo

Nke Si N'Aka

Ihedigbo Ruth Ebere

Ngalaba Lingwistics na Asụsụ Igbo nke Mahadum Naijirịa Nsụkka.

ebere.ihedigbo@unn.edu.ng, ebereihedigbo@yahoo.com

08034722818

na

Okey-Agbo, Ndidi

Ngalaba Lingwistics na Asụsụ Igbo nke Mahadum Naijirịa Nsụkka.

08061271905, jacinta.okey-agbo@gmail.com

Ụmịedemede

Nchọcha a lebara anya na nkọmịrịkọ ụfọdụ a na-akọ gbasara Zik n'ala Igbo. Ebumnuche nchọcha a bụ ichọpụta eziokwu ma ọ bụ ugha dị na nkọmịrịkọ ndị a. O ji atụtụ nkọmịrịkọ nkendoko tuchaa data. Nchọpụta nchọcha a gosiputara ụfọdụ nkọmịrịkọ e nwere n'ala Igbo gbasara Zik dika Zik na mmụọ mmiri nke osimiri Benue, Zik na nwaanyị na-arọ ụkwụ, Zik na oche ntọ, Zik na ndị ogbu isi na Zik na pawuda abalị Satodee. Nchọcha a chọpụtara na e nwere ihe gosiri na ụfọdụ nkọmịrịkọ ndi a bụ eziokwu ebe ụfọdụ enweghi ihe ngosi ọbụla. Nchọcha a gosiri na mmadụ ọbụla nwere akụkụ abụọ ma gosikwa na nkọkịrịkọ niile a na-akọ maka Zik, o nweghi nke ọ chọrọ okwu ma ọ bụ ikpe mara ya. Nchọcha gosikwara na nkọmịrịkọ bụ otu ụzọ e ji eji agụmagụ ọnụ arụ ọrụ dị egwu bara uru n'ala Igbo.

Abstract

i

This paper undertakes the study of myths related to Zik in Igbo land. The objective of the study is to find out the truth or falsehood behind these myths. It adopts the structural theory of myth as its theoretical framework. It x-rays some myths about Zik in Igbo land such as Zik and the mermaid of the Benue River, Zik and the limping woman, Zik and the gummy chair, Zik and the assassins, Zik and the Saturday night powder. The study reveals that while there are evidences to prove that some of the myths are true, some have no empirical evidence. It also reveals that every human has two sides of life and that Zik in all the myths was never guilty of any offense. The study also reveals the function of literature as a means of entertainment.

Ntọala Nchọcha

Ikwu na Nnamdi Azikiwe nwụrụ anwụ bụ odogwu n'ala Afrịka gbaa gburugburu ọ kachasị ala Igbo bụ ala nna ya abụghị okwu nkwufe. Aha mkpọbiri ya n'ala Igbo bu Zik. Na nchọcha a, anyị ga-ejikari aha mkpọbiri a rụọ ọrụ. Ọ bụ eziokwu na Zik anwụọla mana ihe ndị o merela e ji echeta ya n'ala Igbo nakwa n'ala Afrịka gbaa gburugburu juru eju bara abara. Ọ dị mkpa na anyị kara akara na-egosi ndịiche dị na Zik dịka onye isi mbụ nke ala anyị bụ Naijiria na Zik nke anyị na-akọ nkọmịrịkọ ya. Zik dịka onye isi ala anyị nke mbụ bụ nwoke topuru etopu, jie nji, maa mma ma zuo oke na nwoke. Ọ na-eyikari uwe nke ndị bekee kpọrọ suutu ma ọ na-aga obodo oyibo ma na-eyikwa agbada mgbe o nwere ihe ọgbakọ nke obodo ma ọ bụ otu. Ọ hụrụ ala Afrịka ọ kachasi Naijiria n'anya bụ ihe kpatara o ji gbaa mbọ hụ na Naijiria kwụụrụ onwe ya n'afọ 1960. Zik nke anyị chọrọ ileba anya na nkọmịrịkọ ya bụ ndụ ime Zik nke ndị mmadụ ọ kachasị ndị Igbo jirila kụọ akụkọ dị iche iche ma kwenyekwa nakụkọ ndị ahụ nke mere ụfọdụ ndị Igbo ji ekwu na Zik bụ mmadụ mmụọ. Ihe kpatara nkenye a bụ na akụkọ na-akọ etu Zik si merie ọtụtụ ndị mmadụ ma ndị ọcha, ndị isi ojii nakwa ụmụ mmụọ. Nwala (1985:81) kwenyere na e nwere mmadu bụ mmụọ. Ọtụtụ nkọmịrịkọ gbasara Zik mere nchọcha a jiri kwado ihe Nwala (1985:81) kwuru kwenyekwa na Zik bụ mmadụ mmụọ.

Nkọmịrịkọ dịka Encyclopaedia Britannica, vol 8, (1988:470) sị kọwaa ya bụ akụkọ, nke nsiripuru ya edoghi anya na-akọwa maka ihe mere eme ma ọ bụ ihe na-eme eme n'ụwa. Na nkọwa nke anyị, anyi ga-akọwa nkọmịrịkọ dịka akụkọ nkwenye mgbe ochie na-akọwa maka ihe ndị na-eme eme. Nkọmịrịkọ na-esi n'aka nna fee n'aka ụmụ na ụmụ ụmụ ha. Otu njirimara nkọmịrịkọ dịka ọ dị n'agụmagụ ọnụ ndị ọzọ bụ na ọ na-enwe mgbanwe na nkọpụta ya.

Nkọmịrịkọ dị adị n'ala Igbo tupu a mụọ Zik. Emenyeonu (1976:1) kwenyere nke a ma kwuo na n'akụkọ ifo na nkọmịrịkọ n'ala Igbo, mma na-emeri njọ, eziokwu na-emeri asị, ezindụ na emeri arụrụala. N'ịkwado nke a, Ọnwụbiko (1991:3) kwuru na ụwa ndị Afrịka bụ ụwa mmadu, anụmanụ na mmụọ. Ihe kpatara okwu a bụ na o kwenyere na site na ntọala ndị Igbo, e nwere ọtụtụ nkọmịrịkọ na nkọkịrịnkọ dị iche iche gbasara ụmụ mmadụ, ụmụ mmụọ na ụmụ anụmanụ.Nkọmịrịkọ anyị na-eleba anya na nchọcha a bụ nke mmadụ-Nnamdi Benjamin Azikiwe.

Atụtụ e ji arụ ọrụ

Na nchọcha a, anyị ga-eleba anya n'atụtụ dị iche iche e nwere ike iji rụọ ọrụ gbasara nkọmịrịkọ. Ụfọdụ atụtụ ndị ahụ bụ:

i. Atụtụ nkọmịrịkọ kenkọwa

Ụdị atụtụ a na-akọwa na ọrụ nkọmịrịkọ bụ ịkọwapụta ihe kpatara ihe ji dịrị etu ọ dị n'ụwa taa. Ụdị nkọmịrịkọ a na-akọwa ọtụtụ ihe gbasara akụkọ ya mere na ihe kpatara ụfọdụ ihe na-eme n'ụwa taa ji eme dịka ihe kpatara na mmadụ na-anwụ anwụ taa. Nkọmịrịkọ a na-ekwenye na ọ bụ chi dị iche iche na-eme ka ihe niile na-eme na ndụ mmadụ na-eme. Ọ bụ ezịokwu na Chukwu keputara mmadụ n'ụwa a, e ji nkọmịrịkọ kenkọwa akọwapụta ihe kpatara ọtụtụ ihe na-eme na ndụ mmadụ ji eme.

ii. Atụtụ nkọmịrịkọ keọrụ

Atụtụ nkọmịrịkọ keọrụ na-akọwa etu e si eji nkọmịrịkọ dị iche iche dozie obodo n'ala Igbo. Ụdị nkọmịrịkọ a na-akọwa ihe ndị e kwesiri ime nke ndị Igbo na-anabata na ihe ndị a na-ekwesighị ime bụ nke ndị Igbo na-anaghị anabata. Atụtụ a kwenyere na e ji nkọmịrịkọ edozi obodo n'ụzọ dị iche iche. Obodo ọbụla kwenyere ma na-akọwapụta nkọmịrịkọ a anaghị enwekabe mpụ na nnupuisi a na-enwe n'obodo ndị ọzọ na-ekwenyeghi na nkọmịrịkọ a.

iii. Atụtụ nkọmịrịkọ nke nsinubụrụ

Atụtụ nkọmịrịkọ a na-akọwa ka nkọmịrịkọ si metuta ụbụrụ na echiche mmadụ. O kwenyekwara na ọ bụ site n'ụbụrụ amaghị ama (subconscious mind) ka nkọmịrịkọ niile e nwere n'ụwa a si toputa. O kwenyere na ihe mere ọtụtụ nkọmịrịkọ dị n'ebe dị iche iche ji yie onwe ha bụ maka na ọtụtụ ndị n'ebe dị iche iche na-agabịga ihe yiri ibe ya. Atụtụ a kwenyere na ọ bụ n'ihi na nkọmịrịkọ si n'ụbụrụ mere e ji nwee ihe ọkpụ dị iche iche n' ụwa niile gbaa gbụrụgbụrụ.

Atụtụ ihe ndị e merela gbasara isiokwu

Ikwubuzo (2006) mere nchọcha gbasara ndịiche dị na nkọmịrịkọ okike n'ala Igbo. Usoro o ji họpụta ọnụọgụgụ ndị mmadụ o ji mee nchọcha bụ usoro tụmbọm tụmbọm. Nchọcha ya gosiri na ihe na-akpata ndị iche ndị a bụ n'ihi na ọ bụ n'ọnụ ka a na-akọputa nkọmịrịkọ ndị a. Ihe ọzọ ọ chọpụtakwara na-ebute ndịịche ndị a bụ akanka ndị nkọpụta. O kwuru na ebe ndị nkọpụta nwere akanka dị iche iche, na ha na-emekwa mgbe ụfọdụ webata akanka ha na nkọmịrịkọ ha. Nchọcha abụọ a yiri n'ihi na ha na ekwu maka nkọmịrịkọ mana ndịiche ha bụ na ọrụ a na-akọ maka otu onye mana Ikwubuzo (2006) na-akọ maka nkọmịrịkọ ala Igbo.

Ekeke na Ekeopara (2010) mere nchọcha gbasara chi-ukwu, chinta na mmụọ dị iche iche. Ebumnuche ọrụ a bụ ịchọpụta etu ndị Afrịka si ahụta chi ndị a ma na-efekwa ha ofufe ebe ọ bụ na ndị mba ndị ọzọ na-ahụta ndị Afrịka dika ndị anaghi efe chi ọbụla ofufe. Nchọcha a chọpụtara na ihe gbasara chi ndị a abụghị ihe ọhụụ nye ndị Afrịka kama na ha na-ahụta obere chi ndị ọzọ na mmụọ dị iche iche dịka ndị na-ejere chi-ukwu ozi. Nchọcha ya gosikwara na ndị mba Afrịka kwenyere na chi nchekwa. Ha kwenyere na mmadụ ọbụla Chukwu kere eke nwere chi nchekwa na-edu ya. Nchọcha anyị na nke Ekeke na Ekeopara (2010) chọwara iyi n'ihi na ha na-akọwa maka ihe gbasara ihe karịrị mmadụ nkịtị dịka chi. Ebe ha nọrọ diwaga iche bụ na ebe nchọcha a na-eleba anya na nkọmịrịkọ Zik, nke Ekeke na Ekeopara lebara anya na chi-ukwu, chinta na mmụọ dị iche iche.

Akaeze (2010) lebara anya na nkọmịrịkọ ala anyị Naijịrịa dịka ihe e ji edozi obodo. Ihe bụ ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta ụrụ na ọghọm dị na nkọmịrịkọ ala anyị Naijịrịa. Nchọcha ya jiri atụtụ arụmọrụ tụchaa data. Nchọcha a tụchara nkọmịrịkọ ndị a họpụtara na agbụrụ atọ na Naijịrịa. Nchọcha a chọpụtara na nkọmịrịkọ na-arụ ọrụ dịka odozi obodo n'otu aka ma na-ebutekwa nsogbu n'aka nke ọzọ. Ndịịche dị na nchọcha Akaeze (2010) na nke anyị bụ na Akaeze (2010) mere nchọcha n'uru nkọmịrịkọ bara ebe nchọcha nke a na-akọ maka odogwu nwoke bụ Zik. Nchọcha abụọ a yiri n'ihi na ha abụọ na-akọcha maka nkọmịrịkọ.

Jaja (2012) lebara anya na nkọwa nkọmịrịkọ n'Afrịka dịka o si metuta mhụrụ ụwa ha. Ebumnuche nchọcha ya bụ ịchọpụta ihe jikoro nkọmịrịkọ ndị Afrịka na mhụrụ ụwa ha. Ọrụ a chọpụtara na nkọmịrịkọ na-anọchịta anya mmụọ ndị Afrịka na mhụrụ ụwa ha. Ihe kpatara nke a bụ na nkọmịrịkọ na-egosiputa ka ụwa dị, ya na ihe niile dị ya n'ime. Nchọcha ya gosikwara na nkọmịrịkọ bara ọtụtụ uru n'ala Afrịka dịka idozi ma ọ bụ imezi omenaala nna nna anyị ha, mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ihe ndị ọzọ. Myiri dị na nchọcha Jaja (2012) na nchọcha nke a bụ na ha abụọ na-akọwa ihe gbasara nkọmịrịkọ mana ndịiche dị na ha abụọ bụ na ebe Jaja (2012) na-akọ maka nkọmịrịkọ dịka o si gbasata mhụrụ ụwa ndị Afrịka, nchọcha anyị na-eleba anya na nkọmịrịkọ nke gbasara mmadụ-Zik.

Ekwobi, Osuora, Ndu, Ifediora, Asinobi na Eke (2016) mere nchọcha gbasara etu nsọ nrị na nkọmịrịkọ ha n'ala Igbo si metuta ọnọdụ ụmụ nwaanyị dị ime. Ihe ebumuche ha bụ kpọmkwem na nchọcha a bụ ịchọpụta etu nsọ nri n'ala Igbo si ebutara ụmụ nwaanyị dị ime na ụmụaka erịzughi nri oke. Nchọcha a jiri nhọpụta mkpachara anya họpụta ndị e ji mee nchọcha. Nchọcha a gosịrị na ejụla na anụ nchị bụ anụ ụmụ nwaanyị dị ime na-asọkarị n'ala Igbo n'ihi nkwenye ha nwere na anụ ejụla ga-eme nwatakịrị adịghị gara gara ebe anụ nchị ga-eme ka ime omume nye nwaanyị dị ime nsogbu. Ha chọputakwara na akwa bụ otu ihe a na-awọ ụmụaka n'ala Igbo n'ihi nkwenye ha nwere na nwatakịrị na-eri akwa ga-amụta izu ohi n'ihi ụtọ akwa ahụ. Nchọcha anyị na nke a yiwere n'ihi na ha abụọ lebara anya n'ihe gbasara nkọmịrịkọ mana ha abụọ dị iche n' ihi na nchọcha anyị na-akọ maka nkọmịrịkọ mmadụ ebe nchọcha nke ndị a na-akọ maka nkọmịrịkọ nri.

Atụtụ ntụcha data

Atụtụ nkọmịrịkọ a ga-eji atụcha data anyị bụ atụtụ nkọmịrịkọ kendoko. Atụtụ a na-egosi na mmadụ ọbụla Chukwu kere eke nwere akụkụ abụọ. Mgbe ụfọdụ anyị ga-ahụta ezigbo onye ohi a zụrụ azụ ebe ọ na-akpaso nne ya, ụmụnne ya nakwa ndi ọzọ agwa ọma. Atụtụ a na-akọwa na mmadụ ọbụla nwere mma na njọ n'ahụ ha kamgbe Chukwu jiri kee ha.

Ụfọdụ nkọmịrịkọ gbasara Zik n'ala Igbo

Zik na mmụọ mmiri nke osimiri Benue

Akụkọ kọrọ na mgbe a na-achọ ịrụ akwammiri Benue, mmụọ mmiri nwe ma birikwa na mmiri ahụ ekweghi ka nke a mee. Ndị ọrụ Nigerian Railway rịọrọ ya arịrịọ otu ha nwere ike chukwaa aja etu ha nwere ike mana mmụọ mmiri ahụ ekweghi. Ha gbaa isi akwara rụọ ọrụ, tupuu echi ya, ihe niile ha rụrụ na emebisi ha bidokwa n'isi.

N'oge na-eteghi aka, akụkọ mmụọ mmiri na mkpamkpa a ọ na-akpa ruo Zik ntị. N'egbughi oge, Zik zọchiri na mmiri ahụ wee bido iyipusi efe ya. Ka o yipusiri efe ya, ọ dabara n'ime mmiri wee nọọ abalị asaa apụtaghị apụta. N'ụbọchị nke asatọ, ọ kpọọrọ otu ọmarịcha nwaagbọghọ bụ sọ mma seputa n'elu mmiri. Ọ gwara nwaagbọghọ ahụ ka ha gwuo egwu karama. Mgbe ha malitere igwu egwu a, Zik bụ ụzọ bido, ghọọ ijiji fegharịa fegharịa feba n'ime karama nọ n'ekepere mmiri ahụ. O fegharịrị ntakịrị n'ime karama ahụ tupuu ọ pụta. Mgbe o ruru oge nwata nwa agbọghọ, o fegharịkwara ka Zik feba n'ime karama ahụ. Ozugbo o febara na ya, Zik were ihe kpuchie ọnụ karama ahụ. Mgbe o kpuchiri ya ọ kpọọ ndị mmadụ ka ha gwụọ kọnkịrị ebe e liri ijiji ahụ na karama ahụ. Ili ahu dị ruo taa n'osimiri Benue.

Zik na nwaanyi na-arọ ụkwụ

Akụkọ kọrọ n'otu ụtụtụ ụbọchị ụka ka Zik na-aga ụka, ọ hụrụ otu nwaanyị na-arọ ụkwụ ka ọ bụ nkụ n'isi. Mgbe Zik hụrụ ya, o metara nwaanyị ahụ ebere wee keputa akwa ogologo olu ya wee keere nwaanyị ahụ nkụ. Ka o kechara nku ahụ, o rịọrọ nwaanyị ahụ ka o nyere ya aka bụrụ ya mana nwaanyị jụrụ ajụ Zik n'onwe ya siekwa ọnwụ na ya chọrọ ibu nkụ ahụ. N'ikpeazụ, nwaanyị ahụ kwetara, Zik buru nkụ ahụ na-eso ya n'azụ.

Ka ha rutere n'ekpere mmiri, nwaanyị ahụ gwa Zik ka ọ kwusị. O buuru nkụ ahụ n'isi Zik tuba ya n'ime mmiri ahụ gwa Zik na ọ ga-abụ ọgaranya a na-anụ aha ya n'ụwa a. Ọ gwakwara ya na o nweghi mmadụ ime muru ga-enwe ike igbu ya. O nyere Zik otu ọla aka gwa ya ka o loo ya. Mgbe Zik loro ọla aka ahụ, Nwaanyi ahụ gwara ya na ọ nyela ya ike ime ọtụtụ ihe ndị mmadụ nkịtị na-enweghi ike ime bido ụbọchị ahụ.

Ka mgbe ahụ, o nweghi ihe ndị mmadụ mere ka ha gbụọ Zik na-enweta ya. Ọnwụ bụ chi ya kpọọrọ ya.

Zik meriri ndị iro ya na ọgwụ ntọ

Zik na ndị iro ya nọ n'ọchịchị mana o nweghi ka o si mata na ndị ya na ha na-eriko anụkọ bụ ndị iro ya. Otu ụbọchị, ha nwere ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị mana Zik abaghị n'oge. Ndị iro ya were ohere abịaghị n'oge a gaa be dịbia nata ya ọgwụ ga-eme na Zik nọdụ n'oche ka ọ ghara ibilite ọzọ. Ka ike ya tọ n'oche ahụ. Ha were ọgwụ ahụ dịbịa nyere ha tee n'oche ha hapuru Zik.

Mgbe Zik jiri bata, ha bidoro n'ụzọ tuwe ya aha dị iche iche. Mgbe o rutere n'ihu oche, ha duru ya gaa gosi ya oche ahụ ha tere ọgwụ ntọ ka ọ nọdụ ala. Zik gwara ha chere nwa ntịtị oge na ya ga-anọ ọdụ. Ọ rịọrọ ha ka ha nye ya ohere. Ka ha nyere ya ohere, ọ gaa ihu gaa azụ, gaa aka nrị na akaekpe chilie aka ya elụ. Ka ọ na-achịtụ aka ha wulata ka ọ nọdụ ala oche ọzọ esi n'ala pụta n'ukwu ya o wee nọdụ n'elu ọche ahụ. Nke a mere ka ndị iro Zik na ọgwụ ntọ ha maa afọ n'ala. Iwe juputara ụfọdụ ndị iro ya obi ebe ụfọdụ ndị ọzọ nọ n'ụjọ na mgbaghojuanya maka udị mmadụ Zik bụ. Ụfọdụ n'ime ha kpebiri n'obi ha na Zik abụghị mmadụ kama mmụọ.

Zik na ndị ogbu isi

Akụkọ na-akọ na Zik bụ onye ndọrọndọrọ a maara ama n'ala Naijiria. N'ihi nke a ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ndị ọzọ nọ na-atajiri ya anya. Ha chọrọ ụzọ dị iche iche ha ga-eji egbu Zik dika oche ntọ ahụ anyị kọrọ, maka ya ma mekwara ya nsị dị iche iche mana o nweghi ihe ndị a nwetara Zik. Ndị iro ya kpebiri na ebe mbọ ha niile igbu Zik nọ-akpụ afọ n'ala, na ha ga-egbu ya site n'aka ndị ọzọ. Ha gara gobie ndị ogbu isi mmadụ ise kwuọ ha ezigbo ụgwọ mara abụba wee rịọ ha ka ha jiri egbe ma ọ bụ mma gbagbuo/sugbuo Zik.

Ka oge ọgbakọ ndị isi ndọrọndọrọ ụfọdụ ruwere, ha tinyere nzuko ahụ n'Abụja. Ihe ha ji mee nke a bụ na mgbe ahụ, Abuja abụbeghi isi obodo ala anyị ya na n'ihi na mmepe adịghị na ya dịka ọ dị na Legos bụ isi obodo ala anyị mgbe ahụ. N'uche ha ọ ga-enye ndị uwe ojii nsogbu ịchọpụta ha n'Abụja.

Mgbe ha mechara nzụkọ, ndị ntọ ahụ bụ ụmụ okorobịa aji jụrụ obi dị ise n'ọnụ ọgụgụ kewara onwe ha n'ebe dị iche iche n'ụlọ oriri na ọnụnụ ahụ Zik no n'ime ya ka e wee hụ ihe niile ọ na eme mgbe niile. Mgbe Zik batara n'ụlọ ebe ọ ga-ehi ụra, ha niile kelere ya ma gwa otu onye n'ime ka o nyere ya aka bụba akpa ya n'ime ụlọ ahụ. Ihe ha ji mee nke a bụ ka onye ahụ chọpụta anya ụlọ ebe Zik na-edina. Ka nwa ntịntị oge gasịrị, mmadụ abụọ tinyere onye nke bubara ya akpa gara ebe ahụ o na-arahụ jiri igodo anya ụlọ ya ha gobiri n'aka ndị ọrụ ụlọ oriri na ọnụnụ ahụ wee kpọpee ụzọ. Ha hụrụ Zik ka o dina ala na-arahụ ụra mana ozugbo otu onye n'ime ha dapụda egbe, Zik wee minwuo site n' aja pụọ. Ha niile we gbapụ ọsọ ka ha gbaputara ị kọrọ ndị otu ha mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ na-eche ụzọ nche, ha huru Zik ahụ ka o si n'iro na-abata n'ụlọ oriri na ọnụnụ ahụ. Ụjọ wee jide ha niile ha jiri ọsọ gbapu ga kọọ ihe ha hụrụ.

Akụkọ Pawụda abalị Satodee

Akụkọ kọrọ na ihe dịka afọ iri asatọ gara aga, Zik gara lụọ nwaanyị izizi. Nwaanyị a abụghị ezigbo nwaanyị. O nwere anya ukwu, oke ọchịchọ nakwa ntaji anya tinyere na ike ọrụ adịghị ya. Nwaanyị a hụrụ ego n'anya nke ukwuu. Ọ naghị ọrụ ya dịka nwaanyị n'ezinaụlọ ya. Nke a mere ka iwe wee Zik o wee baara ya oke mba otu ụbọchị gwa ya na ọ bụrụ na ọ kwusighi ụdị ajọ omume ahụ ọ na-eme na ya ga-aga alụ nwaanyị ọzọ. Ozigbo nwaanyị a nụrụ maka ịlụ nwaanyị ọzọ, isi kpakara ya o wee saghee ọnụ ya gwawa dị ya ihe nsị ka mma. Ka o mechara nke a hụ na dị ya atụpụrụghị ya ọnụ ọbụla, o kwakọta ihe ya pụọ n'ụlọ Zik. Alumdi na nwunye ha dị ezigbo nkenke, o rughi otu ọnwa.

Mgbe Zik hụrụ na nwaanyị a apụọla, ọ gaa ga-alụta ezigbo nwaanyị maara obi ya a na-akpọ Uche. Ozigbo nwaanyị nke mbụ ahụ hụrụ na Uche na dị ya na-ebi n'udo na-enweghi nsogbu ma ọ bụ esemokwu ọbụla, na ha hụrụ onwe ha n'anya nke ukwuu, o nwewere ha ntaji anya. Ọ gara chọwa ụzọ ọ ga-eji egbu Zik. Ozigbo ndị iro Zik nọ na ndọrọndọrọ chọpụtara ihe nwaanyi a bụ n'obi, ha nyere ya ego aka azụ buru ibu gwa ya ka o mee ihe ọbụla ọ chọrọ ime ma ya bụrụ na Zik nwụrụ anwụ.

Nwaanyị a kwadochara otu ụbọchị bata n'ụlọ Zik gbuo ikpere n'ala na-arịọ di ya ka ọ gbaghara ya na ya amaghị ama kama na ọ bụ ọrụ ekwensu.

Zik jụrụ ajụ ịgbaghara ajọ nwaanyị a mana nwunye ya Uche tinyere ọnụ rịọ dị ya ka ọ gbaghara ya. Zik wee kwe gbaghara nwaanyị ahụ. O kelere Zik na nwunye ya ekele nke ọma gwa ha na ebe ọ bụ na ha agbagharala ya ka ya na ha rahụ n'ụlọ ha n'abalị ahụ. N'ime abalị mgbe onye ọbụla nọ n'ụra. Zik n'onwe ya nọkwa n'ụra, nwaanyị ọjọọ ahụ bata igbu di ya. Ozugbo o weliri mma elu ka ọ magbuo Zik, Zik mepee anya ya jụọ ya ihe mere o ji daba n'ụdị ọnwụnwa ahụ. O tụpụrụ mma ahụ o ji n'aka gaa gbaa onwe ya ọkụ n'iro n'ụlọ ZIk. Ihe a o mere wutere dị ya mana o nweghi ihe ọzọ o nwere ike ime. Ọ gara kpọrọ ntụ ahụ nwunye ahụ, were ya mere pawụda. Ọ bụ ya bụ nkwenye ndị Igbo ụfọdụ banyere mmebere pawụda ahụ na-esi isi ọma a na-akpọ Saturday night.

Mkpọkọta na mmechi

Anyị gbara mbọ na nchọcha a ideputa nkọmịrịkọ ole na ole gbasara Zik nke e nwere n'ala Igbo. Nkọmịrịkọ ndị a bụ ka ọ si ruo anyị aka ka anyị si kọpụta ya. Anyị e nweghị ike ikwu ma nkọmịrịkọ ndị a ha bụ eziokwu ka ha bụ okwu asi. N'ihi ụfọdụ nkọmịrịkọ dịka ndị anyị kọrọ maka ha gbasara Zik, ndị Igbo kwenyere na Zik abụghị mmadụ nkịtị kama mmadụ mmụọ. Iji kwado na a na-enwe mmadụ mmụọ, Douglas (1977) kwuru na a na-enwewanye ọnụọgụgụ nke mkpụrụ obi gafere nke mmadụ nọ n'ahụ ndị mmadụ.

Ọ bụghị sọọsọ n'ala Igbo ka e nwere ụdị mmadụ Zik. Obodo ndị ọzọ dị iche iche nwechakwara ụdị mmadụ mmụọ dịka Zik na be ha. Ụfọdụ bụ ndị a: Sekou Toure - Guinea, Gnasimgbe Eyadema-Togo, Obafemi Awolowo-Yoruba.

Ụdị mmadụ ndị a dịka Zik n'ala Igbo, ala Naijiria n'ala Afrịka niile na-enwe nkwanye ugwu puru iche. Ọ bụ eziokwu na Nnamdị Azikiwe anwụọla mana nkọmịrịkọ ya enweghi ike ịnwụ anwụ. Nchọcha a chọputara na e nwere ihe ngosi na-ekwu na nkọmịrịkọ ụfọdụ bụ eziokwu dịka nke a hụrụ na osimiri Benue ebe nkọmịrịkọ ndị ọzọ enweghi ihe ngosi ọbụla ga-akwado na ha bụ eziokwu.

Mmechi

Agụmagụ ọnụ na-enwe ihe mmụta na-eso ya. N'otu aka ahụ, nkọmịrịkọ Zik nke anyị na-ede maka ya nwere ihe mmụta anyị kwesiri ịmụta n'ime ya. N'ime nkọmịrịkọ ndị a, o nweghi mgbe Zik chọrọ mmadụ ibe ya okwu. Nkọmịrịkọ anyị niile gbadoro ụkwụ ebe Zik na-achọ inyere mmadụ aka, ịzọpụta mmadụ ma ọ bụ obodo n'otu nsogbu ma ọ bụ nke ọzọ. Anyị hụtakwara na na-agbanyeghi anya ụfụ, ntaji anya na ọnwụ ndị iro ya na-echere ya, chi ya kwu ya na-azụ. O kweghi ka ihe ọjọọ ọbụla mee ya n'ihi n'aka ya kwụ ọtọ.

Nchọcha kwenyere na nkọmịrịkọ ndị a gbasara Zik bụ ihe ndị hụrụ ya n'anya chịkọbara iji mee ka a tụwa ya egwu ma mekwaa ka ndị mmadụ nye ya nsọpụrụ puru iche ọ kachasị dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọ bụ. Nke a bụ ebe ọrụ agụmagụ pụtara ihe nke ọma. A na-eji agụmagụ eme ka ndị mmadụ mata ma kwenye n'ihe ha na-ekwenyeghị na ya mbụ.

References

Akaeze, C.M (2010). "Myth in Social Control and Problems: A Look into some selected Nigerian myth". A Conference Paper presented at the maiden conference of the Department of Linguistics, Igbo and other Nigerian languages, UNN.

Douglas, B. (1977). The powers latent in man Wellingborough. The aquanian press.

Ekeke, E.C and C.A Ekeopara (2010). God, divinities and spirit in African traditional religious ontology.

Ekwochi, U. Osorah, C.D, Ndu, I.K, Ifediora, C. Asinobi, I.N and Eke, C.B (2016). "Food taboos and myths in South Eastern Nigeria: The belief and practice of mothers in the region". Journal ofEthnobiology and Ethnomedicine.

Emenyeonu (1978). The rise of the Igbo novel: up.

Ikwibuzo, 0.1(2006). "The Diversity of Igbo Myth of Origin: A Brief survey". Journal of Igbo Studies. Department of Linguistics, African and Asian Studies, UNILAG: Nigeria.

Jaja, J.M (2012). "Myth in African Concept of reality. International Journal of Educational Administration and Policy studies". Institute of Foundation Studies Rivers State university of Science and Technology Port-Harcourt: Nigeria

Nwala, T. (1985). Igbo philosophy. Lagosi Literamed Limited.

Onwubiko (1991). African thought, religion and culture. Enugu: SNAAP press limited.

The New Encyclopaedia Britannica, vol.8 (1988), Chicago; Encyclopaedia Britannica.