ÉKWÉ JỌNAL NKE NDỊ IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA VOLUME 12; NO 2, JULY, 201


Nkuzi n'Asụsụ Epum dịka Ụzọ Isi Gbochie Nkewa dị n'etiti Nwata Akwụkwọ na krịkulum


Chineke Stella Obiọma Department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka. 08063385262 Stella.chineke@unn.edu.ng

NA

Eze Roseline Ifeoma Department of Arts Education, University of Nigeria, Nsukka. 08064008703 roseline.eze.ss12303@unn.edu.ng

Ụmịedemede

Mmụta bụ ihe a hụtara dịka ihe na‐enyere mmadụ aka inweta agamnihu n'usoro obibi ndụ na kwa ihe niile mmadụ na‐eme na ndụ. Ọ bụ akara ngwa dị mkpa nke na mba dị iche iche na‐agba mbọ iji ya wee hụ na ha mejupụtara nhụrụ ụwa na mbunuche ha. N'ihi ya, obodo ọbụla leghaara mmụta anya na‐enweta nnukwu ihe ọghọm. Ọ bụ nke a ka o ji bụrụ na obodo ọbụla chọrọ ịga n'ihu ga‐ejikọ aka ọnụ ihu na ụmụ amaala ya niile bagidere agụm akwụkwọ na‐enweghị oke ihe nhịaahụ. Ka o sila dị, nchọpụta gosiri na o nwere ọtụtụ ihe ịma aka n'ihu na‐echere nwata akwụkwọ aka mgba n'ala Naịjirịa, bụ nke nwere ike ime na ọ gaghị enwe agamnihu zuru oke na ndụ ya. Otu n'ihe ịma aka n'ihu ndị a bụ nsogbu nke nwata akwụkwọ ịnọ dị ka onye ọbịa n'ebe ihe ọmụmụ n'ụlọakwụkwọ dị. Ihe ọghọm na‐esochi ọnọdụ a gụnyere enweghị mmasị ịga akwụkwọ, oke ọdịda akwụkwọ na a gakata a ghara. Iji asụsụ Bekee, nke bụ asụsụ ndị mbịara chịwa akuzi ihe n'ụlọakwụkwọ na-eme ka nwata akwụkwọ nọrọ ka onye ọbịa n'ebe kọrịkulum (njikọta ihe ọmụmụ) dị. Ederede a na‐ezipụta na iji asụsụ epum akuzi ihe ga‐enye aka n'igbochi nkewa ahụ dị n'aghata nwata akwụkwọ na kọrịkulum, ma si etu a gboo nsogbu nke nwata akwụkwọ ịnọ dị ka onye ọbịa n'ebe ihe ọmụmụ n'ụlọakwụkwọ dị.

Ọkpụrụkpụ okwu: Asụsụ, Nkuzi, Kọrịkulum, Mmụta, Epum.

Mkpọlite

Obodo dị iche iche kwetara na mmụta bụ ụzọ pụtara ihe e si enweta agamnihu. Gọọmenti Etiti Naịjirịa (2004) nabatara nke a wee kwuo na mmụta ga na‐enwe ọkwa dị elu n'usoro agamnihu nke obodo a, maka na ọ bụ akara nkwa dị mkpa maka mgbanwe. N'ihi nke a, obodo ọbụla kwesịrị itinye nnukwu akụnụba na mmụta. Fafunwa (1974) kọwara na mmụta bụ njikọta usoro niile nwatakịrị ji enweta ike na omume bara uru nke na‐enyere ya aka n'ọgbọrọgbọdọ (society) ebe o bi. Iji kwado nkọwa a, Ojo (2006) kọwara mmụta dị ka usoro mmekọrịta na‐agbanwe mmadụ ma mee ka o nweta nka ga‐enyere ya aka isonye nke ọma n'ihe dị iche iche na‐eme na gburugburu ya. Nke a na‐egosi na mmadụ ga‐abụrịrị onye nwetara ọzụzụ n'usoro mmụta tupu o nweta amamihe na nka ọ ga‐eji tụnye oke ya na mmepe na agamnihu nke obodo ya. N'echiche Chukwurah (2014), usoro mmụta gụnyere nkuzi na ọmụmụ tụmadị nke a na‐eme n'ụlọakwụkwọ. Ụdị mmụta a na‐ewere ọnọdụ n'ụlọakwụkwọ bụ nke a na‐ahazi n'ụzọ doro anya. O nwere afọ ole a tụrụ anya na mmadụ ga‐anọ na ya; ma nwekwazị ihe ọmụmụ ndị a na‐ele anya onye nọ ya ga‐amụta. Mkpokọta ihe ọmụmụ ndị a ka e depụtara n'ime akwụkwọ a kpọrọ kọrịkulum.

Nkọwa Kọrịkulum

Kọrịkulum bụ mkpokọta ihe ọmụmụ niile nwata akwụkwọ na‐abagide malite ụbọchị mbụ ọ batara n'ụlọ akwụkwọ ruo ụbọchị ọ gụchara. Na nkọwa Akudolu (2011), o metụtara mbunuche a haziri ahazi, ihe a ga‐amụ, ihe omume a ga‐eji mụọ ya bụ ihe, usoro a ga‐agbaso kuzie ihe iji mejupụta mbunuche nkuzi, usoro nnwale iji mata ogo e mejupụtara mbunuche na kwa gburugburu ebe a ga‐anọ mụọ ya bụ ihe. A haziri ihe ndị ahụ dị n'ime kọrịkulum ka e wee nweta mbunuche mmụta. Okebukola (2004) kwuru na imejupụta ihe dị na kọrịkulum na‐adị ire oge a tinyere ihe ndị ahụ e dere n'akwụkwọ n'ọrụ n'ụdị nkuzi na ọmụmụ. Ọ bụkwa oke na ọrụ dịịrị ndị nkuzi ime nke a maka na ha nwere nka na ọzụzụ pụrụ iche iji mee ka nwata akwụkwọ mata ihe dị na kọrịkulum. Site na nkọwa a, e nwere ike ikwu na imejupụta kọrịkulum bụ oge a na‐abagide nkuzi na ọmụmụ, bụ nke gbasara onye nkuzi, nwata akwụkwọ na ihe ọmụmụ.

Oke onye nkuzi na ụmụ akwụkwọ. jedebere n'imejupụta ihe dị na kọrịkulum bụ ihe na‐egosi ogo e nwere ike iru n'imejupụta mbunuche mmụta. Akudolu (1994) mere ka a mata na ihe ọmụmụ dị na kọrịkulum nwere ike ịbụ kpoo na oyooyo maka imejupụta mbunuche mmụta. Ka o sila dị, ọ kọwara na e nwere ike ghara imejupụta mbunuche mmụta, ma ọ bụrụ na ụzọ e si enyefe ya bụ ihe ọmụmụ dị na kọrịkulum n'aka ụmụ akwụkwọ. adịghị ire. N'ihi nke a, ndị nchọcha a na‐eche na otu ụzọ a ga‐esi mata adịmire nkuzi bụ site n'ileba anya n'asụsụ e ji hazie, depụta ma na‐enyefe ya bụ ihe ọmụmụ n'aka ụmụ akwụkwọ.

nọd Ass Nkuzi n'ime Kọrịkulum

Asụsụ dịka Anagbogu, Mbah na Eme (2001) siri kọwaa, bụ ụzọ nzikọrịta ozi mmadụ wepụtara iji zipụta mmetụta, echiche na ọchịchọ ya, n'ụdị ekwuru n'ọnụ ma ọ bụ ederede. Ọ bụ akara ngwa kewapụrụ mmadụ n'etiti ụmụ anụ ndị ọzọ. Anọzie (2007) chọpụtara na asụsụ na‐arụ ọrụ buru ibu na ndụ mmadụ. Ọ bụ site n'asụsụ ka ndị mmadụ ji aghọta onwe ha ma na‐aghọtakwa ọgbọrọgbọdọ (society) ha. Asụsụ nwere ọrụ ọ na‐arụ n'ihe niile mmadụ na‐eme na ndụ. Agamnihu a na‐eweta na ngalaba ihe ọmụmụ dị iche iche dị ka Nka, Sayensị na Nkanụụzụ bụkarị site n'enyemaaka asụsụ. Ọ bụ asụsụ ka mmadụ ji amụ ihe, ejigide ihe ọ mụtara ma jirikwa ya echeta mmụta o nwerela. Mkpa asụsụ dị na mmụta kpatara Gọọmenti Etiti Naịjirịa (2004) jiri kwubie okwu gbasara asụsụ nkuzi n'ụlọakwụkwọ.

Asụsụ nkuzi pụtara asụsụ onye nkuzi ji enyefe amamihe na nka n'aka ụmụ akwụkwọ. Onye nkuzi na ụmụ akwụkwọ. ji asụsụ enwe mmekọrịta n'etiti onwe ha oge nkuzi na ọmụmụ na‐aga n'ihu. Magulu (2016) rụtụrụ aka na o nwere mgbe a na‐ahụta asụsụ nkuzi dị ka ihe agbamonwe (variable) adịghị mkpa ilebara anya na nkuzi na ọmụmụ. Ha kọwara na n'oge ahụ, na ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ihe kacha dị mkpa bụ inwe klaasị a haziri nke ọma na ihe ọmụmụ dị mma. Mana ka ndị mmadụ na‐agbawanye mbọ ịchọpụta ihe mere mmụta ji ada ada, a chọpụtara na asụsụ nkuzi bụ otu ụzọ e nwere ike isi nwee agamnihu na mmụta. Wolff (2006) mere ka a mata na n'agbanyeghị na ọ bụghị naanị asụsụ dị mkpa na mmụta; na e wezuga asụsụ, na o nweghị ihe a na‐eme n'usoro mmụta nwere isi. N'ezi okwu, ọ bụghị naanị na nkuzi na ọmụmụ ka asụsụ dị mkpa n'usoro mmụta, kama ọ dịkwazị mkpa n'ihe niile gbasara kọrịkulum (malite n'ichepụta ya n'echiche, ịhazi ya, idetu ya, imejupụta ya na klaasị na ịnwale ya). Otu 'Uhited Nations Education Scientific and Cultural Organization (UNESCO)' kọwara na asụsụ nkuzi so n'ihe mere mmụta na mmetadebe ụmụ akwụkwọ. ji adị ala n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ na mba Afrịka. Nke a bụ maka na ọ bụ naanị na mba Afrịka ka ọtụtụ ụmụaka na‐eji asụsụ ndị mba ọzọ amalite ịmụ ihe n'ụlọakwụkwọ, (Ouane na Glanz, 2010). Wyse, Hayward, Higgins na Livingston (2017) chọpụtara na nchọcha e mere n'ime afọ iri gara aga na‐egosi na asụsụ bụ otu ihe dị mkpa nwere ike ime ka nkuzi na ọmụmụ dị ire. Na nkọwa ha, asụsụ na mmekọrịta dị ezigbo mkpa maka ịmụta ka e si agụ na ka e si ede. Nka ọgụgụ na odide na‐enyekwazịrị mmadụ aka ịmụta ihe ọmụmụ niile a na‐akuzi na klaasị. Ụdị ihe ọmụmụ ọ sọkwara ya bụrụ, Bashar (2017) kwuru na ụmụ akwụkwọ. na‐amụta ihe ọhụrụ na ya site n'ige ntị, ikwu, ịgụ na idetu ihe ha na‐amụ.

N'ime kọrịkulum, asụsụ nọ dị ka ihe ọmụmụ ma nọrọkwa ka ihe e ji akuzi ihe ọmụmụ ndị ọzọ. Ọ bụ n'ọnọdụ nke abụọ a ka a na‐elegara asụsụ anya n'ọrụ a maka na o nweghị ka a ga‐esi mejupụta ihe ọmụmụ dị na kọrịkulum na‐achọghị enyemaaka asụsụ. Nke a gosiri na ọ bụ asụsụ, ma nke a sụrụ asụ ma nke e dere ede na‐eduba n'imejupụta mbunuche mmụta. Iji hụ na asụsụ rụrụ ọrụ a dị mkpa, asụsụ e ji akuzi ihe na klaasị ga‐abụ asụsụ ụmụ akwụkwọ maara nke ọma. N'aka nke ọzọ, mgbe ọbụla ụmụ akwụkwọ amaghị asụsụ nkuzi, ha enweghị ike iji ya kọwaa onwe ha nke ha ji aghọta ihe e ji ya akuzi, ya bụ asụsụ anaghị arụ ọrụ zuru oke n'ebe mmụta dị. Iji maa atụ, ọ bụrụ na e jiri asụsụ nwata akwụkwọ amaghị wee na‐akuziri ya ihe ọ maghị, ọ ga‐ahịa ya ahụ ịghọta ihe ahụ a na‐akuzi. Nke a ga‐eme ka ọ nọrọ dị ka onye ọbịa na klaasị. Mushtaq na Alam (2015) kwadoro echiche a maka na ha kwuru na asụsụ nkuzi na‐ekpebi ụdị mmekọrịta a na‐enwe na klaasị na kwa ka ụmụ akwụkwọ si aghọta ihe a na‐akuziri ha. Na nkọwa ha, ọ bụrụ na asụsụ klaasị bụ asụsụ onye nkuzi na ụmụ akwụkwọ. maara nke ọma, ọ ga‐akwalite nkuzi na ọmụmụ maka na ụmụ akwụkwọ. ga na‐esonyesi ike n'ihe omume niile. Mana, ọ bụrụ kwa na asụsụ klaasị bụ asụsụ ma onye nkuzi ma ụmụ akwụkwọ. na‐amụ amụ, ọ ga na‐akpụchi mmụta azụ. Ya ka o jiri dị mkpa na e ji asụsụ dabara eme nkuzi na ọmụmụ ka e wee nwee ike mejupụta mbunuche mmụta dị ka ọ dị na kọrịkulum.

Nsogbu dị n'iji ass Bekee akụzi nkuzi

Asụsụ Bekee, bụ asụsụ ndị ọcha chịburu obodo a webatara, kacha nwee ọkwa dị elu n'etiti asụsụ niile a na‐asụ na Naịjirịa tụmadị n'usoro mmụta. Ọ bụ ya ka e jiri dee ọtụtụ kọrịkulum ma jirikwa ya dee imeriime akwụkwọ ọgụgụ na akwụkwọ ọrụ e ji eme nkuzi na ọmụmụ n'ogo mmụta dị iche iche. Iji maa atụ, n'agbanyeghị na Gọọmenti Etiti Naịjirịa (2004) tụpụtara na asụsụ nkuzi n'ogo mmụta praịmarị nta bụ asụsụ epum; a naghị atinye ya n'ọrụ etu o kwesịrị. Maduewesi (2002) kọwara ihe abụọ mere na nke a anaghị adịcha ire. Nke mbụ bụ na ọtụtụ ndị nne na nna na‐atụ anya na ụmụaka ha ga‐amalite ịsụ asụsụ Bekee ngwa ngwa ha banyere n'ụlọakwụkwọ. Ha kwenyere na iji asụsụ Bekee akuziri ụmụaka ihe ga‐eme ka nke a dị ire. N'ihi ya, ọtụtụ ndị nkuzi ọtaakara na praịmarị na‐eji asụsụ Bekee akuzi ihe iji mee ka obi dị ndị nne na nna mma. Ọ bụrụ na ha emeghị etu a, ike kwe, ndị nne na nna a ga‐akpọga ụmụaka ha n'ụlọakwụkwọ ọzọ, ebe e ji asụsụ Bekee eme nkuzi. Nke abụọ bụ na ọkwa dị elu e nyere asụsụ Bekee n'ihe niile a na‐eme n'obodo a mere na ọtụtụ mmadụ anaghị ahụta asụsụ epum dị ka ihe bara uru ọbụla. O nweghịkwa mbọ pụtara ihe a na‐agba itinye ihe e dere n'akwụkwọ iwu na‐achịkwa mmụta gbasara iji asụsụ epum akuzi ihe n'ọrụ. Nke a na‐enwe ọghọm n'ebe ụmụ akwụkwọ. nọ. Iji maa atụ, tupu nwatakrị amalite akwụkwọ, o nwebego ntụkwasị obi n'onwe ya; na ya enweela ike iji asụsụ epum ya kparịta ụka n'ụzọ doro anya. Mmụta na amamihe o nwere n'asụsụ epum a so n'ihe ga‐enyere ya aka ịmụta ihe na klaasị. Mana ọ bụrụ na asụsụ nkuzi bụ asụsụ ndị mba ọzọ (dị ka ọ dị na Naịjirịa), ụmụaka malitere akwụkwọ ọhụrụ na‐aghọta na asụsụ na amamihe ha nweburu bụ ihe efu n'ihi na o nweghị uru ha bara na klaasị. Lee ihe Cummins (2001) kwuru banyere nke a:

...mgbe ọ bụla e leghaara asụsụ, ọdịnaala na mmụta ụmụ akwụkwọ. nweburu anya, maọbụ ghara iwebata ha n'ihe e ji arụ ọrụ na klaasị, ụmụ akwụkwọ. dị etu a na‐ebido na mbụ nwebe ihe ọghọm na ọgbatauhie. Ha na‐ahụta na ihe niile ha mụtaburu maka ebim ndụ na kwa ụwa tupu ha ebido akwụkwọ enweghị ka ha siri gbasata ihe a na‐amụ na klaasị (ia.1).

Okwu a dị n'elu gosiri na iji asụsụ Bekee mere asụsụ nkuzi na‐ebute nkewa n'etiti ihe a na‐akuzi (kọrịkulum) na nwata akwụkwọ; bụ onye nwere otu n'ime asụsụ ala Naịjirịa dị ka asụsụ mbụ ya. Nwata akwụkwọ dị etu a nwere ike na‐ahụta onwe ya dị ka onye riri mperi n'ebe ndị ogbo ya nọ. Ọnọdụ a ga‐eme ka nwatakịrị na‐ajọ ụjọ ịga akwụkwọ maọbụ na‐ewezuga onwe ya n'ihe omume dị iche iche a na‐eme na klaasị n'ihi ihere amaghị asụsụ a na‐asụ na klaasị.

Ọzọ kwa, iji asụsụ nke abụọ akuzi ụmụaka ihe na‐eme ka o siere ha ike ịghọta ihe a na‐akuzi. Walter (2000) kwadoro nke a maka na ọ chọpụtara na ejighi asụsụ epum akuziri ụmụaka ihe so n'ihe kacha ebute ndaghachi azụ a na‐enwe n'ebe mmụta dị, na kwa amụtaghị akwụkwọ a na‐ahụta n'etiti ụmụ akwụkwọ. Mackenzie na Walker (2018) mekwara ka a mata na ụmụaka e ji asụsụ abụghị nke ha na‐asụ n'ụlọ akuziri ihe na‐akacha enwe nhịa ahụ n'ịmụta ihe. Ihe abụọ na‐echere ụmụaka dị etu a aka mgba n'otu oge. Nke mbụ bụ ịghọta asụsụ e ji akuzi ihe, ya na ịghọta isiokwu a na‐akuzi maka ya. Nke a ga‐ebute oke ọdịda akwụkwọ na kwa ịgụwo klaasị.

N'iga n'ihu, UNESCO (2013) gosiri na a na‐hụtakarị ọnọdụ ekweghi aga akwụkwọ na agakata akwụsị n'etiti ụmụaka ndị e ji asụsụ nke abụọ akuziri ihe n'ụlọakwụkwọ. Ihe nke a pụtara bụ na iji asụsụ Bekee akuzi ihe n'ụlọakwụkwọ abụghị naanị na ọ na‐akpata ekweghị aga akwụkwọ, kama na ọ na‐ebutekwazị a gakata a kwụsị n'etiti ụmụ akwụkwọ. UNESCO (2008) kwuru na a bịa na mba ụwa, na ihe dị ka ụmụaka ọnụọgụ ha dị n'agbata nde iri ise na nde iri asaa na ise bụ ndị e jighi asụsụ ha eme nkuzi anaghị aga akwụkwọ. Ọtụtụ n'ime ndị kachiri obi banye ụlọakwụkwọ na‐adachapụkwa ngwa ngwa. Na nkwenye, Ụlọ Akụ Mba Ụwa (World Bank, 2005) kọwara na pasenti iri ise ụmụaka ndị anaghị aga akwụkwọ na mba ụwa bụcha ndị bi n'obodo ebe asụsụ nkuzi dị iche n'asụsụ a na‐asụ n'ụlọ. Ọ bụ ọnọdụ a kpatara ọrụ a ji akọwa na iji asụsụ Bekee eme nkuzi tụmadị n'ogo praịmarị na‐adọghachi mmụta azụ, ma na‐ebute nkewa n'etiti kọrịkulum na nwata akwụkwọ .

Iji ass epum ghochie nkewa dị n'etiti nwata akwụkwọ na kọrịkulum

Asụsụ epum dị ka Mbah (2012) siri kọwaa ya bụ asụsụ mbụ nwatakịrị nwetara na‐akpachaghị anya tinye mgbalị ọbụla na ya . Ọ bụ asụsụ nwata na‐anọ n'apata ụkwụ nne ya amụta. UNESCO (2003) hụtara ya dịka asụsụ nwata na‐ebu ụzọ amụta ma marakwa ka e si asụ ya nke ọma. Nghọta mbụ nwatakịrị nwere banyere ụwa ọ nọ n'ime ya na kwa ihe ndị ọzọ gbara ya okirikiri bụ site n'enyemaaka asụsụ. Asụsụ a na‐ekwu maka ya n'ebe a bụ asụsụ mbụ nwata ahụ, nke bụ asụsụ epum, (Aboderin, 2012).

Asụsụ epum nwere ihe pụrụ iche ọ na‐eme na ndụ mmadụ dị ka onye ahụ na‐etolite, maka na ọ bụ asụsụ mbụ nwatakịrị mụtara o ji akọwapụta onwe ya n'ebe ndị ọzọ nọ. N'ihi nke a, ọ na‐arụ ọrụ dị mkpa n'ịtọ ntọala mmụta na ndụ nwata ọbụla. Ọ bụ ya kpatara e ji akwado ka e jiri ya mere asụsụ nkuzi, tụmadị oge ụmụaka malitechara akwụkwọ ọhụrụ. Iji asụsụ epum eme nkuzi na ọmụmụ ka a na‐akpọ nkuzi n'asụsụ epum (NAE).

Gọọmenti Naịjirịa kwadoro NAE ọ kachasị na mmalite agụm akwụkwọ. Dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu na‐achịkwa mmụta (2004), asụsụ epum maọbụ asụsụ a n‐asụ na gburugburu ụlọakwụkwọ ka a ga‐eji eme nkuzi bido n'ogo praịmarị nke mbụ ruo na nke atọ. Malite n'ogo praịmarị nke anọ, asụsụ Bekee ga‐abụzị asụsụ nkuzi, ebe asụsụ a na‐asụ na gburugburu ga‐abụzị otu n'ihe ọmụmụ a na‐akuzi na klaasị. Atụmatụ a dabara na ntụzi aka UNESCO (1953), nke kwuru na ọ ka mma ka e jiri asụsụ obodo ndị mmadụ wee na‐akuziri ha ihe n'ụlọakwụkwọ. Site na ntụzi aka a, ọtụtụ ndị mmadụ emeela nchọcha ịmata mmetụta NAE nwere n'ebe mmụta dị, (Fafunwa, 1975; Barron, 2012). Nchọpụta sitere na nchọcha ndị a gbara akaebe na NAE na‐akwalite mmụta n'ụzọ abụna ụzọ. Ya ka Mackenzie na Walker (2018) jiri kwado na kọrịkulum ọbụla gbanyere mgbọrọgwụ n'asụsụ nwatakịrị maara, ọdịnaala ya na kwa gburugburu ya na‐akwalite mmụta; ọ kachasị oge nwatakịrị bidochara akwụkwọ ọhụrụ. Ọ na‐enyere nwatakịrị aka isite n'ihe ndị ọ mabuuru doro ya anya wee banyewe na ndị ọhụrụ edochachị ya anya. Ọ na‐akpalite mmasị nwata akwụkwọ n'ebe ihe a na‐akuzi dị, ma mekwaa ka nwata akwụkwọ nwee ntụkwasị obi n'onwe ya na agụụ isonyesi ike n'ihe omume a na‐emegasị na klaasị.

NAE na‐akwadebe nwatakịrị maka ịmụta ka e si agụ na ka e si ede. Ọ na‐akwalite nka ọsụsụ n'asụsụ epum na kwa asụsụ ndị ọzọ nwata akwụkwọ nwere ike ịmụ n'ọdị n'ihu. Nchọpụta Ụlọ Akụ Mba Ụwa (2005) gosiri na ụmụ akwụkwọ. na‐aka amụta asụsụ nke abụọ, ma ọ bụrụ na ha dị na mbụ mụta asụsụ nke mbụ ha nke ọma. Sidhu (2017) gbara akaebe wee kwuo na nchọpụta o mere gosiri na ụmụaka ndị e ji asụsụ epum ha kuziere ihe n'afọ atọ mbụ ha n'ụlọakwụkwọ praịmarị nwetara akara nrite dị elu n'ihe ọmụmụ asụsụ Bekee karịa ndị ogbo ha e jiri asụsụ Bekee kuziere ihe ọmụmụ niile. Benson (2008) kọwara na ọ na‐adị ka ibu ụzọ mee ka ụmụaka nwee mmụta tọrọ atọ n'asụsụ epum ha abụ ịla oge n'iyi. Mana nke a abụghị ezi okwu maka na nwata akwụkwọ inwe mgbọrọgwụ siri ike n'asụsụ epum ya na‐enyere ya aka ịmụta ihe ọmụmụ ndị ọzọ, tinyere asụsụ nke abụọ.Ya bụ na mkpa ọ dị ime nkuzi n'asụsụ epum abụghị ihe a ga‐akọchawu. Banda (2010) kwuru na ọ bụ ihe mara nnukwu mma bụ iji asụsụ ụmụaka maara nke ọma tupu ha amalite akwụkwọ wee na‐akuziri ha ihe. Ọ na‐eme ka ụmụaka ghara inwe nnukwu nhịa ahụ isite n'ihe ndị ha na‐eme n'ụlọ banye n'ihe ndị a na‐eme n'ụlọakwụkwọ.

Ọzọ kwa, NAE na‐eme ka nwatakịrị ghara ịhụta onwe ya dị ka onye ọbịa n'etiti ndị ọzọ nọ n'ụlọakwụkwọ maka na ha na‐asụ asụsụ ọ maara nke ọma. Nke a ga‐eme ka o mesapụ ahụ ma sonye n'ihe omume dị iche iche a na‐eme n'ụlọakwụkwọ. Ike kwe, ọ bụ ya kpatara Gurganyi (2015) ji kwuo na ụmụ akwụkwọ. e jiri asụsụ ha na‐asụ n'ụlọ kuziere ihe n'ime afọ asatọ mbụ nke ndụ ha, na‐aka eme nke ọma n'ịmụ asụsụ nke abụọ na kwa ihe ọmụmụ ndị ọzọ a na‐akuzi n'ụlọakwụkwọ. NAE nwere ike ịkwalite mmụta. Nchọpụta gosiri na NAE na‐eme ka ọ dịịrị ụmụ akwụkwọ. mfe ịghọta ihe a na‐akuziri ha, (Viswanathan, 2013). Nke a bụ eziokwu maka na asụsụ e ji akuzi ihe doro ha anya, ihe ha na‐agbakeri ala ịghọta bụ naanị isiokwu a na‐akuzi.

N'ịga n'ihu, NAE na‐eme ka ọtụtụ ndị nne na nna nwee ohere ịtụnye oke ha na mmụta ụmụaka ha. Benson (2002) kqwara na iji asụsụ nne na nna na‐asụ akuziri ụmụaka ha ihe ga‐akwalite ezi mmekọrịta n'etiti ha na ndị nkuzi, ma mekwaa ka ndị nne na nna na‐enyere ụmụaka ha aka ime ihe omume e nyere ha n'ụlọ. Ọ dịghị etu a n'ebe ụmụaka ndị e ji asụsụ nke abụọ akuziri ihe nọ. Nne na nna na kwa ikwu na ibe amaghị asụ ya bụ asụsụ nke abụọ agaghị enwe ike ịtụnye oke ha maka agamnihu mmụta nke ụmụaka ha.

Ụmụaka e ji asụsụ epum ha akuziri ihe na‐aka enweta nka iche echiche nke ọma (Bialystok, 2001). Sapir‐Whorf tụpụtara atụtụ iji gosi na asụsụ mmadụ na‐asụ na‐emetụta ka ụbụrụ ya si enwe agamnihu. Na nkọwa ya, asụsụ na‐emetụta ka mmadụ si eche echiche. O nwere usoro echiche na nkwenye sitere n'echiche miri emi na kwa ọdịnaala nke a na‐esi naanị n'asụsụ epum enweta dị ka mmadụ na‐eto. Nke a na‐enyere mmadụ aka ime ka ụbụrụ ya dị nkọ. O kwere nghọta na nwata ụbụrụ ya dị nkọ na‐aka aghọta ihe a na‐akuzi na klaasị. Mana iji asụsụ nke abụọ malite ikuziri nwatakịrị ihe ga‐eme ka e nwee ọgbatauhie n'uto nke ụbụrụ ya. Ihe ọ pụtara bụ na NAE na‐eme ka usoro ahụ ụbụrụ na‐agbaso n'inweta agamnihu maka ịdị nkọ na iche echiche nke ọma gaa sịrịrị werere.

Gurganvi (2015) mekwara ka a mata na a na‐aka enwe ụbara ụmụaka na‐aga akwụkwọ ma na‐emekwa nke ọma n'obodo ebe a na‐eme nkuzi n'asụsụ epum. Anaghị enwekebe ọnọdụ a gakata a ghara n'etiti ụmụaka dị etu a. Ụlọ Akụ Mba Ụwa (2006) kwuru na nke a anaghị adịkebe ire na mba ndị ka na‐eto eto n'ihi na ọ bụ asụsụ nke abụọ ka ha jikarị eme nkuzi. Dịka o siri kọwaa, ihe pekarịrị pesenti iri isii n'ụmụaka banyere ụlọakwụkwọ praịmarị bụ ndị na‐aguru ya n'isi. Ọtụtụ n'ime ha na‐adachapụ n'ụzọ. Nke a gosiri na NAE na‐akwalite ọnụọgụ ụmụaka n'abanye n'ụlọakwụkwọ ma na‐ebelatakwa a gakata a ghara. N'ezie, NAE na‐eweta ezi mmekọrịta n'etiti nwata akwụkwọ na onye nkuzi na kwa ụmụ akwụkwọ. ndị ọzọ. Ọ na‐ebutu kọrịkulum ala, gbarie ya etu ọ ga‐esi dịịrị nwata akwụkwọ mfe na nghọta.

Nchịkọta na Aro

Ọtụtụ oge ka ndị ọkammụta na‐agbarụ ihu gbasara ndaghachi azụ nke usoro mmụta, ya na ọnọdụ ọtụtụ ụmụaka anaghị aga akwụkwọ. A na‐ele anya na otu ihe so ebute ajọ ọnọdụ a n'obodo ka na‐emepe emepe, nke Naịjirịa so na ya bụ ejighi asụsụ epum atọrọ ụmụaka ntọala siri ike n'usoro mmụta ha. Ọtụtụ obodo na‐emepe emepe bụ asụsụ nke abụọ ka ha ji emekarị nkuzi na ọmụmụ n'ụlọakwụkwọ. Nchọpụta gosiri na o nwere ike ime ka ụmụaka ghara inwetacha nka na mmụta zuru oke n'usoro agụm akwụkwọ ha. O nwekwara ike ibute oke ọdịda akwụkwọ na a gakata a ghara. Otu ụzọ e nwere ike isi gbochie ihe ndị a bụ site n'ime nkuzi n'asụsụ epum. Nkuzi n'asụsụ epum ọ kachasị na mmalite agụm akwụkwọ na‐eme ka nkuzi na ọmụmụ dị ire. N'ihi ya, a na‐atụ aro ka:

  • Gọọmenti hụ na a na‐agbaso atụmatụ niile e nwere gbasara iji asụsụ epum akuzi ihe maka na ọ ga‐eweta agamnihu n'usoro mmụta;
  • E nye ndị nkuzi ọzụzụ ga‐eme ka ha nwee ezi mmụta na nka iji asụsụ epum akuzi ihe maka ịkwalite nghọta ụmụ akwụkwọ. na‐enwe n'ihe a na‐akuziri ha.
  • A hazigharịa kọrịkulum n'ụdị ọ ga‐akwado nkuzi n'asụsụ epum.
  • E mee ka ndị mmadụ mata mkpa na uru dị na nkuzi n'asụsụ epum, ka ha wee kwado iji ya akuziri ụmụaka ha ihe.

Edensibịa

Aboderin, M. (2012). Children should learn mother tongue first. Retrieved June, 2013 from file:///C:/Users/user/Desktop/EDU%20FOR%20ALL/Children%20should%20learn%20mother%20tongue%20first%20%E2%80%93Lecturer%20%E2%80%94%20The%20Punch%20%20Nigeria%27s%20Most%20Widely%20Read%20Newspaper.htm

Akudolu, L. R. (1994). Concept of curriculum implementation. In G. C. Offorma (ed). Curriculum Implementation and Instruction. Onitsha: Uni‐World Educational Publishers.

Akudolu, L. (2011). The formal, non‐formal and informal continuum in peace education curriculum. Journal of Curriculum and Instruction, 8 (1), 1‐9.

Anagbogu, P. N., Mbah, B. M. & Eme, C. A. (2010). Introduction to general linguistics. Awka: Amaka Dreams.

Anqzie, C. C. (2007). General linguistics: An introduction. Enugu: Tashiwa Networks.

Banda, F. (2010). Defying monolingual education: Alternative bilingual discourse practices in selected coloured schools in Cape Town. Journal of Multilingual and Multicultural Development 31(3): 221-235.

Bashar, A. (2017). Role and importance of language in the curriculum. Retrieved from https://www.slideshare.net/abubashars/role-and-importance-of-language-in-the-curriculum

Benson, C. (2002). Real and potential benefits of bilingual progammes in developing countries. International Journal of Bilingual Education and Bilingualism, 5 (6), 303-317.)

Benson, C. (2008). Common themes and areas for further work: Questions, answers and remaining issues. In C. Haddad (ed). Improving the Quality of Mother Tongue-based Literacy and Learning: Case Studies from Asia, Africa and South America. Bangkok: UNESCO Asia and Pacific Regional Bureau for Education.

Bialystok, E. (2001).Bilingualism in development Language, literacy, and cognition Cambridge: Cambridge University Press.

Cummins, J. (2001). Negotiating identities: Education for empowerment in a diverse society. Los Angelis: California Association for Bilingual Education.

Chukwurah, C. C. C. (2014). Mathematics education: A panacea for Nigerian education for all agenda. Journal of Teacher Perspectives (JOTEP), 8 (2) 357‐366.

Federal Republic of Nigeria. (2004). National policy on education. Lagos: NERDC press.

Fafunwa, A. B. (1975): Education in the mother tongue: A Nigerian experiment. The Six-Year (Yoruba Medium) Primary Education Project at the University of Ife, Nigeria. West African Journal of Education, 19, (2), 213-227.

Gurganvi, K. (2015). The advantages of having one's mother tongue as the medium of instruction during primary education in India. Retrieved from https://www.quora.com/What-are-the-advantages-and-disadvantages-of-having-ones-mother-tongue-as-the-medium-of-instruction-during-primary-education-in-India

Islam, Q. N., Mushtaq, M. & Alam, M. T. (2015). Problems of teachers and students due to implementation of English as medium of instruction at primary level in Punjab. International Journal of Academic Research in Business and Social Sciences, 5 (4), 23‐36.

Mackenzie, P. J. & Walker, J. (2018). Mothertongue education: Policy lessons for quality and inclusion. Retrieved from https://www.campaignforeducation.org/docs/reports/GCE%20Mother%20Tongue_EN.pdf

Maduewesi, E. J. (2002). Education for character and skills development. In Yoloye, E. A. and Osiyale, A. O. (eds). Publication of Fafunwa Educational Foundation. Lagos: NERDC Press.

Magulu, H. B. (2016). The impact if the language of instruction on teacher‐pupils classroom interaction in History subject in primary schools in Tanzania. Masters Project, Department of Education, Faculty of Educational Sciences, University of Oslo.

Mbah, B. M. (2012). Language policy, mother tongue education and the role of the Nigerian language teacher in Nigerian language education. Journal of Education and Practice, 3, 48-54.

Ojo, M. O. (2006). Vision and mission of teacher education in Nigeria: The teacher preparation paradigm. Journal of Physical Education and Research , (20), 15‐18.

Okebukola, P. A. O. (2004). Curriculum implementation in Nigeria, strategies for the 21st century. Curriculum Implementation and Professionalizing Teaching in Nigeria. A. O. K. Noah, D. O. Shoibare A. A. Ojo and T. Olujuwon (eds). Lagos: A‐Traide Associate.

Ouane, A. & Glanz, C. (2010). Why and how Africa should invest in languages and multilingual education. Paris: UNESCO Institute for Lifelong Learning.

Sidhu, G. S. (2017). What are the advantages and disadvantages of having one's mother tongue as the medium of instruction during primary education in India? Retrieved from https://www.quora.com/What-are-the-advantages-and-disadvantages-of-having-ones-mother-tongue-as-the-medium-of-instruction-during-primary-education-in-India

UNESCO (1953). The use of the vernacular languages in education. Monographs on Foundations of Education, No. 8. Paris: UNESCO.

UNESCO (2003). Education in a multilingual world. UNESCO Education Position Paper. Paris: UNESCO. Retrieved from https://unesdoc.unesco.org/images/0012/001297/129728e.pdf

UNESCO (2008). Mother tongue instruction in early childhood education: A selected bibliography. Paris: UNESCO.

UNESCO, (2013). Mother tongue education and books: Celebration international mother language day. Retrieved from https://www.unesco.org/new/en/kathmandu/about-this-office/single-view/news/mother_tongue_education_and_books_celebrating_international_mother_language_day/

Viswanathan, B. (2013). What are the advantages and disadvantages of having one's mother tongue as the medium of instruction during primary education in India? Retrieved from https://www.quora.com/What-are-the-advantages-and-disadvantages-of-having-ones-mother-tongue-as-the-medium-of-instruction-during-primary-education-in-India

Walter, S. (2000). Work papers of the summer institute of linguistics, University of North Dakots Session. Retrieved from https://www.sil.org/resources/archives/40199

Wolff, H. E. (2006). Language politics and planning in Africa, in Hassana Alidou, Aliou Boly, Birgit Brock‐Utne, YayaSatina Diallo, Kathieen Heugh, H. Ekkehart Wolff. (eds). Optimizing Learning and Education in Africa-the Language Factor: A Stocktaking Research on Mother Tongue and Bilingual Education in SubSaharan Africa. Association for the Development of Education in Africa (ADEA).

World Bank. (2005). Education notes: In their own language...Education for all. Retrieved from https://siteresources.wolrdbank.org/EDUCATION/Resources/Education ‐Notes‐Lang‐of‐instruct

World Bank. (2006). Education for all (EFA). Retrieved June, 2013 from https://web.worldbank.org/WBSITE/EXTERNAL/TOPICS/EXTEDUCATION/0,,contentMDK:20374062~menuPK:540090~pagePK:148956~piPK:216618~theSitePK:282386,00.html

Wyse, D., Hayward, L., Higgins, S. & Livingston, K. (2017). Language and education. Curriculum Journal, 28 (4), 443‐445. Retrieved from https://www.tandfonline.com/doi/full/10.1080/09585176.2017.1378463




Nsogbu Ụmụ akwụkwọ N'itinye Akara Ụdaolu Igbo na Mkpụrụokwu

Nke

Onwuka, Gloria T

Ngalaba Mmụta Nka, Mahadum Naịjirịa, Nsụka

gloria.onwuka@unn.edu.ng

Ụmịedemede

Nchọcha a lebara anya na nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo n'ogo Juniọ sekọndịrị. Mbunuche nchọcha anọ ka e wepụtara maka nchọcha a. Ụdị nchọcha a bụ nke sọvee nkọwa. Ajụjụ nchọcha anọ ka e wepụtara maka nchọcha a. Ndị e ji mee nchọcha a bụ umụ akwụkwọ dị narị abụọ n'ọnụọgụ bụ ndị e sitere n'usoro ebumnobi wee họpụta. Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ - Njụmaza Nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na Mkpụrụokwu Igbo (NNUNNAMI) bụ nke onye nchọcha ji aka ya mepụta. E ji 'miin' na 'ndịpụ' na 'izugbe' (standad divieshọn) wee zaa ajụjụ nchọcha, nyochaa ma tulekwaa data e nwetara. Nchọpụta nchọcha gosiri na ụmụ akwụkwọ nọ n'ogo junịọ sekọndịrị ọ kachasị n'okpuru ọchịchị Nsụka na-enwe nsogbu n'itinye akara ụdaolu. Nke a bụ maka na ụfọdụ ndị nkụzi anaghi akụzi ụdaasụsụ ọ kachasị akara ụdaolu, nke mere na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si etinye akara ụdaolu Igbo na mkpụrụokwu. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha. A na-amachibido ụmụ akwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ nke na-ebutere ha ndọghachi azụ n'ọmụmụ asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu n'ime ya. Ụmụ akwụkwọ na-enwe mgbagwoju anya n'itinye akara ụdaolu tinyere na olundị na-ebute nsogbu n'itinye akara ụdaolu. A tụnyere aro nke otu n'ime ha bụ na ndị nkụzi ga-agba mbọ hụ na ha ji usoro nkụzi kwesịrị ekwesi akụzi asụsụ Igbo ọ kachasị akara ụdaolu.

Ọkpụrụkpụ Okwu: Ụdaolu, Akara Ụdaolu.

Mkpọlite na Ntụlegharị Nchọcha

Asụsụ bụ otu ihe mere mmadụ ji dị iche n'anụmanụ ndị ọzọ Chukwu kere. Ihe ọmụmụ sayensị asụsụ mere ka a mata na mmadụ bụ naanị anụ a maara nwere ike ịsụ asụsụ. Asụsụ bụ ngwa ọrụ mmadụ na ibe ya ji emekọrịta, ezipụta echiche obi ha n'ụdị ekwurekwu maọbụ ederede. Asụsụ bụ otu ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe ezi mmekọrịta. Ọ bụ ụdaokwu nwere ezi nghọta nke sitere n'ọnụ mmadụ pụta. N'echiche ya, Anozie (2010) kọwara asụsụ dịka ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe mkparịtaụka n'etiti onwe ha. Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ mmekọrịta na-adị n'etiti ọgan okwu dị iche iche n'ahụ mmadụ na-enye ụda. Ọ bụkwazi ụda ndị a na-esite n'olu mmadụ ka mmadụ na-ahazi n'ụdị njimara nke mmadụ na ibe ya ji ezirita onwe ha ozi ka a na-akpọ asụsụ. Anayochukwu (2005) kọwara asụsụ dịka ụzọ mmadụ ji e nwekọrịta mmekọ n'etiti mmadụ na ibe ya. Nke a na-apụta ihe mgbe mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka. Ọ na-egosi na ọ bụrụ na onye a na-agwa ihe aghọtaghị ihe a na-agwa ya, onye ahụ na-agwa ya ihe ahụ anaghị asụ asụsụ doro anya maọbụ ọ naghị asụ asụsụ ka ihe a chọrọ wee zuo oke, onye a na-agwa ga-aghọtarịrị ihe a na-agwa ya. Asụsụ na-arụkwa nnukwu ọrụ n'ebe agumakwukwọ dị, n'ihi na ọ na-enye aka ebute amamihe site n'aka onye na-akụzi rue n'aka onye a na-akụziri. Odenigwe (1998) kọwara na asụsụ bụ ọnọdụ mmadụ haziri e ji akọwapụta echiche n'okwu ọnụ maọbụ n'edemede. N'ịga n'ihu, ọ kọwara na asụsụ bụ ụda dị iche iche e ji olu na ọnụ eme nke mba ọbụla ji akparịta ụka. Nke a bụ ezie n'ihi na ọ bụrụ na asụsụ adịghị, ọ dịghị ezigbo ụzọ mmadụ ga-esi amata maọbụ mee ka ndị ọzọ mata ihe o chepụtara n'obi. Mmadụ ọbụla Chukwu kere nwere asụsụ ọ na-asụ, ọ bụ asụsụ ahụ ọ na-asụ ka o si amata ihe ndị gbara ya okirikiri nakwa ụwa ọ nọ n'ime ya. Ọ bụ asụsụ onye na-asụ ka e ji a mata onye ọ bụ, obodo o siri pụta maọbụ mpaghara mba ụwa ebe o si. Asụsụ na-enye aka na mmekọrịta maka na onye hụ onye ya na ya na-asụ otu asụsụ na mba ọzọ, ọ ga na-eweta ezi mmekọrịta n'etiti ha abụọ. Asụsụ abụghị ọnatarachi kama ọ bụ ụdaokwu sitere n'ọnụ mmadụ pụta nke a haziri nke ọma e ji ezipụta echiche mmadụ site n'okwu ọnụ maọbụ n'edemede. Nke a pụtara na asụsụ mmadụ abụghị ebumputa ụwa dịka asụsụ ụmụ anụmanụ dị iche iche siri dị.

Asụsụ ọbụla nwere etu dị iche iche e si asụpụta ya site n'obodo dị iche iche na-asụ ya. Asụsụ Igbo bụ asụsụ e ji mara agbụrụ a kpọrọ ndị Igbo bụ ndị isi ojii ndị a na-ahụ n'akụkụ ndịda ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa. Asụsụ Igbo so n'asụsụ atọ a gụnyere n'asụsụ pụtakarịchara ihe n'ala Naịjirịa. Nke a mere ka o soro n'otu asụsụ ụmụ akwụkwọ na-ele n'ule iji nweta asambodo Sinịọ Sekọndịrị ọ kachasị na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Asụsụ Igbo na-egosi omenala na ihe dị iche iche ndị Igbo nwere dịka o siri dị mkpa. Uru asụsụ Igbo bara n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, iwelite ndụ mmadụ na obodo elu abụghị ihe a ga-eleghara anya. N'ihi nke a, Gọọmenti etiti nke Naịjirịa kọwara n'akwụkwọ iwu gbasara agụmakwụkwọ n'afọ puku abụọ na anọ; Federal Republic fo Nigeria 'FRN' (2004) na:

Ndị gọọmenti kwetara na asụsụ na-aba uru iji kwalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya, obodo na obodo iji chekwaba omenala nakwa ịdị n'otu n'ala anyị. Nwatakịrị ọbụla ga-amụrịrị otu asụsụ ala anyị bụ Naịjirịa nke a ga-akụziri ụmụ akwụkwọ dị n'ala anyị (P.8).

Asụsụ Igbo bụ asụsụ ụdaolu. Ọ bụ asụsụ e ji ụda ya ma a na-asụ ya amata ihe ọ na-akọwa. Asụsụ ụdaolu bụ asụsụ e ji piichi maọbụ ogoolu ezipụta ndịiche dị n'etiti mọfịm abụọ maọbụ karịa, nkebiokwu abụọ maọbụ karịa dịka ha yiri onwe ha site n'ụdaume, myiriụdaume na mgbochiume dịgasị na ha. Ụdaolu bụ ọnọdụ ogoolu na anọ mgbe a na-akpọpụta mkpụrụokwu. Ọ bụkwa ụda ndị ahụ pụtara mmadụ n'ọnụ mgbe onye ahụ kpọpụtara mkpụrụokwu. Ụda na-esi n'olu okwu mmadụ nwere ike ria elu, dị ala maọbụ nọrọ n'etiti mgbe a na-akpọpụta okwu. Ụdaolu nwekwara ike ịbụ etu ụda ọbụla si ada na ntị mgbe a na-akpọpụta ya ga-egosi ihe okwu dị otu a pụtara. Asụsụ Igbo so n'asụsụ nwere ụdaolu. Ọ bụ site n'ụdaokwu Igbo ka e si amata nghọta okwu ahụ. Nke a bụ eziokwu n'ihi na ụdaokwu na-ewepụta ihe okwu pụtara maọbụ ihe okwu bụ. Mgbe a na-akpọpụta mkpụrụokwu maọbụ okwu, ụda ndị ahụ na-apụtawa ihe bụ ụdaolu. Na nkọwa nke ha, Emenanjo, Okolie na Ekwe (2010) gosiri ụdaolu dịka ọnọdụ oluokwu mmadụ na-anọ mgbe a na-akpọpụta mkpụrụokwu ahụ. Olu okwu dịka ha siri kọwaa nwere ike rịa elu, dị ala maọbụ nọrọ n'etiti. Nke a bụ eziokwu n'ihi na mgbe ọbụla a na-akpọpụta okwu, ogoolu na-egosipụta ọnọdụ okwu onye ahụ ma ọ rịrị elu ma ọ dara ala maọbụ na ọ nọ n'etiti. Nwadike na ndị ọzọ (2014) kọwara ụdaolu dịka ihe ọmụmụ na-amụ ka olu okwu mmadụ si arị elu maọbụ ada ala. Otu e si welie olu elu maọbụ wedata olu mgbe a na-akpọpụta mkpụrụokwu ọbụla ka a ga-eji mata okwu nke a na-ekwu maka ya. Ya bụ na mweli maọbụ mweda olu wee kpọpụta mkpụrụokwu iji zipụta ụda ka a kpọrọ ụdaolu. Ofor n'ime Ngoesi (2004) kọwara ụdaolu dịka ụzọ dị iche iche a na-eji ogoolu egosipụta ndịiche dị n'etiti okwu maọbụ ahịrịokwu abụọ ndị yiri onwe ha ma n'ụdị mkpụrụ edemede maọbụ n'ụdị mkpụrụokwu mebere ha nwere ike isite naanị n'ụdị akara ụdaolu a kanyere na ha.

Akara ụdaolu pụtara akara ndị ahụ e ji ezipụta ọnọdụ oluokwu mmadụ mgbe onye ahụ na-akpọpụta mkpụrụokwu. Ọ bụ akara ndị ahụ e ji ezipụta ndịiche dị na mkpụrụokwu abụọ maọbụ karịa yiri onwe ha na nsupe. Ọ bụ akara e ji ezipụta mgbe olu okwu mmadụ gbadara ala maọbụ mgbe ọ dị larịị. Akara ụdaolu na-eme ka a kpọpụta ụdaokwu etu kwesịrị ekwesị . Nke a pụtara na akara ụdaolu bụ nke na-akọwapụtara mmadụ ka e si akpọpụta okwu yiri onwe ha na nsupe. E nwekwara ike ịkọwa akara ụdaolu dịka ihe e ji egosi kpọmkwem ụdị ụda a chọrọ ka okwu nwee. Akara ụdaolu atọ pụtara ihe n'odide asụsụ Igbo. Ha gụnyere: akara ụdaelu(/) , akara ụdaala(\) na akara ụdansụda(-). A na-etinye akara ụdaolu elu mgbe ụdaokwu dị elu, a na-etinyekwa nke ala mgbe ụdaokwu dị ala, tinyekwa nke nsụda mgbe ụdaokwu arịghị elu ma ya adaghị ala. Ngoesi (2004) kọwara akara ụdaolu dịka akara ndị ahụ a na-etinye ụdaolu ka o wee zipụta nghọta a chọrọ. Tupu e tinye akara ụdaolu n'okwu, a ga-ebu ụzọ kpọpụta okwu ahụ n'olu ọ ga-enwe ezi nghọta n'usoro ebe ọ dị. A ga-achọpụta nkejiokwu ole okwu ahụ nwere n'ihi na ọ bụ nkejiokwu ole okwu nwere na-egosi akara ụdaolu ole a ga-akanye n'okwu ahụ.

Akara ụdaolu bụ akara dị iche iche e ji egosipụta ụdaolu n'edemede Igbo. Ofomata (2010) mere ka a mata na ọ bụ maka na asụsụ Igbo bụ asụsụ ụdaolu kpatara e jiri wepụta akara ụdaolu a ga-eji were na-ama okwu nke bụ nke. Akara ụdaolu bụkwa akara e ji ezipụta ihe odee bu n'uche ka ọgụụ wee ghọta ihe odee bu n'uche. Nke a pụtara na site n'akara ụdaolu ka ọgụụ si aghọta maọbụ edepụta ihe odee bu n'uche banyere mkpụrụokwu ọ kachasị nke nwere otu nsụpe. Nze (2011) kọwakwara akara ụdaolu dịka akara a na-etinye n'okwu ndị nwere ọtụtụ mpụtara iji gosi ndịiche n'ụda dị na mkpụrụokwu nke ọbụla. Ọ gara n'ihu kọwaa na anaghị etinye akara ụdaolu na mkpụrụ edemede mgbochiume kama naanị ebe a na-etinye akara ụdaolu bụ na ụdaume nakwa myiriụdaume. Ọ bụ akara ụdaolu a na-etinye n'okwu Igbo ka e ji ama ihe okwu ahụ pụtara. Ọfọmata (2005) kọwara na ọ bụ akara ụdaolu na-egosi ndịiche n'ụda n'okwu ndị ahụ nwere otu myiri na ndapụta ha. Ọ bụ otu onye na-akpọpụta okwu ahụ si dewe olu ka akara ụdaolu ya ga-esi wee dị. O nwere okwu ụfọdụ nwere nghọta ruru abụọ maọbụ karịa n'asụsụ Igbo ma ọ bụ naanị mgbe e tinyere ha akara ụdaolu ka a ga-enwe ike ịmata ha. Ọmụmaatụ: mkpụrụokwu a bụ 'isi' dị ụzọ anọ; isi (akụkụ ahụ mmadụ), isi (ahụghị ụzọ), isi (ajọ ikuku) na isi (nkwadobe ihe oriri). Ọ bụrụ na e dee mkpụrụokwu a n'etinyeghị ya akara ụdaolu, ọ ga-esi ezigbo ike ịmata nke a na-ekwu maka ya.

Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu. Nke a pụtara ihe n'ozi onye isi ule WAEC (2017) banyere amaghị ka e si etinye akara ụdaolu nke ọtụtụ ụmụ akwụkwọ. O kwupụtara na ọtụtụ n'ime ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu, ọ kachasị nke yitere onwe ha na nsupe.

Otụtụ nsogbu dị iche iche ka ụmụ akwụkwọ nwere ike inwe mgbe ha na-etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu nke olundị bụ otu n'ime ha. Ọtụtụ olundị dị iche iche e nwere n'asụsụ Igbo nwere ike ibutere ụmụ akwụkwọ nsogbu mgbe ha na-etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu. Olundị ndị a dịka Emenanjo (1982) siri kwupụta, nwere ike na-emetụta Igbo Izugbe mgbe ụmụ akwụkwọ na-etinye akara ụdaolu Igbo na mkpụrụokwu.

Amaghị mkpụrụ edemede Igbo na amaghị ebe a na-etinye ntụpọ tinyere amaghị asụpe okwu Igbo, e nweghị ike ịgụ mkpụrụokwu Igbo na anaghị enwe mmasị n'ọmụmụ asụsụ Igbo nwekwara ike bụrụ nsogbu ọzọ ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Ụmụ akwụkwọ nwekwara ike inwe nsogbu n'itinye akara edemede maka usoro ndị nkụzi na-agbaso mgbe ha na-akụziri ha ụdaasụsụ (Nwadike, 1990). Ọ bụrụ na ọ bụghị nke ha na-aghọta nke ọma, ọ ga-enye ha nsogbu. Ndị nkụzi na-akụzi asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu n'ime ihe ha na-akụzi dịkwazi ka ha so na nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Nke a bụ maka na ụfọdụ ndị nkụzi amaghị ka e si akpọpụta mkpụrụokwu Igbo nke ọma dịka o si metụta ụdaolu. Onye nkụzi na-akpọpụtaghị mkpụrụokwu nke ọma agaghị etinye akara ụdaolu okwu ahụ etu o kwesịrị. N'otu aka ahụ kwa, ụmụ akwụkwọ ọ na-akụziri agaghịkwa ama ka e si etinye akara ụdaolu okwu ahụ, maka na ọ hịara ahụ mmadụ inye onye ọzọ ihe o nweghị . N'ihi nke a ka o ji dị mkpa na ndị na-akụziri ụmụakwkwọ ihe ga-abụ ndị a zụrụ nke ọma maka nkụzi na ọmụmụ asụsụ Igbo.

N'agbanyeghị mbọ niile a na-agba ịkwalite ụmụ akwụkwọ ka ha nwee mmasị ịmụ etu e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo, ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ejighị nke a kpọrọ ihe. Nsogbu a na-apụtakarị ihe ma ọ bụrụ ná mpụrụokwu abụọ maọbụ karịa yiri onwe na nsupe. Onye nchọcha chọpụtara nke a mgbe ọ gara nleta ụmụ akwụkwọ nọ n'afọ nke ikpeazụ na ngalaba Mmụta Nka na mahadum Naịjirịa, Nsụka ndị gara ọmụmụ n'ụlọakwụkwọ maka ịbụ ndị nkụzi. O depụtara ọtụtụ mkpụrụokwu nwere otu nsupe na klaasị ma gwa ụmụ akwụkwọ ndị ha na-akụziri ka ha were akara ụdaolu zipụta ndịiche dị na ha, mana o nweghị onye nwere ike ime nke a nke ọma. Ọ bụ nke a mere onye nchọcha ji chọọ ịchọpụta nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo ọ kachasị n'ogo sinịọ sekọndịrị.

Mbunuche nchọcha a nke izugbe bụ ichọpụta nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itnye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Nchọcha a lebara anya kpọmkwem na mbunuche ndị a:

  • Ịchọpụta ka usoro nkụzi dị iche iche ndị nkụzi ji akụzi akara ụdaolu si emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo.
  • Ileba anya ka olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ.
  • Ịchọpụta ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo.
  • Ịchọpụta nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo.

E wepụtara ajụjụ anọ maka nchọcha a:

  1. Kedu ka usoro nkụzi dị iche iche ndị nkụzi ji akụzi ihe si emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo?
  2. Kedu ka olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ?
  3. Kedu ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo?
  • Kedu nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo?

· Usoro Nchọcha

Udị nchọcha e jiri mee nchọcha a bụ nke sọvee nkọwa. Nworgu (2015) kọwara sọvee nkọwa dịka ihe ọmụmụ na-amụ etu e si achịkọta data ma kọwaa n'ụzọ doro anya, ihe gbasara mmadụ ole na ole maọbụ ọnụọgụgụ ndị e jiri mee nchọcha. Ụdị nchọcha a bụ nke ga-enye aka inweta ụsa dị mkpa nakwa echiche ndị mmadụ n'ihe gbasara nsogbu ụmụ akwụkwọ nọ na sekọndịrị ọ kachasị n'ogo sinịọ sekọndịrị na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo n'okpuru ọchịchị Nsụka. Ebe onye nchọcha mere nchọcha a bụ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị n'okpuru ọchịchị Nsụka nke steeti Enugu. Ụmụ akwụkwọ narị abụọ bụ nke e ji usoro ebumnobi wee họrọ ka e ji mee nchọcha a.

Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ njụmaza, nke isiokwu ya bụ Njụmaza Nsogbu Ụmụ akwụkwọ na-enwe N'itinye Akara ụdaolu na Mkpụrụokwu Igbo (NNUNNAMI) nke onye nchọcha ji aka ya mepụta. Ọ bụ ndi ọkammụta nọ na ngalaba Mmụta Nka na ngalaba Lingwistiks, Igbo na Asụsụ Naịjirịa ndị ọzọ na Mahadum Naịjirịa, Nsụka tulere ya. Ajụjụ dị iri abụọ na anọ nke ụmụ akwụkwọ zara mebere NNUNNAMI. E ji miin na ndịpụ n'izugbe (Standard Deviation) wee hazie ma tụchaa data e nwetara na nchọcha a. Akara miin bidoro na 2.50 gbagowe ka a nabatara dịka ọsịsa dabara n'ihe a na-achọ, ebe akara miin pekarịrị 2.50 bụ ndị anabataghị na nchọcha a.

Nchọpụta

Ajụjụ Nchọcha Nke Mbụ

Kedu ka usoro nkụzi dị iche iche ndị nkụzi ji akụzi ihe si emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo?

Tebul 1: Ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe ka usoro nkụzi dị iche iche ndị nkụzi ji akụzi ihe si emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo.

Ọnụọgụ

Ndịna

SD

Nkọwa

1

Ndị nkụzi na-akụzi ụdaolu site n'ikwugharị ihe ha kụziri gbasara ụdaolu iji me ka mmụta dịrị ụmụ akwụkwọ nso.

2.50

1.11

Anabatara

2

Ndị nkụzi na-akụzi akara ụdaolu site n'inye ha ihe omume nke na-eme ka ha tinye uchu n'ịmụta ụdịdị akara nke ọbụla.

2.52

1.13

Anabatara

3

Ndị nkụzi na-akpọpụta ụmụ akwụkwọ na klaasị ka ka ha kanye akara ụdaolu n'ọtụtụ mkpụrụokwu nwere otu nsupe.

2.30

0.91

Anabataghị

4

Ndị nkụzi na-eji ọmụmatụ dị iche iche akụzi ụdaolu nke na-enyere ha aka ịmụta ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu.

2.63

1.63

Anabatara

5

Ndị nkụzi na-eji ụzọ egwuregwu akụzi akara ụdaolu iji me ka ụmụ akwụkwọ cheta ihe a kụziri ha ọsọ ọsọ.

2.24

0.56

Anabataghị

Nchịkọta

2.44

1.07

Anabataghị

Tebul nke mbụ gosiri ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe ka usoro nkụzi dị iche iche ndị nkụzi ji akụzi ihe si emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Site na tebulu a, ndị zara ajụjụ nabatara ndịna ajụjụ nke mbụ, nke abụọ na nke anọ ndị akara miin ha bụ 2.50, 2.52 na 2.63 n'otu n'otu. Nke a pụtara na ndị nkụzi ikwugharị ihe ha kụziri gbasara ụdaolu, inye ha ihe omume na iji ọmụmatụ dị iche iche kụzi ụdaolu bụ usoro dị mma nke na-emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. N'aka nke ọzọ, ndị zara ajụjụ anabataghị ndịna ajụjụ nke atọ na nke ise ndị akara miin ha bụ 2.30 na 2.24. Nke a pụtara na ndị nkụzi anaghị akpọpụta ụmụ akwụkwọ na klaasị ka ha kanye akara ụdaolu n'ọtụtụ mkpụrụokwu nwere otu nsupe. Ha anaghịkwa eji ụzọ egwuregwu akụzi ihe. Nke a bụ usoro ọjọọ na-emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo.

Ajụjụ Nchọcha nke Abụọ

Kedu ka olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ?

Tebul 2: Ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe ka olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ.

nụọgụ

Ndịna

SD

Nkọwa

6

Ndị nkụzi na-eji olundị Nsụka akụzi ụdaolu nke na-eme ka ọ hia ụmụ akwụkwọ ahụ itinye akara ụdaolu n'Igbo izugbe.

3.10

0.83

Anabatara

7

Ọtụtụ ndị nkụzi Igbo amaghị asụ Igbo izugbe nke ọma nke mere na ha na-ejikarị olundị akụzi ihe.

3.08

0.92

Anabatara

8

Olundị Nsụka ụfọdụ ndị nkụzi ji akụzi ihe na-eme na ha anaghị etinye akara ụdaolu kwesịrị ekwesị na mkpụrụokwu ebe ọ dị iche na Igbo izugbe .

3.37

0.86

Anabatara

9

Ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo izugbe ebe ọ bụ olundị Nsụka ka e ji akụziri ha asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu n'ime ya.

2.63

0.93

Anabatara

10

11

12

Olundị ndị nkụzi ji akụzi ihe anaghị ekwe ụmụ akwụkwọ ghọta mgbe okwu gbagoro elu na mgbe ọ gbadara ala.

Ụmụ akwụkwọ na-etinye akara ụdaolu nke ọma maka na enweghị ndịiche na mkpọpụta mkpụrụokwu

n'olundị Nsụka na Igbo izugbe.

Ụmụ akwụkwọ na-asụpe mkpụrụokwu n'olundị Nsụka karịa isupe ya n'Igbo izugbe.

3.32

2.20

3.00

0.82

0.72

0.70

Anabatara

Anabatahgị

Anabatara

Nchịkọta

2.96

0.83

Anabatara

Tebul nke abụọ gosiri ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe ka olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ. Data e gosipụtara na tebul nke abụọ na-egosi na ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ nke isii rue na nke iri, tinyere nke iri na abụọ ndị akara miin ha bụ 3.10, 3.08, 3.37, 2.63, 3.32 na 3.00 n'otu n'otu. Nke a pụtara na ndịna ajụjụ ndị a bụcha ụzọ olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ. N'aka nke ọzọ, ndị zara ajụjụ ekwenyeghị na ndịna ajụjụ nke iri na abụọ nke akara miin ya bụ 2.20. Nke a na-egosi na ha ekwenyeghị na ụmụ akwụkwọ na-etinye akara ụdaolu nke ọma maka na enweghị ndịiche na mkpọpụta mkpụrụokwu n'olundị Nsụka na Igbo izugbe.

Ajụjụ Nchọcha nke Atọ

Kedu ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo?

Tebul 3: Ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo.

nụọgụ

Ndịna

SD

Nkọwa

13

Ụmụ akwụkwọ anaghị enwe mmasị itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo nke na-eme ka ha na-ada ule.

3.53

0.74

Anabatara

14

Ụmụ akwụkwọ na-enwe mmasị ide na ịsụ asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu ngalaba ya.

2.29

0.94

Anabataghị

15

Ụmụ akwụkwọ na-enwe mmasị itinye akara ụdaolu n'okwu ụfọdụ e ji ede edemede ọ kachasị ndị ahụ nsupe ha bụ otu ma nghọta ha dị iche iche.

1.93

1.22

Anabataghị

16

Ụmụ akwụkwọ anaghị enwe mmasị ịnọ mgbe a na-akụzi akara ụdaolu nke na-eme ka ọ hịa ha ahụ ịmụta ya.

3.13

1.06

Anabatara

17

Ụmụ akwụkwọ na-ada akara ụdaolu n'ihi enweghị mmasị ha n'ịzụta akwụkwọ na-akụzi maka ya.

3.40

0.82

Anabatara

Nchịkọta

2.86

0.96

Anabatara

Tebul nke atọ gosiri ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe (standad divieshọn) ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo. Site na tebul a, ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ nke iri na atọ, iri na isii na nke iri na asaa. Nke a pụtara na ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo gụnyere : enweghị mmasị ha n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo nke na-eme ka ha na-ada ule, enweghị mmasị ha ịnọ mgbe a na-akụzi akara ụdaolu nke na-eme ka ọ hịa ha ahụ ịmụta ya na enweghị mmasị ha n'ịzụta akwụkwọ na-akụzi maka ya. N'aka nke ọzọ, ndị zara ajụjụ ekwenyeghị na ndịna ajụjụ nke iri na anọ na nke iri na ise ndị akara miin ha bụ 2.29 na 1.93 n'otu n'otu. Nke a gosiri na ndị zara ajụjụ ekwenyeghị na ndịna ajụjụ ndị a bụ ka mmasị ụmụ akwụkwọ nwere si emetụta ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo.

Ajụjụ Nchọcha nke Anọ

Kedu nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo?

Tebul 4: Ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo.

nụọgụ

Ndịna

SD

Nkọwa

18

Ndị nkụzi ejighị nka doro anya akụzi ụdaolu .

2.30

1.10

Anabataghị

19

Ụfọdụ ndị nkụzi anaghị akụzi ụda asụsụ ọ kachasị akara ụdaolu.

3.52

0.92

Anabatara

20

Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ nwere mmasị n'ọmụmụ asụsụ Igbo tụmadị akara ụdaolu.

2.13

1.06

Anabataghị

21

Ụmụ akwụkwọ na-enwe nsogbu n'ihi amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha.

3.29

0.79

Anabatara

22

23

24

A na-amachibido ụmụ akwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ nke na-adọghachi ọmụmụ asụsụ Igbo azụ nke ụdaolu bụ otu n'ime ngalaba ya.

Ụmụ akwụkwọ na-enwe mgbagwoju anya n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu.

Olundị na-ebutere ụmụ akwụkwọ nsogbu n'itinye akara ụdaolu.

3.53

3.20

2.70

0.91

0.68

1.21

Anabatara

Anabatara

Anabatara

Nchịkọta

2.95

0.95

Anabatara

Tebul nke anọ gosiri ọsịsa miin na ndịpụ n'izugbe nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo. Site na tebul a, ndị zara ajụjụ kwenyere na ndịna ajụjụ nke iri na itọolu, iri abụọ na otu rue na nke iri abụọ na anọ ndị akara miin ha bụ 3.52, 3.29, 3.53, 3.20 na 2.70 n'otu n'otu. Nke a pụtara na nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo gụnyere na: ụfọdụ ndị nkụzi anaghị akụzi ụda asụsụ ọ kachasị akara ụdaolu, ụmụ akwụkwọ amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha tinyere na a na-amachibido ụmụ akwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ nke na-adọghachi ọmụmụ asụsụ Igbo azụ nke ụdaolu bụ otu n'ime ngalaba ya. Ọ gụnyekwara na, ụmụ akwụkwọ na-enwe mgbagwoju anya n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu tinyere na olundị na-ebutere ụmụ akwụkwọ nsogbu n'itinye akara ụdaolu. N'aka nke ọzọ, ndị zara ajụjụ ekwenyeghị na ndịna ajụjụ nke iri na asatọ, na nke iri abụọ ndị akara miin ha bụ 2.30 na 2.13 n'otu n'otu. Nke a pụtara na ndịna ajụjụ ndị a esoghị na nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo.

Mkparịtaụka

Nchọpụta nchọcha a gosiri na e nwere nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo ọ kachasị n'okpuru ọchịchị Nsụka na steeti Enugu. Site na nchọcha a, usoro dị iche iche ndị nkụzi ji akụzi ihe na-emetụta ụmụ akwụkwọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Ndị nkụzi anaghị akpọpụta ụmụ akwụkwọ na klaasị ka ha kanye akara ụdaolu n'ọtụtụ mkpụrụokwu nwere otu nsupe. Ha anaghịkwa eji ụzọ egwuregwu akụzi ihe. Usoro ndị a na-emetụta ụmụ akwụkwọ nke ọjọọ n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Nke a kwadoro ngosipụta Nwadike (1990) n'ọtụtụ ndị nkụzi anaghị eji usoro kwesịrị ekwesị were na-akụzi ụdaasụsụ Igbo.

Nchọpụta nchọcha a gosikwara na olundị Nsụka na-ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ. Nke a bụ maka na ndị zara ajụjụ kwenyere na ndị nkụzi na-eji olundị Nsụka akụzi ụdaolu nke na-eme ka ọ hia ụmụ akwụkwọ ahụ itinye akara ụdaolu n'Igbo izugbe. Ha kwenyekwara n'ọtụtụ ndị nkụzi Igbo amaghị asụ Igbo izugbe nke ọma nke mere na ha na-ejikarị olundị akụzi ihe ọ kachasị olundị Nsụka. Ọzọ, olundị Nsụkka ụfọdụ ndị nkụzi ji akụzi ihe na-eme na ha anaghị etinye akara ụdaolu kwesịrị ekwesị na mkpụrụokwu ebe ọ dị iche na Igbo izugbe, ọ na-emekwa na ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo izugbe ebe ọ bụ olundị Nsụka ka e ji akụziri ha asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu n'ime ya. Ụzọ ndị ọzọ olundị Nsụka si ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ dịka nchọcha a si gosipụta gụnyere: olundị ndị nkụzi ji akụzi ihe anaghị ekwe ụmụ akwụkwọ ghọta mgbe okwu gbagoro elu na mgbe ọ gbadara ala, ụmụ akwụkwọ anaghị etinye akara ụdaolu nke ọma maka na e nwere ndịiche na mkpọpụta mkpụrụokwu n'olundị Nsụka na Igbo izugbe tinyere na ụmụ akwụkwọ na-asụpe mkpụrụokwu n'olundị Nsụka karịa isupe ya n'Igbo izugbe. Nchọpụta ndị a kwadoro echiche Umo (2001) na mwebata olundị oge a na-akụzi ụtọasụsụ na-emetụta nkụzi na ọmụmụ nakwa itinye akara ụdaolu.

Sitekwa na nchọpụta nchọcha a, mmasị ụmụ akwụkwọ nwere na-emetụtakwa ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo. Ụmụ akwụkwọ anaghị enwe mmasị itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo nke na-eme ka ha na-ada ule. Ha anaghị enwe mmasị ide na ịsụ asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu ngalaba ya. Ha anaghị enwe mmasị itinye akara ụdaolu n'okwu ụfọdụ e ji ede edemede ọ kachasị ndị ahụ nsupe ha bụ otu ma nghọta ha dị iche iche. Mmasị ụmụ akwụkwọ nwere na-emetụtakwa ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo n'ihi na ha anaghị enwe mmasị ịnọ mgbe a na-akụzi akara ụdaolu nke na-eme ka ọ hịa ha ahụ ịmụta ya. Ha na-ada akara ụdaolu n'ihi enweghị mmasị ha n'ịzụta akwụkwọ na-akụzi maka ya. Nchọpụta ndị a dabara na ngosipụta onye isi ule WAEC (2017) na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ amaghị ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu, ọ kachasị nke yitere onwe ha na nsupe n'ihi na ha anaghị enwe mmasị n'ọmụmụ asụsụ Igbo. Nke a bụ eziokwu n'ihi n'ụfọdụ n'ime ha na-eche ma na-ahụta ndị na-etinye uchu n'ọmụmụ asụsụ Igbo dịka ndị amaghị akwụkwọ.

Nchọpụta nchọcha a gosikwara nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo. Ụfọdụ nsogbu ndị a gụnyere na: ụfọdụ ndị nkụzi anaghị akụzi ụda asụsụ ọ kachasị akara ụdaolu, ụmụ akwụkwọ na-enwe nsogbu n'ihi amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha tinyere na a na-amachibido ụmụ akwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ nke na-adọghachi ọmụmụ asụsụ Igbo azụ nke ụdaolu bụ otu n'ime ngalaba ya. Ọzọkwa, ụmụ akwụkwọ na-enwe mgbagwoju anya n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu tinyekwara na olundị na-ebutere ha nsogbu n'itinye akara ụdaolu. Nchọpụta ndị a kwadoro nke Emenanjo (1982) na olundị nwere ike na-emetụta Igbo Izugbe mgbe ụmụ akwụkwọ na-etinye akara ụdaolu Igbo na mkpụrụokwu. Nke a bụ eziokwu maka na onye nkụzi jiri olundị na-akụziri ụmụ akwụkwọ asụsụ Igbo okachasị ụdaolu, ha ga-enwe mgbagwoju anya n'ihi ndịiche a ga-enwe na mkpọpụta mkpụrụokwu Igbo izugbe na olundị ahụ. Nke a ga-eme ka ọ hia ụmụ akwụkwọ ahụ ịma ka e si etinye akara ụdaolu na mpkụrụokwu Igbo.

Mmechi, Mpụtara na Ntụnye Aro

Ọtụtụ nsogbu ka ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe n'itinye akara ụdaolu Igbo na mkpụrụokwu. Ụfọdụ nsogbu ndị a bụ nke sitere n'aka ndị nkụzi ebe ụfọdụ sitere n'aka ụmụ akwụkwọ. Olundị Nsụka na-ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ maka na ndị nkụzi na-eji olundị Nsụka akụzi ụdaolu nke na-eme ka ọ hia ụmụ akwụkwọ ahụ itinye akara ụdaolu n'Igbo izugbe. Ọtụtụ ndị nkụzi Igbo amaghị asụ Igbo izugbe nke ọma nke mere na ha na-ejikarị olundị akụzi ihe ọ kachasị olundị Nsụka. Mmasị ụmụ akwụkwọ nwere na-emetụtakwa ha n'ọmụmụ akara ụdaolu Igbo. Ha anaghị enwe mmasị itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo, nke a na-eme ka ha na-ada ule. Ha anaghị enwe mmasị ịnọ mgbe a na-akụzi akara ụdaolu nke na-eme ka ọ hịa ha ahụ ịmụta ya. Nsogbu ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe gbasara amaghị etinye akara ụdaolu Igbo gụnyere na: ụfọdụ ndị nkụzi anaghị akụzi ụdaasụsụ ọ kachasị akara ụdaolu, ụmụ akwụkwọ na-enwe nsogbu n'ihi amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha na ihe ndị ọzọ.

Nsogbu dị iche iche ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo emeela n'ọtụtụ n'ime ha amaghị ka e si akpọpụta mkpụrụokwu Igbo. Olundị Nsụka na-ebute nsogbu banyere itinye akara ụdaolu n'ebe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị nọ. Olundị Nsụka ndị nkụzi ji akụzi ụdaolu emeela ka ọ hia ụmụ akwụkwọ ahụ itinye akara ụdaolu n'Igbo izugbe. Ọtụtụ ndị nkụzi Igbo amaghị asụ Igbo izugbe nke ọma nke a emeela na ha na-ejikarị olundị akụzi ihe ọ kachasị olundị Nsụka. Nke a emekwaala n'ọtụtụ ụmụ akwụkwọ amaghị asụ nke ha ma ede Igbo izugbe.

Enweghị mmasị ụmụ akwụkwọ n'ọmụmụ asụsụ Igbo emeela n'ọtụtụ n'ime ha amaghị etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. Nke a emekwaala ka ha na-ada ule ọ kachasị na nkega ụdaasụsụ. O mekwaala ka na ha anaghị enwe mmasị ịnọ mgbe a na-akụzi akara ụdaolu nke mere ka ọ hịa ha ahụ ịmụta ya. Anaghị akụzi ụdaasụsụ ọ kachasị ụdaolu na akara ụdaolu nke ụfọdụ ndị nkụzi na-eme, emeela ka ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-enwe nsogbu n'ihi amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha. Mmachibido a na-amachibido ụmụ akwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ebutela ndọghachiazụ ọmụmụ asụsụ Igbo nke ụdaolu bụ otu n'ime ngalaba ya. Mgbagwoju anya ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo emeela na ha amaghị ndịiche dị na mkpụrụokwu ndị nwere otu nsupe

Ọ bụ oke na ọrụ ndị nkụzi ịkwụsị maọbụ ibelata nsogbu ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo site n'iji usoro kwesịrị ekwesị were na-akụziri ha ihe. Ndị nkụzi ga-akwụsị iji olundị Nsụka akụzi ụdaolu iji mee ka ụmụ akwụkwọ mụta ka e si etinye akara ụdaolu n'Igbo izugbe. O kwesịrị ka e mee ka ụmụ akwụkwọ mata mkpa ọ dị na ha ga-enwe mmasị n'ọmụmụ asụsụ Igbo, nke a ga-eme ka ha na-agafe n'ule ọ kachasị na nkega ụdaasụsụ. Ọ ga-enyekwara ha aka ịmụta ka e si etinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo. O kwesịrị ka ndị nkụzi gbaa mbọ na-akụzi ụdaasụsụ tụmadị ụdaolu na akara ụdaolu iji gbochie nsogbu ụmụ akwụkwọ gbasara amaghị mkpụrụ edemede ndị a na-etinye akara ụdaolu na ha. A ga-akwụsị ịmachibido ụmụ akwụkwọ ịsụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ. Ọ bụrụ na e mee nke a tinyere ihe ndị ọzọ a rụtụrụla aka na mbụ, ọ ga-enye aka ịkwalite ọmụmụ asụsụ Igbo. Ọ ga-enyekwazi aka ibelata maọbụ kwụsị kpam kpam nsogbu ndị ahụ ụmụ akwụkwọ na-enwe n'itinye akara ụdaolu na mkpụrụokwu Igbo.

Edensibịa

Anayochukwu, L.O. (2005). Nnyocha Agụmagụ Ederede na Ntụgharị N'asụsụ Igbo. Enugu: Fidgma Global Service limited.

Anozie, C.C. (2010). Lingwistiiki Sayensị Asụsụ. Nsụka: Fulladu Publishing Company.

Emenanjo, E.N. (1982). Towards neocentral Igbo. Journal of Linguistics Association of Nigeria. 1, 149-174.

Emenanjo, E.N, Okolie, O.O. & Ekwe, B.U. (2010). Igbo maka sinịọ sekọndịrị. Ibadan: University Press Plc.

Federal Republic of Nigeria, (2004). National policy on education. Lagos : NERDC Press.

Nwadike, I.U. (1990). Nka na usoro nkụzi Igbo. Onitsha: Ifunanya Publishers.

Nwadike, I.U. Et al (2014). Mbido Igbo 6. Onitsha: Kawuriz and Manilas Publishers Limited.

Nworgu, B.G. (2015). Educational research: Basic issues and methodology. Nsụka: University Trust Press.

Ngoesi, M.C. (2004) Nchịkọta ihe ọmụmụ nke asụsụ Igbo maka ule siniọ sekọndịrị. Anambra:

Optimal Press Ltd.

Nze, (2011). Usoro edemede Igbo na sekọndịrị nta. Enugu: Computer Edge Publisher.

Odenigwe, O. (1998). Atụmatụ agụmagụ na atụmatụ okwu. Enugu: John Best publishers

Ofomata, C.E. (2002). Ndezu ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Format Publishers Nig. Ltd.

Ofomata, C.E. (2010). Ndezu ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Format Publishers Nig. Ltd.

Umo, C.U. (2001). "Teachers and Students Perception of Sources of Poor Performance in Senior School Certificate Examination in Igbo Language". In Kalu, W.J. et al (Eds). International Journal of arts and Technology Education.

West African Examinations Council (2017). Chief examiners reports' Nigeria. Lagos: WAEC





Ndịna Na Akanka Abụ Echichi N'okpuje Nsukka

Si N'aka

Ezesinachi, Juliet Ngozika ngizi.sinachijuly@gmail.com 08033223859

Ihedigbo, Ruth Ebere ebere.ihedigbo@unn.edu.ngebere.ihedigbo@yahoo.com 08034722818

na

Eze, Monica Ngozika monica.eze@unn.edu.ng 08068481351

Ụmịedemede

Nchọcha a lebara anya n'abụ echichi n'Okpuje Nsukka. Mbunuuche nchọcha a bụ ileba anya na ndịna na akanka abụ echichi n'Okpuje. Atụtụ e ji mee nchọcha bụ atụtụ akanka. Ngwa ọrụ data e ji rụọ ọrụ bụ ajụjụ ọnụ. Nchọpụta e nwetere na nchọcha bụ na abụ echichi na-adi n'udị dị iche iche dịka otito, nke ekele, nke ikpe na nke nkọcha. Nchọcha a gosikwara na abụ echichi nwere ọrụ dị iche iche ọ na-arụ na ndụ ndị chiri echichi dịka inye ha ugwu na nsọpụrụ igba ha ume n'igosipụta mbụnụche ndị obodo ebe ha nọ. O gosikwara na abụ echichi nwere nke a na-abụ mgbe a na-echi echichi na nke a na-abụ mgbe ọbụla maka ndị chiri echichi. Nchọcha a chọpụtakwara na abụ echichi na-enwe ọgụụ na ndị nkwee. Ọzọ kwa, ọ chọpụtara na atụmaatụ okwu na-apụtakarị ihe n'abụ echichi bụ mbụrụ na egbeokwu. Abụ echichi anaghi adịzị ugbu a dịka ọ na-adị na mgbe mbụ. Arọ ndị nchọcha tụnyere bụ na ndị nchọcha ọzọ ga-eleba anya n'ọrụ, ọnọdụ na uru abụ echichi bara maka nkwalite omenaala na agụmagụ Igbo.

Ntọala Nchọcha

Agụmagụ bụ echiche mmadụ chepụtara n'obi ya dee ya ede ma ọ bụ kwuputa ya n'ọnụ nkịtị nke na-enye amamihe, mkpalite nke mmụọ, obi ụtọ ma ọ bụ obi ọjọọ nakwa afọ ojuju. Dika Okoye (2008) si kọwaa, agụmagụ bụ echiche dị omimi nke mmadụ maọbụ ndị mmadụ chepụtara maka mmadụ ibe ha, ogbe maọbụ obodo, maọbụ ihe ndị abụghi mmadụ dịka otu ọnwụ si bịa n'ụwa, otu ọkụ si pụta nakwa ihe kpatara ihe ụfọdụ ji emegasị. Site na nkọwa a, anyị ga-aghọta na agụmagụ adịghị n'ikuku. Agụmagụ na-egosi ụwa na ihe dị n'ime ụwa dị ka mmadụ, anụmanụ, osisi na ekereke ụwa ndị ọzọ niile. Ọ na-akọwakwa na agụmagụ kere ụzọ abụọ, agụmagụ ọnụ na agụmagụ ederede. Agụmagụ ndị a bụ otu, naanị ndịiche bụ na otu bụ nke e kwuru n'ọnụ ebe nke ọzọ bụ nke e deturu n'akwụkwọ. Ha abụọ na-egosi ụwa na ihe dị n'ime ụwa. Agụmagụ nwere ngalaba atọ, ha bụ akụkọ, abụ na ejije. Nke a na-egosi na ụzọ atọ a ka e nwere ike iji wee kọwaa ụwa na ihe dị n'ụwa. Ọtụtụ ndị odee na ndi, ọkamụta edeela ọtụtụ ihe banyere ụdị agụmagụ abụọ bụ akụkọ na ejije mana a bịa n'abụ nchọcha emereela na ya egosibeghi ihe gbasara abụ echichi. Nke a kpaliri mmụọ ndị nchọcha a ileba anya na ndịna na akanka abụ echichi Okpuje nke dị n'okpuru ọchịchi Nsụka.

Abụ bụ nzimozi nke si n'obi pụta nke e nwere ike dee n'akwụkwọ maọbụ zipụta n'ọnụ nke a na-eji okwu okpora ma ọ bụ okwu apịrị aka maọbụ nka okwu bụ ịgba ziputa n'ụzọ dị nke nke. Nze (2010) kọwara n'aka nke ya, na abụ bụ echiche mmadụ chepụtara n'obi ya wee dee ya edee ma ọ bụ kwuputa ya n'ọnụ nke na-enye amamihe, mkpalite nke mmụọ, obi ụtọ ma ọ bụ obi ọjọọ nakwa afọ ojuju. Nwadike (2014) kọwara n'abu bụ ihe metụtara ndị mmadụ na ndụ, ihe ndị ha nụrụ na nti, ihe ndị ha hụrụ n'anya, ihe ndị ha rọrọ na nrọ; ihe ndị ha hụrụ n'ọhụ, ihe ndị ha gụtara n'akwụkwọ, na ihe mere na ndụ ndị ọzọ. Na nkọwa nke ya, ọ bụ ihe ndị a niile e depụtara n'elu ka ndị mmadụ ji ede maọbụ agụ abụ. Abụ bụ ozuru mba ọnụ. Mba ọbụla nwere abụ ha ji egosiputa ọnọdụ dị iche iche dịka ọnọdụ ọchịchị, ọnọdụ ọnwụ, ọnọdụ ihụnanya, ọnọdụ nkatọ, ọnọdụ mkpesa na ọnọdụ ndị ọzọ dị iche iche.

N'ala Igbo e nwere abụ e ji ekele ndị chiri echichi ekele, abụ e ji akọcha ha, abụ e ji arịọ ha ihe, abụ e ji ekpesara ha mkpesa na ihe ndị ọzọ. Dịka Ihedigbo (2017) si kọwaa, abụ bụ otu ụzọ e si ezirita ozi. Abụ bidoro kamgbe ndị Igbo bidoro n'ụdị abụ ọnụ. Abụ bara oke uru n'echimechi ndị Igbo. Ọ na-ede obi karịa ogologo okwu. Mmadụ ọbụla nọ n'ụwa n'agbanyeghi ọkwa onye ahụ nọ na ya na-ege ntị n'abụ karịa mkpọtụ ọzọ. Abụ na-arụ ọrụ dị oke mkpa na mkpalite maọbụ mwulite obi ndị mmadụ. Ọ na-enyekwa aka eme ka obi ndị mmadụ daa mba ọ kachasị mgbe ọ na-egosipụta ihe ọjọọ na ihe mwute maọbụ nkọcha. Ọ na-enyekwa aka n'ịkwalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Mgbe mmadụ na-agwa onye chiri echichi okwu buru ụzọ guọrọ ya egwu, ọ na-aka amịta mkpụrụ. Abụ bara oke uru n'ihe niile a na-eme n'ụwa bido na ngụgụ nwa wee rue n'abụ akwamaozu.

Atụtụ e ji rụọ ọrụ

Na mpaghara a, anyị ga-atulee ụfọdụ atụtụ metutere nchọcha a, mana n'ikpeazụ, anyị ga-atule atụtụ e ji mee ntụcha a kpọm kwem.

Atụtụ Ọnọdụ

Atụtụ ọnọdụ bụ nke Clifford Geertz chepụtara nke e deghi oge o ji chepụta ya, mana Annis na David (1978), meziri ka ọhanaeze mara maka ya bụ atụtụ. Ha kọwara atụtụ a dịka atụtụ na-achịkọta ebumunobi ndị mmadụ nke gbadoro ụkwụ n'ọnọdụ ihe jiri mee. Ha na-ekwu na nghọta ụda, mkpọtụ maọbụ okwu mmadụ kwuru na-agbado ụkwụ n'ihe na-eme mgbe ahụ. Atụtụ a na-egosi na tupu a ghọta ụda, mkpọtụ maọbụ okwu mmadụ kwuru na aga-ebu ụzọ lee anya n'ihe mere maọbụ na-eme maọbụ ọnọdụ e ji kwuo okwu ahụ.

Annis na David (1978) bụ ndị isi ahụrụ kwaba okpu atụtụ a, kwenyere na abụ ọbụla bara uru n'ọnọdụ maọbụ ihe na-eme mgbe a gụrụ ya. Atụtụ ọnọdụ bara uru na nchọcha a n'ihi na abụ echichi nwere uru na nghọta n'ebe ndị chiri echichi nọ.

Atụtụ nrụmọru

Atụtụ a so n'atụtụ kacha mkpa n'ọmụmụ asụsụ na agụmagụ. Onye weputara ya bụ Goldschamdt (1966), ọ na-akọwa mkpa ọ dị ileba anya n'ọrụ ihe na-arụ na ndụ mmadụ. Atụtụ a na-atụcha echiche na mmekọrịta ndị mmadụ. N'ihi nke a, agụmagụ na-arụ ọrụ pụrụ iche na ndụ mmadụ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Atụtụ a dị oke mkpa na nchọcha ọrụ na akanka dị n'abụ echichi n'ihi na abụ nwere ọrụ pụrụ iche ọ na-arụ na, mwulite na mkpalite mmụọ ndị chiri echichi.

Atụtụ usoro abụ ọnụ kefọmụla (oral formulaic approach)

Atụtụ a bidoro mgbe ọmụmụ ochie agụmagụ akụkọ banyere ike mmadụ maọbụ obodo kpara (epic), e wepụtazie ya nke ọma n'etiti senchury nke iri abụọ. Ndị weputara atụtụ a bụ Millan Parry na Albert Lord (1968). Nke a mere na e nwere ike ikpọ atụtụ a "Parry-Lord Theory". Atụtụ a bịara ịkọwa ihe abụọ. Ihe abụọ ndị ahụ bụ (1) usoro ndị ọgụụ abụ iweputa abụ na mberede maobụ n'adịghị nkwadobe (2) inye nkọwa ihe butere abụ ọnụ a kwadoghi akwado ji dị etu ọ dị. Echiche atụtụ a bụ na ndị ọgụụ abụ nwere ọba usoro ụkpụrụ abụ nke ha na-esi na ya agụ abụ mgbe ọbụla. N'echiche Millan Parry na Albert Lord (1968), atụtụ a gbanwere ọmụmụ abụ n'ụzọ mgbe ochie. O wetara ezigbo mgbanwe ọhụrụ n'ebe ndị ọka agụmagụ na agụmagụ mgbe ochie nọ. Na mgbe ochie, ndị ọgụụ abụ nwere mgbagwoju anya pụrụ iche n'ihe gbasara onye mbụ chepụtara akụkọ ndụ mana ugbu a, atụtụ a ekpochapụla ihe mgbagwoju anya ahụ site n'ikọwa na e nwere usoro ụkpụrụ abụ nke ndị ọgụụ na-esi e were abụ ha na-agụ. Atụtụ a metutara nchọcha a n'ihi na abụ echichi nwere usoro ụkpụrụ abụ nke ya.

Ihe ndị emerela gbasara isiokwu

Na mpaghara a, anyị ga-eleba anya n'ọrụ ndị a rụrụla gbasara abụ echichi n'ụzọ ọbụla. Mana, ọ bụ ihe itunaanya na o nwebeghi ọrụ mbụ a rụrụla banyere abụ echichi. N'agbanyeghị ihe ịtụnaanya a, anyị ga-atụcha ọrụ ndị a rụrụla banyere abụ ndị ọzọ n'agụmagụ Igbo.

Duruji (2005) mere nchọcha n'abụ emume Odo na Ngwoo. Ebumunuche ya bụ idepụta abụ a na-abụ mgbe a na-eme mmemme Odo. Ngwa nchọcha ya sitere n'ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị na-eti Odo. O depụtara abụ ndị ahụ ma tụgharịa ha n'asụsụ bekee. Nchọcha ya gosiri na o nwere ebe abụ Odo Ngwoo siri yite abụ ọnụ ndị ọzọ. Ọ chọpụtakwara na abụ odo bara uru na ndụ ndị na-eti mmọnwụ Odo. Nchọcha Duruji (2005) na nchọcha a yitere onwe ha n'ihi na ha abụọ bụ abụ mmemme Igbo. Ha abụọ dị iche n'ihi na ebe Duruji mere nchọcha n'abụ emume Odo, nchọcha nke a na-elebe anya n'ọrụ na akanka abụ echichi.

Asogwa (2016) mere nchọcha n'abụ nnapụta n'Eha Alumona. Ebumunuche ya bụ idepụta abụ nnapụta n'akwụkwọ ka abụ ndị ahụ ghara ịnwụ anwụ, nakwa ka o jiri ya kagbuo nkwenye ndị ọcha nwere na agụmagụ ndị Afrika enweghi abụ. O jiri atụtụ nka mma wee mee ntụcha data ya. Nchọpụta ya gosiri na mma abụ na-esite n'ụda na atụmatụ okwu dị n'abụ ahụ. Nchọpụta ya gosịkwara na ọmụmụ abụ nnapụta adịghị ire n'ọmụmụ agụmagụ Igbo. Nchọcha Asọgwa (2016) mere na nke a yitere onwe ha n'ihi na ha abụọ bụ abụ Igbo mana ha abụọ dị iche n'ihi na ebe Asọgwa nyọchara abụ nnapụta, nchọcha a na-enyocha ọrụ na akanka dị n'abụ echichi.

Ihedigbo (2017) lebara anya na ndịna na akanka abụ ọṅụnwa. Ebumnobi ya tinyere ịchọpụta ndịna na akanka abụ ọṅụnwa bụkwa ịchọpụta nnyemaka asụsụ dị n'abụ ọṅụnwa, myiri na ndịiche dị na ya nakwa ihe ọbịbịa ndị ọcha butere abụ ọṅụnwa. O jiri atụtụ abụọ were rụọ ọrụ. Ha bụ atụtụ ọrụ na atụtụ ọnọdụ (functionalism and contextualism theories). O nwetara data ya site n'ịgba ọhịa ajụjụ. Nchọpụta ya gosiri na abụ ọṅụnwa na-adị n'ụdị ọgụụ na nkwee. Ọzọ kwa, nchọpụta ya gosikwara na egwu ọṅụnwa nwere ndịna dịka ekpere, afọ ime, ọrụ dịrị mmadụ na ndụmọdụ. Ọ chọpụtakwara na ndị nne arapụla egwu ọṅụnwa n'ihi ụka ọgbara ọhụrụ na agụmagụ ndị ọcha wetere n'ala Igbo. Ọ chịkọtara ọrụ nchọcha ya site n'itinye arọ na ebe a naghị agọ mmụọ n'abụ ọṅụnwa, na ndị nne kwesịrị ijikọta ọnụ ma soro na-agụ egwu ọṅụnwa maka ịkwalite omenaala na ewumewu ndị Igbo. Ọrụ Ihedigbo (2017) na nke a yiri onwe ha n'ihi na ha abụọ na-atule ọrụ na akanka dị n'abụ ebe ha abụọ dị iche n'ihi na ebe Ihedigbo (2017) lebara anya n'ọrụ na akanka dị n'abụ ọṅụnwa , nchọcha nke a na-elebanya n'ọrụ na akanka dị n'abụ echichi.

Atụtụ ntụcha data

Atụtụ e jiri mee nchọcha bụ atụtụ akanka. Onye chepụtara atụtụ a bụ Yoshifumi, Saito (1997). Atụtụ a na-eleba anya n'omume maọbụ ka ihe si dị iche n'ihe ndị ọzọ. Ọ na-atụcha akanka e ji mee ihe. Iji atụtụ akanka wee nyocha abụ bụ iwepụta ma tụcha nkamma niile dị n' abụ. N'abụ echichi anyị na-elebanya, atụtụ akanka ga-enyere anyị aka iweputa nkamma na atụmatụ okwu niile dị n'abụ a ga-edepụta, nyocha ha ma tụchaa ha nke ọma. Atụtụ akanka na-enyocha ka ọgụụ abụ/ode si webata mkpụrụokwu, nkebiokwu, nkebiahịrị, ahịriokwu na atụmaatụ okwu niile dị n'abụ. Atụtụ ọzọ a ga-eji nyocha ma tụcha data nchọcha bụ atụtụ nrụm ọrụ maka na nchọcha a na-elebanya na ndina na akanka dị n'abụ echichi.

Ntụcha data

Na ntụcha abụ echichi, anyi na-enyocha ndịna ya nakwa akanka dị na ya. Anyị ga-ewebatakwa ma kọwaa abụ a na-agụ mgbe a na-echi echichi nakwa abụ a na-agu mgbe a chọrọ ịhụ onye chiri echichi. Ya na abụ ndị e ji emeda ndị chiri echichi obi.

Abụ nke mbụ

Ọgụụ Eze anyị bụ odogwu

Odogwu anəgə aba mba

Okwee Eze anyị bụ odogwu

Odogwu anəgə aba mba

Ọgụụ Oliver bụ odogwu

Odogwu anəgə aba mba

Okwee Oliver bụ odogwu

Odogwu anəgə aba mba

Abụ a dị n'elu na-akọwa na eze ha bụ odogwu na odogwu anaghị aba mba. Ọgụụ gụchaa, ndị okwee ekwete ya. Abụ a ka a na-abụ iji too onye chiri echichi otito. Anyị lee anya na ya, anyị ga-ahụ n'isiokwu abụ a bụ otito. Abụ a nwekwara mbụrụ na ya "bụ odogwu". Olu e ji gụọ ya bụ olu otito.

Abụ nke abụọ

Ọgụụ lekwa ya lekwa ya

Okwee lekwa ya na oyiri anyị o

Ọgụụ lekwa igwe Okpuje

Okwee lekwa ya na o yiri anyi oo

N'abụ nke abụọ a, anyị ga-achọpụta na ndịna ya bụ mmetuta. E nwere myiri na ya. e ji abụ a egosi onye chiri echichi na o yiri ndị ọ na-achị. Nke a na-emekwa ndị chiri echịchi obi ụtọ mgbe ndị ọ na-achị na-egosi ya na ọ dị ka achọrọ.

Abụ nke atọ

Ọgụụ kelere anyị ndị operu owete

Okwee kelere anyị ndị operu owete

Ọgụụ Igwe Oliver Ayọgụ bụ operu owete

Okwee kelere anyị ndị operu owete

Abụ a na-egosi na igwe bụ ọgaranya zuru ka e mee maka na ọ bụghị onye ọbula ga-aba n'ụlọ weta ihe nye mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahu enweghị. Ụfọdụ ọgaranya nwejuru ihe ụlọ mana ọ bụghị onye ọbụla nwere mmụọ onyinye. Abụ a na-egosi na Igwe Oliver Ayọgụ bụ ọgaranya ma nwekwaa mmụọ onyinye.

Abụ nke atọ bụ abụ ekele na ịja mma. Ọgụụ abụ na-akọwa na igwe ha bụ ọ banye n'ụlọ oweputa ego. E nwekwara mbụrụ na ya bụ abụ ebe ọkpọabụ na-akọwa na igwe ya bụ operu owete. E nwekwara ụda n'ụsoro n'abụ ahụ - kelere - peru - wete. E nwere e e e na mkpụrụokwu ndị a sotere onwe ya.

Abụ nke anọ

Ọgụụ O chiri ọzọ emeghi ebubu

Okwee Ọzọ afa ibine awa ya

Ọgụụ Egwu ekwekwe ọzọ

Okwee Ị bụrụ di ji chiere anyị ọzọ

Ọgụụ Egwu ekwekwe ọzọ

Okwee Chie mgbe n'abọ, chie mgba n'atọ

Abụ nke anọ a bụ abụ ikpe. Ọ na-akọwa na onye chiri ọzọ ewepụtaghị, afa awaa ya ka o weputa ego n'ike. Ọ na-ekpekwa ikpe, si onye sịrị na ya bụ dịji, onye ahụ chie ọzọ, n'ihi na ichi ọzọ abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba. E nwekwara ụda n'usoro n'abụ a ekwekwe. Ndịna dị n'abụ a bụ ikpe. N'ihi na ọ na-ekpe ndị ogbenye gbaliri chie ọzọ ma nwee aka ntagide iwepụta ihe ka ha mesapụ aka n'ihi na ọ bụ dike maọbụ diji na-eji ọzọ.

Abụ nke ise

Ọgụụ Oshimiri makọdị n'eze Okpuje bụ okorobia

Okwee Oshimiri makọdi n'eze Okpuje bụ okorobia

Ọgụụ Oshimiri makọdi n'agabaidu bụ okorobia

Okwee Oshimiri makọdi n'agabaidu bụ okorobia

Ndịna abụ a bụ njiaamma. Abu a na-aja onye chiri echichi n'obodo. Ọ na-ebuli ya elu na-akewa na ọ bụ ọgaranya. O nwekwara ntụnyere ebe o ji eze Okpuje atụnyere oshimiri. E nwekwara mbụrụ e bu ọ sịrị na eze obodo ha bụ okorobịa. Otu e jiri dee ya bụ otu otito. Ọgụụ abụ webatara olundị n'abụ a: ne-na. Ahịrị a niile bụ ahịrị otito.

Nchikọta na Mmechi

N'abụ a bụ abụ echichi anyị tulere, a chọpụtara na e nwere ndịna dị iche iche n'abụ echichi. Ụfọdụ ndịna a chọpụtara bụ otito, mmetuta, ekele, ikpe, njiamma na ndịna ndị ọzọ dị iche iche. A bịa, n'akanka, ọgụụ abụ jiri ahịrịmfe na ahịrịnha wee rụọ ọrụ. Ahịrị abụ ya gara were were. O webatakwa olundị iji mee ka abụ ụfọdụ ndị a nwee ụdanusoro. A hụtakwara na ọtụtụ abụ ndị a nwere mbụrụ na ndịka. Atụmaatụ echiche apụtaghi ihe nke ọma n'abụ ndị a a tụchara. A chọpụtakwara na abụ echichi nwere nnukwu ọrụ ọ na-arụ na ndụ ndị chiri echichi na ndị a na-echi echichi. Aro anyị bụ na ndị nchọcha ọzọ ga-agba mbọ lebaa anya n'ọrụ nakwa ọnọdụ abụ echichi n'oge ugbu a maka na nchọcha nke a chọpụtara na abụ echichi adịghịzị ire ka ọ dị n'oge mbu. Nchọcha anyị gosikwara na ọtụtụ mgbe, abụ echichi n'Okpuje na-adị, n'ụdị ihe ọgụụ gụrụ ka ndị nkwee ga-ekwekwa.

Edensibia

Annis and David (1978). A contextualist theory of epitemic. American: Philpapers.

Asogwa, M.G. (2016). Eha-Alumona vindication poetry. Ph.D seminar, Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka.

Duruji (2005). Odo festival songs: An Ngwo oral poetry, M.A. Thesis, Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka.

Goldschamdt, B. (1966). Structural functionalism: An introduction to the literature. Amazon com Grin publishing.

Ihedigbo, R.E. (2017). Theme and style of Igbo Birth songs. Ph.D. Thesis, Department of Linguistics, Igbo and Other Nigerian Languages, University of Nigeria, Nsukka.

Nwadike, I.U. (2014). Akonuche, Obosi: Pacific correspondence college & press. Anambra state.

Nze, A.I. (2010). Nchikọta akwụkwọ ule maka siniọ sekọndịrị. nnewa: MIS-FAU publishers.

Ogbalụ, F.C. (2013). Mbem na egwu Igbo Onitsha: Varsity publishing Co. Ltd.

Okoye, L.O. (2008). Ntuziaka maka ụdaasụsụ, ụtọasụsụ na omenaala Igbo. Enugu: Innoge & Sons Company Limited.

Parry Millan and Albert Lord (1968). Research and the oral tradition. Cambridge: Cambridge University Press.

Yoshifumi, Saito (1997). Style and creativity: Towards a theory of creative stylistics. Ph.D Thesis, University of Nottingham.