IGBOSCHOLARS INTERNATIONAL OF IGBO SCHOLARS FORUM, NIGERIA VOL.12, NO.1,

Ndụ Ndị Igbo: Etu Ha Si Eji Ilu Emedaobi N'ọgbaaghara dị N'Etiti Ha

nke

Ogoo Ifeka                                                                                                                                                                                                    Ngalaba Linquistiks na Igbo                                                                                                                                                                 Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu                                                                                                                                  Ịgbarịam                                                                                                                                                                                                       Steeti Anambara

Ụmịedemede

Ilu bụ amamihe nke dị omimi ndị Igbo ji achọ asụsụ ha mma. Ha na-atụ ilu site n'usoro ibi ndụ ha, ndụmọdụ ha, anya iru ala ha, zipụta nchedo Eke, ịgba ume ha, nkasiobi ha, udo ha, nzuzu ha, mkparị ha, ịkwụwa aka ọtọ ha, umeala ha, idi ichu n'ọrụ ha, dgz. (Ifeka O. 2011). Dịka okwu nka e ji achọ okwu mma nke na-apụta ihe mgbe a na-ekwu okwu maọbụ mgbe e dere ya n'akwụkwọ, a chọpụtara na e nwegasịrị ọtụtụ ilu Igbo ndị Igbo ji emedaobi mgbe e nwere ọgbaghara n'ezinụụlọ, n'ụmụnna, n'ogbe maọbụ n'obodo. N'edemede a, e nyochara ụfọdụ ilu ndị Igbo, ndị a chọpụtara na ha bụ ngwaọrụ e ji akpa udo n'ụdị ọbụla n'ebe esemookwu selitere isi. E ji ọmụmaatụ dị icheiche wee gbaa ilu ndị ahụ n'anwụ dịka ngwaọrụ akpamudo n'ala Igbo.

Mmalite

Ilu dịka ndị igbo siri kwu, bụ mmanụ e ji eri okwu. Ilu dị nnukwu mkpa na ndụ ndị Igbo. Ezi onye Igbo nwere uche kwube okwu ma o tinyeghị ilu, ọ na-adị ka akọba akụkọ ifo ma akọnyeghị mbe mana o tinye ilu ndị nọ nso na-asị na ego e jiri lụọ nne ya anaghị nna ya n'iyi.

Ndị Igbo na-ewere onye na-aghọta ihe ilu pụtara ka onye nwere uche na oke amamiihe. Ilu igbo niile n'ụdị ha na-ezipụta ka ndị Igbo si ebi ndụ ha, n'oge ha biri ndụ nke ha na-ekwukarị n'ụdị agụmagụ ọnụ.

A na-eji ilu ekwu okwu dị icheiche n'ala Igbo, dịka okwu ala maọbụ ikpe ala, alụmdi, ike ekpe maọbụ iri ekpe, nhachi nwaanyị maọbụ nkuchi nwaanyị, karịsịa e ji ilu edozi esemookwu dị n'etiti obodo na obodo, ogbe na ogbe, ụmụnna na ụmụnna, di na nwunye, nne na ụmụ, dgz.

Ilu bụ ejighị ebuli ma si elila dike n'ebe ndozi esemookwu dị n'ala Igbo, kama onye Igbo ga-atagheriwe ọnụ ọ tụọ otu ilu ga-achịkọta n'ụzọ amamihe okwu a kpụ n'ọnụ ozigbo. Mgbe ọ bụla okwu siri ike okenye nọ n'isi, a tụọ ilu ga-eme ka obi dajụọ ma nwoke ma nwaanyị nọ n'ikpe ahụ. E lebara anya n'ilu Igbo iri ma were nkenke akụkọ were zipụta n'ụdị ilu si eme ka ọnụma dajụọ mgbe anọ n'ikpe n'ezinụụlọ maọbụ n'obodo.

Ilu Igbo ndị a na-ejikarị akpa udo n'etiti ndị nwere esemookwu:

  • Aka mmiri mmiri ka e ji eri ụtara ede.
  • A na-agwọ nsi odo anya anaghị etinye ya ose.

(ch) Egwu dagharịa a tụgharịa ụkwụ egwu.

(d) E lebe ihe nkịta na-eri agaghị eri anụ ya.

(e) Ibu ebughị ibu anaghị agwọrọ ya ajụ riri nne.

(f) Ihunye mmanụ n'ọkụ abụghị ụzọ a ga-esi menyụọ ọkụ.

(g) Isi ala anaghị atọ ebe e tiri ya.

(gb) Ihu dị mma adịghị mma ịga mbọ.

(gh) Ka ewu tara igu o kpeere ekwere?

(gw) Nwanne na nwanne nọrọ n'ọgụ nwụọ, onye ọbịa a kpara akụ nna ha.

(h) Okwu atụghị ụlọ anaghị amara ya uko.

(i) Otu anya ka e ji alụ di na nwunye.

(ị) Ụkwụ ọkụkọ zọrọ nwa ya agaghị egbu ya.

(j) E were aka nri tie nwata ihe e were aka ekpe gụgụọ ya.

(k) Ọ bụghị ka aka ha ka a na-eti nwa.

Iji nkenke akụkọ wee zipụta etu ilu Igbo ụfọdụ si bụrụ ngwaọrụ e ji enweta udo n'etiti ndị Igbo mgbe ha nwere nsogbu.

Nzipụta nke mbụ: (i) Aka mmiri mmiri ka e ji eri ụtara ede.

(ii) Otu anya ka e ji alụ di na nwunye.

Ihe merenụ: Ebe a nọ n'ikpe di na nwunye

Onye mkpesa: Nwunye

Ndị nọ n'ikpe: ụmụnna nke nwoke

Ebe ihe nọ mee: Ogidi

Ụmụnna nọ n'ikpe n'Ogidi ebe nwunye nwanne ha nwoke kpesaara ha banyere agwa nwanne ha, agwa teerela di ya na-akpa n'enweghị mmụọ mgbanwe. Nwaanyị ahụ wee na-agwa ndị be di ya na ya agaghị anabatazi agwa ahụ ma ncha. Ndị be di ya maara na nwanne ha nwoke amaghị eme kama ha gwara nwunye ya sị; "Anyị ma na nwanne anyị amaghị eme kama anyị na-arịọ ka idibezie niihina, ọ bụkwanụ aka mmiri mmiri ka e ji eri ụtara ede maọbụ na otu anya ka e ji alụ di na nwunye."

E ji ilu a were dụọ nwaanyị ahụ ọdụ ka ọ hapụ diwe ma nagide ọnọdụ o nwetara onwe ya site n'alụmdi. Nke a ga-eme ka obi dajụọ nwaanyị ka o were ihe ọ lụtara na di ma nwe nchekwube n'otu ụbọchị n'ihe ga-adị mma.

Nzipụta nke abụọ: (i) A na-agwọ nsi odo anya anaghị etinye ya ose.

(ii) Ihunye mmanụ n'ọkụ abụghị ụzọ a ga-esi menyụọ ọkụ.

Ihe merenụ: Ebe ụmụokorobịa abụọ na-alụ ọgụ.

Onye mkpesa: Nne otu n'ime ha.

Ndị nọ n'ikpe: Nwoke na nwunye ya.

Ebe ihe nọ mee: N'ahịa ọhụụ dị n'ọnịcha.

Ụmụ okorobịa abụọ na-azọ ndị ahịa were kọwa ọnụ, wee lụwa ọgụ. Ha abụọ wee danye n'ọdụ ahịa nne onye nke ọzọ, ebe ọ bụ nwa ya bu ụzọ tụọ ọgụ. Mgbe ndị na-edozi ikpe na-ekpezi, nwaanyị emebiri ihe ọ kpọbara n'ahịa bụ nne otu n'ime ya wee sị ha; "A ga-akwụ m ụgwọ ihe ha mebiri. Mgbe a na-asị onye e mejọrọ ka ha hapụ esemookwu ka nwaanyị ahụ malitere ikwu maka ihe ya emebisịrị n'agbanyeghị na ọ bụ nwa ya bụ isi sekpụ nti n'esemookwu ahụ. Nwoke ahụ na nwunye ya nọ n'ikpe wee baa mba sị nne nwata ahụ ya kwụsị ụdị okwu ahụ maka na o nwere ike ime ka onye achọrọ okwu nwee mkpali iwe, wee sị; "A na-agwọ nsi odo anya anaghị etinye ya ose maọbụ ihunye mmanụ n'ọkụ abụghị ụzọ a ga-esi menyụọ ọkụ."

Nzipụta nke atọ: Egwu dagharịa a tụgharịa ụkwụ egwu.

Ihe merenụ: Nwaanyị nwetara ọrụ ọhụụ na-enye ya ego mana ọ naghị alọtazi n'oge n'ụlọ ya.

Onye mkpesa: Di nwaanyị

Ndị nọ n'ikpe: Ndị ọgọ (ndị be nwaanyị)

Ebe ihe nọ mee: Ịgbarịam

Ndị ọgọ nọ n'ikpe, ebe nwoke kpere nwunye ya na kemgbe o bidoro ọrụ na Mahadum di n'Ịgbarịam na ọ naghị alọtazi n'oge. ọ kọwara sị na ego a na-akwụ ya na-abara ha uru kama na ọ naghị alọta n'oge were siere ya na ụmụ nri n'oge. Ka ndị ọgọ nụrụchara mkpesa ya ha chọpụtara na nwaanyị na-arụ ọrụ Bekee na o nweghị onwe ya, ọzọ ọ na-enwete ego e ji eri nri n'ụlọ ha wee dụọ di ya ọdụ sị; "Egwu dagharịa a tụgharịa ụkwụ egwu". Ya mere ọ bụrụ na ọrụ a baara ezinụụlọ ya uru ya leghara anya oge o ji abata niihina ọ bụ ọrụ Bekee na o nweghị onwe ya ịla mgbe sọrọ ya.

Nzipụta nke anọ: (i) ụkwụ ọkụkọ zọrọ nwa ya agaghị egbu ya.

(ii) E lebe ihe nkịta na-eri agaghị eri anụ ya

Ihe merenụ: Ebe a nọ n'ikpe nwaanyị na di ya.

Onye mkpesa: Nwaanyị kpesaara ụmụnna di ya etu di ya sị achụgharị onye ọbụla a kpọrọ nwaanyị n'ogbe ha.

Ndị nọ n'ikpe: ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaaanyị

Ebe ihe nọ mee: N'Ihiala

Nwaanyị gara gwa ụmụnna di ya na ụmụnna be nna ya na o nweghị ihe ọzọ ga-ejikọ ya na di ya inwe mmekọ edina dịka di na nwunye niihina ọ bụ mkpi na-agbara ọha. O kwuru nke a niihina ụjọ na-atụ ya ibute ọrịa nsi nwaanyị n'ụdị ọbụla. Di nwaanyị ahụ na-agagharị na-akọ na nwunye ya jụrụ ya ndina, nke kpariri mmụọ nwaanyị ịkọrọ ndị ikwunaibe ihe mere o jiri jụ di ya ndina. Ka o kpesachara ikpe ụmụnna abụọ ndị ahụ wee hụta na nwoke ahụ emeghị nke ọma ma ncha. Ma niihina ikpe anaghị amakebe nwoke n'ala igbo, otu onye wee sị nwaanyị ahụ na ọ ghaghị ịgbaghara di ya niihina E lebe ihe nkịta na-eri agaghị eri anụ ya, na-asị na ụkwụ ọkụkọ zọrọ nwa ya anaghị egbu ya, na ya gbaghara di ya.

Nzipụta nke ise: (i) Ibu ebughị ibu anaghị agwọrọ ya ajụ hiri nne.

(ii) Okwu atụghị ụlọ anaghị amara ya uko.

Ihere merenụ: Ikpe na otu nwaokorobịa na-akọ na ya bụ enyi

nwata nwaanyị ma ha abụghị.

Onye mkpesa: Nwaagbọghọbịa

Ndị nọ n'ikpe: Ezinụụlọ nke nwaagbọghụbịa

Ebe ihe nọ mee: N'Alọ

Nwata nwaagbọghọ nụrụ na otu ikorobịa nọ n'obodo ha sịrị na ha bụ enyi mana ha anaghị eri enyi. O wee nwee mwute pụrụ iche wee kọọrọ nne na nna ya ihe ọ nụrụ. Ka o kpesachara nna ya wee jụọ ya ma ha a na-eri enye n'ezie, ọ sị mba na o nweghị ihe jikọtara ha abụọ. Nna ya wee chọpụta na nwa ya nwaanyị gwara ya eziokwu, wee sị na ebe okorobịa ahụ agwaghị ya n'ihu na ọ bụ enyi ya kama ọ bụ naanị asịrị, ọ sị nwa ya nwaanyị na okwu adịghị n'akụkọ ahụ, ya mere, Ibu ebughị ibu anaghị agwọrọ ya ajụ hiri nne, maọbụ okwu atụghị ụlọ anaghị amara ya uko.

Nzipụta nke isii: Isi ala anaghị atọ ebe e tiri ya.

Ihe merenụ: Ikpe nwaanyị na di ya niihi akwa ya niile di ya gbara ọkụ.

Onye mkpesa: Nwaanyị a gbara akwa ya ọkụ

Ndị nọ n'ikpe: Ndị enyi ezinụụlọ di na nwunye ahụ.

Ebe ihe nọ mee: N'Enugwu

Nwaanyị chọpụtara na di ya n'otu ajadu bi n'ogbe na-eri enyi nke mere na mgbe ụfọdụ di ya gwa ya ka ya gaa hụ nne ya n'ime obodo, ọ gaa rahụ na be ajadu ahụ. Ka nwaanyị chọpụtara agwa ọjọọ di ya na-akpa o wee gaa n'ụlọ nwaanyị ahụ ụbọchị di ya nọ ebe ahụ wee tie ajadu ahụ ihe dị egwu ma mebọọ di ya n'ihu ọha. Di ya were ọnụma juru ya obi bupute igbe akwa nwaanyị ahụ wee gbaa akwa niile dị n'ime ya ọkụ ma kwere ike. Mgbe ndị enyi ha ne-ekpeziri ha maka ihe merenụ nwaanyị na-aba mana ndị nọ ebe ahụ sịrị ya rịọ di ya mgbaghara niihi mmebọ ahụ o mebọrọ ya be enyi ya nwaanyị. Nwaanyị wee tie mkpu akwa sị na kama ya ga-eme nke ahụ ihe dị abụọ otu mee niihina mmegbu abaala n'ikpe ahụ. ọ nọrọ na-eti na-ebe akwa arịrị ma sị na ya agaghị eme ya eme. Otu nwaanyị so na ndị enyi ezinụụlọ ahụ wee tie mkpu n'olu ike sị; nwaanyị ibe m, Ị hụlanụ, biko mee ihe e kwuru niihina isi ala anaghị atọ ebe e tiri ya ka e nye oghere ka udo bịaghachi n'ụlọ ụnụ ọzọ.

Nzipụta nke asaa: Ihu dị mma adịghị mma ịga mbọ

Ihe merenụ: Nwoke na ibe ya nwere nghọtahie niihina otu ji ibe ya ụgwọ.

Onye mkpesa: Onye e ji ụgwọ

Ndị nọ n'ikpe: Ndị otu ọgbọ

Ebe ihe nọ mee: Na Nnọkwa

Otu nwoke ka a maara dịka ezigbo mmadụ, ọ na-enyere ndị mmadụ aka mgbe ha bịakwutere ya ma otu naara ya ego ka ọ zụọ ahịa n'ọnwa olenaole ka o weghachiri ya ego ahụ o biiri ya. Ka onye o ji ụgwọ chere ihe ruru afọ abụọ na ụma iwe wee jupụta ya obi, o wee were ikike ndị uweojii ịkpọchi onye ụgwọ n'ụlọ nga. Akụkọ wee ruo ndị otu ọgbọ ha ntị ha wee kpọọ ha ka ha bịa ka edoziere ha ihe butere esemookwu n'etiti ha. Ka onye ji ụgwọ kwuchara sị nyekwuo ya otu afọ ọzọ, onye e ji ụgwọ wee sị na ya agaghị ekweta niihina ọ dịzi ka ya amaghị ihe, na ya ga-akpọchirịrị ya n'ụlọ mkpọrọ. Otu onye n'ime ndị ọgbọ ha wee kpọọ ya aha sị, Nna ọhanaeze maara nke ọma na ị bụ ezi onye mana ihe ekwensu na-achọ bụ imetọ aha gị, biko nyekwuo ya oghere etu o siri rịọ niihina e kwesịghị ịkọ ajọ akụkọ n'isi gị makana ihu dị mma adịghị mma ịga mbọ.

Nzipụta nke asatọ: Nwanne na nwanne nọrọ n'ọgụ nwụọ onye ọbịa a kpara akụ nna ha.

Ihe merenụ: ụmụ ejima bụ dịọkpara na-azọ onye ga-anọchi nna ha bụ eze obodo.

Onye Mkpesa: ụmụ ejima

Ndị nọ n'ikpe: Ndị nze na ọzọ

Ebe ihe nọ mee: N'Aba

Eze na-achị Aba mụtara ụmụ ejima nwoke abụọ dịka diọkpara tupu ọ nwụọ, ka ọ nwụchara ụmụaka abụọ a na-azọ onye ọ dịịrị ịnọchi nna ha dịka eze. Nsogbu ruru na ha abụọ anaghị eji anya dị ha n'isi ahụrịta ibe ha. Ka akwa nne ha ruru ndị nze na ọzọ ntị ha wee sị ka a nọkọọ kpeziere ụmụ eze okwu dị n'etiti ha. Na mgbagha otu n'ime ha sị na a mụrụ ha otu ụbọchị ma bụrụ n'otu oge kama na ya ka nke ọzọ mata omenaala niihina ọ nọteela aka n'ala Bekee. Nke ọzọ sị na a mụrụ ha otu ụbọchị ma ya bu ụzọ pụta ụwa. Idezi okwu wee taa akpụ nke mere na ndị nze na ọzọ obodo gbabiri abụọ, ụfọdụ sonyere otu ndị ọzọ sonyere nke ọzọ. Otu okenye wee bilie sị ha ebe ha ekwetaghị nke ibe ha na-ekwu na ala eze ga-esi be ha pụọ, banye n'ezinụụlọ ọzọ udo dị. ọ gwara ha na o nweghị ike karịrị ha abụọ ịdị n'otu n'ihe ha na-eme. Na mmechi okwu ya o wee sị ha na nwanne na nwanne nọrọ n'ọgụ nwụọ onye ọbịa akpara akụ nna ha. Ha wee kweta otu n'ime ha wee chie eze.

Nzipụta nke iteghete: Ka ewu tara igu o kpeere ekwere?

Ihe merenụ: Nwoke chọpụtara na nwunye ya na nwoke ọzọ nwere mmekọ edina.

Onye mkpesa: Dibiụlọ

Ndị nọ n'ikpe: ụmụnna nke nwoke

Ebe ihe nọ mee: N'Uli

Otu nwoke chọpụtara na nwunye ya na enyi ya nwoke na-enyere ya na ezinụụlọ ya aka na-enwe mmekọ edina wee kpọkuo ụmụnna ka ha bịa nụrụ ihe ọjọọ enyi ya mere ya. Ka ụmụnna na-atụle esemookwu ahụ, ha chọpụtara na enyi ya nwoke ahụ bụ ya na-akụrụ ya nri site n'aka nwunye ya. Ha jiri uche dị nkọ wee nyochapụta ebe ihe siri rie mperi. Ha wee dụọ nwanne ha nwoke ọdụ sị ka ewu tara igu o kpeere ekwere? Ha mere nke a ka ọnụma ya dajụọ niihina ọ hịara ahụ nwoke inyere nwaanyị aka na nkịtị maọbụ nwaanyị achọghị ụzọ isi mee ka obi dị nwoke ahụ na-enye aka mma.

Nzipụta nke iri: (i) E were aka nri tie nwata ihe e were aka ekpe gụgụọ ya.

(ii) Ọ bụghị ka aka ha ka a na-eti nwa

Ihe meenụ: Nwata riri ụgwọ akwụkwọ ya.

Onye mkpesa: Nne nwa

Ndị nọ n'ikpe: Ndị nnaochie nwata ahụ.

Ebe ihe nọ mee: N'Amaọfụ

Otu nwoke nyere nwa ya ego ụgwọ akwụkwọ ya ka ọ kwụọ n'amaghị na ọ kwụghị. Mgbe nna ya jiri chọpụta o wee gaa n'ụlọakwụkwọ kpọrọ nwa ya kpọlaa na be ya n'ime obodo sị ya agụzila akwụkwọ niihina ọ dịghị ya mkpa o wee rie ụgwọ akwụkwọ ya. Ka nne nwa ahụ rịọrọ di ya ọtụtụ ọnwa hụ na o kwetaghị, o wee rịọ ndị nnaochie di ya ikpe banyere nwa ha. ọ gwara ha hoo haa na agwa nwata ahụ kpara adịghị mma mana nwata ahụ nọba n'ụlọ n'ime obodo o nwere ike ọ mụtakwuo ihe ọjọọ karịrị nke o merela o wee rịọ ikpe ka ha rịọrọ ya di ya n'isi nwata ahụ ka ọ gbaghara ya. Otu n'ime ndị nnaochie wee kwacha ikiri sị nna nwata ahụ na ebe nwata nọrọrị ọnwa anọ n'ime obodo na a ga-ezighachi ya n'ụlọakwụụkwọ. Ka o kwuchara nke a o wee sị nna nwata ahụ na e were aka nri tie nwata ihe e were aka ekpe gụgụọ ya maọbụ na ọ bụghị ka aka ha ka a na-eti nwa. O kwuru nke a ka mmụọ nwoke ahụ dajụọ ka o wee nwee ike wepụta ego ọzọ wee kwụọrọ nwa ya ụgwọ akwụkwọ.

N'ezie, ka udo wee chịa n'ebe niile n'ala Igbo, e nwere ndị ọ na-emetụta n'obi ịkpa udo n'oge niile. Ha na-ejikarị atụmatụ okwu a bụ ilu eme ya nke ọma. ọzọkwa, onye Igbo ọbụla a tụụrụ ilu na-ekwu maka udo anaghị asa okwu ahụ asa, ọ na-adị ka a kpụnyere ya mmiri n'ọnụ ozigbo. ọ bụrụ onye na-aba mba o mechie ọnụ ya ozigbo, ọ bụrụ onye na-alụ ọgụ maọbụ na-eti mmadụ ihe ume apụọ ya n'ahụ ozigbo.

Ilu ndị a bụ ọgwụ na agwọ ọnụma ma na-eme ka udo dị n'etiti ụmụ Igbo niile. Niihina ha tukwasịrị ndị okenye, ndị ichie, ụmụọkpụ, mmanwụ obi na ha na-ekpe ikpe nkwụmọọtọ, ihe ọbụla a gwara ha n'ilu okwu ndị ahụ ha na-ewere ya dịka olu Chi ukwu. Ha na-akpa udo n'eleghị mmadụ anya n'ihu maọbụ ọgaranya maọbụ ogbenye.

Edensibịa

Achebe C. (1958). Things fall apart. London: Heinemann ducational Books Limited.

Austin, J.l. (1962). How to do things with words. London: Clarendon Press.

Grundy, P. (2008). Doing pragmatics (3rd ed.) UK: Hodder Education.

Mey Jacob L. (2001). Pragmatics: An introduction (2nd ed.) London. Blackwell publishing Co.

Nwachukwu, Agbada J.O.J. (2002). The Igbo proverbs: A study of its conteụt, performance and functions. Enugu; John Jacobs publishers.

Nwolise O.B.c. (2004). Traditional approaches to conflict resolution among Igbo people of Nigeria. Reinforcing the need for Africa to rediscover its root. Amani Journal of African Peace. No. 1.

Ike - Iloanusi A. (2014). Proverbs - A speech act analysis. A master's thesis submitted to Department of linguistics.

Ajiboye, E.M. (2012). Proverbs and the management of conflicts in Oum. Ndimele (Ed.), Language, Interactive and Communication in a dynamic World. A festschrift or Chinyere Ohiri - Aniche, vol. 9, 305-317.

Levinson, Stephen C. (1983). Pragmatic - Cambridge: Cambridge University Press.

Saeed, John I. (2003). Semantics. UK:Blackwell Publilshing Ltd.

Osasinwo, W. (2003). Introduction to discourse analysis & Pragmatics. Lagos: Femulos - Felos Publishers.

Searle, J.R. (1969). Speech Acts. An essay in the philosophy of language. Cambridge; Cambridge University Press.

Obiechina, e. (1975). Culture, traditional and society in the West African Novel Cambridge: Cambridge university Press.